Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 8/1 p. 4-6
  • N’ikpeazụ—Ikpe Ziri Ezi Maka Mmadụ Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ikpeazụ—Ikpe Ziri Ezi Maka Mmadụ Nile
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkwa nke Anyị Pụrụ Ịtụkwasị Obi
  • A Pụrụ Imeri Ikpe Na-ezighị Ezi
  • Ịgha Mkpụrụ nke Ezi Omume
  • Jehova—Isi Iyi nke Ezi Ikpe na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ṅomie Jehova—Gosipụta Ikpe Ziri Ezi na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jizọs ‘Edoo Ikpe Ziri Ezi n’Ụwa’
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 8/1 p. 4-6

N’ikpeazụ—Ikpe Ziri Ezi Maka Mmadụ Nile

“Anyị ga-agbalịsi ike ige ntị n’ụzọ ndị ọhụrụ . . . n’olu ndị e mejọworo, olu ndị na-echegbu onwe ha, olu ndị na-enwekwaghị olileanya na a ga-anụ ha . . . Ihe fọdụrụ bụ itinye ihe ndị e dere n’iwu n’ọrụ: ijide n’aka n’ikpeazụ na dị ka a mụrụ onye ọ bụla inwe ùgwù hà nhata n’ihu Chineke, otú ahụ ka a mụrụ onye ọ bụla inwe ùgwù hà nhata n’ihu mmadụ.”—President Richard Milhous Nixon nke United States, okwu mmalite ọrụ, January 20, 1969.

MGBE ndị eze, ndị president, na ndị praịm minista malitere ọchịchị, ha na-ekwukarị banyere ikpe ziri ezi. Richard Nixon, onye bụbu president nke United States, mekwara otú ahụ. Ma okwu ọma ya tụfuru ịma mma ha ma e lee ha site n’ihe ndị mere nnọọ eme n’akụkọ ihe mere eme. N’agbanyeghị na o kwere nkwa ‘itinye ihe ndị e dere n’iwu n’ọrụ,’ e mesịrị maa Nixon ikpe ịda iwu wee manye ya ịhapụ ọkwa ya. Afọ iri atọ mgbe nke a gasịrị, ‘olu ndị e mejọworo, ndị na-echegbu onwe ha, na ndị na-enwekwaghị olileanya’ nọgidere na-eti mkpu ka a nụ ha.

Ịnụ olu ndị dị otú ahụ na ilebara nsogbu ha anya abụghị ọrụ dị mfe, dị ka imerime ndị ndú nwere ezi ebumnobi chọpụtaworo. ‘Ikpe ziri ezi maka mmadụ nile’ abụrụwo ihe mgbaru ọsọ siri ike nnweta. Otú o sina dị, ọtụtụ narị afọ gara aga, e kwere otu nkwa nke anyị kwesịrị ichebara echiche—nkwa pụrụ iche banyere ikpe ziri ezi.

Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịsaịa, Chineke mesiri ndị Ya obi ike na ọ ga-ezitere ha “ohu” nke ya onwe ya ga-ahọpụta. “Atụkwasịwo m ya Mmụọ m,” ka Jehova gwara ha. “[Ikpe ziri ezi] ka ọ ga-ewepụtara mba nile.” (Aịsaịa 42:1-3) Ọ dịghị onye ọchịchị bụ́ mmadụ ga-anwa anwa ime ụdị nkwupụta ahụ ga-abara onye ọ bụla, bụ́ nke ga-apụta ikpe ziri ezi nke na-adịgide adịgide nye mba nile. À pụrụ ịtụkwasị nkwa a obi? Ọ̀ dị mgbe a ga-arụzu ọrụ nke a pụrụ iche?

Nkwa nke Anyị Pụrụ Ịtụkwasị Obi

A pụrụ ịdabere ná nkwa nanị dabere n’onye kwere ya. N’ọnọdụ nke a, ọ dịghị onye ọzọ karịa Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile bụ́ onye na-ekwupụta na “ohu” ya ga-eguzobe ikpe ziri ezi n’ụwa nile. N’adịghị ka ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Jehova adịghị ekwe nkwa n’echeghị echiche. ‘Ọ pụghị ikwu okwu ụgha,’ ka Bible na-emesi anyị obi ike. (Ndị Hibru 6:18) “Ihe ọ bụla M kpebiworo ime ga-eme,” ka Chineke kwuru n’ụzọ imesi ihe ike.—Aịsaịa 14:24, Today’s English Version.

A na-emekwa ka obi ike anyị nwere ná nkwa ahụ sie ike site n’ihe ndekọ nke “ohu” Chineke họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst. Onye ahụ nke ga-eguzobe ikpe ziri ezi aghaghị ịhụ ikpe ziri ezi n’anya ma bie ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ikpe ziri ezi. Jisọs hapụrụ ihe ndekọ na-enweghị ntụpọ dị ka nwoke nke ‘hụrụ ezi omume n’anya wee kpọọ mmebi iwu asị.’ (Ndị Hibru 1:9) Ihe ndị o kwuru, otú o si bie ndụ, na ọbụna otú o si nwụọ, gosichara na ọ bụ n’ezie nwoke nke na-eme ihe n’ikpe ziri ezi. N’oge ọnwụ Jisọs, otu onye ọchịagha Rom, nke ihe àmà na-egosi na ọ hụrụ mgbe e kpere Jisọs ikpe na mgbe e gburu ya, bụ onye a kpaliri ikwu, sị: “N’eziokwu Nwoke a bụ onye ezi omume.”—Luk 23:47.

E wezụga ibi ndụ n’onwe ya dị ka onye ezi omume, Jisọs guzogidere ikpe na-ezighị ezi nke juru ebe nile n’oge ya. O mere nke a, ọ bụghị site n’ịgba mgba okpuru ma ọ bụ nkwatu ọchịchị, kama site n’ịkụziri onye ọ bụla ga-ege ntị ezi ikpe. Ozizi Elu Ugwu ya bụ nkọwa onye mara ihe nke ụzọ e kwesịrị isi tinye ezi ikpe na ezi omume n’ọrụ.—Matiu, isi nke 5-7.

Jisọs mere ihe o kwusara. O ledaghị ndị ekpenta ụwa na-atụ n’ọnụ anya, bụ́ “ndị a na-adịghị emetụ aka” n’etiti ndị Juu. Kama nke ahụ, o sooro ha kwurịta okwu, metụ ha aka, ọbụnakwa gwọọ ha. (Mak 1:40-42) Ndị nile o zutere, gụnyere ndị ogbenye na ndị e wedara n’ala, dịcha ya mkpa. (Matiu 9:36) “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike,” ka ọ gwara ha.—Matiu 11:28.

Karịsịa, Jisọs ekweghị ka ikpe na-ezighị ezi nke gbara ya gburugburu merụọ ma ọ bụ mee ka obi luo ya ilu. Ọ dịghị mgbe o nyeghachiri ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. (1 Pita 2:22, 23) Ọbụna mgbe ọ nọ n’oké ihe mgbu, o kpegaara Nna ya nke eluigwe ekpere n’isi otu ndị agha ahụ ndị kpọgburu ya. “Nna, gbaghara ha,” ka ọ rịọrọ, “n’ihi na ha amataghị ihe ha na-eme.” (Luk 23:34) N’eziokwu, Jisọs ‘kọọrọ mba nile akụkọ ikpe ziri ezi.’ (Matiu 12:18) Olee ihe akaebe ka ukwuu anyị nwere na ọ bụ ọchịchọ Chineke iguzobe ụwa nke ikpe ziri ezi karịa ihe nlereanya dị adị nke Ọkpara ya?

A Pụrụ Imeri Ikpe Na-ezighị Ezi

Ihe akaebe dị adị nke na-egosi na a pụrụ imeri ikpe na-ezighị ezi dịkwa n’ụwa taa. N’otu n’otu, nakwa dị ka otu nzukọ, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike imeri ajọ mbunobi, ile mmadụ anya n’ihu, ịkpa ókè agbụrụ, na ime ihe ike. Tụlee ihe atụ nke na-esonụ.

Pedroa kweere na ịgba mgba okpuru bụ nanị ụzọ a pụrụ isi weta ikpe ziri ezi n’Ógbè Basque, ókèala Spain o biri na ya. Iji mezuo nke ahụ ọ ghọrọ onye òtù nke òtù na-eyi ọha egwu nke nyere ya ọzụzụ ndị agha na France. Ozugbo ọ natasịrị ọzụzụ, e nyere ya iwu iguzobe otu ìgwè nta nke ndị na-eyi ọha egwu na ịgbakasị otu ogige ndị uwe ojii. Ndị òtù ya ka nọ na-akwadebe bọmbụ ndị ahụ mgbe ndị uwe ojii jidere ya. Ọ nọrọ ọnwa 18 n’ụlọ mkpọrọ, ma ọbụna n’ime ụlọ mkpọrọ ọ nọgidekwara n’ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, na-ekere òkè n’ịjụ nri na igbuji aka ya n’otu oge.

Pedro chere na ọ na-alụ ọgụ maka ikpe ziri ezi. Mgbe ahụ ọ bịara mara Jehova na nzube ya. Mgbe Pedro nọ n’ụlọ mkpọrọ, nwunye ya malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, mgbe a tọhapụkwara ya, nwunye ya kpọrọ ya òkù ịbịa otu n’ime nzukọ ha. Ihe omume ahụ tọrọ ya ụtọ nke ukwu nke na ọ rịọrọ ka a mụọrọ ya Bible, ihe ọmụmụ nke dugara ya n’ime mgbanwe dị ukwuu n’ụzọ o si ele ihe anya nakwa n’ụzọ ndụ ya. N’ikpeazụ, na 1989, e mere ma Pedro ma nwunye ya baptism.

“Ekelere m Jehova na egbubeghị m mmadụ ọ bụla n’oge m bụ onye na-eyi ọha egwu,” ka Pedro na-ekwu. “Ugbu a m na-eji mma agha nke mmụọ Chineke, bụ́ Bible, akụziri ndị mmadụ ozi nke ezi udo na ikpe ziri ezi—ozi ọma nke Alaeze Chineke.” N’oge na-adịbeghị anya gara aga Pedro, onye na-eje ozi ugbu a dị ka okenye n’etiti Ndịàmà Jehova, letara kpọmkwem ogige ndị ahụ o zubeburu ịla n’iyi. Na nke ugbu a nzube o ji gaa bụ ikwusara ezinụlọ ndị bi ebe ahụ ozi udo.

Ndịàmà Jehova na-eme mgbanwe ndị a n’ihi na ụwa ezi omume na-agụsi ha ike. (2 Pita 3:13) N’agbanyeghị na ha tụkwasịrị obi ha dum ná nkwa Chineke iweta nke a, ha ghọtara na ọ bụkwa ibu ọrụ ha ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ikpe ziri ezi. Bible gosiri anyị n’ụzọ doro anya na Chineke na-atụ anya ka anyị mee òkè anyị.

Ịgha Mkpụrụ nke Ezi Omume

N’eziokwu, mgbe anyị chere ikpe na-ezighị ezi ihu, anyị pụrụ ịchọ iti mkpu, sị: “Olee ebe Chineke nke [ikpe ziri ezi] nọ?” Nke ahụ bụ mkpu ndị Juu nke oge Malakaị tiri. (Malakaị 2:17) Chineke ò lebara anya ná mkpesa ha? N’ụzọ megidere nke ahụ, o mere ka “ike gwụ” ya n’ihi na, tinyere ihe ndị ọzọ, ha onwe ha na-aghọgbu nwunye ha ndị kataworo ahụ, na-agba ha alụkwaghịm n’ihi ihe ndị na-enweghị isi. Jehova kwupụtara nchegbu ya maka ‘nwunye ndị ha lụtara n’okorobịa, ndị ha onwe ha ghọgbuworo, ọ bụ ezie na ha onwe ha bụ nwanyị ndị e jikọrọ ha na ha, na ndị nwunye ọgbụgba ndụ ha.’—Malakaị 2:14.

Ànyị pụrụ ime mkpesa n’ụzọ ezi uche dị na ya banyere ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụrụ na anyị onwe anyị na-eme ihe n’ụzọ ikpe na-ezighị ezi? N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị agbalịa iṅomi Jisọs site n’iwepụ ajọ mbunobi na ịkpa ókè agbụrụ n’obi anyị, site n’ịbụ ndị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu na ndị na-ahụ onye ọ bụla n’anya, nakwa site n’ịghara ịkwụghachi ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ, anyị na-egosi n’eziokwu na anyị hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.

Ọ bụrụ na anyị ga-eweta ikpe ziri ezi dị ka ihe ubi, Bible na-agba anyị ume ‘ịgha mkpụrụ n’ezi omume.’ (Hosea 10:12) N’agbanyeghị otú o si yie ihe dị nta, mmeri onwe onye ọ bụla megide ikpe na-ezighị ezi dị mkpa. Dị ka Martin Luther King, Jr., dere na Letter From Birmingham Jail, “ikpe na-ezighị ezi n’ebe ọ bụla bụ ihe iyi egwu nye ikpe ziri ezi n’ebe nile.” Ndị “na-achọ ezi omume” bụ ndị Chineke na-ahọpụta iketa ụwa ọhụrụ ezi omume ya nke na-abịa n’isi nso.—Zefanaịa 2:3.

Anyị apụghị iwukwasị olileanya anyị maka ikpe ziri ezi n’elu ntọala ahụ na-esighị ike nke nkwa ụmụ mmadụ, ma anyị pụrụ ịtụkwasị okwu nke Onye Okike anyị na-ahụ n’anya obi. Ọ bụ ya mere Jisọs ji gwa ụmụazụ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. (Matiu 6:9, 10) Jisọs, bụ́ Eze ahụ a họpụtara ahọpụta nke Alaeze ahụ, “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; Ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.”—Abụ Ọma 72:12, 13.

N’ụzọ doro anya, ikpe na-ezighị ezi agaghị adịgide. Ịchịisi Kraịst n’elu ụwa nile ga-emeri ikpe na-ezighị ezi ruo mgbe ebighị ebi, dị ka Chineke na-emesi anyị obi ike site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaịa: “Oge ahụ na-abịa mgbe M ga-emezu nkwa M kwere . . . N’oge ahụ M ga-ahọpụta dị ka eze onye ezi omume bụ́ nwa Devid. Eze ahụ ga-eme ihe ziri ezi na ikpe ziri ezi n’ala nile.”—Jeremaịa 33:14, 15, TEV.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Aha ndochi anya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya