Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọ Dịghị Ihe Ka Eziokwu ahụ Mma
    Ụlọ Nche—1998 | Jenụwarị 1
    • Ọ Dịghị Ihe Ka Eziokwu ahụ Mma

      Dị Ka G. N. Van Der Bijl Si Kọọ

      Na June 1941, e nyefere m n’aka ndị Gestapo ma kpọrọ m gaa n’ogige ịta ahụhụ Sachsenhausen na nso Berlin, Germany. N’ebe ahụ, dị ka onye mkpọrọ nwere nọmba bụ́ 38190, m nọgidere ruo mgbe a gara njem ọnwụ ahụ jọgburu onwe ya n’April 1945. Ma tupu m kọwaa ihe omume ndị ahụ, ka m kọwaa otú m si bịa ghọọ onye mkpọrọ.

      A MỤRỤ m na Rotterdam, Netherlands, ngwa ngwa Agha Ụwa Mbụ malitesịrị, na 1914. Nna m rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè, obere ụlọ anyị dịkwa nso n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè. Ka ọ na-eru ná njedebe agha ahụ na 1918, ahụrụ m ọtụtụ ụgbọ okporo ígwè a sị na ha na-ebu ndị merụrụ ahụ ka ha na-ekwofere. Obi abụọ adịghị ya na ha jupụtara ná ndị agha e merụrụ ahụ bụ́ ndị e si n’ọgbọ agha ebula ụlọ.

      Mgbe m gbara afọ 12, ahapụrụ m ụlọ akwụkwọ iji nweta ọrụ. Afọ asatọ n’ihu edenyere m aha m ịrụ ọrụ dị ka onye na-eje ozi n’ime ụgbọ mmiri ndị njem, ruokwa afọ anọ ọzọ, eji m ụgbọ mmiri mee njem n’agbata Netherlands na United States.

      Mgbe anyị kwụsịrị n’ọdụ ụgbọ mmiri New York n’oge okpomọkụ nke 1939, agha ụwa ọzọ na-achọ ịda. Ya mere mgbe otu nwoke batara n’ime ụgbọ anyị ma nye m akwụkwọ bụ́ Government, bụ́ nke kwuru banyere otu ọchịchị ezi omume, anaara m ya n’obi ụtọ. Mgbe m laghachiri Rotterdam, amalitere m ịchọ ọrụ n’elu ala, ebe ndụ n’osimiri na-eyikwaghị ihe dị nchebe. Na September 1, Germany wakporo Poland, e nubakwara mba nile n’Agha Ụwa nke Abụọ.

      Ịmụ Eziokwu Bible

      N’otu ụtụtụ Sunday na March 1940, m jere ileta nwanne m nwoke lụworo nwunye mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova pịrị mgbịrịgba ụzọ. Agwara m ya na mụ enweworị akwụkwọ Government ma jụọ ya banyere eluigwe na onye ga-aga ebe ahụ. M natara nnọọ azịza doro anya na nke ezi uche dị na ya nke na m gwara onwe m sị, ‘Nke a bụ eziokwu ahụ.’ Enyere m ya adres m ma gwa ya ka ọ kpọtụrụ m n’ebe obibi m.

      Mgbe nanị nleta atọ gasịrị, bụ́ oge ndị anyị nwere nkwurịta okwu Bible miri emi, m malitere iso Onyeàmà ahụ n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ. Mgbe anyị ruru n’ókèala ahụ, o gosiri m ebe m ga-amalite, arụkwara m nanị m. Otú ahụ ka e si malitere ọtụtụ ndị ọhụrụ ọrụ nkwusa n’oge ahụ. A dụrụ m ọdụ na, iji ghara ịbụ onye a hụrụ n’okporo ámá, m kwesịrị ịnọ na paseji mgbe nile mgbe m na-eche akwụkwọ n’ihu ndị mmadụ. Ọ dị mkpa ịkpachara anya n’oge mmalite agha ndị ahụ.

      Izu atọ n’ihu, na May 10, 1940, ndị agha Germany wakporo Netherlands, na May 29 kwa, kọmishọna Reich bụ́ Seyss-Inquart kwupụtara na a machibidowo nzukọ nke Ndịàmà Jehova iwu. Anyị na-ezukọ nanị n’ìgwè nta dị iche iche, a kpachapụkwara anya izochi ebe anyị na-enwe nzukọ. Nleta nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-ewusi anyị ike karịsịa.

      M na-esebu siga nke ukwuu, mgbe m nyekwara Onyeàmà na-amụrụ m ihe siga ma chọpụta na ọ dịghị ese siga, m sịrị: “Enweghị m ike ịhapụ ise siga ma ọlị!” Otú ọ dị, ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ka m na-eje n’okporo ámá, echere m, sị, ‘Ọ bụrụ na m ga-abụ Onyeàmà, achọrọ m ịbụ ezigbo Onyeàmà.’ Ya mere ọ dịghị mgbe m sere siga ọzọ.

      Iwere Nguzo Maka Eziokwu

      Na June 1940, ihe na-erughị ọnwa atọ m zutesịrị Onyeàmà ahụ n’ọnụ ụzọ nwanne m nwoke, egosipụtara m nrara m nye Jehova, e mekwara m baptism. Ọnwa ole na ole n’ihu, n’October 1940, abanyere m n’ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ. N’oge ahụ, e nyere m ihe a kpọrọ jacket ọsụ ụzọ. O nwere ọtụtụ akpa maka akwụkwọ na akwụkwọ nta, a pụkwara iyikwasị ya kotu.

      Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ site ná mmalite mgbe ndị Germany weghaara ọnọdụ, a nọ na-achụgharị nta Ndịàmà Jehova n’usoro ma na-ejide ha. Otu ụtụtụ na February 1941, mụ na Ndịàmà ole na ole ndị ọzọ nọ n’ozi ubi. Ka ha na-akpọtụrụ ndị nọ n’otu akụkụ nke otu ìgwè ụlọ, arụrụ m akụkụ nke ọzọ nke ụlọ ndị ahụ iji zute ha. Ka oge na-aga, ejere m ile ihe na-egbu ha oge ma zute otu nwoke nke jụrụ m, sị, “Ì nwekwara otu n’ime akwụkwọ nta ndị a?”

      “Ee,” ka m zaghachiri. Mgbe m kwuru nke ahụ o jidere m ma kpọga m n’ogige ndị uwe ojii. A kpọchiri m ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ izu anọ. Ihe ka ukwuu ná ndị uwe ojii ahụ nwere omume enyi. Ọ bụrụhaala na e nyefeghị mmadụ n’aka ndị Gestapo, ọ pụrụ inweta ntọhapụ ya site nanị n’ịbịanye aka ná nkwupụta e dere ede na ya agakwaghị ekesa akwụkwọ e ji amụ Bible. Mgbe a gwara m ka m bịanye aka n’ụdị nkwupụta ahụ, azaghachiri m, sị: “Ọ bụrụgodị na unu enye m otu ma ọ bụ nde gulden abụọ, agaghị m abịanyekwarị aka na ya.”

      Mgbe e jidesịrị m ruo nwa oge, e nyefere m n’aka ndị Gestapo. Mgbe ahụ a kpọọrọ m gaa n’ogige ịta ahụhụ Sachsenhausen dị na Germany.

      Ndụ na Sachsenhausen

      Mgbe m rutere na June 1941, e nweworị ihe dị ka Ndịàmà 150—ndị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ha bụ ndị Germany—na Sachsenhausen. A kpọọrọ anyị bụ ndị mkpọrọ ọhụrụ gaa n’akụkụ ogige ahụ a kpọrọ Nkewapụ. N’ebe ahụ ụmụnna anyị ndị Kraịst lekọtara anyị ma kwadebe anyị maka ihe a ga-atụ anya ya. Otu izu n’ihu, ìgwè ọzọ nke Ndịàmà sitere Netherlands rutere. Na mbụ a gwara anyị ka anyị guzo n’otu ebe ahụ n’ihu ogige ndị agha site n’elekere anya asaa n’ụtụtụ ruo n’elekere anya isii n’uhuruchi. Mgbe ụfọdụ ndị mkpọrọ aghaghị ime nke ahụ kwa ụbọchị ruo otu izu ma ọ bụ karịa.

      N’agbanyeghị mmeso obi ọjọọ ahụ, ụmụnna ghọtara ịdị ngwa nke ịnọgide na-abụ ndị a haziri ahazi na iri nri ime mmụọ. Kwa ụbọchị a na-ekenye mmadụ ịkwadebe echiche ndị sitere n’otu akụkụ Bible. E mesịa, n’ebe a na-agbakọ, Ndịàmà n’otu n’otu ga-agakwuru onye ahụ ma nụrụ ihe ọ kwadebeworo. N’otu ụzọ ma ọ bụ ọzọ, a na-ezubata akwụkwọ n’ime ogige ahụ site n’oge ruo n’oge, anyị na-ezukọkwa na Sunday ọ bụla ma mụkọọ akwụkwọ a e ji amụ Bible ọnụ.

      N’ụzọ ụfọdụ e zubatara otu akwụkwọ bụ́ Children, bụ́ nke e wepụtara ná mgbakọ St. Louis na United States n’oge okpomọkụ nke 1941, n’ime Sachsenhausen. Iji belata ihe ize ndụ nke akwụkwọ ahụ ịbụ nke a chọpụtara ma bibie, anyị kewasịrị ya, e kesakwara akụkụ ya n’etiti ụmụnna ka onye ọ bụla nwee ike ịgụ ya, onye gụọ ibe ya agụọ.

      Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị na-elekọta ogige ahụ chọpụtara banyere nzukọ ndị anyị na-enwe. Ya mere e kewara Ndịàmà ma kpọba ha n’ogige ndị agha dị iche iche. Nke ahụ nyere anyị ezigbo ohere ikwusara ndị mkpọrọ ọzọ ozi ọma, n’ihi ya kwa, ọtụtụ ndị Poland, ndị Ukraine, na ndị ọzọ nakweere eziokwu ahụ.

      Ndị Nazi ezoghị nzube ha ibibi ma ọ bụ igbu Bibelforscher, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova ezo. N’ihi ya, nrụgide a rụgidere anyị siri ike. A gwara anyị na a pụrụ ịtọhapụ anyị ma ọ bụrụ na anyị abịanye aka ná nkwupụta na-akatọ okwukwe anyị. Ụfọdụ ụmụnna malitere iche, sị, “Ọ bụrụ na m nwere onwe m, m pụrụ imekwu ihe n’ozi Jehova.” Ọ bụ ezie na ole na ole bịanyere aka, ihe ka ukwuu n’ime ụmụnna anyị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ụkọ, mweda n’ala, na mmeso ọjọọ nile. A nụghị ihe banyere ụfọdụ n’ime ndị ahụ mebiri okwukwe ha ọzọ ma ọlị. Otú ọ dị, dị ka ihe obi ụtọ, ndị ọzọ mesịrị nwetaghachi onwe ha, ha ka bụkwa Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike.

      A na-amanye anyị mgbe nile ịnọ na-ekiri ka a na-enye ndị mkpọrọ ntaramahụhụ anụ ahụ, dị ka iji osisi apịa ha ọnụ apịpịa 25. N’otu mgbe, e mere ka anyị kirie ogbugbu nke ụmụ nwoke anọ site ná nkwụgbu. Ahụmahụ ndị ahụ na-enwe mmetụta n’ahụ mmadụ n’ezie. Otu nwanna, bụ́ nwoke mara mma, toro ogologo bụ́ onye bi n’otu ogige ndị agha ahụ m bi, gwara m, sị: “Tupu m bịa n’ebe a, enweghị m ike ịhụ ọbara n’atụbọghị ozugbo. Ma ugbu a obi akaala m.” Ma, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na obi akaala anyị, anyị abụghị ndị obi tara mmiri. Aghaghị m ikwu na, ọ dịghị mgbe m buuru ndị na-akpagbu anyị ihe ọjọọ ma ọ bụ ịkpọasị n’obi.

      Mgbe m sosịrị ndị kommando (ndị ọrụ) rụọ ọrụ ruo oge ụfọdụ, e nyere m àkwà n’ụlọ ọgwụ n’ihi oké ahụ ọkụ. Onye dọkịta nwere obiọma si Norway na otu nọọsụ si Czechoslovakia nyeere m aka, ma eleghịkwa anya obiọma ha zọpụtara ndụ m.

      Njem Ọnwụ Ahụ

      Ka ọ na-erule April 1945, o doro anya na a na-emeri Germany n’agha ahụ. Ndị agha jikọrọ aka nke ebe ọdịda anyanwụ si n’ebe ọdịda anyanwụ na-abịa ngwa ngwa, ndị Soviet, sikwa n’ebe ọwụwa anyanwụ. O kweghị ndị Nazi omume igbuchapụ ọtụtụ narị puku mmadụ nọ n’ogige ịta ahụhụ ma bupụsịa ozu ha n’ụbọchị ole na ole n’ahapụghị ihe a ga-eji achọpụta. Ya mere ha kpebiri igbuchapụ ndị ọrịa na ịkpọrọ ndị mkpọrọ ndị ọzọ gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri kasị nso. N’ebe ahụ ha mere atụmatụ ikpoju ha n’ụgbọ mmiri ma kpuo ụgbọ mmiri ahụ n’osimiri.

      Njem nke ihe dị ka ndị mkpọrọ 26,000 site na Sachsenhausen malitere n’abalị nke April 20. Tupu anyị ahapụ ogige ahụ, a napụtara ụmụnna anyị na-arịa ọrịa site n’ụlọ ọgwụ. E nwetara ụgbọ nke ịnyịnya na-adọkpụ nke a pụrụ iji buru ha. Ná ngụkọta, anyị dị 230 sitere ná mba isii dị iche iche. N’ime ndị na-arịa ọrịa bụ Nwanna Arthur Winkler, bụ́ onye tụnyeworo ụtụ dị ukwuu ná mgbasa nke ọrụ ahụ na Netherlands. Anyị bụ́ Ndịàmà nọ n’azụ azụ nke njem ahụ, anyị nọgidekwara na-agbarịta onwe anyị ume ịnọgide na-aga n’ihu.

      Ná mmalite, anyị jere ije ruo hour 36 n’akwụsịghị akwụsị. Ka m na-eje ije, ụra tụụrụ m n’ezie n’ihi ahụhụ na ike ọgwụgwụ. Ma ịkwụsị ma ọ bụ izu ike agaghị ekwe omume n’ihi na mmadụ na-etinye onwe ya n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye ndị nche gbara égbè. N’abalị anyị na-ehi ụra n’èzí ma ọ bụ n’ime ọhịa. Nri adịghị. Mgbe ihe mgbu nke agụụ dịrị oké ukwuu, arara m ihe e ji asa ezé nke ndị Red Cross Sweden nyeworo anyị.

      N’otu mgbe, n’ihi na o doghị ndị nche Germany anya ebe ndị agha Russia na United States nọ, anyị nọrọ n’ime ọhịa ruo ụbọchị anọ. Nke a sitere na nduzi Chineke n’ihi na, n’ihi ya, anyị erughị Ọnụ Mmiri Lübeck n’oge iji banye n’ụgbọ mmiri ndị gaara akpọje anyị n’ili anyị bụ́ mmiri. N’ikpeazụ, mgbe ụbọchị 12 na njem were ihe karịrị kilomita 200 gasịrị, anyị ruru Crivitz Wood. Nke a adịghị anya site na Schwerin, obodo dị ihe dị ka kilomita 50 site na Lübeck.

      Ndị Soviet nọ n’aka nri anyị, ndị America, n’aka ekpe anyị kwa. Site n’ụda nke égbè ukwu na ịkwa mgbọ nke égbè rifle, anyị maara na anyị nọ nso n’ihu agha. Ndị nche Germany tụrụ ụjọ; ụfọdụ gbalagara, ndị ọzọkwa yipụrụ uwe agha ha ma yiri uwe ndị mkpọrọ ndị ha yipụrụ ndị nwụrụ anwụ, na-atụ anya ịbụ ndị a na-amataghị. N’etiti ọgba aghara ahụ, anyị bụ́ Ndịàmà gbakọrọ ikpe ekpere maka nduzi.

      Ụmụnna na-enye nduzi kpebiri na anyị ga-ahapụ n’isi ụtụtụ echi ya ma gaa chee ihu n’akụkụ nke ndị agha United States. Ọ bụ ezie na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị mkpọrọ ahụ malitere njem ọnwụ ahụ nwụrụ ma ọ bụ bụrụ ndị e gburu n’ụzọ, Ndịàmà nile lanarịrị.

      Onye ọrụ ndị agha Canada buuru m n’ụgbọala gaa n’obodo Nijmegen, ebe otu nwanne m nwanyị bibu. Ma mgbe m ruru n’ebe ahụ, achọpụtara m na ọ kwapụla. Ya mere m kwadoro iji ụkwụ gaa Rotterdam. N’ịbụ ihe ndabara ọma, n’ụzọ, otu onye nkịtị ji ụgbọala ya buru m garuo kpọmkwem n’ebe m na-aga.

      Eziokwu Abụrụwo Ndụ M

      Kpọmkwem n’ụbọchị ahụ m rutere Rotterdam, m tinyere akwụkwọ ọzọ maka ọrụ ọsụ ụzọ. Izu atọ n’ihu anọ m n’ebe e kenyere m ọrụ n’obodo Zutphen, ebe m jere ozi ruo otu afọ ọzọ na ọkara. N’oge ahụ, enwetaghachiri m ume ụfọdụ. Mgbe ahụ a họpụtara m ịbụ onye nlekọta sekit, dị ka a na-akpọ ndị ozi na-ejegharị ejegharị. Ọnwa ole na ole n’ihu, a kpọrọ m òkù na Watchtower Bible School of Gilead na South Lansing, New York. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ na klas nke 12 nke ụlọ akwụkwọ ahụ na February 1949, e zigara m Belgium.

      Ejewo m ozi n’ọtụtụ akụkụ nke ozi ahụ na Belgium, gụnyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ asatọ n’alaka ụlọ ọrụ na ọtụtụ iri afọ n’ọrụ njegharị dị ka ma onye nlekọta sekit ma onye nlekọta distrikti. Na 1958, alụrụ m Justine, bụ́ onye ghọrọ onye mụ na ya so na-ejegharị. Ugbu a, ka m nọ na-akawanye nká, m ka nwere ọṅụ nke inwe ike ije ozi n’ụzọ a kpaara ókè dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-enye aka.

      Mgbe m leghachiri anya azụ n’ozi m, m pụrụ ikwu n’ezie, sị: “Ọ dịghị ihe ka eziokwu ahụ mma.” N’ezie, ọ dịbeghị mfe mgbe nile. Achọpụtawo m mkpa nke ịmụta ihe site ná njehie na emezighị emezi m. Ya mere mgbe m na-agwa ndị na-eto eto okwu, m na-agwakarị ha, sị: “Gị onwe gị kwa ga-ejehie, eleghịkwa anya ọbụna mee mmehie dị oké njọ, ma aghala ụgha banyere ya. Soro ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye okenye kwurịta ihe ahụ, mgbe ahụ mee mgbanwe ndị dị mkpa.”

      N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 50 n’ozi oge nile m na Belgium, enwewo m ihe ùgwù nke ịhụ ndị m mabuuru dị ka ụmụaka ịbụ ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye na ndị nlekọta sekit. Ahụwokwa m ndị nkwusa Alaeze 1,700 ma ọ bụ ihe yiri ya ná mba a ka o toro ruo ihe karịrị 27,000.

      M na-ajụ, sị, “À pụrụ inwe ụzọ ibi ndụ a gọziri agọzi nke karịrị ijere Jehova ozi?” E nwebeghị ya, e nweghị ya ugbu a, a gaghịkwa enwe ya ma ọlị. M na-ekpe ekpere ka Jehova nọgide na-edu ma na-agọzi mụ na nwunye m ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-ejere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi.

      [Foto dị na peeji nke 26]

      Mụ na nwunye m ngwa ngwa anyị gbasịrị akwụkwọ na 1958

  • “Mee Ndị nke Mba Nile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ”
    Ụlọ Nche—1998 | Jenụwarị 1
    • “Mee Ndị nke Mba Nile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ”

      “YA MERE, gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” Nke a bụ otú New World Translation si sụgharịa iwu Jisọs nke dị na Matiu 28:19. Otú ọ dị, a katọwo nsụgharị a. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ nta okpukpe na-azọrọ: “Nanị nsụgharị ihe odide Grik pụrụ ịnabata bụ: ‘Mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ!’” Nke a ọ̀ bụ eziokwu?

      Nsụgharị a, “Mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,” pụtara n’ọtụtụ nsụgharị Bible, ọ bụkwa nsụgharị nkịtị nke okwu Grik ahụ. Ya mere, olee ihe ndabere e nwere maka nsụgharị bụ́, “Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism”? Ihe a na-ekwu. N’ụzọ doro anya, okwu ahụ bụ́ “na-eme ha baptism” na-ezo aka n’ebe ndị mmadụ nọ, ọ bụghị n’ebe mba nile nọ. Onye Germany bụ́ ọkà mmụta bụ́ Hans Bruns na-ekwu: “[Okwu] ahụ bụ́ ‘ha’ adịghị ezo aka ná mba nile (nke Grik ya nwere ọdịiche pụtara ìhè), kama ná ndị mmadụ nọ ná mba nile.”

      Ọzọ, e kwesịrị ịtụle ụzọ e si mezuo iwu Jisọs. Banyere ozi Pọl na Banabas na Dabe, obodo ukwu dị n’Asia Minor, anyị na-agụ: “Mgbe ha zisasịịrị obodo ahụ ozi ọma, meekwa ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ, ha laghachiri na Listra, na Aịkọniọm, na Antiọk.” (Ọrụ 14:21, NW) Rịba ama na Pọl na Banabas mere ka, ọ bụghị obodo Dabe, kama ụfọdụ ndị Dabe ghọọ ndị na-eso ụzọ.

      N’ụzọ yiri nke ahụ, banyere oge ọgwụgwụ, akwụkwọ Mkpughe buru amụma, ọ bụghị na mba nile ga-efe Chineke, kama na “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile na ndị nile na asụsụ nile” ga-eme otú ahụ. (Mkpughe 7:9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otú a, a na-ewepụ nsụgharị New World Translation n’ụta dị ka nsụgharị a pụrụ ịtụkwasị obi nke ‘Akwụkwọ Nsọ nile, nke si n’obi Chineke pụta.’—2 Timoti 3:16.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya