-
Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Ndụ Ebighị EbiỤlọ Nche—2006 | Ọktoba 1
-
-
Ọchịchọ Ụmụ Mmadụ Na-achọ Ndụ Ebighị Ebi
Ọ DỊWO anya ọ nọworo na-agụ ụmụ mmadụ agụụ ịdị ndụ ebighị ebi. Ma nke ahụ enwebeghị isi—ọ dịbeghị onye nwere ike ịkwụsị ọnwụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịchabeghị anya, nnyocha ndị a na-eme n’ihe banyere ọgwụ na ahụ́ ike emeela ka ndị mmadụ nweghachi olileanya na ọ ka ga-ekwe omume ịgbatị ndụ mmadụ. Ka anyị tụlee nnyocha dị iche iche ndị ọkà mmụta sayensị nọworo na-eme iji mee ka nke a kwe omume.
Ndị na-amụ ihe banyere ihe ndị dị ndụ na-enyocha otu mmiri ọgwụ ahụ́ mmadụ na-emepụta bụ́ nke a na-akpọ telomerase iji nwee ike ịmụba ugboro ole mkpụrụ ndụ ga na-emepụtaghachi onwe ha. Ndị sayensị maara na mkpụrụ ndụ ndị merela ochie na ndị nke ike gwụrụla na-anwụ, ndị ọhụrụ anọchie ha. N’ezie, ọ na-afọ nke nta ka akụkụ ahụ́ nile nke mmadụ nwoghaa onwe ha ọtụtụ ugboro n’oge nile mmadụ dị ndụ. Ndị ahụ na-eme nnyocha na-eche na ọ bụrụ na a mụbaa ugboro ole mkpụrụ ndụ na-emepụtaghachi onwe ha, “ahụ́ mmadụ pụrụ ịdị na-enwogha onwe ya ruo ogologo oge—ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.”
E nwere ihe ọzọ ndị sayensị na-amụ banyere ya. Nke ahụ bụ otú ha ga-esi jiri mkpụrụ ndụ ha wepụtara n’imeju, akụrụ, ma ọ bụ n’obi mmadụ nke mebiri emebi mepụta imeju, akụrụ ma ọ bụ obi ọhụrụ. Nke ọhụrụ ahụ ha mepụtara ga-adị nnọọ ka nke ahụ mebiri emebi, ha ga-etinyere onye ahụ nke ọhụrụ ahụ ma ha wepụ nke ahụ mebiri emebi.
Ndị ọkà mmụta na-amụ otú a pụrụ isi mepụta ụmụ ihe ndị pere nnọọ mpe a ga-eji nanị onyokomita na-ahụ, na-atụ anya na oge ga-eru mgbe a ga-emepụta robot ndị ha ka mkpụrụ ndụ, bụ́ ndị ndị dọkịta ga na-agbanye n’ọbara ka ha gaa chọta mkpụrụ ndụ ndị bu ọrịa cancer na nje ndị na-akpata ọrịa ma gbuo ha. Ụfọdụ ndị kweere na ọ bụrụ na e mepụta nke a ma jikọta ya na usoro iji mkpụrụ ndụ e ketara eketa agwọ ọrịa, na ọ ga-eme ka ahụ́ mmadụ dịgide ndụ.
E nwere ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-akwado ka a na-adọwa ozu na friza iji chekwaa ha ruo mgbe ndị dọkịta ga-achọpụta ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa dịgasị iche iche, ọgwụ ndị a ga-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị na-aka nká, mee ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ ma nweghachi ahụ́ ike ha. Otu akwụkwọ kwuru na nke a na ịgbasi ozu bụ́ nke ndị Ijipt oge ochie na-eme bụ nwanne.
Otú a ụmụ mmadụ si na-eme ike ha nile iji chọta ihe ga-eme ka mmadụ ghara ịnwụ anwụ gosiri otú o si siere ha ike ịnabata echiche ahụ bụ́ na mmadụ na-anwụ anwụ. Ọ̀ ga-ekwe ụmụ mmadụ omume ịdị ndụ ebighị ebi? Gịnị ka Bible nwere ikwu n’okwu a? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị ahụ.
-
-
Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị EbiỤlọ Nche—2006 | Ọktoba 1
-
-
Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi
IHE ka ọtụtụ ná ndị nọ n’okpukpe ndị e nwere n’ụwa na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi, n’agbanyeghị ebe ọ ga-abụ. Otú ha si akọwa ya pụrụ ịdịgasị iche, ma n’ụzọ bụ́ isi, olileanya ha bụ otu—ibi ndụ obi ụtọ n’ebe ndị mara mma n’anwụghị anwụ. Nke a ọ́ bụghị ihe ị na-atụ anya ya? Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji nwee ọchịchọ dị otú a? Ọ̀ dị mgbe ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi?
Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Onye Okike tinyere ọchịchọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụmụ mmadụ site na mgbe o kere ha, malite n’oge o kere di na nwunye mbụ ahụ. Bible na-ekwu, sị: “Mgbe ebighị ebi ka [Chineke] tinyeworo n’obi ha.”—Eklisiastis 3:11.
Otú ọ dị, ka ọchịchọ di na nwunye mbụ ahụ nwere ịdị ndụ ebighị ebi wee mezuo, ha aghaghị ikwe ka Chineke na-ekpebiri ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ha mere nke ahụ, Jehova gaara agụ ha ná ndị ruru eru ịdị ndụ ruo “mgbe ebighị ebi” n’ebe obibi ọ kwadebeere ha, ya bụ, ogige Iden.—Jenesis 2:8; 3:22.
A Tụfuo Ndụ Ebighị Ebi
Bible gosiri na Chineke kụrụ “osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ” n’ubi ahụ, bụ́ nke ọ gwara Adam na Iv ka ha ghara iri mkpụrụ ya, ma ọ bụghị ya, ha ga-anwụ. (Jenesis 2:9, 17) Adam na Iv ịghara iri mkpụrụ osisi ahụ ga-egosi Chineke na ha na-erubere ya isi. Irikwanụ ya ga-egosi na ha adịghị erubere Chineke isi. Adam na Iv jụrụ irubere Jehova isi ma dụnyere Setan, bụ́ mmụọ nke jụrụ ime ihe Chineke kwuru, úkwù. N’ihi ihe a merenụ, Chineke ziri ezi ikpebi na Adam na Iv erughịzi eru ịdị ndụ ebighị ebi.—Jenesis 3:1-6.
Ihe Chineke chere ha n’ihu bụ ndụ ma ọ bụ ọnwụ, ịdị adị ma ọ bụ adịghị adị. Ihe si n’isi ha nupụrụ pụta bụ ọnwụ, ngwụsị nke ịdị adị ha. Ọ gaghị ekwe omume Adam na Iv ma ọ bụ ụmụ ha ịdịgide ndụ site n’ịṅụ ọgwụ ma ọ bụ n’ihi na ha nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ.a
Nnupụisi Adam wetaara ụmụ ya nile ahụhụ. Pọl onyeozi kọwara ihe siri na ya pụta. O dere, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.”—Ndị Rom 5:12.
E Weghachi Ndụ Ebighị Ebi
Pọl onyeozi gosiri ọnọdụ ụmụ Adam nọ na ya site n’iji ha tụnyere ndị ohu e nwere na narị afọ nke mbụ. N’ihi mmehie nke nne na nna ha, a mụnyere ụmụ Adam na Iv ‘n’ohu nke mmehie,’ ha agaghịkwa agbanahụ ya, nke a pụtara na ha ga na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12; 6:16, 17) Ọ bụrụ na Jehova emeghị ihe kwekọrọ n’iwu ya iji gbapụta ụmụ Adam na Iv n’ohu ha nọ na ya, ha agaghị agbanahụ ya n’onwe ha. Pọl kọwara, sị: “Dị ka amamikpe nke ụdị mmadụ nile sitere n’otu njehie [nke Adam], n’otu aka ahụkwa, site n’otu ime ihe ziri ezi, a na-akpọ ụdị mmadụ nile ndị ezi omume maka ndụ.” “Otu ime ihe ziri ezi” ahụ dugara Jizọs n’iji ndụ mmadụ ya zuru okè chụọ àjà dị ka “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ nile.” Jehova maara na ihe mgbapụta ahụ nwere ikike nke ịtọhapụ ụmụ mmadụ ‘n’ikpe’ nke “amamikpe” n‘ụzọ kwekọrọ n’iwu ahụ.—Ndị Rom 5:16, 18, 19; 1 Timoti 2:5, 6.
Ọ bụ nke a mere ndị ọkà mmụta sayensị agaghị achọtali ndụ ebighị ebi ná mkpụrụ ndụ e ketara eketa nke mmadụ. E nwere ebe ọzọ a ga-achọta ya. Dị ka Bible si kwuo, ihe kpatara ọnwụ ụmụ mmadụ na-anwụ bụ n’ihi na ha mere mmehie nakwa n’ihi na ha dara iwu, ọ bụghị n’ihi ihe si ha n’ọbara. Ihe a ga-eji weghachi ndụ ebighị ebi—àjà mgbapụta Jizọs—bụkwa ihe iwu chọrọ. Àjà mgbapụta ahụ bụkwa ihe na-egosi na Chineke bụ onye ezi omume nakwa na o nwere obiọma. Oleezi ndị ga-erite uru site n’àjà mgbapụta ahụ ma nweta ndụ ebighị ebi?
Onyinye nke Anwụghị Anwụ
Jehova bụ Chineke “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ dịghị anwụ anwụ. (Abụ Ọma 90:2) Jizọs Kraịst bụ onye mbụ Jehova nyere onyinye nke anwụghị anwụ. Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Kraịst, ebe e siworo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, adịkwaghị anwụ anwụ; ọnwụ abụkwaghị nna ukwu n’ebe ọ nọ.” (Ndị Rom 6:9) N’ezie, mgbe Pọl na-akọwa ọdịiche dị n’etiti Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ na ndị ọchịchị bụ́ mmadụ, ọ kọwara na ọ bụ Jizọs bụ nanị onye na-apụghị ịnwụ anwụ n’ime ha. Jizọs na-adịgide “ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” A pụghị ‘ibibi ndụ ya ebibi.’—Ndị Hibru 7:15-17, 23-25; 1 Timoti 6:15, 16.
-