-
Àchọwala M Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 1
Àchọwala M Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?
“Ọtụtụ ụmụ nwoke na-agwa m ka mụ na ha kpawa. E nwekwara ọtụtụ ụmụ nwoke mara mma mụ na ha nwere ike ịkpa.”—Whitney.
“Ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-arịọsi ụmụ okoro ike ka ha na ha kpawa. Ọ na-adị m ka m kweta. Ma, ọ bụrụ na mụ ajụọ ndị mụrụ m, ama m na ha agaghị ekwe.”—Phillip.
O NWERE ike na-agụsi gị agụụ ike ka gị na onye ị hụrụ n’anya—na onye hụrụ gị n’anya—na-akpa, ọbụna mgbe ị ka bụ nwata. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jenifer kwuru, sị: “Mgbe m dị afọ iri na otu, ọ malitere ịgụ m agụụ ka mụ na nwoke kpawa.” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Brittany kwukwara, sị: “N’ụlọ akwụkwọ, ọ bụrụ na i nweghị nwoke gị na ya na-akpa, ọ ga-adị gị ka ị bụghị nwaanyị!”
Gịnwa kwanụ? Ị̀ chọwala ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Iji zaa ajụjụ ahụ, anyị kwesịrị ibu ụzọ tụlee otu ajụjụ ka mkpa:
Gịnị Ka “Nwoke na Nwaanyị Ịkpa” Pụtara?
Kanye akara n’ihe ị chọrọ ịza n’ajụjụ ndị a:
Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpapụ mgbe niile. Gị na ya ùnu na-akpa?
□ Ee
□ Ee e
Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị hụrụ ibe unu n’anya. Ọtụtụ ugboro n’ụbọchị, ị na-eji ekwe ntị gị ezigara ya ozi ma ọ bụ na-akpọ ya. Gị na ya ùnu na-akpa?
□ Ee
□ Ee e
Mgbe ọ bụla gị na ndị enyi gị zukọtara, gị na otu onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-anọkarị. Gị na ya ùnu na-akpa?
□ Ee
□ Ee e
Ikekwe, ịza ajụjụ nke mbụ ahụ esighịrị gị ike. Ma o nwere ike ịbụ na i bu ụzọ chee echiche tupu gị azaa ajụjụ nke abụọ na nke atọ. Gịnị kpọmkwem ka nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara? N’ezie, nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara na ha abụọ na-emekọ ihe ma nwee mmasị n’ebe ibe ha nọ. Ya mere, azịza nke ajụjụ atọ ahụ a jụrụ na mbụ bụ ee. Ma ọ̀ bụ n’ekwe ntị, ma ọ bụ n’ihu n’ihu, n’ebe ndị mmadụ nọ ma ọ bụ n’ebe ndị mmadụ na-anọghị, ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere mmasị n’ebe ibe unu nọ, na-eziritakwa ozi mgbe niile, unu na-akpa. Ị̀ dịla njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye? E nwere ajụjụ atọ ị ga-atụle ga-enyere gị aka ịchọpụta.
Gịnị Mere I Ji Chọọ Ka Unu Na-akpa?
N’ọtụtụ ebe, a na-ewere na nwoke na nwaanyị ịkpa bụ ụzọ kwesịrị ekwesị ha ga-esi amata ibe ha nke ọma. Ma e kwesịrị inwe ezigbo ihe mere nwoke na nwaanyị ga-eji na-akpa. Ọ bụ iji nyere nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa aka ịmata ma hà ga-alụ.
N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ndị ọgbọ gị na-ewere nwoke na nwaanyị ịkpa dị ka ihe egwuregwu. Ma eleghị anya, ọ na-atọ ha ụtọ ka ha na enyi ha nwoke ma ọ bụ enyi ha nwaanyị ihe ya kasị amasị ha na-anọ, n’agbanyeghị na ha achọghị ịlụ onye ahụ. Ụfọdụ nwere ike iwere enyi ha nwoke ma ọ bụ enyi ha nwaanyị dị ka onye ha ga-eji na-akpa nganga n’ihu ọha. Ọ bụghị ihe ijuanya na mmekọrịta dị otú ahụ anaghị adịtekarị aka. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Heather kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime ndị ntorobịa ndị nwere enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị na-etisa n’ime otu izu ma ọ bụ abụọ. Ha na-ele mmekọrịta ha na mmadụ ibe ha anya dị ka ihe na-ekwesịghị ịdịte aka. E nwekwara ike ikwu na ọ na-eme ka ha mụta ịgba alụkwaghịm kama ịmụta ịnọgide n’alụmdi na nwunye.”
O doro anya na mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, ị na-eri onye ahụ obi. Ya mere, jide n’aka na i bu ezi ihe n’obi. Chegodị echiche: Ị̀ chọrọ ka onye ọzọ were obi gị na-egwuri egwu dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe ụmụaka ji egwuri egwu, nke a ga-atụtụrụ, tụfuokwa n’egbughị oge? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Chelsea sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m na-eche na nwoke na nwaanyị ịkpa kwesịrị ịbụ ihe egwuregwu, ma ọ bụghị ihe egwuregwu ma otu onye buru n’obi na ha ga-alụ, ma onye nke ọzọ ebughị ya n’obi otú ahụ.”
Ị̀ Dị Afọ Ole?
Afọ ole ka i chere onye na-eto eto kwesịrị ịdị tupu ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya akpawa? ․․․․․
Ugbu a, jụọ papa gị ma ọ bụ mama gị ajụjụ ahụ, ma ọ bụkwanụ jụọ ha abụọ, ma dee ihe ha zara. ․․․․․
Afọ ole papa gị na mama gị gwara gị i dere nwere ike ịkarị afọ ole i chere onye na-eto eto kwesịrị ịdị. O nwere ike ọ gaghị akarị ya! I nwere ike ịbụ otu n’ime ndị ntorobịa maara ihe, ndị kpebiri na ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha agaghị akpa ruo mgbe ha toruru ịmata onwe ha nke ọma. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Danielle kpebiri ime otú ahụ. Ọ sịrị: “Ụdị onye m gaara achọ ịlụ n’afọ abụọ gara aga dị nnọọ iche n’ụdị onye m ga-achọ ịlụ ugbu a. Ọbụna ugbu a, echeghị m na m ga-ekpebili ụdị onye m ga-alụ. Mgbe m chere na amatala m ihe m chọrọ, afọ ole na ole agafeekwa, mgbe ahụ ka m ga-echewe echiche ka mụ na nwoke kpawa.”
E nwere ihe ọzọ mere o ji dị mma ka mmadụ cheretụ. Baịbụl ji okwu bụ́ “ntoju ntorobịa” kọwaa oge agụụ mmekọahụ na-esi ike ná ndụ. (1 Ndị Kọrịnt 7:36) Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị ka nọ n’oge ntoju ntorobịa, o nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụsiwe gị ike, meekwa ka i mee omume ọjọọ. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ọ bụghị ihe ọjọọ n’anya ndị ọgbọ gị. Ọ na-anụ ọtụtụ n’ime ha ọkụ n’obi inwe mmekọahụ. Ma i nwere ike izere ụdị echiche ahụ! (Ndị Rom 12:2) A sị ka e kwuwe, Baịbụl dụrụ gị ọdụ ka ‘ị gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ọ bụrụ na i chere ruo mgbe ị gafere oge ntoju ntorobịa, ‘ị gaghị ekwe ka ọdachi dakwasị gị.’—Ekliziastis 11:10.
Ị̀ Chọwala Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?
Iji nyere gị aka ịza ajụjụ a, leruo onwe gị anya. Chee echiche banyere ihe ndị a:
Mmekọrịta gị na ndị mmadụ. Olee otú i si akpaso ndị mụrụ gị na ụmụnne gị àgwà? Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe niile ijide onwe gị mgbe gị na ha na-emekọ ihe, ikekwe, gị ejiri olu ike ma ọ bụ njakịrị na-agwa ha okwu? Ọ bụrụ na a jụọ ha, gịnị ka ha ga-ekwu banyere gị? Otú i si akpaso ndị ezinụlọ gị àgwà na-egosi otú ị ga-esi na-akpaso di gị ma ọ bụ nwunye gị àgwà.—Gụọ Ndị Efesọs 4:31.
Otú i si ele ihe anya. Ì nwere olileanya na ihe ga-aka mma, ka ị̀ na-eche na ọ ga-aka njọ? Ì nwere ezi uche, ka ị̀ na-esi ọnwụ mgbe niile ka e mee ihe otú ị chọrọ? Ì nwere ike ijide onwe gị mgbe ihe siri ike? Ị̀ na-enwe ndidi? Ịmụta àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ugbu a ga-enyere gị aka ịbụ di ma ọ bụ nwunye n’ọdịnihu.—Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23.
Otú gị na ego si aga. Olee otú gị na ego si aga? Ị̀ na-ejikarị ụgwọ? Ị̀ na-anọgideli n’ọrụ i nwetara? Ọ bụrụ na ị naghị anọgideli na ya, gịnị mere? Ọ̀ bụ n’ihi otú ọrụ ahụ dị, ka ọ̀ bụ n’ihi onye ị na-arụrụ ọrụ, ka ọ̀ bụkwanụ n’ihi àgwà na-adịghị mma ị na-akpa? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike iji ego gị eme ihe bara uru, olee otú ị ga-esi elekọta ezinụlọ gị?—Gụọ 1 Timoti 5:8.
Mmekọrịta gị na Chineke. Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, gịnị ka ị na-eme ka ị ghara imebi mmekọrịta gị na Chineke? Ị̀ na-ewepụta oge iji gụọ Baịbụl, iji gaa ozi ọma, na iji gaa ọmụmụ ihe? Onye ị ga-alụ kwesịrị ịlụ onye okwukwe ya siri ike.—Gụọ Ekliziastis 4:9, 10.
Ihe I Nwere Ike Ime
Ọ bụrụ na mmadụ enyewe gị nsogbu ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị na-achọbeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o yiri mmadụ ịmanye gị ile ule ikpeazụ n’ihe ị ka malitere ịmụ amụ. O doro anya na ọ gaghị adị mma otú ahụ! I kwesịrị ịmụ ihe ahụ ruo ogologo oge ka i nwee ike ịmata ụdị ajụjụ a ga-ajụ gị n’ule ahụ.
O yiri nwoke na nwaanyị ịkpa. Dị ka anyị hụrụ, nwoke na nwaanyị ịkpa abụghị ntakịrị ihe. Ya mere, tupu gị enwee mmasị n’otu onye, i kwesịrị iwepụta oge mụọ “ihe” dị oké mkpa, ya bụ, otú ị ga-esi bụrụ ezigbo enyi ndị mmadụ. Mgbe ị ga-emecha hụ onye ị ga-alụ, ọ ga-adịrị gị mfe ime ka mmekọrịta gị na ya sie ike. A sị ka e kwuwe, ezigbo alụmdi na nwunye bụ mmekọrịta nke ezigbo enyi abụọ.
Icheretụ tupu gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị amalite ịkpa agaghị eme ka ị ghara inwere onwe gị. Kama nke ahụ, ọ ga-eme ka i nwekwuo ike ‘ịṅụrị ọṅụ mgbe ị bụ onye ntorobịa.’ (Ekliziastis 11:9) Ọ ga-eme ka i nwee oge ị ga-eji kwadebe onwe gị, ya bụ, imezikwu àgwà gị, nke ka nke, imezikwu mmekọrịta gị na Chineke.—Abụ Ákwá 3:27.
Ka ọ dị ugbu a, gị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere ike ịna-akpakọrịta. Olee ụzọ kacha mma ị ga-esi na-eme otú ahụ? Unu kwesịrị ịna-akpakọrịta n’ìgwè ebe ụmụ okoro, ụmụ agbọghọ na ndị mere okenye nọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tammy sịrị: “Echere m na ọ ka ụtọ otú ahụ. Ọ ka mma inwe ọtụtụ ndị enyi.” Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Monica kwetara ihe Tammy kwuru ma sị: “Ọ bara nnọọ uru ka ndị na-eto eto na-akpakọrịta n’ìgwè, n’ihi na ị ga-ahụ ndị nwere àgwà dị iche iche.”
Ma, ọ bụrụ na i nwee mmasị n’ebe otu onye nọ, n’oge na-adịghị anya, i nwere ike iji aka gị kpatara onwe gị obi mgbawa. Ya mere, ya adịla gị oké ngwa ngwa. Jiri oge a i nwere ugbu a mụta otú e si emeta enyi, nakwa otú enyi na enyi si adị ná mma. Ọ bụrụ na i mechaa kpebie ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa, ị ga-amatakwu onwe gị, matakwa ụdị àgwà ị chọrọ ka onye ị ga-alụ nwee.
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 29 NA NKE 30
Ọ̀ na-adị gị ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa n’emeghị ka ndị mụrụ gị mara? E nwere ọtụtụ nsogbu dị n’ime otú ahụ karịa otú i chere.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”—Ilu 14:15.
NDỤMỌDỤ
Gụọ 2 Pita 1:5-7 ma họrọ otu àgwà i kwesịrị ịmụtakwu nke ga-enyere gị aka mgbe gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ga-akpawa maka ọlụlụ. Mgbe otu ọnwa gachara, chọpụta otú ị mụtaruru àgwà ahụ—na otú i si na-akpa ya ugbu a n’ụzọ ka mma.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ọtụtụ nchọpụta e mere gosiri na ndị lụrụ di na nwunye mgbe ha na-erubeghị iri afọ abụọ na-agbakarị alụkwaghịm n’ime afọ ise ha lụchara.
IHE M GA-EME!
Iji kwadebe maka alụmdi na nwunye, m kwesịrị ịmụtakwu àgwà ndị a: ․․․․․
Otú m ga-esi amụtakwu àgwà ndị a bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Olee ebe ụfọdụ gị na ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kwesịrị ịna-akpakọrịta?
● Gịnị ka ị ga-agwa nwanne gị nke chọrọ ka ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa mgbe ọ na-etorubeghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye?
● Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, ma i bughị n’obi ịlụ ya, olee otú obi nwere ike ịdị onye ahụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 18]
“Echere m na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya kwesịrị ịna-akpa bụ onye ị hụrụ n’anya n’ezie, onye gị na ya nwere ike ibi. Ihe i kwo na-abịa onye ahụ nso bụ na ị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị naanị ka gị na ya na-akpa.”—Amber
[Foto dị na peeji nke 16 na 17]
Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, ma i bughị n’obi ịlụ ya, ị na-eme ka nwatakịrị nke ji ihe o ji egwuri egwu a zụtaara ya ọhụrụ gwutụ egwu ma tụfuo ya
-
-
Olee Ihe Ọjọọ Dị na Nwoke na Nwaanyị Ịkpa na Nzuzo?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 2
Olee Ihe Ọjọọ Dị na Nwoke na Nwaanyị Ịkpa na Nzuzo?
Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jessica amaghị ihe ọ ga-eme eme mgbe otu nwa klas ha aha ya bụ Jeremy malitere inwe mmasị n’ebe ọ nọ. Jessica sịrị, “Ọ mara mma nwoke. Ndị enyi m gwakwara m na o nweghị nwa okorobịa ọzọ m ga-enweta ga na-akpa ezi àgwà ka ya. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ agbalịala imeta ya enyi, ma o nweghị mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụ naanị m ka ọ chọrọ.”
Tupu Jessica amara ihe na-emenụ, Jeremy agwala ya ka ha kpawa. Jessica gwara ya na ebe ya bụ Onyeàmà Jehova, papa ya na mama ya agaghị ekwe ka ya na onye na-abụghị Onyeàmà na-akpa. Jessica kwuru, sị: “Ma, Jeremy kwuru na ya ma ihe anyị ga-eme. Ọ jụrụ m, sị, ‘Ọ́ bụrụkwanụ na anyị akpawa n’agwaghị papa gị na mama gị?’”
Ọ BỤRỤ na onye i nwere mmasị n’ebe ọ nọ agwa gị ụdị ihe ahụ, gịnị ka ị ga-eme? O nwere ike iju gị anya na Jessica kwetara n’ihe ahụ Jeremy kwuru. Jessica sịrị: “Obi siri m ike na ọ bụrụ na mụ na ya akpawa, m nwere ike ịkụziri ya ịhụ Jehova n’anya.” Oleezi otú ihe si gaa? Anyị ga-emecha chọpụta. Ma, ka anyị burugodị ụzọ hụ ihe mere ọnyà a ji ama ụfọdụ ndị.
Ihe Mere Ha Ji Eme Ya
Gịnị mere ụfọdụ ndị ji akpa na nzuzo? Otu nwa okorobịa aha ya bụ David kwuru ná nkenke, sị: “Ha ma na papa ha na mama ha agaghị ekwe. Ọ bụ ya mere ha anaghị agwa ha.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jane kwuru ihe ọzọ nwere ike ịkpata ya. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị ana-akpa na nzuzo, ọ bụ nnupụisi. Ọ bụrụ na i chere na i toruola ogo mmadụ, ma a naghị eme gị ka onye torurula ogo mmadụ, o nwere ike mee ka i kpebie na ị ga na-eme ihe ọ bụla sọrọ gị n’agwaghị papa gị na mama gị.”
Ì chetara ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chọwa ka ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpa na nzuzo? Ọ bụrụ na i chetara, dee ya ebe a.
․․․․․
N’ezie, ị ma na Baịbụl nyere gị iwu ka ị na-erubere papa gị na mama gị isi. (Ndị Efesọs 6:1) Ọ bụrụ na ha ekweghị ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa, a ga-enwerịrị ezigbo ihe kpatara ya. Ma, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ị na-eche, sị:
● Ọ na-adị m ka ò nwere uru m na-anaghị erite n’ihi na onye ọ bụla nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ya na ya na-akpa ma e wezụga m.
● Enwere m mmasị n’onye na-abụghị Onyeàmà.
● Achọrọ m ka mụ na Onye Kraịst na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m kpawa, n’agbanyeghị na etorubeghị m ịlụ di ma ọ bụ nwunye.
Ikekwe, ị ma ihe papa gị na mama gị ga-ekwu ma ị gwa ha ihe ndị ahụ. N’obi gị, ị makwa na ihe ha ga-ekwu bụ eziokwu. Ma, i nwere ike iche ụdị ihe a nwa agbọghọ aha ya bụ Manami chere, bụ́ onye sịrị: “Ọtụtụ ndị na-agwasi m ike ka mụ na nwoke kpawa, nke mere ka m na-eche mgbe ụfọdụ ma mkpebi m mere na mụ na nwoke agaghị akpa ọ̀ dịkwa mma. Ụmụ okoro na agbọghọ ugbu a na-eche na o nweghị otú mmadụ ga-esi nọrọ n’enweghị onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ya na ya na-akpa. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na enweghị m onye mụ na ya na-akpa, obi agaghị adị mụ mma.” Ụfọdụ ndị ọ dị otú ahụ na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha akpawala, ha ezochiere ya papa ha na mama ha. Olee otú ha si eme ya?
“A Gwara Anyị Ekwula”
Mgbe e kwuru na ‘nwoke na nwaanyị na-akpa na nzuzo,’ ọ pụtara na ha na-aghọ aghụghọ. Ọ bụ aghụghọ na-eme ka o nwee isi. Ụfọdụ anaghị ekwe ka a mara na e nwere onye ha na ya na-akpa. Ihe ha na-ejikarị ekwurịta okwu bụ ekwe ntị ma ọ bụ Ịntanet. Ha na ndị mmadụ nọrọ, ha abụrụ ndị enyi nkịtị. Ma ha jiri kọmputa ma ọ bụ ekwe ntị na-edere ibe ha ozi, ma ọ bụ jiri ekwe ntị na-akparịta ụka, egwú adagharịa.
Ụzọ aghụghọ ọzọ ha si eme ya bụ ịhazi ihe a ga-eme n’ìgwè, ha rute, ya abụrụ onye na nke ya onye na nke ya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ James sịrị: “Ọ dị mgbe a kpọrọ anyị òkù ka anyị bịa n’otu ebe n’ìgwè. Mgbe anyị rutere, anyị chọpụtara na ihe mere e ji nwee nnọkọ ahụ bụ ka mmadụ abụọ nọ n’ebe ahụ nwee ike ịnọkọ ọnụ. A gwara anyị ekwula.”
Dị ka James kwuru, mgbe mmadụ abụọ na-akpa na nzuzo, ọ na-abụkarị ndị enyi ha na-enyere ha aka zochie ya. Carol sịrị, “Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, a ga-enwerịrị otu enyi ha nke ma na ha abụọ na-akpa, ma ya ekpebie na ya agaghị ekwu, n’ihi na a gwara ya ekwula.” Mgbe ụfọdụ, a na-aghacha okpookpo ụgha na ya. Beth, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa, sịrị: “Ọtụtụ ndị ntorobịa na-aghara papa ha na mama ha ụgha ma a jụọ ha ebe ha gara n’ihi na ha achọghị ka ha mata na e nwere onye ha na ya na-akpa.” Ọ bụ ihe otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Misaki mere. Ọ sịrị: “Ana m achọta otu ihe kọọrọ ha. Ana m akpachara anya ka m ghara ịghara ha ụgha n’ihe ndị ọzọ ma e wezụga n’ihe gbasara nwa okorobịa mụ na ya na-akpa, ka ha ghara inyowe m enyo.”
Ọnyà Dị n’Ịkpa na Nzuzo
Ọ bụrụ na obi gị na-agwa gị ka gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị kpawa na nzuzo—ma ọ bụkwanụ na ị na-eme otú ahụ ugbu a—i kwesịrị ịjụ onwe gị ajụjụ abụọ a:
Olee uru ihe a m na-eme ga-abara m? Ì bu n’obi ịlụ onye ahụ n’oge na-adịghị anya? Evan, bụ́ nwa okorobịa dị iri afọ abụọ, sịrị: “Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị na-akpa mgbe ị na-ebughị n’obi ịlụ ya, o yiri ịkpọsà ngwá ahịa ị na-achọghị ire ere.” Gịnị ga-esi na ya pụta? Ilu 13:12 sịrị: “Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa.” Ị̀ chọrọ n’ezie ime ka obi gbawaa onye ị hụrụ n’anya? Ihe ọzọ dị na ya bụ: Ọ bụrụ na gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị ana-akpa na nzuzo, ọ ga-eme ka ị ghara inweta ndụmọdụ papa gị na mama gị na ndị ọzọ toro eto, bụ́ ndị hụrụ gị n’anya, gaara enye gị. N’ihi ya, o nwere ike ime ka ị kwaa iko.—Ndị Galeshia 6:7.
Olee otú Jehova Chineke si ele ihe a m na-eme anya? Baịbụl kwuru na “ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Ya mere, ọ bụrụ na ị chọghị ka mmadụ mara na e nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya na-akpa—ma ọ bụkwanụ na ị chọghị ka a mara na e nwere onye ya na enyi gị na-akpa—Jehova ma ihe ị na-eme. Ọ bụrụkwa na ị na-aghọ aghụghọ, i kwesịrị ichebara onwe gị echiche. Jehova Chineke kpọrọ ịgha ụgha asị. N’eziokwu, “ire na-agha ụgha” bụ otu n’ime ihe Baịbụl kwuru hoo haa bụ́ ihe arụ n’anya Jehova!—Ilu 6:16-19.
Mee Ka A Mara Ihe ahụ Ị Na-ezo Ezo
N’eziokwu, ọ bụrụ na e nwere onye gị na ya na-akpa na nzuzo, ọ ga-adị mma ka ị gwa ya papa gị na mama gị ma ọ bụkwanụ Onye Kraịst tozuru okè. Ọ bụrụkwanụ na e nwere onye ya na enyi gị na-akpa na nzuzo, akwadola ihe ahụ ọ na-eme site n’inyere ya aka na-ezochi ya. (1 Timoti 5:22) A sị ka e kwuwe, olee otú obi ga-adị gị ma ya na onye ahụ mechaa baa ná nsogbu? Í cheghị na i so kpata nsogbu ahụ?
Dị ka ihe atụ: Ka e were ya na i nwere enyi nke na-arịa ọrịa shuga, ya ana-ezo ezo aracha ihe na-atọ bịrịbịrị. Ọ́ bụrụkwanụ na ị chọpụta na ọ bụ ihe ọ na-eme, ma ya arịọ gị ka ị ghara ịgwa onye ọ bụla? Olee ihe ga-akacha dịrị gị mkpa—ọ̀ bụ izochi ihe ahụ enyi gị na-eme, ka ọ̀ bụ ime ihe nwere ike ichebe ndụ ya?
Otú ahụ ka ọ dị ma ọ bụrụ na ị ma na enyi gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa na nzuzo. Ụjọ atụla gị na ọ ga-emebi enyi gị na ya ma i kwuo! Ka oge na-aga, ọ bụrụ na onye ahụ bụ ezigbo enyi gị, ọ ga-achọpụta na ihe i mere bụ maka ọdịmma ya.—Abụ Ọma 141:5.
Ị̀ Na-eme Ya na Nzuzo, ka Ọ̀ Bụ na Ị Chọbeghị Ka Ndị Ọzọ Mara?
N’ezie, ọ bụghị mgbe niile nwoke na nwaanyị na-ezo mkpakọrịta ha ezo ka aghụghọ na-adị na ya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa chọrọ ịmata ibe ha nke ọma, ma ha achọbeghị ime ka ndị mmadụ mara. Ma eleghị anya, dị ka otu nwa okorobịa aha ya bụ Thomas kwuru, “ha achọghị ka ndị mmadụ na-ama ha njakịrị, na-ajụ ha ajụjụ ndị dị ka, ‘Oleekwanụ mgbe unu ga-alụ?’”
N’eziokwu, nsogbu ndị mmadụ na-enye ibe ha nwere ike imebi ihe. (Abụ nke Abụ 2:7) N’ihi ya, mgbe ụfọdụ ndị bidoro ịkpa, ha nwere ike ikpebi na ha agaghị eme ka ndị mmadụ mara. (Ilu 10:19) Anna, bụ́ nwa agbọghọ dị iri afọ abụọ, sịrị: “Ọ ga-eme ka mmadụ abụọ ahụ nwee ike ikpebi ma hà ga-alụ. Ọ bụrụ na ha ekpebie na ha ga-alụ, ha nweziri ike ime ka ndị mmadụ mara.”
Ma, ọ dịghị mma ka i zochiere ya ndị kwesịrị ịma na unu na-akpa, dị ka ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị mụrụ onye ahụ gị na ya na-akpa. N’ezie, ọ bụrụ na ị chọghị ime ka ndị ọzọ mara, i kwesịrị ịjụ onwe gị ihe kpatara ya. Obi gị ọ̀ na-agwa gị na papa gị na mama gị ga-enwe ezigbo ihe mere ha ga-eji sị gị na onye ahụ akpala?
“Amatara M Ihe M Kwesịrị Ime”
Mgbe Jessica, bụ́ onye e kwuru okwu ya ná mmalite, nụrụ banyere nwa agbọghọ ọzọ bụ́ Onye Kraịst ya na nwa okorobịa kpara na nzuzo, ọ gbanwere otú o si ele ya na Jeremy ịkpa na nzuzo anya. Jessica sịrị: “Mgbe m nụchara otú o si hapụ onye ahụ ya na ya na-akpa, amatara m ihe m kwesịrị ime.” Ọ̀ dịịrị ya mfe ịhapụ Jeremy? Mbanụ! Jessica kwuru, sị: “Ọ bụ naanị ya bụ nwa okorobịa m nwetụrụla ezigbo mmasị n’ebe ọ nọ. Ebere m ákwá kwa ụbọchị ruo ọtụtụ izu.”
Ma, Jessica ma na ya hụrụ Jehova n’anya. N’agbanyeghị na o mere ihe na-adịghị mma, o ji obi ya dum chọọ ime ihe ziri ezi. Mwute ọ na-ewute ya na ọ hapụrụ onye ahụ mechara kwụsị. Jessica sịrị: “Ugbu a, o meela ka mmekọrịta mụ na Jehova ka mma. Obi dị m nnọọ ụtọ na ọ na-agwa anyị ihe anyị kwesịrị ime n’oge kwesịrị ekwesị!”
Ka e were ya na ị chọwala ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ya abụrụ na i nwetala onye dị gị mma. Olee otú ị ga-esi ama ma ihe ọ̀ ga-adabara gị na onye ahụ ma unu lụọ?
AMAOKWU BAỊBỤL
‘Anyị chọrọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.’—Ndị Hibru 13:18.
NDỤMỌDỤ
Ọ bụghị iwu na ị ga-agwa ụwa niile na o nwere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya na-akpa. Ma, gwa ndị kwesịrị ịma. Nke ka nke, i kwesịrị ịgwa ndị mụrụ gị na ndị mụrụ onye ahụ gị na ya na-akpa.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ihe na-eme ka mmekọrịta dịtee aka bụ mmadụ ịtụkwasị ibe ya obi. Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-akpa na nzuzo, ọ ga-eme ka papa gị na mama gị ghara ịtụkwasị gị obi, meekwa ka mmekọrịta gị na onye ahụ ghara isi ike.
IHE M GA-EME!
Ọ bụrụ na mụ na Onye Kraịst na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe m na-akpa na nzuzo, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na enyi m na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa na nzuzo, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Tụgharịa uche n’ihe atọ ahụ e ji mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo dee na peeji nke 22. Ò nwere nke kọwara ihe ị na-eche mgbe ụfọdụ? Ọ bụrụ na o nwere, olee nke ọ bụ?
● Gịnị ka ị ga-eme banyere ya ma ghara inwe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị gị na ya ga-akpawa na nzuzo?
● Ọ bụrụ na ị ma na enyi gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa na nzuzo, gịnị ka ị ga-eme, n’ihi gịnịkwa?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 27]
“Akwụsịrị m mụ na ya ịkpa. N’eziokwu, mgbe m laghachiri n’ụlọ akwụkwọ ma na-ahụ nwa okorobịa ahụ kwa ụbọchị, ọ na-ewute m. Ma Jehova Chineke nwere ike ịghọta ihe niile mere mgbe ahụ, ma anyị agaghị aghọtali ya. Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi.”—Jessica
[Foto dị na peeji nke 25]
Inyere enyi gị aka zochie ọkpụkpa ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-akpa yiri inyere onye na-arịa ọrịa shuga aka zochie nracha ọ na-aracha ihe na-atọ bịrịbịrị na nzuzo
-
-
Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 3
Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?
Wepụta oge zaa ajụjụ ndị a:
Olee àgwà ndị i chere ugbu a na onye ị ga-alụ kwesịrị inwe? N’ime ụdị mmadụ ndị e depụtara n’ebe a, kanye ✔ n’anọ ndị i chere kacha mkpa.
□ Onye mara mma □ Onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe
□ Onye ya na ndị ọzọ □ Onye a pụrụ ịtụkwasị obi
na-adị ná mma
□ Onye a ma ama □ Onye omume ya dị mma
□ Onye na-akpa ndị □ Onye na-agba mbọ
mmadụ ọchị
Mgbe ị na-erubeghị afọ ole ị dị ugbu a, ò nwetụla onye ị na-anwụrụ? N’ime ụdị mmadụ ndị ahụ e depụtara, kanye × na nke ọ bụla kacha masị gị banyere onye ahụ mgbe ahụ.
O NWEGHỊ ihe dị njọ na nke ọ bụla n’ime ụdị mmadụ ndị ahụ e depụtara. O nwere ihe dị mma na nke ọ bụla n’ime ha. Ma, ọ̀ bụ na i kweghị na ọ bụrụ na i nwere onye ị na-anwụrụ mgbe ị ka na-eto eto, ebe anya gị ga na-aga bụ n’àgwà ndị na-adịchaghị mkpa, dị ka ndị ahụ e depụtara n’aka ekpe n’igbe ahụ?
Ma, ka ị na-eto, ị ga-amalite iji ikike nghọta gị nyochawa àgwà ndị ka mkpa, dị ka ndị ahụ e dere n’aka nri n’igbe ahụ. Dị ka ihe atụ, ị ga-amalite ịghọta na nwa agbọghọ ahụ kacha mma n’obodo unu nwere ike bụrụ onye na-ekwesịghị ka a tụkwasị ya obi, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na nwa okorobịa ahụ a kacha mara amara na klas unu anaghị akpa àgwà ọma. Ọ bụrụ na ị gafeela oge ntoju ntorobịa, o yiri nnọọ ka ị̀ ga-ahụ àgwà ndị ọzọ ma e wezụga ndị ahụ na-adịchaghị mkpa mgbe ị na-aza ajụjụ ahụ bụ́, “Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na onye a ma anyị lụọ?”
Matagodị Ụdị Onye Ị Bụ
Tupu gị achọpụta onye ihe nwere ike ịdabara gị na ya ma unu lụọ, i kwesịrị ịmata ụdị onye ị bụ nke ọma. Iji nyere gị aka ịmatakwu ụdị onye ị bụ, zaa ajụjụ ndị a:
Olee ebe m na-eme nke ọma? ․․․․․
Olee ebe m na-anaghị eme nke ọma? ․․․․․
Olee ihe ndị ga-eme ka obi dị mụ mma, oleekwa otú m chọrọ ka mmekọrịta mụ na Chineke dịrị? ․․․․․
Ọ gaghị adịrị gị mfe ịmata ụdị onye ị bụ. Ma ajụjụ ndị dị ka ndị ahụ a jụrụ ga-enyere gị aka. Ka ị na-amatakwu ụdị onye ị bụ, ị ga-enwe ike ịchọta onye ga-eme ka i mezikwuo ebe ị na-eme nke ọma, ọ bụghị onye ga-eme ka ebe ị na-anaghị eme nke ọma ka njọ.a Ọ́ bụrụkwanụ na i chere na ị chọtala ụdị onye ahụ?
Ọ̀ Bụ Onye Ọ Bụla Ka Ihe Ga-adabara Mụ na Ya?
“Achọrọ m ka mụ na gị lụọ.” Okwu ahụ nwere ike ime ka ị kụja ma ọ bụ mee ka obi dị gị ezigbo ụtọ—dabere n’onye gwara gị ya. Ka e were ya na i kwetara. Ka oge na-aga, olee otú ị ga-esi mata ma ihe ọ̀ ga-adabara gị na onye ahụ ị chọrọ ịlụ?
Ka e were ya na ị chọrọ ịzụ akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ. Gị agaa ahịa hụ nke dị gị mma. Gị eyitụ ya, ma hụ na ọ baghị gị ụkwụ. Ọ ga-ewute gị nke ukwuu. Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-azụwa ya otú ahụ? Ka ị ga-achọrọ akpụkpọ ụkwụ ọzọ? O doro anya na ọ ga-aka mma ka ị hapụ akpụkpọ ụkwụ ahụ ma chọrọ ọzọ. Ọ gaghị adị mma ka i yiri akpụkpọ ụkwụ na-abaghị gị ụkwụ na-agagharị!
E nwere ike iji ya tụnyere ịchọta onye ị ga-alụ. Ka oge na-aga, ọtụtụ n’ime ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị ị hụrụ ga-amasị gị. Ma, ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe ga-adabara gị na ya. A sị ka e kwuwe, ị chọrọ onye gị na ya ga-anọ, ahụ́ eruo gị ala, ya bụ, onye àgwà gị na ya na ihe mgbaru ọsọ gị na ya bụ otu. (Jenesis 2:18; Matiu 19:4-6) Ị̀ hụla ụdị onye ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ị ga-esi mara ma ihe ọ̀ ga-adabara gị na ya?
Lekwasị Anya n’Ihe Ndị Ka Mkpa
Iji zaa ajụjụ ikpeazụ ahụ, leruo onye ahụ ị chọrọ ịlụ anya nke ọma. Ma, kpachara anya! I nwere ike ịhụ naanị ihe ị chọrọ ịhụ. N’ihi ya, ya adịla gị ngwa ngwa. Gbalịa ka ị chọpụta kpọmkwem ụdị onye ọ bụ. Ị ga-agbalịsi ike ma ọ bụrụ na ị chọrọ ime otú ahụ. Ma o kwesịghị iju gị anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụ ụgbọala, ị́ gaghị eleru ya anya nke ọma? Mkpa gị ọ ga-abụ naanị otú ahụ́ ya dị? Ọ́ gaghị aka mma ma i leruo ya anya nke ọma—ma eleghị anya, chọpụta ihe niile i nwere ike ịchọpụta banyere otú njin ụgbọala ahụ dị?
Ịchọta onye ị ga-alụ dị mkpa karịa ịchọta ụgbọala ị ga-azụ. Ma, ọtụtụ ndị ha na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-akpa anaghị elekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa. Kama nke ahụ, ha na-ekwukarị banyere ihe na-amasị ha abụọ, sị: ‘Ụdị egwú na-amasị m na-amasị ya.’ ‘Ihe ndị na-atọ m ụtọ na-atọ ya ụtọ.’ ‘Obi mụ na ya bụ otu n’ihe niile!’ Ma, dị ka e kwuru na mbụ, ọ bụrụ na ị gafeela ntoju ntorobịa n’eziokwu, ị ga-elekwasị anya n’àgwà ndị ka mkpa. Ị ga-ahụ na i kwesịrị ịchọpụta “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi” onye ahụ.—1 Pita 3:4; Ndị Efesọs 3:16.
Dị ka ihe atụ, kama ilekwasị anya n’ebe ihe na-adabara gị na ya, i nwere ike ịghọtakwu ụdị onye ọ bụ ma ọ bụrụ na ị hụ ihe o mere mgbe okwu na-adabaghịrị gị na ya. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, olee otú onye ahụ si eme omume mgbe obi unu na-abụghị otu? Ọ̀ na-esi ọnwụ ka e mee ihe ọ chọrọ, ma eleghị anya, na-ewe “iwe ọkụ,” ma ọ bụ na-ekwu “okwu mkparị”? (Ndị Galeshia 5:19, 20; Ndị Kọlọsi 3:8) Ka omume onye ahụ ọ̀ na-egosi na o nwere ezi uche, ya bụ, ikweta ihe i kwuru ka udo dịrị ma ọ bụrụ na ọ gaghị emebi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ?—Jems 3:17.
Ihe ọzọ i kwesịrị ichebara echiche bụ: Onye ahụ ọ̀ na-eji aghụghọ enweta ihe ọ chọrọ, ọ̀ bụ okwuchaa obie, ka ọ̀ bụ onye ekworo? Ọ̀ na-achọ ịmata ihe niile ị na-eme? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Nicole sịrị: “Ana m anụ akụkọ banyere ndị na-ekwu okwu ọlụlụ ma ihe na-esekarịrị ha abụrụ na otu onye n’ime ha anaghị agwa onye nke ọzọ ebe ọ nọ na ihe ọ na-eme. Echere m na ọ na-egosi na nsogbu dị.”—1 Ndị Kọrịnt 13:4.
N’ihe ndị ahụ e kwuru banyere ha, e lekwasịrị anya n’ụdị onye mmadụ bụ na omume mmadụ. Otú ọ dị, ọ dị oké mkpa ka ị mata àgwà e ji mara onye ahụ ị chọrọ ịlụ. Olee otú ndị ọzọ si ele ya anya? I nwere ike ịjụ ndị ma ya nke ọma ajụjụ, dị ka ndị tozuru okè nọ n’ọgbakọ. Ị ga-esi otú ahụ mata ma ‘à na-akọ akụkọ ọma banyere ya.’—Ọrụ 16:1, 2.
I nwere ike ịmata onye ahụ nke ọma ma ọ bụrụ na i dee ihe ị chọpụtara banyere ya ede iji hụ ma ò nwere àgwà ndị ahụ a tụlere.
Ụdị onye ọ bụ ․․․․․
Omume ya ․․․․․
Àgwà e ji mara ya ․․․․․
Ọ ga-abara gị uru ma ị gụọ igbe bụ́ “Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Di?” na peeji nke 39 ma ọ bụ “Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Nwunye?” na peeji nke 40. Ajụjụ ndị a jụrụ ebe ahụ ga-enyere gị aka ịmata ma onye ahụ ị chọrọ ịlụ ọ̀ ga-abụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye.
Ọ́ bụrụkwanụ na mgbe i lebachara okwu ahụ anya, gị achọpụta na ihe agaghị adabara gị na ya? Mgbe ahụ, ị ga-echebara otu ajụjụ dị mkpa echiche:
M̀ Kwesịrị Ịhapụ Onye Ahụ?
Mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mma ma ị hapụ onye ahụ. Chee echiche banyere ihe mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jill. Ọ sịrị: “Ná mmalite, obi tọrọ m ụtọ na onye chọrọ ịlụ m na-achọkarị ịma ebe m nọ, ihe m na-eme, na onye mụ na ya nọ. Ma, o ruziri nke na o nweghị onye ọzọ mụ na ya na-anọ ma ọ bụghị ya. Ya hụ ebe mụ na ndị ezinụlọ anyị nọ—nke ka nke, ebe mụ na papa m nọ, iwe abịa ya. Mgbe m hapụrụ ya, ọ dị m ka è bupụrụ ibu nọ na-anyịgbu m!”
Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sarah. Ọ chọpụtara na nwa okorobịa chọrọ ịlụ ya aha ya bụ John nwere ọnụ ọjọọ, ọ naghị ekwe mmeta, ọ naghịkwa asọpụrụ mmadụ. Sarah kwuru, sị: “O nwere otu mgbe o kwesịrị ịbịa n’ụlọ anyị. Ma, ọ bịara mgbe awa atọ gachara! Ọ tụpụrụghị mama m ọnụ mgbe ọ bịara mepeere ya ụzọ. Ihe o kwuru bụ: ‘Ka anyị gawa. Oge aganahụla anyị.’ Ọ sịghị, ‘Abịaghị m n’oge,’ kama ọ sịrị, ‘Oge aganahụla anyị.’ O kwesịrị ịrịọ m arịrịọ ma gwa m ihe mere na ọ bịaghị n’oge. Nke ka nke, o kwesịrị ịkwanyere mama m ùgwù!” Otú ọ di, otu ihe onye gị na ya na-akpa mehiere ekwesịchaghị ime ka gị na ya kwụsị ịkpa. (Abụ Ọma 130:3) Ma mgbe Sarah chọpụtara na ọ bụghị naanị mama ya ka John na-anaghị akwanyere ùgwù, o kpebiri na ya na ya agaghị akpakwa.
Dị ka Jill na Sarah, gịnị ka ị ga-eme ma ị chọpụta na ihe agaghị adabara gị na onye ahụ ị chọrọ ịlụ? Ọ bụrụ otú ahụ, agbachila nkịtị. Ọ ga-akacha mma ka gị na ya kwụsị ịkpa, ọ bụ ezie na o siri ike omume. Ilu 22:3 kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye gị na ya chọrọ ịlụ na-akpa otu n’ime àgwà ọjọọ ndị ahụ ma ọ bụ karịa, bụ́ ndị dị na peeji nke 39 na nke 40, ihe ga-akacha mma ga-abụ ka unu kwụsị ịkpa—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo mgbe ọ kwụsịrị ịkpa àgwà ahụ. N’eziokwu, o nwere ike ịbụ na ịhapụ onye ahụ adịghị mfe. Ma, alụmdi na nwunye abụghị ihe e kwesịrị itisa etisa. Ọ ka mma idi obi mgbawa ugbu a karịa inwe mwute n’oge ndụ gị niile n’ọdịnihu!
Otú Ị Ga-esi Ekwu Ya
Olee otú ị ga-esi agwa onye gị na ya chọrọ ịlụ na ị ga-ahapụ ya? Buru ụzọ chọpụta mgbe ga-akacha mma ka gị na ya kwuo ya. Olee mgbe ọ ga-abụ? Chegodị echiche otú ị ga-achọ ka e si gwa gị ya ma ọ bụrụ gị. (Matiu 7:12) Ị̀ ga-achọ ka a nọrọ n’ebe ndị ọzọ nọ gwa gị ya? E nwere ike ị gaghị achọ. Ọ gwụla ma è nwere ihe mere ị ga-eji mee ya otú ahụ, ọ dịghị mma ma i jiri ígwè na-aza fon gwa ya na ị hapụla ya, ma ọ bụ jiri ekwe ntị dee ya, ma ọ bụkwanụ jiri kọmputa deere ya ozi ahụ. Kama nke ahụ, chọpụta oge na ebe kwesịrị ekwesị unu ga-anọ kwurịta okwu a dị mkpa.
Gịnị ka i kwesịrị ikwu mgbe oge ruru ka i kwuo ihe ị chọrọ ikwu? Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘na-agwa ibe ha eziokwu.’ (Ndị Efesọs 4:25) N’ihi ya, ọ ga-akacha mma ka i jiri akọ kwuo okwu, ma kwụsie ike n’ihe ị na-ekwu. Kọwaara ya ihe mere i ji chee na mmekọrịta gị na ya agaghị enwe isi. I kwesịghị ịga gwawa ya ọtụtụ ihe ọjọọ o mere ma ọ bụ kọwa ya ọnụ. N’eziokwu, kama ịsị, “Ị naghị” eme nke a ma ọ bụ nke ọzọ, ọ ga-aka mma ka i kwuo okwu na-egosi otú ọ dị gị n’obi—“Achọrọ m onye . . . ” ma ọ bụ “Echere m na anyị ga-akwụsị ịkpa n’ihi na . . . ”
Ugbu a abụghị mgbe ị ga na-ama ọnụ jijiji, ọ bụghịkwa mgbe ị ga-ekwe ka onye ahụ mee ka ị gbanwee obi gị. Cheta na ihe mere i ji kpebie ịhapụ ya abụghị ntakịrị ihe. Ya mere, kpachara anya ma ọ bụrụ na onye ahụ gị na ya na-akpa ejiri aghụghọ gbalịa ime ka ị gbanwee obi gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lori sịrị: “Mgbe onye mụ na ya chọrọ ịlụ kwụsịrị ịkpa, ọ malitere ime ka à ga-asị na ọ na-ewutebiga ya ókè mgbe niile. Echere m na ọ na-eme ihe ahụ ka m mewere ya ebere. O wutere m n’eziokwu. Ma, ekweghị m ka ihe ahụ ọ na-eme mee ka m gbanwee obi m.” Dị ka Lori, mara ihe ị chọrọ. Nọsie ike n’ihe i kpebiri. Ka ee e gị bụrụ ee e.—Jems 5:12.
Ihe Ịhapụ Onye ahụ Ga-akpata
Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ọ na-ewute gị nke ukwuu mgbe gị na onye ahụ kwụsịrị ịkpa. Obi nwere ike ịdị gị otú ọ dị ọbụ abụ bụ́ onye sịrị: “Obi erukwaghị m ala, adawo m mbà nke ukwuu; ejegharịwo m ná mwute ogologo ụbọchị dum.” (Abụ Ọma 38:6) Ụfọdụ ndị enyi gị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi nwere ike ịgbalị inyere gị aka site n’ịgba gị ume ka gị na onye ahụ maliteghachi ịkpa. Kpachakwara anya! Ihe ọ bụla si ná mkpebi i mere pụta ga-adị gị n’isi—ọ bụghị n’isi ndị enyi gị ndị ahụ. Ya mere, ụjọ atụla gị ịnọsi ike n’ihe i kwuru—n’agbanyeghị na ihe mere nwere ike ịna-ewute gị.
Ka obi sie gị ike na mwute ị na-enwe ga-akwụsị ka oge na-aga. Ka ọ dị ugbu a, ọ ga-adị mma ma i mee ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka idi ya, dị ka ihe ndị a e depụtara.
Gwa onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị.b (Ilu 15:22) Gwa ya Jehova n’ekpere. (Abụ Ọma 55:22) Anọla nkịtị. (1 Ndị Kọrịnt 15:58) Anọla naanị gị! (Ilu 18:1) Ka gị na ndị mmadụ na-akpakọrịta, ya bụ, ndị ga na-agba gị ume. Gbalịsie ike ka ị na-eche banyere ihe ndị kwesịrị ekwesị.—Ndị Filipaị 4:8.
Ka oge na-aga, i nwere ike ịchọta onye ọzọ ị ga-achọ ịlụ. O doro anya na ị ga-elerukwu anya mgbe ị na-eme otú ahụ. Ma eleghị anya, ị jụọ onwe gị ajụjụ ahụ bụ́ “Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na onye a ma anyị lụọ?” ihe ị ga-aza ugbu a bụ ee!
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 31
Mgbe gị na onye ị chọrọ ịlụ na-akpa, olee otú unu ga-esi mara ihe unu kwesịrị ime n’ihe banyere igosi ibe unu ịhụnanya?
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ị ga-achọpụta ihe ndị ọzọ banyere ụdị onye ị bụ ma ọ bụrụ na ị tụlee ajụjụ ndị ahụ dị n’Isi nke 1, n’isiokwu nta bụ́ “Ị̀ Chọwala Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?”
b Papa gị na mama gị ma ọ bụ ndị ọzọ toro eto, dị ka ndị okenye ọgbakọ, nwere ike inyere gị aka. I nwere ike ịchọpụta na ụdị ihe ahụ na-ewute gị mere ha mgbe ha ka na-eto eto.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.” —Ilu 20:11.
NDỤMỌDỤ
Ka gị na onye ahụ na-eme ihe ga-enyere unu aka ịmata àgwà ibe unu:
● Na-amụkọnụ Okwu Chineke ọnụ.
● Mata otú onye nke ọzọ si aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe na otú o si ezi ozi ọma.
● Soronụ na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa n’iwu ebe a na-anọ efe Chineke.
Ị̀ MA NA . . .. ?
Nchọpụta e mere gosiri na ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-anọghị n’otu okpukpe alụọ, ha na-agbakarị alụkwaghịm.
IHE M GA-EME!
Ọ bụrụ na mụ enwee mmasị n’ebe onye na-ekweghị ekwe nọ, ihe m ga-eme bụ
Iji chọpụta àgwà e ji mara onye mụ na ya na-akpa, ihe m ga-eme bụ
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ
GỊNỊ KA I CHERE?
● Olee àgwà ọma ndị ị ga na-akpa ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye?
● Olee àgwà ndị dị mkpa ị chọrọ ka onye ị ga-alụ na-akpa?
● Olee nsogbu ndị tara akpụ ị ga-enwe ma ọ bụrụ na ị lụọ onye na-ekweghị ekwe?
● Olee ụzọ ndị i nwere ike isi matakwuo àgwà onye ị chọrọ ịlụ, tinyere omume ya na otú ndị mmadụ si ele ya anya?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 37]
“Otú onye ị chọrọ ịlụ si akpaso ndị ezinụlọ ya àgwà bụ otú ọ ga-esi na-akpaso gị àgwà.”—Tony
Igbe dị na peeji nke 34]
‘Unu na Ha Ekekọtala Onwe Unu, nke Bụ́ Nkekọ Na-ekwekọghị Ekwekọ’
“Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu, nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ.” Ma eleghị anya, ị ghọtara na amamihe dị n’ụkpụrụ Baịbụl ahụ dị ná 2 Ndị Kọrịnt 6:14. N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike ịbụ na i nwere mmasị n’ebe onye na-ekweghị ekwe nọ. N’ihi gịnị? Mgbe ụfọdụ, ọ bụ naanị n’ihi na onye ahụ mara mma. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Mark sịrị: “M na-ahụ otu nwa agbọghọ mgbe niile n’ebe anyị na-amụ otú e si emega ahụ́. Ọ bụ ya na-eji ụkwụ ya abịakwute m, gwawa m okwu. Ọ raghị ahụ́ mụ na ya akpawa.”
Ọ bụrụ na ị ma onwe gị, jirikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe—ọ bụrụkwa na i tozuola okè nke na ị gaghị eme ihe n’ebughị ụzọ chebara ya echiche—ị ga-ama ihe i kwesịrị ime. N’eziokwu, n’agbanyeghị otú onye ahụ si maa mma, ma ọ bụ otú o si dị ka ọ̀ na-akpa àgwà ọma, ọ gaghị eme ka adịm ná mma gị na Chineke ka mma.—Jems 4:4.
N’ezie, ọ bụrụ na ịhụnanya eriela gị obi, ịhapụ onye ahụ agaghị adịrị gị mfe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cindy chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “M na-ebe ákwá kwa ụbọchị. M na-eche banyere nwa okorobịa ahụ mgbe niile, ọbụna mgbe m nọ n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst. M hụrụ ya n’anya nke na m chere na ọ kaara m mma ịnwụ kama ịhapụ ya.” Ma, n’oge na-adịghị anya, Cindy hụrụ na amamihe dị na ndụmọdụ mama ya nyere ya ka ya na onye na-ekweghị ekwe ghara ịkpa. Ọ sịrị: “Ọ dị mma na m hapụrụ ya. Obi siri m ike na Jehova ga-egboro m mkpa m.”
Ị̀ nọ n’ọnọdụ yiri nke Cindy? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị ihe naanị gị ga-akwụsịli! I kwesịrị ịgwa ndị mụrụ gị. Nke ahụ bụ ihe Jim mere mgbe ọ chọpụtara na ya na-anwụrụ otu nwa agbọghọ ya na ya nọ n’otu ụlọ akwụkwọ. Ọ sịrị: “M mechara gwa ndị mụrụ m ka ha nyere m aka. Ọ bụ ihe nyeere m aka ime ka nwa agbọghọ ahụ pụọ m n’obi.” Ndị okenye ọgbakọ nwekwara ike inyere gị aka. Ọ ga-adị mma ma ị gwa otu n’ime ha ihe gị na ya na-alụ.—Aịzaya 32:1, 2.
[Igbe na Foto dị na peeji nke 39]
Ebe M Dere Ihe
Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Di?
Ihe Dị Mkpa M Kwesịrị Ịma Banyere Nwoke Ahụ
□ Olee otú ọ na-esi akpaso ndị ọzọ àgwà mgbe e nyere ya ikike?—Matiu 20:25, 26.
□ Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya?—1 Timoti 4:15.
◻ Ọ̀ na-agbalịsi ike ugbu a iru ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ? —1 Ndị Kọrịnt 9:26, 27.
□ Olee otú o si emeso ndị ezinụlọ ya?—Ọpụpụ 20:12.
□ Olee ndị bụ́ ndị enyi ya?—Ilu 13:20.
□ Gịnị ka ọ na-ekwukarị?—Luk 6:45.
□ Olee otú ya na ego si aga?—Ndị Hibru 13:5, 6.
□ Olee ụdị ntụrụndụ na-amasị ya?—Abụ Ọma 97:10.
□ Olee otú o si egosi na ya hụrụ Jehova n’anya?—1 Jọn 5:3.
Àgwà Ya
□ Ọ̀ dị ike ọrụ?—Ilu 6:9-11.
□ Ọ̀ ma otú e si eji ego eme ihe bara uru?—Luk 14:28.
□ À na-ekwu okwu ọma banyere ya?—Ọrụ 16:1, 2.
□ Ọ̀ na-echebara ndị ọzọ echiche?—Ndị Filipaị 2:4.
Ihe Na-egosi na Nsogbu Dị
□ Ọ̀ na-ewekarị iwe?—Ilu 22:24.
□ Ọ̀ na-achọ ka gị na ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ? —Ndị Galeshia 5:19.
□ Ọ̀ bụ onye na-alụkarị ọgụ ma ọ bụ onye nwere ọnụ ọjọọ? —Ndị Efesọs 4:31.
□ Ọ̀ bụ iwu na ọ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya ekweta na ya na-ekpori ndụ?—Ilu 20:1.
□ Ọ̀ bụ onye na-ekwo ekworo ma na-achọ ọdịmma onwe ya naanị?—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.
[Igbe na Foto dị na peeji nke 40]
Ebe M Dere Ihe
Ọ̀ Ga-abụ Ezigbo Nwunye?
Ihe Dị Mkpa M Kwesịrị Ịma Banyere Nwaanyị Ahụ
□ Olee otú o si edo onwe ya n’okpuru ndị mụrụ ya nakwa n’okpuru ndị okenye? —Ndị Efesọs 5:21, 22.
□ Olee otú o si emeso ndị ezinụlọ ya?—Ọpụpụ 20:12.
□ Olee ndị bụ́ ndị enyi ya?—Ilu 13:20.
□ Gịnị ka ọ na-ekwukarị?—Luk 6:45.
□ Olee otú ya na ego si aga?—1 Jọn 2:15-17.
□ Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ya?—1 Timoti 4:15.
□ Ọ̀ na-agbalịsi ike ugbu a iru ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ? —1 Ndị Kọrịnt 9:26, 27.
□ Olee ụdị ntụrụndụ na-amasị ya?—Abụ Ọma 97:10.
□ Olee otú o si egosi na ya hụrụ Jehova n’anya?—1 Jọn 5:3.
Àgwà Ya
□ Ọ̀ dị ike ọrụ?—Ilu 31:17, 19, 21, 22, 27.
□ Ọ̀ ma otú e si eji ego eme ihe bara uru?—Ilu 31:16, 18.
□ À na-ekwu okwu ọma banyere ya?—Rut 3:11.
□ Ọ̀ na-echebara ndị ọzọ echiche?—Ilu 31:20.
Ihe Na-egosi na Nsogbu Dị
□ Ọ̀ bụ nwaanyị na-ese okwu?—Ilu 21:19.
□ Ọ̀ na-achọ ka gị na ya nwee mmekọahụ rụrụ arụ?—Ndị Galeshia 5:19.
□ Ọ̀ bụ onye nwere ọnụ ọjọọ ma ọ bụ onye na-alụ ọgụ?—Ndị Efesọs 4:31.
□ Ọ̀ bụ iwu na ọ ga-aṅụ mmanya na-aba n’anya tupu ya ekweta na ya na-ekpori ndụ?—Ilu 20:1.
□ Ọ̀ bụ onye na-ekwo ekworo ma na-achọ ọdịmma onwe ya naanị?—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.
[Foto dị na peeji nke 30]
Ọ bụghị akpụkpọ ụkwụ ọ bụla ga-aba gị ụkwụ; n’otu aka ahụ, ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe ga-adabara gị na ya ma unu lụọ
[Foto dị na peeji nke 31]
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịzụ ụgbọala, í cheghị na ọ dị mkpa ka i leruo ya anya, ọ bụghị naanị ile otú ahụ́ ya dị? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ọ dị mkpa ka i lerukwuo anya!
-
-
Olee Ihe Nwoke na Nwaanyị Ga-eme, Ya Abụrụ Ịgafe Ókè?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 4
Olee Ihe Nwoke na Nwaanyị Ga-eme, Ya Abụrụ Ịgafe Ókè?
Ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha . . .
Nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ ekwesịghị imetụ ibe ha aka mgbe ọ bụla n’agbanyeghị ebe ha nọ.
□ Eziokwu
□ Ụgha
E nwere ike ikwu na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ kwara iko n’agbanyeghị na ha enwebeghị mmekọahụ.
□ Eziokwu
□ Ụgha
Ọ bụrụ na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ anaghị adịda ibe ha aka, ha agaghị ahụli ibe ha n’anya.
□ Eziokwu
□ Ụgha
O DORO anya na i chebarala okwu a echiche ọtụtụ mgbe. A sị ka e kwuwe, ọ bụrụ na ọ dị onye gị na ya chọrọ ịlụ, o nwere ike isiri unu ike ịma ebe unu ga-akwụsị mgbe unu na-egosi ibe unu ịhụnanya. Ka anyị leba anya n’ihe atọ ndị ahụ a chọrọ ka mmadụ zaa eziokwu ma ọ bụ ụgha, ma hụ otú Okwu Chineke ga-esi enyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ bụ́, “Olee ihe nwoke na nwaanyị ga-eme, ya abụrụ ịgafe ókè?”
● Nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ ekwesịghị imetụ ibe ha aka mgbe ọ bụla n’agbanyeghị ebe ha nọ.
Ụgha. Baịbụl ekwughị na ọ dị njọ igosi ịhụnanya n’ụzọ ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kọrọ banyere nwa agbọghọ Shulem na nwa okorobịa na-azụ atụrụ, bụ́ ndị chọrọ ịlụ. Ha emeghị omume rụrụ arụ mgbe ha na-ele àgwà ibe ha. N’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na e nwere oge ụfọdụ ha gosiri ibe ha ịhụnanya tupu ha alụọ. (Abụ Sọlọmọn 1:2; 2:6; 8:5) Taa, ụfọdụ ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ ndị na-ele àgwà ibe ha nwekwara ike iche na ọ dịghị njọ ma ha gosi ibe ha ịhụnanya n’ụzọ ziri ezi mgbe ha bu n’obi ịlụ.a
Otú ọ dị, nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ kwesịrị ịkpachapụ nnọọ anya. Ha kwesịrị ịghọta na isusu ọnụ, mmakụ, ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke na-akpali agụụ mmekọahụ nwere ike ime ka ha kwaa iko. Ọ naghị ara ọbụna ndị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi ahụ́ ichefu onwe ha ma kwaa iko.—Ndị Kọlọsi 3:5.
● E nwere ike ikwu na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ kwara iko n’agbanyeghị na ha enwebeghị mmekọahụ.
Eziokwu. Okwu Grik e si sụgharịta “ịkwa iko” (por·neiʹa) pụtara ọtụtụ ihe. Ọ pụtara ụdị mmekọahụ niile na-abụghị n’etiti di na nwunye, ya bụ, iji ihe e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị eme ihe na-ezighị ezi. N’ihi ya, ịkwa iko apụtaghị naanị inwe mmekọahụ, kama ọ pụtakwara nwoke ma ọ bụ nwaanyị ịdịda ibe ha aka n’ihe ha ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, isi n’ọnụ ma ọ bụ n’otule enwe mmekọahụ.
Ọzọkwa, ọ bụghị naanị ịkwa iko ka Baịbụl kwuru na ọ dị njọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè, ha bụ ịkwa iko, adịghị ọcha, omume rụrụ arụ.” O kwukwara, sị: “Ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.”—Ndị Galeshia 5:19-21.
Gịnị bụ “adịghị ọcha”? Okwu Grik e si sụgharịta ya gụnyere ụdị ihe ọ bụla na-adịghị ọcha, ma ọ̀ bụ n’okwu ma ọ̀ bụ n’omume. N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ amanye aka n’efe onye ọzọ yi, yipụ mmadụ efe ma ọ bụ dịdaa aka n’ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, dị ka n’ara, ọ bụ adịghị ọcha. Baịbụl kwuru na ọ bụ naanị ndị lụrụ nwaanyị kwesịrị ịdịda nwunye ha aka n’ara iji nwee obi ụtọ. (Ilu 5:18, 19) Ihere anaghị eme ụfọdụ ndị na-eto eto imebi iwu Chineke. Ha na-akpachara anya emefe ihe ókè, ma ọ bụkwanụ nwee ọtụtụ ndị ha na ha na-eme omume na-adịghị ọcha.
Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ime ihe Pọl onyeozi kpọrọ “omume rụrụ arụ.” Okwu Grik e si sụgharịta “omume rụrụ arụ” pụtara ‘ihe jọgburu onwe ya, ihe gabigara ókè, asọghị anya, na agụụ mmekọahụ ịgba mmadụ ara.’ N’eziokwu, i kwesịghị ịghọ ‘onye mmehie ya na-adịghị ewute’ n’ihi imikpu onwe gị “n’omume rụrụ arụ iji anyaukwu na-eme ụdị omume adịghị ọcha niile.”—Ndị Efesọs 4:17-19.
● Ọ bụrụ na nwa okoro na nwa agbọghọ ndị chọrọ ịlụ anaghị adịda ibe ha aka, ha agaghị ahụli ibe ha n’anya.
Ụgha. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị ndị chọrọ ịlụ na-adịda ibe ha aka, ọ naghị eme ka ha dịkwuo ná mma dị ka ụfọdụ nwere ike iche. Kama, ọ na-eme ka ha ghara ịkwanyere ibe ha ùgwù, meekwa ka ha ghara ịtụkwasị ibe ha obi. Tụlee ihe mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Laura. O kwuru, sị: “Otu ụbọchị, onye chọrọ ịlụ m bịara n’ụlọ anyị mgbe mama m na-anọghị ya, sị na ya bịara ile TV. O bu ụzọ jide m aka. Ya anọtụ malite ibitụgharị m aka n’ahụ́. Obi akachaghị m ịsị ya hapụ m, n’ihi na echere m na iwe ga-ewe ya, ya asị na ya alawala.”
Gịnị ka i chere? Onye ahụ chọrọ ịlụ Laura ọ̀ hụrụ ya n’anya n’eziokwu, ka ihe ọ chọrọ ọ̀ bụ naanị igbo agụụ mmekọahụ na-agụ ya? Onye chọrọ ka gị na ya mee omume rụrụ arụ ò gosiri na ọ hụrụ gị n’anya n’ezie?
Mgbe nwa okorobịa na-enye nwa agbọghọbịa nsogbu ka o mee ihe megidere akọnuche ya na ọzụzụ o nwetara n’ọgbakọ Ndị Kraịst, nwa okorobịa ahụ na-emebi iwu Chineke, na-egosikwa na ọ hụghị nwa agbọghọ ahụ n’anya n’ezie n’agbanyeghị na o nwere ike ịsị na ya hụrụ ya n’anya. Ọzọkwa, nwa agbọghọbịa nke kwerenụ emebiela onwe ya. Nke ka njọ bụ na o meela omume na-adịghị ọcha, ma eleghị anya ọ kwaala iko.b—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.
Kpebienụ Ebe Unu Na-agaghị Agafe
Ọ bụrụ na o nwere onye gị na ya chọrọ ịlụ, gịnị ka unu ga-eme ka unu ghara igosi ibe unu ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị? Ihe kacha mma bụ ibu ụzọ kpebie ebe unu na-agaghị agafe. Ilu 13:10 kwuru, sị: “Ndị na-agba izu na-enwe amamihe.” N’ihi ya, gị na onye ị chọrọ ịlụ kwuo ụdị ịhụnanya kwesịrị ekwesị unu ga na-egosi ibe unu. Ọ bụrụ na unu echere ruo mgbe agụụ mmekọahụ gụsiwara unu ike tupu unu ekpebie ya, o yiri ebe mmadụ cheere ruo mgbe ụlọ ya gbawara ọkụ tupu ya etinye ihe na-egosi na ụlọ achọwala ịgba ọkụ.
N’eziokwu, ikwu ụdị ihe ahụ adịchaghị mfe, o nwere ike imenye ihere, nke ka nke, mgbe nwa okoro na nwa agbọghọ ka malitere ịkpa amalite. Ma, ikpebi ebe unu na-agaghị agafe ga-enyere unu aka ịgbara nsogbu ọsọ. Mkpebi ahụ unu ga-eme ga-adị ka ihe na-agba àmà mgbe ọkụ chọrọ ịgba n’ụlọ. Ọzọkwa, ụdị mkparịta ụka ahụ nwere ike igosi ma ihe ọ̀ ga-adabara unu ma unu lụọ. N’eziokwu, njide onwe onye, inwe ndidi, na achọghị ọdịmma onwe onye naanị bụ ihe ga-eme ka mmekọahụ na-atọ di na nwunye ụtọ.—1 Ndị Kọrịnt 7:3, 4.
N’ezie, idebe iwu Chineke adịghị mfe. Ma ị ga-atụkwasịli ndụmọdụ Jehova obi. A sị ka e kwuwe, o kwuru n’Aịzaya 48:17 na ya bụ “Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.” Jehova chọrọ ka ihe dịrị gị mma!
[Foto dị na peeji nke 44]
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 24
Amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị abụghị ọrịa. Kama, ọ kacha mma. Ka anyị chọpụta ihe kpatara ya.
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ná mba ụfọdụ, a na-ele nwa okoro na nwa agbọghọ na-abụghị di na nwunye anya ọjọọ ma ha gosi ibe ha ịhụnanya n’ihu ọha. Ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịkpa àgwà ga-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.—2 Ndị Kọrịnt 6:3.
b N’eziokwu, ihe e kwuru na paragraf a gbasara ma nwoke ma nwaanyị.
AMAOKWU BAỊBỤL
‘Ịhụnanya adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.’ —1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.
NDỤMỌDỤ
Na-akpanụ n’ìgwè, ma ọ bụkwanụ hụnụ na onye ọzọ so unu. Unu anọla ebe ga-etinye unu ná nsogbu, dị ka naanị unu ịnọ n’ụgbọala a dọwara otu ebe ma ọ bụ n’ime ụlọ.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ọ bụrụ na i nwere onye i kwere nkwa ọlụlụ, e nwere ihe ndị gbasara naanị unu abụọ unu kwesịrị ikwurịta. Ma, okwu e kwuru iji kpalie agụụ mmekọahụ bụ adịghị ọcha, ma è kwuru ya n’ekwe ntị ma è ji ekwe ntị dee ya.
IHE M GA-EME!
Ka m nwee ike izere iji omume rụrụ arụ na-egwuri egwu, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na onye mụ na ya na-akpa anwaa ime ka anyị mee omume rụrụ arụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Olee ụdị egwuregwu ị ga-ekpebi na ị gaghị egwusa onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị?
● Kọwaa ihe dị iche n’ịkwa iko, adịghị ọcha na omume rụrụ arụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 46]
“Mụ na onye chọrọ ịlụ m agụọla isiokwu ndị dabeere na Baịbụl, bụ́ ndị kwuru banyere omume dị ọcha. Obi dị anyị ụtọ na isiokwu ndị ahụ enyerela anyị aka inwe akọnuche dị ọcha.”—Leticia
Igbe dị na peeji nke 44]
Ọ́ Bụrụkwanụ na Anyị Agafeela Ókè?
Ọ́ bụrụkwanụ na unu emeela omume rụrụ arụ? Aghọgbula onwe gị chee na naanị unu abụọ ga-edozili nsogbu ahụ. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “Ekpekuru m Chineke ekpere ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ime ya ọzọ. Mgbe ụfọdụ, anyị emeghị ya, ma ọtụtụ mgbe, anyị mere ya.” N’ihi ya, gwa ya papa gị na mama gị. Baịbụl nyekwara ezigbo ndụmọdụ, sị: “Kpọọ ndị okenye nke ọgbakọ.” (Jems 5:14) Ndị Kraịst a bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ ga-enye unu ndụmọdụ, dọọkwa unu aka ná ntị ka unu na Chineke nwee ike ịdịghachi ná mma.
[Foto ndị dị na peeji nke 47]
Ị̀ ga-echere ruo mgbe ụlọ gị gbawara ọkụ tupu gị etinye ihe na-egosi na ọkụ chọrọ ịgba n’ụlọ? N’ihi ya, echela ruo mgbe agụụ mmekọahụ riri unu isi tupu unu ekpebie ebe unu na-agaghị agafe
-
-
Gịnị Mere M Ga-eji Nọrọ n’Amaghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
-
-
ISI NKE 5
Gịnị Mere M Ga-eji Nọrọ n’Amaghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?
“Ọ na-agụsi m agụụ ike ịma otú mmekọahụ na-adị.”—Kelly.
“Ọ na-eme m ihere na amabeghị m nwaanyị.”—Jordon.
“Ị̀ KA nọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?” Ajụjụ a nwere ike ime ka ụjọ tụwa gị! A sị ka e kwuwe, n’ọtụtụ ebe, e nwere ike na-ele onye ntorobịa na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị anya dị ka onye ime ọhịa. Ka a sịkwa ihe mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji enwe mmekọahụ tupu ha eruo afọ iri abụọ!
Enweghị Njide Onwe Onye na Nsogbu Ndị Ọgbọ
Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst, ị ma na Baịbụl gwara gị ka i “zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike ịna-esiri gị ike ijide onwe gị mgbe agụụ mmekọahụ na-agụ gị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Paul kwuru, sị: “Mmekọahụ na-abata m n’obi mgbe ụfọdụ n’enweghị ihe kpatara ya.” Ka obi sie gị ike na ọ dịchaghị njọ ma mmekọahụ bata gị n’obi mgbe ụfọdụ.
Otú ọ dị, ịma gị njakịrị ma ọ bụ ịkparị gị mgbe niile n’ihi na ị maghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-emenye ihere! Dị ka ihe atụ, ọ́ bụrụkwanụ na ndị ọgbọ gị agwa gị na ahụ́ adịghị gị ma ọ bụrụ na i nwebeghị mmekọahụ? Otu onye na-eto eto aha ya bụ Ellen kwuru, sị: “Ndị ọgbọ gị na-eme ka inwe mmekọahụ yie ihe ga-eme ka i nwee obi ụtọ nakwa ihe na-adịghị njọ. Ọ bụrụ na ị naghị enwe mmekọahụ aghara aghara, ha ga na-ele gị anya dị ka onye iberiibe.”
Ma eleghị anya, ọ dị ihe ndị ọgbọ gị na-agaghị ekwu banyere mgbe mbụ ha nwere mmekọahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria, bụ́ onye ya na enyi ya nwoke kwara iko, kwuru, sị: “Ihere mewere m mgbe anyị kwachara iko ahụ. Onwe m sọwara m oyi, mụ akpọọkwa enyi m nwoke ahụ asị.” Ụdị ihe ahụ na-eme eme karịa otú ọtụtụ ndị na-eto eto chere. N’eziokwu, mgbe mbụ ndị na-eto eto nwere mmekọahụ, ọ na-agbawakarị ha obi, na-akpatakwa nsogbu!
Otú ọ dị, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Shanda jụrụ, sị: “Gịnị mere Chineke ji mee ka ọ na-agụ ndị na-eto eto agụụ inwe mmekọahụ, ebe ọ ma na ha ekwesịghị inwe ya ruo mgbe ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye?” Nke ahụ bụ ezigbo ajụjụ. Ma, chegodị echiche:
Ọ̀ bụ naanị mmekọahụ na-agụ gị agụụ? Mbanụ. Jehova Chineke kere gị ka ihe dị iche iche na-agụ gị agụụ.
Ọ̀ bụ ihe ọ bụla gụwara gị agụụ ka ị na-eme ozugbo ahụ? Ee e, n’ihi na Chineke kere gị, mee ka i nwee ike ijide onwe gị n’ihe ọ bụla ị na-eme.
N’ihi ya, gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ? Ihe i kwesịrị ịmụta bụ na o nwere ike ị gaghị emeli ka ihe ụfọdụ ghara ịgụ gị agụụ, ma i nwere ike ijide onwe gị mgbe ha gụwara gị agụụ. N’eziokwu, ịga kwaa iko mgbe ọ bụla agụụ mmekọahụ na-agụ gị dị njọ ma bụrụ nzuzu otú ahụ ịkụ mmadụ ihe mgbe ọ bụla a kpasuru gị iwe si dị njọ ma bụrụ nzuzu.
N’eziokwu, Chineke achọghị ka anyị jiri akụkụ ahụ́ anyị ji amụta nwa na-enwe mmekọahụ na-ezighị ezi. Baịbụl sịrị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara otú ọ ga-esi jide arịa nke ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:4) Otú ahụ e si nwee “oge ịhụ mmadụ n’anya na oge ịkpọ mmadụ asị,” e nwekwara oge mmadụ ga-enwe mmekọahụ mgbe ọ gụrụ ya agụụ na oge ọ na-agaghị enwe ya. (Ekliziastis 3:1-8) Mee elu mee ala, ọ bụ gị ga-ejide onwe gị mgbe ihe na-agụ gị!
Ma, gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ jiri njakịrị jụọ gị, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na ị mabeghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?” Ihere emekwala gị. Ọ bụrụ na naanị ihe onye ahụ chọrọ ime bụ imenye gị ihere, i nwere ike ịgwa ya, sị: “Ee, amabeghị m nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ị̀ ma na ọ na-eme m obi ụtọ?” Ma ọ bụ gị agwa ya, sị: “O nweghị onye ọ gbasara.”a (Ilu 26:4; Ndị Kọlọsi 4:6) N’aka nke ọzọ, i nwere ike iche na i kwesịrị ịgwa onye ahụ jụrụ gị ajụjụ ahụ banyere ya. Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịkọwara ya ihe ị mụtara na Baịbụl mere na ị mabeghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị.
Ì nwere ike icheta ihe ndị ọzọ ị ga-agwa onye kwara gị emo, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na ị mabeghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?” Ọ bụrụ na i chetara, dee ha ebe a.
․․․․․
Onyinye Dị Oké Ọnụ Ahịa
Olee otú obi na-adị Chineke ma ndị mmadụ nwee mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye? Ka e were ya na ị zụtaara enyi gị onyinye. Ma tupu gị enye ya onyinye ahụ, ya emepee ya n’ihi na ọ chọrọ ịmata ihe ọ bụ! Ọ́ gaghị ewe gị iwe? Chee echiche otú obi ga-adị Chineke ma i nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Ọ chọrọ ka i chere ruo mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye tupu gị enwewe mmekọahụ, nke bụ́ onyinye o nyere mmadụ.—Jenesis 1:28.
Olee ihe i kwesịrị ime agụụ mmekọahụ na-agụ gị? E kwuo ya ná nkenke, mụta otú ị ga-esi na-ejide onwe gị. Ị ga-emeli ya! Kpekuo Jehova ekpere ka o nyere gị aka. Mmụọ ya nwere ike ime ka ị na-ejide onwe gị. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Cheta na Jehova “agaghị ajụ inye ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ ihe ọ bụla bụ́ ihe ọma.” (Abụ Ọma 84:11) Otu onye na-eto eto aha ya bụ Gordon kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mụ echewe na mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye adịchaghị njọ, ana m echeta na ọ ga-emebi adịm ná mma mụ na Jehova, chetakwa na ọ dịghị mmehie ọ bụla ga-abara m uru karịa mmekọrịta mụ na Jehova.”
N’eziokwu, amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị abụghị ọrịa. Mmekọahụ rụrụ arụ na-eweda mmadụ ala, na-emenye mmadụ ihere ma na-akpata nsogbu. N’ihi ya, ekwela ka ụgha ụwa na-agha mee ka i chewe na ahụ́ adịghị gị ma ọ bụrụ na ị nọsie ike n’ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na ị nọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ị ga-enwe ahụ́ ike, akọnuche dị ọcha, nke ka nke, ọ ga-emekwa ka mmekọrịta gị na Chineke sie ike.
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A NA NWANNE AKWỤKWỌ A E BU ỤZỌ BIPỤTA, ISI NKE 24
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ọ dị mma ịmara na Jizọs gbara nkịtị mgbe Herọd na-ajụ ya ajụjụ. (Luk 23:8, 9) N’ihi ya, mgbe a jụrụ gị ajụjụ iberiibe, ọ dị mma ịgba nkịtị.
AMAOKWU BAỊBỤL
‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie n’ime obi ya na ya ga-anọgide n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, ọ ga-eme nke ọma.’—1 Ndị Kọrịnt 7:37.
NDỤMỌDỤ
Gị na ndị na-anaghị akpa ezi àgwà akpala, a sịgodị na ha sịrị na ha bụ Ndịàmà ibe gị.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ịlụ di ma ọ bụ nwunye anaghị eme ka ndị na-enwe mmekọahụ aghara aghara kwụsị ya. Ma ndị nọsiri ike n’ụkpụrụ Chineke nyere banyere omume ọma tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye ga-ekwesịkwu ntụkwasị obi n’ebe di ha ma ọ bụ nwunye ha nọ.
IHE M GA-EME!
Ọ bụrụ na m ga-anọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ruo mgbe m lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ihe m kwesịrị ime bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na ndị enyi m na-eme ka o siere m ike ịnọgide ná mkpebi m mere, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị ka i chere mere ụfọdụ ji achị ndị na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ọchị?
● Gịnị mere o ji esi ike ịnọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị?
● Olee uru ị ga-erite ma ị nọrọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ruo mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye?
● Olee otú ị ga-esi akọwara nwanne gị ị tọrọ uru ịnọ n’amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị bara?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 51]
“Mgbe ọ bụla a nwara m ọnwụnwa inwe mmekọahụ, ihe na-enyere m aka imeri ya bụ icheta mgbe niile na ‘ọ dịghị onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze Chineke.’’’ (Ndị Efesọs 5:5)”—Lydia
Igbe dị na peeji nke 49]
Ebe M Dere Ihe
Gịnị n’Ezie Na-eme Ma E Mechaa?
Ndị ọgbọ gị na ndị na-eme ntụrụndụ na-ewu ewu na-ejikarị akọ ezochi nsogbu mmadụ na-enweta ma o nwee mmekọahụ mgbe ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Chebara ọnọdụ atọ a echiche. Olee ihe i chere n’ezie ga-eme ndị na-eto eto ndị a?
● Ka e were ya na nwa akwụkwọ ibe gị turu ọnụ na ya na ọtụtụ ụmụ agbọghọ enweela mmekọahụ. Ọ sịrị na ọ na-atọ ụtọ, na o nweghị ihe ọ na-eme mmadụ. Gịnị n’ezie mere ya na ụmụ agbọghọ ndị ahụ mgbe ha mechara? ․․․․․
● Ná ngwụcha otu fim, e gosiri ebe ndị na-eto eto na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe mmekọahụ iji gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya. Ọ bụrụ na ihe ahụ emee eme, gịnị n’ezie ga-emecha mee ha? ․․․․․
● Ka e were ya na otu nwa okorobịa mara mma gwara gị ka gị na ya nwee mmekọahụ. Ọ sịrị na ọ dịghị onye ga-ama. Ọ bụrụ na gị na ya enwee mmekọahụ, gị agbalịa izochi ya, gịnị n’ezie ga-eme mgbe unu mechara? ․․․․․
[Foto dị na peeji nke 54]
Inwe mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye yiri imepe onyinye mgbe a na-enyebeghị gị ya
-