Abụ nke 99
Na-eto Eze Ọhụrụ nke Ụwa
1. Kraịst Jizọs na ọgbakọ ya
bụ́ ndị e tere ’manụ
N’achịkọta ìgwè mmadụ
si ná mba n’ebo niile.
A mụọl’Al’eze Chineke;
A g’eme uche ya n’ụwa.
Ọ bụ olil’anya n’enwegh’atụ,
nke n’akasi anyị obi.
(KORỌS)
N’etonụ Jehova
Na Nwa ya, Kraịst Jizọs,
Onye chụr’àjà, gbapụt’anyị.
Anyị nwer’olil’any’ibi n’ụwa
Fee Jaa ruo mgb’ebigh’ebi.
2. Anyị ji ọṅụ n’eto Jizọs,
bụ́ Eze nke n’achị anyị.
Ony’isi Udo a g’eme uche
Chineke, zọpụt’anyị.
Anyị n’ahụ ọṅụ dị n’ihu:
Ụwa nk’egwu n’agagh’adị,
Ndị nwụr’anwụ g’ebilikwa.
Ọ g’abụ og’ịṅụrị ọṅụ!
(KORỌS)
N’etonụ Jehova
Na Nwa ya, Kraịst Jizọs,
Onye chụr’àjà, gbapụt’anyị.
Anyị nwer’olil’any’ibi n’ụwa
Fee Jaa ruo mgb’ebigh’ebi.
(Gụọkwa Ọma 2:6; 45:1; Aịza. 9:6; Jọn 6:40.)