Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Amụma Ndị E Buru na Ya Na-emezu
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
    • Amụma Ndị E Buru na Ya Na-emezu

      “Ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị.”​—JỌSHỤA 23:14.

      IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Ma n’oge ochie ma n’oge a, ihe a na-agwa ndị gara ịjụ ase n’arụsị anaghị edo anya, ha anaghịkwa ama ma ọ̀ ga-emezu. N’oge anyị a, ndị na-ekwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu na-esi n’ihe na-eme ugbu a ekwu ihe ha chere na ọ ga-eme. O sikwara ike ịhụ ebe ha kpọrọ otu ihe aha ma kwuo na ihe ahụ ga-eme ma ọtụtụ narị afọ gafee. Ma amụma ndị e dere na Baịbụl doro anya, ha na-ekwu otú ihe niile ga-esi eme, ha na-emezukwa, ọ sọkwa ya ya bụrụ na e kwuru ha ‘n’oge dị anya gara aga mgbe ha na-emebeghị eme.’—Aịzaya 46:10.

      IHE GOSIRI NA AMỤMA BAỊBỤL NA-EMEZU: Ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ ise gara aga, Daniel onye amụma buru amụma na mba Gris ga-emeri mba Midia na Peshia n’egbughị oge. O kwukwara na ozugbo eze Gris “dịrị ike,” a ‘ga-agbaji’ ọchịchị ya. Ònye ga-anọchi ya? Daniel dere, sị: “A ga-enwe alaeze anọ ga-esi ná mba ya pụta, ma ha agaghị enwe ụdị ike o nwere.”—Daniel 8:5-8, 20-22.

      IHE NDỊ ỌKỌ AKỤKỌ IHE MERE EME KWURU: Ihe karịrị narị afọ abụọ Daniel nwụrụ, Alegzanda Onye Ukwu ghọrọ eze Gris. N’ime afọ iri, Alegzanda meriri Midia na Peshia ma mee ka ọchịchị ya ruo Osimiri Indus (nke dị ugbu a na Pakịstan). Ma, ọ nwụrụ na mberede mgbe ọ dị afọ iri atọ na abụọ. Ọchịchị ya mechara daa mgbe a lụrụ agha n’ebe dị nso n’obodo Ipsọs nke dị n’Eshia Maịnọ. Mmadụ anọ ndị meriri n’agha ahụ kewaziri ebe niile mba Gris na-achị ụzọ anọ, onye nke ọ bụla n’ime ha achịwa otu. Ma o nweghị onye n’ime ha kparuru ike ka Alegzanda.

      GỊNỊ KA I CHERE? È nwere akwụkwọ ọzọ e nwere ike ikwu na ihe niile e dere na ya na-emezu? Ka ì chere na Baịbụl dị iche?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]

      ‘Ebe ọ bụ na amụma Baịbụl ndị mezurulanụ dị ọtụtụ, e nweghị ike ịsị na ha mezuru ná ndaba.’​—AKWỤKWỌ BỤ́ A LAWYER EXAMINES THE BIBLE, NKE IRWIN H. LINTON DERE

      [Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 4]

      © Robert Harding Picture Library/SuperStock

  • Ihe Ndị A Kọrọ na Ya Mere Eme, Ha Abụghị Akụkọ Ifo
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
    • Ihe Ndị A Kọrọ na Ya Mere Eme, Ha Abụghị Akụkọ Ifo

      “Esi m ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi.” —LUK 1:3.

      IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Mgbe ọ bụla a na-akọ akụkọ ifo, ihe a na-ekwukarị bụ ‘O nwere otu mgbe.’ A naghị ekwu ebe ihe a na-akọ akụkọ ya mere, oge o mere, na ndị nọ mgbe o mere. Ma, ihe ndị a kọrọ na Baịbụl dị iche n’ihi na e kwuru ebe ha mere, oge ha mere, na ndị nọ mgbe ha mere. Nke a na-eme ka obi sie ndị na-agụ Baịbụl ike na ‘ihe niile e kwuru na ya bụ eziokwu.’—Abụ Ọma 119:160.

      IHE GOSIRI NA IHE A KỌRỌ NA BAỊBỤL ABỤGHỊ AKỤKỌ IFO: Baịbụl kwuru na ‘Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn dọọrọ Jehoyakin bụ́ eze Juda n’agha laa Babịlọn.’ Baịbụl kwukwara na ‘n’afọ Ivil-merodak ghọrọ eze Babịlọn, ọ kpọpụtara Jehoyakin eze Juda wee mee ka o si n’ụlọ mkpọrọ pụta.’ A na-esikwa “n’ihe eze nwere enye [Jehoyakin] ihe mgbe niile, kwa ụbọchị dị ka o kwesịrị, n’ụbọchị niile nke ndụ ya.”—2 Ndị Eze 24:11, 15; 25:27-30.

      IHE NDỊ NA-AMỤ BANYERE IHE NDỊ MGBE OCHIE CHỌPỤTARA: Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie egwupụtala ihe ndị e dere ede bụ́ ndị kọrọ banyere ọchịchị Babịlọn. Ọ bụ ihe ndị mere n’oge Nebukadneza nke Abụọ na-achị Babịlọn ka e dere n’ihe ndị ahụ. E gwupụtara ha n’ebe obodo Babịlọn oge ochie dịbu. Ụfọdụ ihe ndị e dere na ha bụ otú e si enye ndị mkpọrọ nakwa ndị ọzọ eze na-akpa afọ ha nri. E dekwara na “Yaukin [ya bụ, Jehoyakin],” bụ́ “eze obodo Yahud (ya bụ, Juda),” na ezinụlọ ya so ná ndị ahụ eze na-enye nri. Ma ọ̀ bụ eziokwu na e nwere onye a kpọrọ Ivil-merodak, bụ́ onye nọchiri Nebukadneza? Ihe e dere n’ite a hụrụ n’ebe dị nso n’obodo Susa kwuru banyere Ivil-merodak. Ihe e dere na ya bụ: “Obí Amil-Maduk [ya bụ, Ivil-merodak], Eze Babịlọn, nwa Nebukadneza bụ́ Eze Babịlọn.”

      GỊNỊ KA I CHERE? E wezụga Baịbụl, è nwere akwụkwọ ọzọ e weere na ọ bụ akwụkwọ dị nsọ nke kọrọ ihe ndị mere n’oge ochie, e mechaa chọpụta na ihe ndị ahụ ọ kọrọ mere otú ahụ o si kọọ ha? Ka ì chere na Baịbụl dị iche?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

      “N’ime akwụkwọ niile kọrọ ihe ndị mere n’oge ochie, ọ bụ Baịbụl kacha kọọ nke bụ́ eziokwu.”​—AKWỤKWỌ BỤ́ A SCIENTIFIC INVESTIGATION OF THE OLD TESTAMENT, NKE ROBERT D. WILSON DERE

      [Foto dị na peeji nke 5]

      Ihe ndị Babịlọn dere nke kpọrọ aha Jehoyakin bụ́ eze Juda

      [Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 5]

      © bpk, Berlin/Vorderasiatisches Museum, SMB/Olaf M. Tessmer/Art Resource, NY

  • Ihe O Kwuru Dabara n’Ihe Ndị Dọkịta Chọpụtara
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
    • Ihe O Kwuru Dabara n’Ihe Ndị Dọkịta Chọpụtara

      “Ọ̀ bụ na mụ edeghịrị gị okwu ndụmọdụ na nke ihe ọmụma n’oge gara aga, iji gosi gị izi ezi nke okwu bụ́ eziokwu, ka i wee gaa kọọrọ onye zitere gị okwu bụ́ eziokwu?”—ILU 22:20, 21.

      IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Ndị sayensị nke oge a achọpụtala na ọtụtụ ihe e dere n’akwụkwọ ndị e nwere n’oge ochie abụghị eziokwu, ọ bụrụkwa na mmadụ emee ihe ndị ahụ, ọ ga-akpatara ya nsogbu. Ndị na-ede akwụkwọ taa na-edegharịkwa ihe ụfọdụ ha dere ka ha daba n’ihe ọhụrụ ndị sayensị na-achọpụta. Ma Baịbụl sịrị na ọ bụ Onye kere ihe niile kwuru ihe e dere na ya nakwa na Okwu ya “na-adịru mgbe ebighị ebi.”—1 Pita 1:25.

      IHE GOSIRI NA IHE BAỊBỤL KWURU DABARA N’IHE NDỊ DỌKỊTA CHỌPỤTARA: N’iwu Jehova nyere ụmụ Izrel, a gwara ha na onye chọrọ ịga mposi ga-egwu ala ‘ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu’ ma kpochie nsị ya ma ọ nyụchaa. (Diuterọnọmi 23:12, 13) Iwu ahụ kwukwara na ọ bụrụ na onye Izrel emetụ ozu mmadụ ma ọ bụ ozu anụmanụ aka, ọ ga-eji mmiri saa onwe ya. (Levitikọs 11:27, 28; Ọnụ Ọgụgụ 19:14-16) N’oge ahụ, ọ bụrụ na mmadụ ebute ọrịa ekpenta, a na-akpọpụ ya iche ka ọ ghara ibunye ya ndị ọzọ ruo mgbe a chọpụtara na ọrịa ahụ alaala.—Levitikọs 13:1-8.

      IHE NDỊ DỌKỊTA CHỌPỤTARA: A chọpụtala na inwe ebe dị mma a na-aga mposi, ịkwọ aka mgbe niile, na ịkpọpụ ndị na-arịa ọrịa na-efe efe iche ka bụ ụzọ kacha mma e si eme ka ndị mmadụ ghara ibute ọrịa. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Igbochi Ọrịa n’Amerịka sịrị na ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghị ụlọ mposi, ‘ebe ha kwesịrị ịga mposi bụ n’ebe na-adịghị nso ná mmiri. Ha ga-egwu ala, nyụọ nsị ma kpochie ya.’ Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na ọ bụrụ na ndị mmadụ nwere ebe dị mma ha na-aga mposi ma ghara ịna-anyụ nsị aghara aghara, afọ ọsịsa agaghị na-asakarị ndị mmadụ. N’ihe na-erubeghị narị afọ abụọ gara aga, ndị dọkịta chọpụtara na ha bunyere ọtụtụ ndị ọrịa ọrịa n’ihi na ha akwọghị aka mgbe ha metụchara ozu aka. Ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka igbochi ọrịa kwukwara na ịkwọ aka “bụ ihe kacha mma mmadụ ga-eme ka ọ ghara ibute ọrịa.” Oleekwanụ maka ihe ahụ Chineke gwara ụmụ Izrel, nke bụ́ ka ha na-akpọpụ onye ekpenta iche ma ọ bụ onye na-arịa ụdị ọrịa ọzọ na-efe efe? N’oge na-adịbeghị anya, otu akwụkwọ nke na-akọ maka ahụ́ ike kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ọrịa na-efe efe amalite ịrịa ndị mmadụ n’obodo, otú kacha mma e nwere ike isi mee ka ndị ọzọ ghara ibute ya bụ ịkpọpụ ndị ahụ na-arịa ọrịa iche.”

      GỊNỊ KA I CHERE? N’akwụkwọ niile e weere na ha bụ akwụkwọ dị nsọ, bụ́ ndị e dere n’oge ochie, è nwere nke kwuru ihe dabara n’ihe ndị dọkịta nke oge a chọpụtara? Ka ì chere na Baịbụl dị iche?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

      “O nweghị onye gụrụ iwu Chineke nyere ụmụ Izrel banyere otú ha ga-esi na-edewe onwe ha ọcha nke na-agaghị ekweta na iwu ndị ahụ enweghị atụ.”​—AKWỤKWỌ BỤ́ MANUAL OF TROPICAL MEDICINE, NKE NDỊ DỌKỊTA BỤ́ ALDO CASTELLANI NA ALBERT J. CHALMERS DERE

  • Ihe Niile E dere na Ya Bụ Otu
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
    • Ihe Niile E dere na Ya Bụ Otu

      “Ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 PITA 1:21.

      IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Ọtụtụ akwụkwọ ndị e dere n’oge ochie na-ekwu ihe dị iche n’ihe akwụkwọ ndị ọzọ e dere ha na ha otu oge na-ekwu. Ọ bụrụ na ndị na-ebighị ndụ n’otu oge nakwa ndị na-ebighị n’otu ebe edee akwụkwọ dị iche iche, o siri ezigbo ike ka akwụkwọ ahụ niile kwuo otu ihe. Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụ otu Onye kwuru ihe e dere n’akwụkwọ iri isii na isii dị na ya, nke mere ka ihe ha niile na-ekwu bụrụ otu.—2 Timoti 3:16.

      IHE GOSIRI NA IHE NIILE E DERE NA BAỊBỤL BỤ OTU: Otu onye na-azụ atụrụ nke dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ isii gara aga, onye aha ya bụ Mozis, dere n’akwụkwọ mbụ nke Baịbụl na e nwere “mkpụrụ” nke ga-azọpụta ụmụ mmadụ. E mechara kwuo n’akwụkwọ ahụ na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ Ebreham, Aịzik, na Jekọb. (Jenesis 3:15; 22:17, 18; 26:24; 28:14) Mgbe ihe dị ka narị afọ ise gafere, Netan onye amụma kwuru na mkpụrụ ahụ ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid. (2 Samuel 7:12) Otu puku afọ Netan kwuchara nke a, Pọl onyeozi kwuru na ndị ga-eso ná mkpụrụ ahụ bụ Jizọs na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ọ họọrọ. (Ndị Rom 1:1-4; Ndị Galeshia 3:16, 29) N’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu gara aga, e buru amụma n’akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl na ndị so ná mkpụrụ ahụ ga-agba àmà banyere Jizọs n’ụwa, nakwa na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha biri n’eluigwe ma soro Jizọs chịa otu puku afọ. Ha na Jizọs ga-eso bibie Ekwensu ma zọpụta ụmụ mmadụ.—Mkpughe 12:17; 20:6-10.

      IHE NDỊ ỌKÀ MMỤTA KWURU: Mgbe Louis Gaussen lebachara anya nke ọma n’akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl, o dere na otu ihe tụrụ ya n’anya bụ ‘otú Baịbụl si kwuo otu ihe n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị so dee ya, n’agbanyeghịkwa na o were ha otu puku afọ na narị afọ ise iji dechaa ya.’ Ihe ọzọ tụrụ ya n’anya bụ na ‘onye ọ bụla n’ime ha dere akwụkwọ nke ya ka à ga-asị na ya na ibe ya bu otu ihe n’obi, nke bụ́ ịkọ otú Ọkpara Chineke ga-esi azọpụta ụwa a.’—Akwụkwọ bụ́ Theopneusty—The Plenary Inspiration of the Holy Scriptures.

      GỊNỊ KA I CHERE? Ọ bụrụ na o were ihe dị ka mmadụ iri anọ ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise iji dechaa otu akwụkwọ, ì chere na akwụkwọ ahụ ga na-ekwu otu ihe? Í cheghị na Baịbụl dị iche?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

      “Anyị achọpụtala na ihe niile e dere na Baịbụl, malite na Jenesis ruo Mkpughe, na-ekwu otu ihe . . . O nweghị akwụkwọ ọzọ yiri ya ma ọ bụ nke hụrụ azụ ya anya.”​—AKWỤKWỌ BỤ́ THE PROBLEM OF THE OLD TESTAMENT, NKE JAMES ORR DERE

  • Ihe Ndị E kwuru na Ya Bara Uru Taa
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
    • Ihe Ndị E kwuru na Ya Bara Uru Taa

      “Okwu gị bụ oriọna nke na-enye ụkwụ m ìhè, bụrụkwa ìhè na-enwu n’okporo ụzọ m.”—ABỤ ỌMA 119:105.

      IHE MERE BAỊBỤL JI DỊ ICHE: Akwụkwọ ụfọdụ e dere n’oge ochie mara mma ọgụgụ, ma ha anaghị akụziri ndị mmadụ otú e si ebi ezigbo ndụ. N’oge anyị a, a na-edegharịkarị ihe e dere n’akwụkwọ ndị e ji akụziri ndị mmadụ ihe. Ma Baịbụl adịghị otú ahụ. Baịbụl kwuru na ‘ihe niile e dere na ya n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka.’—Ndị Rom 15:4.

      IHE GOSIRI NA BAỊBỤL BARA URU TAA: Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ na-akụzi otú e si agwọ ọrịa, o kwuru ihe ndị ga-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma, obi eruokwa onye ahụ ala. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị na “obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́.” (Ilu 14:30) Baịbụl dọkwara aka ná ntị, sị: “Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya; ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.” (Ilu 18:1) O kwukwara na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

      IHE NDỊ A CHỌPỤTARA: Obi iru mmadụ ala, mmadụ inwe ndị enyi, na mmadụ imesapụ aka nwere ike ime ka ahụ́ dị mmadụ mma. Otu akwụkwọ nke na-ekwu maka ahụ́ ike kwuru, sị: “Ụmụ nwoke ndị na-ewekarị iwe ọkụ nwere ike ịrịa ọrịa strok karịa ndị nke na-anaghị ewe iwe ọkụ.” Mgbe e mere otu nchọpụta n’Ọstrelịa, bụ́ nke were afọ iri, a chọpụtara na ndị agadi “ndị nwere ndị enyi na ndị ha na-akọsara ụwa ha” na-adị ogologo ndụ karịa ndị nke na-enweghị. N’afọ 2008, ndị na-eme nchọpụta na Kanada nakwa n’Amerịka chọpụtara na “mmadụ iji ego ya emere ndị ọzọ ihe na-eme ka onye ahụ nwee obi ụtọ karịa onye ahụ ịna-eri ego ya naanị ya.”

      GỊNỊ KA I CHERE? Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ e dechara n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ị̀ ga-ekweta ihe o kwuru banyere ihe ị ga-eme ka ahụ́ dị gị mma? Í cheghị na Baịbụl dị iche?

      [Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

      ‘Ihe mere Baịbụl ji masị m bụ na o kwuru ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma.’​—DỌKỊTA BỤ́ HOWARD KELLY, ONYE SO NÁ NDỊ BIDORO MAHADUM BỤ́ THE JOHNS HOPKINS UNIVERSITY SCHOOL OF MEDICINE

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya