-
Ì Kwesịrị Ikwere na Ọrụ Ebube Ndị A Kọrọ na Baịbụl Mere Eme?Ụlọ Nche—2012 | Ọgọst 1
-
-
Ì Kwesịrị Ikwere na Ọrụ Ebube Ndị A Kọrọ na Baịbụl Mere Eme?
Ọ BỤRỤ na mmadụ akọọrọ gị akụkọ tụrụ gị n’anya, ị̀ ga-asị ozugbo na ihe ọ kọrọ abụghị eziokwu, ka ị̀ ga-ebugodị ụzọ jụọ onwe gị ma onye ahụ ọ̀ bụ onye na-ekwu eziokwu ka ọ̀ bụ onye ụgha? Ihe ọzọ ị ga-echebara echiche bụ otú o si kọọrọ gị akụkọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ ghatụbeere gị ụgha kemgbe ị maara ya, o nweghị ihe ga-eme ka i chewe na ihe ahụ ọ kọọrọ gị ugbu a abụghị eziokwu.
Otú ahụ ka ọ dịkwa ọrụ ebube ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. O nweghị onye n’ime anyị nọ ndụ mgbe ha mere. Ma anyị nwere ike ịchọpụta ma ihe ndị ahụ a kọrọ na Baịbụl hà bụ eziokwu. Olee otú anyị ga-esi achọpụta? Ka anyị hụ ihe ụfọdụ gosiri na ọrụ ebube ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ eziokwu.
A rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube ndị ahụ n’ihu ndị mmadụ. Ọtụtụ puku mmadụ ma ọ bụ ọtụtụ nde mmadụ hụrụ mgbe a rụrụ ụfọdụ ọrụ ebube ndị ahụ. (Ọpụpụ 14:21-31; 19:16-19) A rụghị ha na nzuzo, n’ebe ndị mmadụ na-agaghị ahụ ha.
A rụghị ọrụ ebube ndị ahụ otú ga-agbagwoju ndị mmadụ anya. Mgbe a rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ, e bughị ụzọ mee nkwadebe pụrụ iche ma ọ bụ weta ihe ụfọdụ ga-adọta mmasị ndị mmadụ ma ọ bụkwanụ gbanye ọkụ ga-emegharị ndị mmadụ anya tupu a rụọ ha. Ọtụtụ ọrụ ebube ndị ahụ mere mgbe ọ na-enweghị onye ma na a ga-eme ha ma ọ bụ ozugbo mmadụ rịọrọ ka e nyere ya aka. (Mak 5:25-29; Luk 7:11-16) N’ihi ya, o nweghị onye ga-asị na a gwara ndị mmadụ ka ha gbakọọ ka a rụọrọ ha ọrụ ebube.
Ndị rụrụ ọrụ ebube ndị ahụ arụghị ha ka ha ghọọ ndị a ma ama ma ọ bụ ka e too ha ma ọ bụ ka ha jiri ya kpaa ego. Kama ha rụrụ ya iji nye Chineke otuto. (Jọn 11:1-4, 15, 40) A katọrọ onye ọ bụla chọrọ iji ọrụ ebube kpaa ego.—2 Ndị Eze 5:15, 16, 20, 25-27; Ọrụ Ndịozi 8:18-23.
Ọrụ ebube ndị a kọrọ na Baịbụl dị n’ụdị n’ụdị. Nke a gosiri na ha esighị n’aka mmadụ. Dị ka ihe atụ, e mere ka osimiri daa jụụ mgbe e nwere ebili mmiri, mee ka mmiri ghọọ mmanya, mee ka mmiri kwụsị izo, meekwa ka o zoo. A gwọkwara ndị ọrịa, megheekwa anya ndị ìsì. Ọrụ ebube niile a na ọtụtụ ọrụ ebube ndị ọzọ gosiri na ọ bụ onye ike ya karịrị nke mmadụ rụrụ ha.—1 Ndị Eze 17:1-7; 18:41-45; Matiu 8:24-27; Luk 17:11-19; Jọn 2:1-11; 9:1-7.
Ndị iro Jizọs, bụ́ ndị hụrụ ọrụ ebube ndị Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya rụrụ, ekwughị na ha emeghị eme. Mgbe Jizọs kpọlitere enyi ya Lazarọs n’ọnwụ, o nweghị mgbe ndị iro Jizọs kwuru na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ. O nweghị otú ha ga-esi ekwu otú ahụ n’ihi na Lazarọs nọrọ abalị anọ n’ili tupu Jizọs akpọlite ya. (Jọn 11:45-48; 12:9-11) Ndị dere akwụkwọ okpukpe ndị Juu a na-akpọ Talmud dere n’akwụkwọ ahụ na Jizọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’agbanyeghị na mgbe ha dere akwụkwọ ahụ na o ruola ọtụtụ narị afọ Jizọs nwụrụ. Ihe ndị iro Jizọs ahụ na-ekwetaghị bụ na ọ bụ Chineke nyere ya ike o ji rụọ ọrụ ebube. Mgbe a kpọgakwara ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ụlọikpe ndị Juu, ajụjụ a jụrụ ha abụghị, “Ọ̀ bụ eziokwu na unu rụrụ ọrụ ebube?” Kama ihe a jụrụ ha bụ: “Olee ike unu ji mee ihe a, ọ̀ bụkwa aha onye ka unu ji mee ya?”—Ọrụ Ndịozi 4:1-13.
Ajụjụ bụzi, ì kwesịrị ikwere na ọrụ ebube ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ eziokwu? Ihe ndị a anyị lebara anya na ha gosiri na ọrụ ebube ndị ahụ mere eme. E nwekwara ihe ndị ọzọ mere anyị ga-eji kweta na ihe ndị ahụ a kọrọ na Baịbụl bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, Baịbụl na-ekwukarị oge akụkọ ndị a kọrọ na ya mere, ebe ha mere, na aha ndị a kọrọ akụkọ ha. Ọ na-ejudị ndị na-ekweghị na Baịbụl anya mgbe ha chọpụtara na akụkọ dị iche iche a kọrọ na Baịbụl mere otú ahụ e si kọọ ha. Ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl emezuokwala otú e buru ha n’amụma. Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe ga-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma. Ihe ndị ahụ enyekwarala ma onye ukwu ma onye nta aka. E nweghị ebe ọzọ mmadụ ga-enweta ndụmọdụ ga-eme ka ya na ndị ọzọ dịrị ná mma karịa ndị nke dị na Baịbụl.
Ọ bụrụ na i kwetachabeghị na ihe ndị e kwuru na Baịbụl bụ eziokwu, gbalịsie ike ka i wepụta oge na-amụ Baịbụl. Ọ bụrụ na ị malite ịmụ Baịbụl, ị ga-amalite ikwere na ihe ndị e kwuru na ya bụ eziokwu. (Jọn 17:17) Ọ bụ mgbe ahụ ka ị ga-aghọta na ọrụ ebube ndị a kọrọ na ya mere eme n’eziokwu. Ozugbo i kwetara na ha mere eme, ọ gaghị esiri gị ike ikweta na ihe ndị Baịbụl kwuru na ha ga-eme n’ọdịnihu ga-emekwa eme.
[Foto dị na peeji nke 7]
O nweghị mgbe ndị iro Jizọs kwuru na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ
-
-
Ọrụ Ebube Ndị Chineke Ga-arụ n’Oge Na-adịghị AnyaỤlọ Nche—2012 | Ọgọst 1
-
-
Ọrụ Ebube Ndị Chineke Ga-arụ n’Oge Na-adịghị Anya
Ọ BỤRỤ na mmadụ gara ụlọ ọgwụ ka a waa ya ahụ́, ya achọpụta na dọkịta ga-awa ya ahụ́ ahụ awatụbeghị mmadụ ahụ́, olee otú i chere obi ga-adị onye ahụ? O doro anya na obi agaghị eru ya ala. Ma ọ bụrụkwanụ na onye ahụ achọpụta na dọkịta ahụ bụ ọkachamara n’ịwa ahụ́ nakwa na ọ waala ọtụtụ ndị ahụ́ ha agbakee? Obi ọ́ gaghị esi ya ike na ọ ga-agbakekwa ma dọkịta ahụ waa ya ahụ́?
Ụwa anyị a yiri onye na-arịa ọrịa. Ọ bụ Jehova Chineke bụ dọkịta ahụ nke ga-agwọ ụwa a ọrịa ya. Chineke kwere anyị nkwa n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na ọ ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs otú ọ dịbu. (2 Pita 3:13) Ma tupu Chineke emee ka ụwa ghọọ paradaịs, ọ ga-ebu ụzọ bibie ndị ajọ omume. (Abụ Ọma 37:9-11; Ilu 2:21, 22) Nsogbu niile juru n’ụwa ga-akwụsịrịrị tupu ụwa aghọọ paradaịs. Ọ bụ ọrụ ebube Chineke ga-arụ ga-eme ka nke a nwee isi!—Mkpughe 21:4, 5.
Ndịàmà Jehova kweere na ihe ọma niile a ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọrụ ebube ndị Jehova Chineke rụrụla gosiri na ọ ga-emezuli nkwa niile o kwere. Ka anyị lebagodị anya n’ọrụ ebube isii ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma hụ ihe ha na-akụziri anyị banyere nkwa ndị Chineke kwere bụ́ ndị ga-emezu n’ọdịnihu.
Ọ ga-adị mma ka ị nọgide na-amụ banyere nkwa ndị Chineke kwere na Baịbụl, bụ́ ndị ga-emezu n’ọdịnihu. I mee otú ahụ, okwukwe gị ga-esi ike. Ọ bụrụ na okwukwe gị esie ike, ọ ga-abịazi doo gị anya na ị ga-eso ná ndị ọrụ ebube ndị ahụ Jehova ga-arụ ga-abara uru.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 9]
ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:
JIZỌS JI ACHỊCHA NA AZỤ̀ OLE NA OLE NYEJUO ỌTỤTỤ PUKU MMADỤ AFỌ.—MATIU 14:13-21; MAK 8:1-9; JỌN 6:1-14.
NKWA CHINEKE KWERE:
“Ala ga-emepụta ihe nke ọma; Chineke bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.”—ABỤ ỌMA 67:6.
IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:
O NWEKWAGHỊ ONYE GA-ANỌ AGỤỤ.
ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:
JIZỌS MEGHERE ANYA NDỊ ÌSÌ.—MATIU 9:27-31; MAK 8:22-26.
NKWA CHINEKE KWERE:
“A ga-emeghe anya ndị ìsì.”—AỊZAYA 35:5.
IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:
NDỊ ÌSÌ NIILE GA-AMALITE ỊHỤ ỤZỌ.
ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:
JIZỌS GWỌRỌ NDỊ NWERE NKWARỤ.—MATIU 11:5, 6; JỌN 5:3-9.
NKWA CHINEKE KWERE:
“Onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele.”—AỊZAYA 35:6.
IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:
A GA-AGWỌ NDỊ MMADỤ ỤDỊ NKWARỤ Ọ BỤLA HA NWERE.
ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:
JIZỌS GWỌRỌ ỤDỊ ỌRỊA DỊ ICHE ICHE.—MAK 1:32-34; LUK 4:40.
NKWA CHINEKE KWERE:
“Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—AỊZAYA 33:24.
IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:
A GA-AGWỌ NDỊ MMADỤ ỤDỊ ỌRỊA Ọ BỤLA HA NA-ARỊA. AHỤ́ GA-ESI MMADỤ NIILE IKE.
ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:
JIZỌS MERE KA OSIMIRI DAJỤỌ, MEEKWA KA OKÉ IFUFE KWỤSỊ.—MATIU 8:23-27; LUK 8:22-25.
NKWA CHINEKE KWERE:
“Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”—AỊZAYA 65:21, 23.
“Ị ga-anọkwa ihe ọ bụla na-emenye ụjọ n’ebe dị anya, n’ihi na ọ gaghị erute gị nso.”—AỊZAYA 54:14.
IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:
A GAGHỊ ENWEKWA ỌDACHI NDỊ NA-EMERE ONWE HA.
ỌRỤ EBUBE A KỌRỌ NA BAỊBỤL:
JIZỌS KPỌLITERE NDỊ NWỤRỤ ANWỤ N’ỌNWỤ.—MATIU 9:18-26; LUK 7:11-17.
NKWA CHINEKE KWERE:
“Ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”—JỌN 5:28, 29.
“Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.”—MKPUGHE 20:13.
IHE NKE A NA-AKỤZIRI ANYỊ:
A GA-AKPỌLITE NDỊ ANYỊ HỤRỤ N’ANYA NWỤRỤ ANWỤ N’ỌNWỤ.
-