Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị̀ Ga-esi Aṅaa Guzo n’Ihu Oche Ikpe Ahụ?
    Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
    • 15, 16. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo na Jisọs aghọghị Eze nke Alaeze Chineke na 33 O.A.? (b) Olee mgbe Jisọs malitere ịchị n’Alaeze Chineke?

      15 Otú ọ dị, n’oge ahụ Jisọs emeghị ihe dị ka Eze na Onye Ikpe n’elu mba nile. Ọ nọdụrụ ala na-esote Chineke, na-echere oge ime ihe dị ka Eze nke Alaeze Chineke. Pọl dere banyere ya, sị: “Ọ̀ bụ ònye n’etiti ndị mmụọ ozi ka O kwuworo okwu banyere ya mgbe ọ bụla, sị, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro Gị ka ihe mgbakwasị ụkwụ Gị abụọ?”—Ndị Hibru 1:13.

      16 Ndịàmà Jehova ebipụtawo ihe àmà dị ukwuu na oge nchere nke Jisọs gwụsịrị na 1914, mgbe ọ ghọrọ onye ọchịchị nke Alaeze Chineke n’eluigwe nke anya na-adịghị ahụ. Mkpughe 11:15, 18 na-asị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst Ya: Ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” “Mba nile wee wee iwe, iwe Gị wee bịa.” Ee, mba nile wesoro ibe ha iwe n’oge Agha Ụwa Mbụ. (Luk 21:24) Agha, ala ọma jijiji, ajọ ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na ihe ndị yiri ha ndị anyị hụworo kemgbe 1914 na-akwado na Jisọs na-achị achị ugbu a n’Alaeze Chineke, ọgwụgwụ ikpeazụ nke ụwa dịkwa nso.—Matiu 24:3-14.

      17. Isi ihe ndị dị aṅaa ka anyị meworo ka ọ pụta ìhè rute ugbu a?

      17 Ná ntụleghachi dị mkpirikpi: A pụrụ ikwu na Chineke na-anọkwasị n’ocheeze dị ka Eze, ma n’echiche ọzọ ọ pụrụ ịnọkwasị n’ocheeze ya ikpe ikpe. Na 33 O.A., Jisọs nọdụrụ ala n’aka nri Chineke, ọ bụkwa Eze nke Alaeze ahụ ugbu a. Ma Jisọs, nke na-achị ugbu a dị ka Eze, ọ̀ na-ejekwa ozi dị ka Onye Ikpe? N’ihi gịnịkwa ka nke a kwesịrị iji gbasa anyị, karịsịa n’oge a?

      18. Olee ihe àmà e nwere na Jisọs ga-abụkwa Onye Ikpe?

      18 Jehova, onye nwere ikike ịhọpụta ndị ikpe, họọrọ Jisọs dị ka Onye Ikpe nke ruru ụkpụrụ ndị Ọ chọrọ. Jisọs gosipụtara nke a mgbe ọ na-ekwu banyere ndị mmadụ ịghọ ndị dị ndụ n’ụzọ ime mmụọ: “Nna m adịghị ekpekwa mmadụ ọ bụla ikpe, kama O werewo ikpe nile nye Ọkpara Ya.” (Jọn 5:22) Ma, ọrụ ikpe ikpe nke Jisọs karịrị ụdị ikpe ikpe ahụ, n’ihi na ọ bụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. (Ọrụ 10:42; 2 Timoti 4:1) Pọl kwuru n’otu oge, sị: “[Chineke edebewo] otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu Nwoke [Jisọs] Ọ kara aka; O nyekwara mmadụ nile ihe ha ga-eji kwere nke a, ebe O mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Ọrụ 17:31; Abụ Ọma 72:2-7.

      19. N’ihi gịnị ka o ji zie ezi ikwu banyere Jisọs dị ka onye na-anọdụ ala dị ka Onye Ikpe?

      19 Ànyị si otú a zie ezi ikwubi na Jisọs na-anọdụ ala n’ocheeze ebube kpọmkwem n’ọkwá nke Onye Ikpe? Ee. Jisọs gwara ndị ozi ahụ, sị: “Ná nkegharị ahụ, mgbe Nwa nke mmadụ nọkwasịrị n’ocheeze ya dị ebube, unu ndị sowooro m, unu onwe unu kwa ga-anọkwasị n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Matiu 19:28, NW) Ọ bụ ezie na Jisọs bụ ugbu a Eze nke Alaeze ahụ, ọrụ ya ọzọ e hotara na Matiu 19:28 ga-agụnye ịnọkwasị n’ocheeze iji kpee ikpe na Narị Afọ Iri ahụ. N’oge ahụ ọ ga-ekpe ihe nile a kpọrọ mmadụ ikpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Ọrụ 24:15) Ọ na-enye aka iburu nke a n’uche ka anyị na-eche ihu n’otu n’ime ilu Jisọs nke metụtara oge anyị na ndụ anyị.

      Gịnị Ka Ilu ahụ Na-ekwu?

      20, 21. Gịnị ka ndị ozi Jisọs jụrụ nke na-emetụta oge anyị, na-eduje n’ajụjụ dị aṅaa?

      20 Ntakịrị oge tupu Jisọs anwụọ, ndị ozi ya jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Jisọs buru amụma banyere oké ihe omume ndị ga-ewere ọnọdụ n’ụwa tupu ‘ọgwụgwụ ahụ eruo.’ Ntakịrị oge tupu ọgwụgwụ ahụ eruo, mba nile “ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.”—Matiu 24:14, 29, 30.

      21 Otú ọ dị, olee otú ihe ga-adịrị ndị nọ ná mba ndị ahụ mgbe Nwa nke mmadụ bịara n’ebube ya? Ka anyị chọpụta site n’ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ, nke ji okwu ndị a malite: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ.”—Matiu 25:31, 32.

      22, 23. Isi ihe ndị dị aṅaa na-egosi na ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ amaliteghị mmezu ya na 1914?

      22 Ilu nke a ò mezuru mgbe Jisọs nọdụrụ ala n’ike eze na 1914, dị ka anyị nọworo na-aghọta eri ogologo oge? Ọ dị mma, Matiu 25:34 na-ekwu banyere ya dị ka Eze, ya mere n’ụzọ ezi ìzù dị na ya ilu ahụ na-enwe mmezu ya kemgbe Jisọs ghọrọ Eze na 1914. Ma ikpe ikpe dị aṅaa ka o kpere ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị? Ọ bụghị ikpe “mba nile” ikpe. Kama nke ahụ, o chere ihu ya n’ebe ndị ahụ na-azọrọ na ha bụ ‘ụlọ Chineke’ dị. (1 Pita 4:17) N’ikwekọ na Malakaị 3:1-3, Jisọs, dị ka onye ozi nke Jehova, nyochara ndị Kraịst e tere mmanụ fọdụrụ n’elu ala n’ụzọ ikpe ikpe. Ọ bụkwa oge ịma Krisendọm ikpe, bụ́ ndị zọọrọ n’ụzọ ụgha ịbụ ‘ụlọ Chineke.’c (Mkpughe 17:1, 2; 18:4-8) Ma ọ dịghị ihe na-egosi na n’oge ahụ, ma ọ bụkwanụ, eri oge ahụ, na Jisọs nọdụrụ ala ikpe ndị nke mba nile ikpe n’ikpeazụ dị ka atụrụ ma ọ bụ ụmụ ewu.

      23 Ọ bụrụ na anyị enyochaa ọrụ Jisọs n’ilu ahụ, anyị na-ahụ ya ka ọ na-ekpe mba nile ikpe n’ikpeazụ. Ilu ahụ adịghị egosi na ikpe ikpe dị otú ahụ ga-aga n’ihu ruo ogologo oge nke ọtụtụ afọ, dị ka a ga-asị na onye ọ bụla nke na-anwụ n’ime afọ iri ndị a gara aga bụ onye e kpebiri na o ruru eru inweta ọnwụ ebighị ebi ma ọ bụ ndụ ebighị ebi. O yiri ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nwụworo n’ime afọ iri ndị na-adịbeghị anya agaala n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 6:8; 20:13) Otú ọ dị, ilu ahụ na-egosi oge mgbe Jisọs ga-ekpe ndị nke “mba nile” ikpe bụ́ ndị nọ ndụ mgbe ahụ ma na-eche mmezu nke amamikpe ya ihu.

      24. Olee mgbe ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ gaemezu?

      24 N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ilu ahụ na-ezo aka n’ọdịnihu mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya. Ọ ga-anọdụ ala ikpe ndị dị ndụ n’oge ahụ ikpe. Mkpebi ikpe ya ga-adabere n’ihe ha gosipụtaworo na ha bụ n’onwe ha. N’oge ahụ, a ga-emeworị ka “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu” pụta ìhè. (Malakaị 3:18) A ga-emezu ịma ikpe ahụ na mmezu ya kpọmkwem n’ime mkpirikpi oge. Jisọs ga-enye mkpebi ikpe ndị ziri ezi dabere n’ihe ndị pụtaworo ìhè banyere ndị mmadụ n’otu n’otu.—Leekwa 2 Ndị Kọrint 5:10.

      25. Gịnị ka Matiu 25:31 na-egosi n’ikwu banyere Nwa nke mmadụ ịnọkwasị n’ocheeze ebube?

      25 Nke a pụtaziri na Jisọs ‘ịnọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya’ maka ikpe ikpe, bụ́ nke e hotara na Matiu 25:31, ga-emezu n’ọdịnihu mgbe Eze a dị ike ga-anọdụ ala ịma mba nile ikpe na imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ha. Ee, ọnọdụ ikpe ahụ metụtara Jisọs nke dị na Matiu 25:31-33, 46 bụ nke a pụrụ iji tụnyere ọnọdụ dị na Daniel isi nke 7, bụ́ ebe Eze ahụ na-achị achị, Onye Ochie ahụ, nọdụrụ ala ịrụ ọrụ ya dị ka Onye Ikpe.

      26. Nkọwa ọhụrụ dị aṅaa nke ilu ahụ na-apụta ìhè?

      26 Ịghọta ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ n’ụzọ dị otú a na-egosi na inye mkpebi ikpe banyere atụrụ na ụmụ ewu ahụ bụ n’ọdịnihu. Ọ ga-ewere ọnọdụ mgbe “mkpagbu” ahụ e hotara na Matiu 24:29, 30 tiwapụsịrị, Nwa nke mmadụ ‘bịakwa n’ebube ya.’ (Tụlee Mak 13:24-26.) Mgbe ahụ, ebe ajọ usoro ihe dum bịaworo ná njedebe ya, Jisọs ga-enwe nnọkọ ikpe ma nye mkpebi ikpe, mezuokwa ha.—Jọn 5:30; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7-10.

      27. Gịnị ka anyị kwesịrị inwe mmasị ịmara banyere ilu ikpeazụ Jisọs?

      27 Nke a na-eme ka nghọta anyị banyere oge ilu Jisọs ga-emezu dowanye anya, bụ́ nke na-egosi mgbe a ga-ekpe atụrụ na ụmụ ewu ahụ ikpe. Ma olee otú o si emetụta anyị bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ? (Matiu 24:14) Ọ̀ na-eme ka ọrụ anyị ghara ịdịchakwa mkpa, ka ọ̀ na-eweta ibu ọrụ ka ukwuu? Ka anyị lee n’isiokwu na-esonụ otú o si emetụta anyị.

  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
    • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?

      “Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.”—MATIU 25:32.

      1, 2. N’ihi gịnị ka ilu nke atụrụ na ụmụ ewu kwesịrị iji dọrọ mmasị anyị?

      JISỌS KRAỊST n’ezie bụ Onye Ozizi kasị ukwuu n’ụwa. (Jọn 7:46) Otu n’ime ụzọ izi ihe ya bụ iji ilu, ma ọ bụ ihe atụ, eme ihe. (Matiu 13:34, 35) Ndị a dị mfe ma dị ike n’inye eziokwu ime mmụọ na nke amụma ndị dị omimi.

      2 N’ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, Jisọs zoro aka n’oge ọ ga-eme ihe n’ọkwá pụrụ iche: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na . . .” (Matiu 25:31) Nke a kwesịrị ịdọrọ mmasị anyị n’ihi na ọ bụ ihe atụ nke Jisọs ji mechie azịza ya nye ajụjụ ahụ bụ́: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Ma gịnị ka nke a pụtara nye anyị?

      3. Ná mmalite okwu ya, gịnị ka Jisọs kwuru ga-eme ngwa ngwa mkpagbu ukwu ahụ malitesịrị?

      3 Jisọs buru amụma ihe omume ndị dị ịrịba ama ndị ga-abịa “ngwa ngwa” mkpagbu ukwu ahụ tiwapụsịrị, bụ́ ihe omume ndị anyị na-echere. Ọ sịrị na mgbe ahụ ka “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” ga-apụta. Nke a ga-emetụta “ebo nile nke ụwa” n’ụzọ dị ukwuu bụ́ ndị ga-ahụ “Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nke eluigwe n’ike na oké ebube.” Nwa nke mmadụ na “ndị mmụọ ozi Ya” ga-eso. (Matiu 24:21, 29-31)a Gịnị banyere ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ? Bible ndị nke oge a

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya