-
Ekwela Ka Ihe Ọ bụla Mee Ka Ị ghara Ịnọ Jehova NsoỤlọ Nche—2013 | Jenụwarị 15
-
-
Ekwela Ka Ihe Ọ bụla Mee Ka Ị ghara Ịnọ Jehova Nso
“Họrọnụ taa onye unu ga-efe.”—JỌSH. 24:15.
1-3. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị iṅomi Jọshụa n’otú o si kpebie ime ihe ziri ezi? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị icheta mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?
ỊHỌRỌ ihe ndị anyị ga-eme dị ezigbo mkpa. Anyị nwere ike iji aka anyị kpebie otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. E nwere ike iji ya tụnyere mgbe mmadụ na-aga n’ụzọ, hụ ebe ụzọ gbara abụọ. Olee nke ọ ga-eso? Ọ bụrụ na e nwere ebe o bu n’obi ịga, ọ ga-esoro nke ga-eduga ya ebe ọ na-aga kama itinye isi na nke ga-edufu ya edufu.
2 Baịbụl kwuru banyere ọtụtụ ndị ji aka ha kpebie ihe ha chọrọ ime. Dị ka ihe atụ, o nwere mgbe Ken kwesịrị ikpebi ihe ọ ga-eme mgbe iwe na-ewe ya. (Jen. 4:6, 7) O nwekwara mgbe Jọshụa kwesịrị ikpebi ma ọ̀ ga-efe Chineke ka ọ̀ ga-efe chi ụgha. (Jọsh. 24:15) Jọshụa chọrọ ịnọ Jehova nso; ọ bụ ya mere o ji kpebie ime ihe ga-enyere ya aka ime otú ahụ. Ma Ken achọghị ime otú ahụ. N’ihi ya, o kpebiri ime ihe ga-eme ka ọ ghara ịnọ Jehova nso.
3 Mgbe ụfọdụ, ọ ga-adị mkpa ka anyị kpebie ihe ga-eme ka anyị nọsie ike n’ụzọ ziri ezi. Ụdị ihe ahụ mee, cheta ihe i bu n’obi ime, ya bụ, ime ihe ga-ewetara Jehova otuto n’ihe niile ị na-eme ma zere ihe ọ bụla ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso. (Gụọ Ndị Hibru 3:12.) N’isiokwu a nakwa na nke na-eso ya, anyị ga-atụle ihe asaa anyị na-ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.
ỌRỤ EGO
4. Gịnị mere ịrụ ọrụ ji dị mkpa?
4 Ndị Kraịst kwesịrị ịna-arụ ọrụ iji na-egboro ha na ezinụlọ ha mkpa ha. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụrụ na mmadụ achọghị ịna-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, ọ jọkarịrị onye na-ekweghị ekwe ná njọ. (2 Tesa. 3:10; 1 Tim. 5:8) O doro anya na ịrụ ọrụ ego dị ezigbo mkpa. Ma ọ bụrụ na ị kpachapụghị anya, ọrụ gị nwere ike ime ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Olee otú o nwere ike isi mee ya?
5. Gịnị na gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche tupu anyị ekweta ịrụ ọrụ a chọrọ inye anyị?
5 Ka e were ya na ị na-achọ ọrụ. Ọ bụrụ na i bi n’ebe ọrụ dị ụkọ, i nwere ike ịchọ ikweta ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọrụ ahụ megidere ihe Baịbụl kwuru? Ọ́ bụrụkwanụ na ọrụ ahụ ga-eme ka ị ghara ịna-enwe efe ma ọ bụ mee ka ị na-aga ebe dị iche iche, nke ga-eme ka ị ghara ịna-agachi ọmụmụ ihe anya ma ọ bụ ka gị na ndị ezinụlọ gị ghara ịna-anọ? Ì kwesịrị ikweta ịrụ ọrụ ahụ, kwuo n’obi gị na ịrụ ya dị mma karịa ịnọ nkịtị? Cheta na ihe i kpebiri ime nwere ike inyere gị aka ịnọ Jehova nso ma ọ bụ mee ka ị ghara ịnọ ya nso. (Hib. 2:1) Ma ị̀ na-achọ ọrụ ma ị̀ na-eche ihe ị ga-eme banyere ọrụ ị na-arụ, olee otú ị ga-esi kpebie ime ihe ziri ezi?
6, 7. (a) Olee ihe abụọ nwere ike ime ka mmadụ kweta ịrụ ọrụ e nyere ya? (b) Olee nke ga-eme ka ị nọrọ Jehova nso, n’ihi gịnị?
6 Dị ka anyị kwuru ná mmalite, cheta ihe i bu n’obi ime. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m chọrọ ka ọrụ a meere m?’ Ọ bụrụ na ị ghọta na ọrụ gị kwesịrị inyere gị aka ịna-egboro gị na ezinụlọ gị mkpa unu ka unu na-ejere Jehova ozi, Jehova ga-agọzi mbọ ị na-agba. (Mat. 6:33) A chụọ gị n’ọrụ ma ọ bụ ihe siere gị ike, Jehova ma otú ọ ga-esi nyere gị aka. (Aịza. 59:1) Ọ “maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.”—2 Pita 2:9.
7 Ọ́ bụrụkwanụ na ihe mere i ji chọọ ịrụ ọrụ bụ ka ị ghọọ aka ji akụ̀? I nwere ike ịkpata ezigbo ego. Ma, i megodị otú ahụ, cheta na ọ bụrụ ihe ahụ ka i bu n’obi na-arụ ọrụ, o nwere ike ịkpatara gị ezigbo nsogbu. (Gụọ 1 Timoti 6:9, 10.) Ọ bụrụ na ego na ọrụ abụrụ ihe kacha gị mkpa, ọ ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso.
8, 9. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ichebara echiche banyere otú ha si ele ọrụ ha anya? Kọwaa.
8 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, cheta na ụmụ gị ga-amụta otú i si ekpebi ihe ị ga-eme. Gịnị ka ha chere bụ́ ihe kacha gị mkpa? Ọ̀ bụ ọrụ gị, ka ọ̀ bụ adịm ná mma gị na Jehova? Ọ bụrụ na ha achọpụta na ihe kacha gị mkpa bụ ịbụ onye a ma ama na ịbụ aka ji akụ̀, hà nwere ike ịmụta àgwà ọjọọ ahụ n’aka gị? Ò nwere ike ime ka ha ghara ịna-akwanyere gị ùgwù? Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst kwuru, sị: “Kemgbe m maara ihe, ihe kacha papa m mkpa bụ ọrụ ya. Na mbụ, o yiri ka ihe mere o ji arụsi ọrụ ike ọ̀ bụ na ọ chọrọ ka ezinụlọ anyị nweta ihe kacha mma. Ọ chọrọ ịna-elekọta anyị nke ọma. Ma ihe agbanweela kemgbe afọ ole na ole. Ọ na-arụ ọrụ mgbe niile, ma ihe ọ na-azụtara anyị bụ ihe ndị dị oké ọnụ, ndị na-adịghị anyị mkpa. N’ihi ya, ihe e ji mara ezinụlọ anyị bụ na anyị nwere ego, ọ bụghị na anyị na-agba ndị ọzọ ume ijere Jehova ozi. Obi ga-adị m mma ma a sị na papa m na-agbalịsi ike ka ezinụlọ anyị nọrọ Jehova nso kama ịna-achụ ego ọnwụ ọnwụ.”
9 Ndị nne na nna, unu ewerela ọrụ ego ka ihe kacha mkpa, nke ga-eme ka unu ghara ịnọ Jehova nso. Ka omume unu mee ka ụmụ unu ghọta na unu kwetara na akụ̀ kachanụ mmadụ nwere ike ịkpata bụ adịm ná mma ya na Jehova, ọ bụghị ego ma ọ bụ ihe a na-ahụ anya.—Mat. 5:3.
10. Gịnị ka onye na-eto eto kwesịrị ichebara echiche mgbe ọ na-ekpebi ụdị ọrụ ọ ga-arụ?
10 Ọ bụrụ na ị ka na-eto eto ma na-eche ụdị ọrụ ị ga na-arụ ma i too, olee otú ị ga-esi mata ihe i kwesịrị ime? Dị ka anyị kwurula, i kwesịrị ịmata ihe ị chọrọ iji ndụ gị mee. Ọ bụrụ na e nwere ihe ị na-amụ ma ọ bụ ọrụ ị chọrọ ịrụ, ọrụ ahụ ọ̀ ga-enyere gị aka ime ka ozi Jehova bụrụ ihe kacha gị mkpa, ka ọ̀ ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso? (2 Tim. 4:10) Ị̀ chọrọ iṅomi ndị ụwa, bụ́ ndị na-enwe obi ụtọ naanị mgbe ha nwere ego ma ọ bụ akụ̀ buru ibu? Ka ị̀ ga-ekpebi ịtụkwasị Jehova obi otú ahụ Devid mere? O dere, sị: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Ọma 37:25) Cheta na e nwere ụzọ ga-eme ka ị ghara ịnọ Jehova nso, nweekwa ụzọ ga-eme ka i nweta ndụ kacha mma. (Gụọ Ilu 10:22; Malakaị 3:10.) Olee nke ị ga-ahọrọ?a
NTỤRỤNDỤ NA EGWUREGWU
11. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ntụrụndụ na egwuregwu? Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi?
11 Baịbụl ekwughị na mmadụ ekwesịghị inwe obi ụtọ. O kwughịkwa na ntụrụndụ bụ igbu oge. Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru.” (1 Tim. 4:8) Baịbụl kwudịrị na e nwere “oge ịchị ọchị” na “oge ịwụli elu,” kwuokwa na mmadụ kwesịrị ịna-ezu ike nke ọma. (Ekli. 3:4; 4:6) Ma, ọ bụrụ na ị kpacharaghị anya, ntụrụndụ na egwuregwu nwere ike ime ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Olee otú ụdị ihe ahụ nwere ike isi mee? E nwere ihe abụọ nwere ike ime ka ọ kpatara gị nsogbu. Nke mbụ bụ ụdị ihe i kpebiri iji na-atụrụ ndụ. Nke abụọ abụrụ awa ole ị na-eji eme ya.
Ntụrụndụ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ nke dị mma ma ghara ịna-erikpọ oge anyị
12. Olee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche banyere ụdị ihe ndị i ji atụrụ ndụ?
12 Ka anyị buru ụzọ leba anya n’ụdị ihe anyị kwesịrị iji na-atụrụ ndụ. Ka obi sie gị ike na ntụrụndụ na egwuregwu ndị dị mma juru eju. Ma, ọtụtụ ihe ndị mmadụ ji atụrụ ndụ n’ụwa taa na-akwado ihe Chineke kpọrọ asị, dị ka ime ihe ike, mgbaasị, na mmekọahụ rụrụ arụ. N’ihi ya, i kwesịrị iche echiche nke ọma banyere ihe ị na-eji atụrụ ndụ. Olee uru ọ na-abara gị? Ọ̀ na-eme ka ị na-achọ ime ihe ike, ịsọ mpi, ma ọ bụ ịhụ mba unu n’anya? (Ilu 3:31) Ọ̀ na-erikpọ ego gị? Ò nwere ike ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ? (Rom 14:21) Olee ụdị ndị ọ na-eme ka gị na ha na-akpa? (Ilu 13:20) Ọ̀ na-eme ka ime ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ?—Jems 1:14, 15.
13, 14. Gịnị ka i kwesịrị ichebara echiche n’ihe gbasara awa ole i ji atụrụ ndụ?
13 Ihe ọzọ ị ga-echebara echiche bụ awa ole ị na-eji atụrụ ndụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m eji ọtụtụ awa atụrụ ndụ ma ghara inwecha efe ime ihe gbasara ofufe Chineke?’ Ọ bụrụ na ị na-eji oge karịrị akarị atụrụ ndụ, ị ga-achọpụta na oge ahụ i ji atụrụ ndụ agaghị na-atọ gị ụtọ otú o kwesịrị. N’eziokwu, ndị na-anaghị ekwe ka ntụrụndụ na-erikpọ oge ha na-achọpụta na ntụrụndụ na-atọkwu ha ụtọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ma na ha eburula ụzọ mee “ihe ndị ka mkpa.” N’ihi ya, obi anaghị ama ha ikpe mgbe ha na-atụrụ ndụ.—Gụọ Ndị Filipaị 1:10, 11.
14 Ọ bụ eziokwu na iji ọtụtụ awa atụrụ ndụ nwere ike iyi ihe na-atọ ụtọ, o nwere ike ime ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri abụọ aha ya bụ Kim si n’ihe mere ya mata na ihe a e kwuru bụ eziokwu. O kwuru, sị: “N’oge mbụ, m na-aga oriri na nkwari mgbe niile. A ga-enwerịrị nke m ga-aga ná ngwụcha izu ọ bụla, ma na Fraịdee ma na Satọdee ma na Sọnde. Ma achọpụtala m ugbu a na e nwere ọtụtụ ihe ka mkpa m kwesịrị ịna-eme. Dị ka ihe atụ, ugbu a m bụ ọsụ ụzọ, m na-eteta ụra n’elekere isii nke ụtụtụ ka m nwee ike ije ozi ọma. N’ihi ya, o nweghị otú m ga-esi gaa oriri ma nọrọ ebe ahụ ruo elekere mbụ ma ọ bụ abụọ nke ụtụtụ. Ama m na ọ bụghị oriri na nkwari niile dị njọ, ma o nwere ike ime ka mmadụ chefuo ihe o kwesịrị ime. Dịkwa ka ihe ndị ọzọ, anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị ghara ịna-enwe efe.”
15. Olee otú ndị nne na nna ga-esi nyere ụmụ ha aka ịhọrọ ntụrụndụ ga-eme ha obi ụtọ?
15 Ndị nne na nna kwesịrị ịna-egboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha. Ha kwesịkwara ịna-enyere ha aka ka ha na Jehova dị ná mma, meekwa ka obi na-adị ha ụtọ ma na-eru ha ala. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, abụla ihu atọ ọchị. Echekwala na ụdị ntụrụndụ niile dị njọ. Ma, i kwesịrị ịkpachara anya ma zere ndị nke na-adịghị mma. (1 Kọr. 5:6) I chee echiche nke ọma, i nwere ike inweta ụdị ntụrụndụ gị na ndị ezinụlọ gị ga-eji na-eme onwe unu obi ụtọ.b I mee otú ahụ, gị na ụmụ gị ga-ahọrọ ụzọ nke ga-eme ka unu na Jehova dịkwuo ná mma.
EZINỤLỌ
16, 17. Olee nsogbu na-agbawa ọtụtụ ndị nne na nna obi, oleekwa otú anyị si mara na Jehova ma otú obi dị ha?
16 Ndị nne na nna na-ahụ ụmụ ha n’anya. Otú ahụkwa ka ụmụ na-ahụ ndị mụrụ ha n’anya. Ọ bụ ya mere Jehova ji kwuo na ya hụrụ ndị ya n’anya otú ahụ nne si ahụ nwa ya n’anya. (Aịza. 49:15) N’ihi ya, ọ na-ewute anyị nke ukwuu ma onye si n’ezinụlọ anyị kwụsị ife Jehova. Otu nwanna nwaanyị a chụrụ nwa ya nwaanyị n’ọgbakọ kwuru, sị: “Obi gbawara m. M nọ na-eche, sị, ‘Gịnị mere o ji hapụ Jehova?’ Obi nọ na-ama m ikpe, mụ ana-ata onwe m ụta.”
17 Ụdị ihe ahụ mee gị, ghọta na Jehova ma otú obi dị gị. O ‘wutere ya’ mgbe onye mbụ o kere n’ụwa nupụụrụ ya isi. O wutekwara ya mgbe ọtụtụ ndị biri tupu Iju Mmiri nupụkwara isi. (Jen. 6:5, 6) Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emetụbeghị mmadụ, o nwere ike isiri ya ike ịghọta otú o si afụ ụfụ n’obi. Ma ọ gaghị adị mma ka anyị kwe ka ihe ọjọọ onye ezinụlọ anyị a chụrụ n’ọgbakọ mere mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso. Ọ bụrụ na obi agbawaa anyị n’ihi na onye ezinụlọ anyị hapụrụ Jehova, olee otú anyị ga-esi die ya?
18. Gịnị mere na ndị nne na nna ekwesịghị ịta onwe ha ụta ma ọ bụrụ na nwa ha ahapụ Jehova?
18 Atala onwe gị ụta maka ihe merenụ. Jehova hapụrụ ndị mmadụ ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Onye ezinụlọ anyị ọ bụla nke raara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim, “ga-ebu ibu nke ya,” ya bụ, ikpebi ma ọ̀ ga-efe Jehova. (Gal. 6:5) Mee elu mee ala, ọ bụ onye ahụ mere ihe ọjọọ ka Jehova ga-ajụ ajụjụ maka ihe o kpebiri ime, ọ bụghị gị. (Ezik. 18:20) Atakwala ndị ọzọ ụta. Kwanyere ndokwa Jehova mere maka ịdọ ndị ya aka ná ntị ùgwù. Guzogide Ekwensu, ọ bụghị ndị okenye, bụ́ ndị na-agbalị ichebe ọgbakọ.—1 Pita 5:8, 9.
Ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị nwee olileanya na onye anyị hụrụ n’anya ga-emecha laghachikwute Jehova
19, 20. (a) Gịnị ka ndị nne na nna a chụrụ ụmụ ha n’ọgbakọ ga-eme ka ha nwee ike idi mwute ha na-enwe? (b) Olee olileanya ndị nne na nna dị otú ahụ kwesịrị inwe?
19 Ma, ọ bụrụ na i kpebie iwesa Jehova iwe, ọ ga-eme ka ị ghara ịnọ ya nso. N’eziokwu, ihe dị mkpa bụ ka onye ahụ ị hụrụ n’anya mata na i kpebisiri ike ịhụ Jehova n’anya karịa onye ọ bụla ọzọ, ma ndị ezinụlọ unu. N’ihi ya, otú ị ga-esi die nsogbu ahụ bụ ịgbalịsi ike ka gị na Jehova na-adị ná mma. Ahapụla ụmụnna gị ma kpawa iche. (Ilu 18:1) Kpee ekpere gwa Jehova otú ọ dị gị n’obi. (Ọma 62:7, 8) Achọla ihe ị ga-akụdo aka na-ezigara onye ezinụlọ unu a chụrụ n’ọgbakọ ozi n’ekwentị ma ọ bụ ozi iimel. (1 Kọr. 5:11) Na-ejesi ozi Jehova ike. (1 Kọr. 15:58) Nwanna nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite kwuru, sị, “Ama m na m kwesịrị ịna-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova ma mee ka okwukwe m sie ike ka m nwee ike inyere nwa m nwaanyị aka mgbe ọ ga-alaghachikwute Jehova.”
20 Baịbụl kwuru na ịhụnanya “na-enwe olileanya ihe niile.” (1 Kọr. 13:4, 7) Ọ dịghị njọ inwe olileanya na onye ahụ ga-alaghachikwute Jehova. Kwa afọ, ọtụtụ ndị mere ihe ọjọọ na-echegharị, a na-abata ha n’ọgbakọ. Ha chegharịa, Jehova anaghị eburu ha iwe n’obi. Kama, ọ ‘dị njikere ịgbaghara mmehie.’—Ọma 86:5.
KPEBIE IME IHE ZIRI EZI
21, 22. Gịnị ka i kpebiri ịna-eme?
21 Jehova kere ndị mmadụ ma hapụ ha ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. (Gụọ Diuterọnọmi 30:19, 20.) Ma ọ pụtara na anyị kwesịrị ịna-ekpebi ime ihe ziri ezi. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-ekpebi ime ihe ziri ezi? Ọrụ ego, ntụrụndụ na egwuregwu, ma ọ bụ ezinụlọ ò meela ka m ghara ịnọ Jehova nso?’
22 O nweghị mgbe Jehova ga-akwụsị ịhụ ndị ya n’anya. Naanị ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịnọ Jehova nso bụ ma ọ bụrụ na anyị ekpebie ịna-eme ihe ọjọọ. (Rom 8:38, 39) Ma, anyị ekwesịghị ime otú ahụ! Kpebisie ike na ị gaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịnọ Jehova nso. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe anọ ndị ọzọ anyị na-ekwesịghị ikwe ka ha mee ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.
a Ị chọọ ịgụkwu banyere ikpebi ọrụ ị ga-arụ, gụọ isi nke 38 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2.
b Ị chọọ ịhụ aro ndị a tụrụ banyere ịhọrọ ntụrụndụ dị mma, gụọ Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2011, peeji nke 8-12.
-
-
Na-abịaru Jehova NsoỤlọ Nche—2013 | Jenụwarị 15
-
-
Na-abịaru Jehova Nso
“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—JEMS 4:8.
1, 2. (a) Olee otú Setan si agbalị ịghọgbu ndị mmadụ? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịbịaru Chineke nso?
JEHOVA CHINEKE kere ụmụ mmadụ ka ha na-achọ ịbịaru ya nso. Ma, Setan chọrọ ka anyị na-eme ka ya, ya bụ, ka anyị chee na e nweghị uru Jehova ga-abara anyị. Ọ bụ ihe Setan na-agbalị ime ka ụmụ mmadụ kweta kemgbe ọ ghọgburu Iv n’ogige Iden. (Jen. 3:4-6) Kemgbe ahụ, ọtụtụ ndị na-eche na ịbịaru Chineke nso abaghị uru.
2 Ma, ọnyà Setan ekwesịghị ịmata anyị n’ihi na “anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya.” (2 Kọr. 2:11) Setan na-anwa anyị ka anyị kpebie ime ihe ga-eme ka anyị ghara ịnọ Jehova nso. Ma, ihe anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ gosiri na anyị nwere ike ikpebi ihe ziri ezi banyere ndị ezinụlọ anyị, ọrụ anyị, na ihe anyị ji atụrụ ndụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ ọzọ Setan na-ejikarị anwa anyị, ya bụ, nkà na ụzụ, ahụ́ ike, ego na nganga. Ọ bụrụ na anyị ekpebie ihe banyere ha nke ọma, anyị ga-enwe ike ‘ịbịaru Chineke nso.’—Jems 4:8.
NKÀ NA ỤZỤ
3. Nye ihe atụ gosiri na nkà na ụzụ nwere uru na ọghọm.
3 Ọtụtụ ndị na-ejizi kọmputa na ihe ndị yiri ya eme ihe dị iche iche. Ọ bụrụ na anyị ejiri ha na-eme ihe ziri ezi, ha nwere ike ịbara anyị uru. Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri ha na-eme ihe na-adịghị mma, ha nwere ike ime ka anyị na Nna anyị nke eluigwe ghara ịdị ná mma. Chegodị uru kọmputa bara. Ọ bụ ya ka e ji dee ma bie Ụlọ Nche a ị na-agụ. Kọmputa nwekwara ike inyere anyị aka ime nchọnchọ na izirịta ozi. E nwekwara ike iji ya tụrụ ndụ. Ma, kọmputa na ihe ndị yiri ya nwere ike ịna-agba mmadụ ara. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-agbalị ime ka ndị mmadụ kweta na ha ga-enwerịrị ihe ndị pụtara ọhụrụ. E nwere ụdị kọmputa otu nwa okorobịa chọsiri ike ịzụ. N’ihi ya, o zooro ezoro gaa ree otu akụrụ ya ka o nweta ego ọ ga-eji zụta kọmputa ahụ. Ihe ahụ o mere ọ́ bụghị iberiibe?
4. Olee otú otu nwanna nke ịpị kọmputa na-agba ara si mechaa kwụsị ya?
4 Ihe kadị njọ bụ mmadụ ikwe ka kọmputa na ihe ndị yiri ya mee ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe efe. Anyị nwekwara ike iji ha na-eme ihe na-adịghị mma. Otu nwanna nwoke nke dị ihe dị ka iri afọ abụọ na asatọ aha ya bụ Jon kwuru, sị: “Ama m na Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ‘ịna-azụtara onwe anyị oge kwesịrị ekwesị’ anyị ga-eji na-eme ihe gbasara ofufe Chineke.a Ma, kọmputa anaghị ekwe m zuru ike.” Jon na-anọkarị na kọmputa ruo ime abalị. O kwuru, sị: “Ka ike na-agwụ m ka ọ na-esikwuru m ike ịkwụsị ụka mụ na ndị mmadụ na-akparịta n’Ịntanet ma ọ bụ vidio ndị m na-ele na ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-adịghị mma.” Iji nyere onwe ya aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ahụ, Jon mere ka kọmputa ya jiri aka ya na-anyụ mgbe oge ọ ga-alakpu ruru.—Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.
Ndị nne na nna, nyerenụ ụmụ unu aka iji ihe ndị dị ka kọmputa na-eme ihe bara uru
5, 6. (a) Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ịna-emere ụmụ ha? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi mee ka ụmụ ha nwee ezi ndị enyi?
5 Ndị nne na nna, ọ pụtaghị na unu ga-eji onyokomita na-enyo ihe ọ bụla ụmụ unu na-eme, ma unu kwesịrị ịma ihe ha ji kọmputa eme. Unu ahapụla ha ka ha na-aga n’ebe a na-egosi omume rụrụ arụ n’Ịntanet ma ọ bụ na-egwu egwuregwu vidio ebe a na-eme ihe ike ma ọ bụ mgbaasị, ma ọ bụ ka ha na ndị ọjọọ na-akpa n’Ịntanet. Ọ bụrụ na unu ahapụ ha ka ha na-eme otú masịrị ha ka ha ghara inye unu nsogbu, ha nwere ike iche, sị, ‘Ebe ọ bụ na papa m na mama m hapụrụ m ka m na-eme ihe ndị a, ọ ga-abụrịrị na ha abụghị ihe ọjọọ.’ Ebe unu bụ ndị nne na nna, ọ bụ unu kwesịrị ichebe ụmụ unu, ma ndị nke ka na-eto eto. Unu ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ha ghara ịnọ Jehova nso. Unu ma na ụmụ anụmanụ na-echebe ụmụ ha ka ihe ghara ime ha. Chegodị ihe nne ọdụm ga-eme onye chọrọ imetụ ụmụ ya aka!—Tụlee Hosia 13:8.
6 Nyerenụ ụmụ unu aka ka ha nweta ezi Ndị Kraịst ha na ha ga na-akpa, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi. Chetakwa na unu na ụmụ unu kwesịrị ịna-anọrị! N’ihi ya, wepụtanụ oge ka unu na ha na-egwuri egwu, na-achị ọchị ma na-arụkọ ọrụ. Ọ ga-enyere unu na ha aka ịnọ Jehova nso.b
AHỤ́ IKE
7. Gịnị mere anyị niile ji achọ ka ahụ́ sie anyị ike?
7 Anyị na-ajụkarị ndị ọzọ “Olee otú i mere?” Mmadụ niile na-arịa ọrịa kemgbe Adam na Iv gere Setan ntị ma kewapụ onwe ha n’ebe Jehova nọ. Obi na-adị Setan ụtọ mgbe anyị na-arịa ọrịa n’ihi na ọ ma na ọrịa na-eme ka o sikwuoro anyị ike ife Jehova. Ọ bụrụkwa na anyị anwụọ, anyị agaghị efeli Chineke. (Ọma 115:17) Ọ bụ ya mere anyị ji agbalịsi ike ka ahụ́ sie anyị ike.c Anyị kwesịkwara ịna-eche otú ahụ́ ga-esi sie ụmụnna anyị ike, ihe adịkwara ha mma.
8, 9. (a) Olee otú anyị nwere ike isi zere ịna-eche naanị banyere ahụ́ ike mgbe niile? (b) Olee uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ana-enwe ọṅụ?
8 Ma anyị ekwesịghị ikwe ka ọ bụrụ naanị ihe gbasara ahụ́ ike ka anyị na-eche mgbe niile. Ihe ụfọdụ ndị na-eji oge ha niile eme bụ ịkọrọ ndị ọzọ ụdị nri ha kwesịrị ịna-eri, ma ọ bụ ụdị ọgwụ ha kwesịrị ịna-aṅụ na ihe ndị ha nwere ike iji na-achọ mma. Ịnụ ọkụ n’obi ha na-eji akọ ya na-akarịdị nke ha ji ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha nwere ike iche na ha na-enyere ndị ọzọ aka. Ma anyị ekwesịghị ịna-akọ banyere ọgwụ, ihe e ji achọ mma ma ọ bụ ihe anyị chere ga-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma tupu a malite ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ mgbe a gbasara, ma ọ bụkwanụ ná mgbakọ. N’ihi gịnị?
9 Ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe na mgbakọ bụ ka anyị mụọ Baịbụl, nwetakwa ọṅụ, nke so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Gal. 5:22) Ọ bụrụ na anyị ejiri oge ahụ na-ekwu banyere ihe e ji agwọ ọrịa, ma è nwere onye jụrụ anyị ajụjụ banyere ya ma ọ bụ na e nweghị, o nwere ike ime ka anyị chefuo ihe mere anyị ji abịa ọmụmụ ihe na mgbakọ, meekwa ka ndị ọzọ ghara inwe ọṅụ. (Rom 14:17) Ọ bụ mmadụ kwesịrị iji aka ya kpebie otú a ga-esi gwọọ ya ọrịa. Anyị kwesịkwara icheta na e nweghị mmadụ ga-agwọtali ọrịa niile. Ndị dọkịta bụ́ ndị ọkachamara na-akakwa nká, na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Ọ bụghị ichekasị onwe anyị banyere ahụ́ ike ga-eme ka anyị bie ogologo ndụ. (Luk 12:25) Kama, Baịbụl kwuru na “obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.”—Ilu 17:22.
10. (a) Olee àgwà ndị na-eme ka mmadụ maa ezigbo mma n’anya Jehova? (b) Olee mgbe anyị na-agaghịzi arịa ọrịa?
10 Ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ ka anyị dị mma n’anya. Ma anyị ekwesịghị ịna-esi ọnwụ ka a ghara ịhụ ihe ọ bụla ga-egosi na anyị akawala. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka anyị nwee ùgwù, mee ka a mata na anyị etoola nakwa na anyị ma ihe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Isi awọ́ bụ okpueze mara mma mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.” (Ilu 16:31) Ọ bụ otú Jehova si ele anyị anya. Anyị kwesịkwara ịna-ele onwe anyị anya otú ahụ. (Gụọ 1 Pita 3:3, 4.) N’ihi ya, ànyị kwesịrị ikwe ka a waa anyị ahụ́ ma ọ bụ nye anyị ọgwụ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu naanị n’ihi ịchọ mma? Ọ bụ “ọṅụ Jehova” ga-eme ka anyị maa mma na-abụghị nke elu ahụ́, n’agbanyeghị afọ ole anyị dị ma ọ bụ otú ahụ́ anyị dị. (Nehe. 8:10) Ọ bụ naanị n’ụwa ọhụrụ ka anyị na-agaghị arịa ọrịa, anyị amaakwa mma okorobịa na agbọghọbịa. (Job 33:25; Aịza. 33:24) Ugbu a ọ na-abịabeghị, ezigbo amamihe na okwukwe ga-enyere anyị aka ịnọ Jehova nso ma na-eme otú ike kwere anyị.—1 Tim. 4:8.
EGO
11. Olee otú ego nwere ike isi ghọọrọ mmadụ ọnyà?
11 Ego abụghị ihe ọjọọ. Ọ bụghịkwa ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị na-arụ ezigbo ọrụ iji na-akpata ego. (Ekli. 7:12; Luk 19:12, 13) Ma, “ịhụ ego n’anya” ga-eme ka anyị ghara ịnọ Jehova nso. (1 Tim. 6:9, 10) Anyị nwee “nchegbu nke usoro ihe a,” ya bụ, na-eche naanị banyere otú anyị ga-esi na-egbo mkpa anyị, o nwere ike ime ka anyị hapụ Jehova. Ọ bụkwa ihe “ike dị aghụghọ nke akụnụba” nwere ike ime anyị, ya bụ, iche na ọ bụ akụnụba ga-eme ka obi dị anyị ụtọ ma ruo anyị ala ruo mgbe ebighị ebi. (Mat. 13:22) Jizọs mere ka o doo anya na “ọ dịghị onye” ga-efeli Chineke na akụnụba.—Mat. 6:24.
12. Olee ọnyà ndị na-ama ụfọdụ ndị taa n’achụmnta ego, oleekwa otú anyị nwere ike isi zere ha?
12 Ọ bụrụ na anyị echee na ọ bụ ego kacha mkpa, o nwere ike ime ka anyị mee ihe ọjọọ. (Ilu 28:20) Akpịrị ogologo emeela ka ụfọdụ ndị tinye aka n’ịgba chaa chaa ma ọ bụ n’achụmnta ego zụọ taa baa echi. Ha na-aratakwa ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ka ha soro ha. Otú e si arata ụfọdụ ndị bụ na a na-ekwe ha nkwa na ha ga-erite uru buru ezigbo ibu ma ha tinye ego ha n’achụmnta ego. Kpachara anya. Ekwela ka anyaukwu mee ka a ghọgbuo gị. Ọ bụrụ na uru a gwara gị ị ga-erite dara gị ka ihe na-agaghị ekwe omume, o nwere ike ọ gaghị eme eme.
13. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-ele ego anya, nke dị iche n’ihe ndị ụwa chere?
13 Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ “Alaeze ahụ na ezi omume Chineke,” Jehova ga-agọzi ezigbo mbọ anyị na-agba ka anyị gboo mkpa anyị. (Mat. 6:33; Efe. 4:28) Ọ chọghị ka anyị bịa ọmụmụ ihe anyị ana-ehi ụra n’ihi na anyị arụgbuola onwe anyị n’ọrụ, ma ọ bụ ka anyị nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eche banyere ego. Ma, ọtụtụ ndị n’ụwa taa chere na ọ bụrụ na ha ejiri oge ha niile na-achụ ego, ọ ga-eme ka ha bụrụ aka ji akụ̀ ma ghara ịta ahụhụ n’ọdịnihu. Ha na-agwakwa ụmụ ha ka ha were ịchụ akụnụba ka ihe kacha mkpa. Jizọs gosiri na onye na-eche otú ahụ enweghị uche. (Gụọ Luk 12:15-21.) Ihe ahụ o kwuru na-echetara anyị Gehezaị, bụ́ onye chere na ya nwere ike inwe anyaukwu ma ka bụrụ enyi Jehova.—2 Eze 5:20-27.
14, 15. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụkwasị ego obi n’ụwa ochie a? Nye ihe atụ.
14 E nwere ugo ndị mmiri na-eri n’ihi na ha siri ọnwụ na ha ga-eburịrị azụ̀ karịrị ha. Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime Onye Kraịst? Otu okenye aha ya bụ Alex kwuru, sị: “Anaghị m eji ego m egwu egwu. Ana m akpị ihe ọ bụla m nwere akpị.” Ma, Alex gara tinye aka n’otu achụmnta ego, buru n’obi na ya nwetatụ ego, na ya ga-akwụsị achụmnta ego ahụ ma malite ịsụ ụzọ. O ji oge ya niile na-amụ ihe gbasara achụmnta ego ahụ. O tinyere ego ndị o nwere na ndị ọ gbazitere n’achụmnta ego ahụ iji rite nnukwu uru. Ma ọ ghọrọ ya ahịa. Alex kwuru, sị: “Ekpebisiri m ike na m ga-enweta isi ego m.” O chere na ya gbakwuo mbọ, na ya ga-amalite irite uru.
15 Ruo ọtụtụ ọnwa, o nweghị ihe ọzọ Alex na-eche ma ọ bụghị achụmnta ego ya. Ọ malitere isiri ya ike ime ka obi ya dịrị n’ozi Jehova. Ọ naghịzi ehi ụra abalị. Ma, isi ego ya ekweghị ya nnweta. Ego niile Alex kpatara gwụrụ, ya emechaa ree ụlọ ya. O kwuru, sị: “Ihe m mere kpataara ezinụlọ m nsogbu.” Ma, ọ mụtara ihe n’ihe mere ya. O kwuru, sị: “Amatala m ugbu a na onye tụkwasịrị ụwa Setan obi ga-akwa mmakwaara.” (Ilu 11:28) N’eziokwu, anyị tụkwasị obi n’ego anyị dewere n’ụlọ akụ̀, n’achụmnta ego anyị, ma ọ bụ n’ihe ọzọ e ji akpata ego n’ụwa ochie a, ọ pụtara na olileanya anyị dị n’ebe Setan nọ, ya bụ, “chi nke usoro ihe a.” (2 Kọr. 4:4; 1 Tim. 6:17) Alex agbanweela ndụ ya ka o nwee ike iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma. Ị jụọ ya, ọ ga-agwa gị na mgbanwe ahụ o mere emeela ka ya na ezinụlọ ya nwekwuo obi ụtọ, meekwa ka ha na Jehova dịkwuo ná mma.—Gụọ Mak 10:29, 30.
NGANGA
16. Olee otú nganga dị mma si dị iche na nganga na-adịghị mma?
16 Iji ihe dị mma akpa nganga abụghị ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị iji Ndịàmà Jehova anyị bụ na-anya isi mgbe niile. (Jere. 9:24) Ọ bụrụ na obi siri anyị ike n’ihe anyị ga-emeli, ọ ga-eme ka anyị kpebie ime ihe ziri ezi ma ghara ime ihe anyị ma na ọ dịghị mma. Ma, ọ bụrụ na ihe anyị chere ma ọ bụ ọrụ e nyere anyị ebuwe anyị isi, o nwere ike ime ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.—Ọma 138:6; Rom 12:3.
17, 18. (a) Olee ndị Baịbụl kwuru na ha dị obi umeala? Olee ndị o kwuru na ha dị mpako? (b) Gịnị ka otu nwanna mere, ka mpako ghara ikewapụ ya n’ebe Jehova nọ?
17 Baịbụl gwara anyị banyere ndị dị mpako na ndị dị obi umeala. Eze Devid dị obi umeala. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Jehova ka o duzie ya. Jehova gọzikwara ya. (Ọma 131:1-3) Ma Jehova wedara Eze Nebukadneza na Eze Belshaza ala n’ihi na ha dị mpako. (Dan. 4:30-37; 5:22-30) Taa, e nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka a mata ma ànyị dị umeala n’obi. E nwere otu ohu na-eje ozi dị afọ iri atọ na abụọ. Aha ya bụ Ryan. Ọ gafere n’ọgbakọ ọhụrụ. O kwuru, sị: “Atụrụ m anya na a ga-eme m okenye n’oge na-adịghị anya. Ma mgbe otu afọ gachara, e meghị m okenye.” Iwe ò juru Ryan obi, ya echewe na ndị okenye akwanyereghị ya ùgwù kwesịrị ya? Ọ̀ kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe, kwe ka mpako mee ka ọ ghara ịnọ Jehova na Ndị Kraịst ibe ya nso? Ọ bụrụ gị, gịnị ka ị ga-eme?
Kama ịnọ na-echegbu onwe gị banyere ihe ùgwù a na-enyeghị gị n’ọgbakọ, gbalịa ka ozi ọma na-atọ gị ụtọ!
18 Ryan kwuru, sị: ‘Emere m nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ma gụọ ihe niile m hụrụ banyere otú mmadụ kwesịrị isi chere ihe ọ na-atụ anya ya.’ (Ilu 13:12) O kwukwara, sị: “Aghọtara m na m kwesịrị ịmụta inwe ndidi na ịdị umeala n’obi. M kwesịrị ikwe ka Jehova na-azụ m.” Ryan kwụsịrị iche banyere onwe ya, chewezie otú ọ ga-esi na-ejere ndị ọzọ ozi ma n’ọgbakọ ma n’ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, o nwetara ọtụtụ ndị ọ na-amụrụ Baịbụl, ha ana-eme nke ọma. O kwuru, sị: “Mgbe e mechara mee m okenye mgbe otu afọ na ọkara gachara, atụghị m anya ya. Ọ naghịzi echu m ụra mgbe ahụ n’ihi na ozi ọma m na-eje na-atọ m ezigbo ụtọ.”—Gụọ Abụ Ọma 37:3, 4.
NỌRỌ JEHOVA NSO!
19, 20. (a) Olee otú anyị ga-esi mee ka ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị ghara ikewapụ anyị n’ebe Jehova nọ? (b) Olee ndị anyị kwesịrị iṅomi n’ihi na ha nọrọ Jehova nso?
19 Ihe asaa ndị ahụ anyị tụlere n’isiokwu a nakwa na nke bu ya ụzọ bụcha ezigbo ihe. Anyị kwesịrị ịna-akpa nganga na anyị na-ejere Jehova ozi. Inwe obi ụtọ n’ezinụlọ nakwa inwe ahụ́ ike socha n’ezigbo onyinye Jehova nyere anyị. Anyị ghọtara na ọrụ anyị na-arụ na ego anyị na-akpata nwere ike inyere anyị aka ịna-egbo mkpa anyị. Anyị ma na ntụrụndụ nwere ike ime ka anyị nwee obi ụtọ, nkà na ụzụ nwekwara ike ịbara anyị uru. Ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị ahụ mgbe na-ekwesịghị ekwesị, na-emefe ya ókè, ma ọ bụ kwe ka o gbochie anyị ife Jehova, o nwere ike ime ka anyị ghara ịnọ Jehova nso.
Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịnọ Jehova nso!
20 N’eziokwu, ọ bụ ihe Setan chọrọ. Ma, i nwere ike izere ụdị ọdachi ahụ ka ọ ghara ịdakwasị gị na ezinụlọ gị! (Ilu 22:3) Bịaruo Jehova nso. Nọrọkwa ya nso. E nwere ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị anyị kwesịrị iṅomi otú ha si nọrọ Jehova nso. Inọk na Noa ‘so ezi Chineke na-eje ije.’ (Jen. 5:22; 6:9) Mozis “guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” (Hib. 11:27) Chineke nyeere Jizọs aka mgbe niile n’ihi na o mere ihe dị Nna ya nke eluigwe mma mgbe niile. (Jọn 8:29) Na-eme otú ahụ ha mere. ‘Na-aṅụrị ọṅụ mgbe niile. Na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị. Na-ekele Chineke banyere ihe ọ bụla.’ (1 Tesa. 5:16-18) Ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara ịnọ Jehova nso!
a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b Gụọ isiokwu bụ́ “Otú A Ga-esi Zụọ Ụmụaka Ha Abaa Uru” na Teta! Ọktoba–Disemba 2011.
c Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ise Ndị Ga-eme Ka Ahụ́ Na-adịkwu Gị Mma” na Teta! Eprel–Jun 2011.
-