Abụ nke 44
Iji Ọṅụ Soro Na-ewe Ihe Ubi
Nke E Biri Ebi
1. Anyị bi n’oge iwe ih’ubi.
Ọ bụ ih’ùgwù n’enwegh’atụ.
Ndị ’mụ’ozi n’ewe ih’ubi;
Anyị so ha n’arụ ọrụ.
Kraịst gosiri ihe nler’anya,
Ọ bụ onye ndú n’ọrụ ahụ.
E nyer’anyị ih’ùgwù iji ọṅụ
Soro n’ewe ih’ubi ya.
2. Ịhụ Jaa na ndị ’madụ n’anya
N’eme k’anyị rụsi’ọrụ ike.
A g’ezi ozi ọma ngwa ngwa,
N’ihi na ọgwụgwụ dị nso.
Anyị n’enw’ọṅụ n’enwegh’atụ;
Anyị na Jaa n’arụk’ọrụ.
K’anyị nọgide n’ọrụ Al’eze ya,
Mara na ọ g’agọzi anyị.
(Gụọkwa Mat. 24:13; 1 Kọr. 3:9; 2 Tim. 4:2.)