Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 10/1 p. 8-9
  • Olee Uru Alaeze Chineke Ga-abara Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Uru Alaeze Chineke Ga-abara Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Jizọs Ji Jiri Alaeze Chineke Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Alaeze Chineke
    Teta!—2013
  • Kpebie Ịkwado Alaeze Chineke Ugbu A
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 10/1 p. 8-9
Ebe Ndịàmà Jehova na-akụziri di na nwunye gbasara Alaeze Chineke

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE URU ALAEZE CHINEKE GA-ABARA GỊ?

Olee Uru Alaeze Chineke Ga-abara Gị?

O nwere ike ịbụ na isiokwu ndị bu nke a ụzọ emeela ka ị ghọta na Ndịàmà Jehova ejighị Alaeze Chineke egwu egwu. O nwekwara ike ịbụ na obi dị gị ụtọ mgbe ị gụtara ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ n’ọdịnihu. Ma, i nwere ike ịna-eche ma ihe ọma ndị ahụ hà ga-eme eme n’eziokwu.

Ọ dị mma na ị na-echebara ihe ị gụrụ echiche tupu gị ekweta na ha niile bụ eziokwu. (Ilu 14:15) E nwere ike ikwu na ihe a i mere yiri ihe ndị Beriaa oge ochie mere. Mgbe mbụ e ziri ha ozi ọma Alaeze Chineke, ha nabatara ya. Ma, ihe mere ha ji nabata ya abụghị naanị na ha chọrọ ka ihe ndị ha nụrụ mee, kama ọ bụ n’ihi na ha nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma iji mara ‘ma ihe ndị ahụ hà bụ eziokwu.’ (Ọrụ Ndịozi 17:11) E nwere ike ikwu na ndị Beria gbalịrị ka ha mata ma ozi ọma e ziri ha ọ̀ dabara n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ha mechara chọpụta na ozi ọma ahụ si n’Okwu Chineke n’eziokwu.

Ndịàmà Jehova na-agba gị ume ka i mee ihe ahụ ndị Beria mere. Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’efu. Ọ bụrụ na i kweta ka gị na ha mụwa Baịbụl, ị ga-achọpụta ma ihe Ndịàmà Jehova kweere gbasara Alaeze Chineke ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl kwuru.

Uru ịmụ Baịbụl ga-abara gị abụghị naanị na ị ga-amụta banyere Alaeze Chineke, kama ị ga-amatakwa azịza ajụjụ ndị na-echu ndị mmadụ ụra.

  • Olee ebe anyị si bịa n’ụwa?

  • Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ?

  • Gịnị mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ?

  • Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

  • Ò nwere mgbe a ga-ebibi ụwa?

  • Olee ihe anyị ga-eme ka ezinụlọ anyị na-enwe obi ụtọ?

Nke ka nke bụ na ịmụ Baịbụl ga-eme ka ị ‘bịaruo Chineke nsọ.’ (Jems 4:8) Ọ bụrụ na gị na Chineke ana-adịkwu ná mma, ị ga-amata uru Alaeze Chineke baara gị ugbu a, matakwa na ọ ga-abara gị uru ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs gwara Nna ya n’ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

Ndịàmà Jehova nwere ike iji akwụkwọ a na-akụziri gị Baịbụl.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ha kụziwere gị Baịbụl n’anaghị gị ego, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ma ọ bụkwanụ gị edejupụta fọm dị na www.jw.org/ig. (Ị ga-ahụ ya n’Isimbido, n’ebe e dere GWA ANYỊ KA ANYỊ NA GỊ MỤWA BAỊBỤL)

a Obodo Beria dị na Masedonia oge ochie.

Ihe Mere Folake Ji Jiri Alaeze Chineke Kpọrọ Ihe

Folake

E nwere otu nwata nwaanyị dị afọ iri aha ya bụ Folake. N’oge na-adịchabeghị anya, a gwara ya n’ụlọ akwụkwọ ha ka o dee edemede isiokwu ya bụ “Ihe Kacha Amasị M n’Ụwa A.” Folake dere ihe mere ịkọrọ ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke ji amasị ya.

O dere na “Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị nke a na-anaghị ahụ anya. Ọ sọgodị gị kpuru enyo anya, ị gaghị ahụ ya.”

Folake dekwara ọtụtụ ihe ọma Alaeze ahụ ga-emere ụmụ mmadụ bụ́ ndị yanwa na-atụsi anya ha ike nakwa ụfọdụ nsogbu Alaeze ahụ ga-ewepụ. O dere, sị, “Ọ na-ewute m ma m hụ ndị na-enweghị ụlọ na-ehi n’okporo ụzọ” nakwa “ụmụaka ndị agụụ na-egbu n’ebe niile n’ụwa.” O dekwara, sị, “Ma, ọ na-abụ m gụọ ihe e dere n’Aịzaya 65:21, obi na-atọ m ụtọ.” Amaokwu ahụ kwuru ihe ọma Chineke ga-emere ndị Alaeze Chineke ga-achị. Ọ sịrị: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.”

Folake dere na ya na-atụkwa anya mgbe Chineke ga-eji Alaeze ya wepụchaa ọrịa niile. N’edemede ahụ, o dere ihe e kwuru ná Mkpughe 21:4. Ebe ahụ sịrị na Chineke ga-ehichapụ “anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.” Mgbe Folake na-apịachi edemede ya, o dekwara ọzọ na ihe kacha amasị ya n’ụwa a bụ ịkọrọ ndị mmadụ banyere Jehova na Alaeze ya. N’eziokwu, nwata nwaanyị a ji Alaeze Chineke kpọrọ ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya