Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Setan Ọ̀ Dị Adị?
    Ụlọ Nche—2014 | Nọvemba 1
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SETAN Ọ̀ DỊ ADỊ?

      Setan Ọ̀ Dị Adị?

      Ihe a kpụrụ akpụ na-egosi na Setan bụ mmụọ ozi a chụturu achụtu

      Ihe a kpụrụ akpụ dị na Madrid, Spen, nke na-egosi na Setan bụ mmụọ ozi a chụturu achụtu

      “Anọ m na El Salvadọ too. Ọ na-abụ m mee isi ike, mama m asị m: ‘Ekwensu ga-abịa jide gị.’ M na-asị ya: ‘Ya bịawanụ!’ Ama m na e nwere Chineke, ma Ekwensu adịghị.”—ROGELIO.

      Ì chere na ihe a Rogelio kwuru bụ eziokwu? Olee nke i chere bụ́ eziokwu n’ihe ndị e dere n’okpuru ebe a?

      • Setan adịghị adị. Ọ bụ ihe ọjọọ dị ndị mmadụ n’obi.

      • Setan dị adị. Ma o nwechaghị ihe gbasara ya na ndị mmadụ.

      • Setan bụ mmụọ dị ike. Ọ na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ.

      Nke ọ bụla n’ime ihe atọ a nwechara ndị kwetara na ọ bụ eziokwu. Ndị nke ọ bụla n’ime ha ruru ọtụtụ nde mmadụ. Ọ̀ baara mmadụ uru ịchọwa ịmata nke bụ́ eziokwu? Ọ bụrụ na Setan adịghị adị, ihe ọ pụtara bụ na e duhiela ndị kwetara na ọ dị adị. Ọ bụrụ na ọ dị adị, ma ya abụrụ na o nweghị ihe gbasara ya na ụmụ mmadụ, ọ pụtara na egwu ọtụtụ ndị na-atụ ya abaghị uru. Ma, ọ bụrụ na Setan bụ onye dị adị nke na-aghọgbu ndị mmadụ, ihe ọ pụtara bụ na e kwesịrị ize ya eze karịa otú ọtụtụ ndị chere.

      Ka anyị leba anya n’Akwụkwọ Nsọ iji mata azịza ajụjụ ndị a: Setan ọ̀ bụ ihe ọjọọ dị ndị mmadụ n’obi, ka ọ̀ bụ mmụọ dị adị? Ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ dị adị, ò kwesịrị ka i zewe ya eze? Ọ bụrụ na i kwesịrị ize ya eze, olee ihe ị ga-eme ka ọ ghara imemila gị?

  • Setan Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ Dị Ndị Mmadụ n’Obi?
    Ụlọ Nche—2014 | Nọvemba 1
    • Setan nọ n’eluigwe na-ele Job ka nsogbu na-abịara ya

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SETAN Ọ̀ DỊ ADỊ?

      Setan Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ Dị Ndị Mmadụ n’Obi?

      Ọtụtụ ndị na-ekwu na Setan a kpọrọ aha na Baịbụl bụ ihe ọjọọ dị ndị mmadụ n’obi. Ma ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ ihe Baịbụl kwuru? Ọ bụrụ na Setan bụ ihe ọjọọ dị mmadụ n’obi, gịnị mere Baịbụl ji kwuo na Setan na Jizọs Kraịst kwurịtara okwu, kwuokwa na Setan na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kwurịtara okwu? Ka anyị leba anya n’okwu Setan na Jizọs kwurịtara nakwa nke Setan na Chineke kwurịtara.

      MGBE SETAN NA JIZỌS KWURỊTARA OKWU

      Mgbe Jizọs bidoro ikwusa ozi ọma n’ụwa, Ekwensu nwara ya ọnwụnwa ugboro atọ. N’ọnwụnwa mbụ Setan nwara ya, Setan gbalịrị ime ka Jizọs jiri ike Chineke nyere ya mee ihe ọ na-ekwesịghị ime ka agụụ na-agụ ya kwụsị. Ọnwụnwa ọzọ Ekwensu nwara Jizọs bụ na ọ gwara ya na ọ sị na ọ bụ Ọkpara Chineke, ka o mee ihe ga-eme ka ndị mmadụ too ya n’agbanyeghị na ime ihe ahụ nwere ike ịkpatara Jizọs nsogbu. N’ọnwụnwa nke atọ, Setan gwara Jizọs na yanwa bụ́ Setan ga-enye ya alaeze niile nke ụwa ma ọ bụrụ na Jizọs adaa n’ala fee ya. Jizọs ekweghị ka Setan nwata ya, kama o ji ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ zaa Setan okwu ugboro atọ ahụ ọ nwara ya.—Matiu 4:1-11; Luk 4:1-13.

      Ọ̀ bụ onye ka ya na Jizọs kwuru okwu? Ọ̀ bụ ihe ọjọọ dị Jizọs n’obi? Akwụkwọ Nsọ kwuru na ‘a nwalere Jizọs n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.’ (Ndị Hibru 4:15) Baịbụl kwukwara, sị: “Ọ dịghị mmehie o mere, a hụghịkwa aghụghọ n’ọnụ ya.” (1 Pita 2:22) Jizọs emeghị mmehie, kama ọ nọ na-eme ihe ọma mgbe niile. O nweghị mgbe Jizọs kwere ka ihe ọjọọ bata ya n’obi. O doro anya na ọ bụ onye dị adị ka Jizọs gwara okwu, ọ bụghị ihe ọjọọ dị ya n’obi.

      Ụka ahụ Jizọs na Setan kpara gosiri anyị ihe ọzọ mere o ji bụrụ na Setan bụ onye dị adị.

      • Ì chetara na Ekwensu gwara Jizọs na ya ga-enye ya ọchịchị niile nke ụwa ma ọ bụrụ na ọ daa n’ala fee ya ofufe? (Matiu 4:8, 9) Ọ bụrụ na Setan adịghị adị, o nweghị otú ọ ga-esi ekwu na ya ga-enye Jizọs ọchịchị. Ihe ọzọ bụ na Jizọs agwaghị Setan na ọ bụghị ya nwe ọchịchị niile ahụ ọ sịrị bụ́ nke ya.

      • Mgbe Jizọs merichara ọnwụnwa ndị ahụ, Ekwensu “si n’ebe ọ nọ pụọ ruo oge ọzọ ga-adaba adaba.” (Luk 4:13) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ na-egosi na Setan bụ ihe ọjọọ dị mmadụ n’obi ka ọ̀ na-egosi na ọ bụ onye iro sigburu onwe ya n’ọnwụ?

      • Baịbụl kwukwara na ‘ndị mmụọ ozi bịara malite ijere Jizọs ozi.’ (Matiu 4:11) Ndị mmụọ ozi ahụ bịara nyere Jizọs aka hà bụ ndị dị adị? O doro anya na ha bụ. Ya bụrụ otú ahụ, gịnị mere anyị ga-eji chewe na Setan adịghị adị?

      MGBE SETAN NA CHINEKE KWURỊTARA OKWU

      Ọ bụ mgbe Baịbụl na-akọ akụkọ nwoke na-atụ egwu Chineke bụ́ Job ka a kọọrọ anyị otú Ekwensu na Chineke si kparịta ụka ugboro abụọ. N’oge abụọ ahụ ha kparịtara ụka, Chineke toro Job n’ihi na ọ na-agbalị ime ihe ọma mgbe niile. Setan kwuru na ọ bụ ihe ọma Chineke na-emere Job mere o ji na-efe Chineke. Ihe Ekwensu na-ekwu bụ na ya ma Job karịa otú Chineke ma ya. Jehova hapụrụ Setan ka o bibie ihe Job nwere, gbuo ụmụ ya ma kpatara ya ọrịa.a O mechara doo onye ọ bụla anya na ihe Jehova kwuru gbasara Job bụ eziokwu. Nke a gosiri na Setan bụ onye ụgha. Chineke gọziri Job maka na ọ kwụsịghị ife ya.—Job 1:6-12; 2:1-7.

      Ọ̀ bụ ihe ọjọọ dị n’obi Jehova ka Jehova nọ na-agwa okwu mgbe ya na Setan na-ekwu okwu? Baịbụl kwuru, sị: “Ezi Chineke, ụzọ ya zuru okè.” (2 Samuel 22:31) Baịbụl kwukwara, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị.” (Mkpughe 4:8) Ihe a Baịbụl kwuru, nke bụ́ na Jehova dị nsọ, pụtara na Jehova zuru okè, o nweghị mmerụ, o nweghịkwa mmehie ọ bụla.

      Ọtụtụ nsogbu bịaara Job mgbe Setan na Chineke kparịtachara ụka

      Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na o nwedịghị onye dịrị ndụ n’oge ochie a na-akpọ Job, kama na ihe a kọrọ gbasara ya bụ akụkọ ifo. Ma ọ̀ bụ eziokwu na e nweghị onye dịrị ndụ n’oge ochie a na-akpọ Job? E nwere ebe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ihe gosiri na Job dịrị ndụ n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ Jems 5:7-11, a gwara Ndị Kraịst ka ha na-atachi obi ka Job n’oge ihe siiri ha ike n’ihi na Jehova ga-akwụ ha ụgwọ ọrụ otú ọ kwụrụ Job. Akụkọ Job ọ̀ ga-abara Ndị Kraịst uru ma a sị na o nweghị onye bụ́ Job, nke e ji enwe onye bụ́ Setan? N’akwụkwọ Ezikiel 14:14, 20, e dere aha Job, Noa, na Daniel. Ha atọ bụ ndị ezi omume. Ebe ọ bụ na Noa na Daniel dịrị ndụ n’oge ochie, ihe ọ pụtara bụ na Job bụkwa nwoke nwere okwukwe nke dịrị ndụ n’oge ochie. Ebe ọ bụ na e nwere onye dịrị ndụ bụ́ Job, ọ pụtakwara na onye ahụ kpataara ya nsogbu bụkwa onye dị adị.

      N’eziokwu, Baịbụl gosiri na Setan bụ mmụọ dị adị. Ma, i nwere ike ịna-ajụ n’obi gị ma Setan ò nwere ike ịkpatara gị na ezinụlọ gị nsogbu n’oge a.

      OLEEKWANỤ MAKA OGE ANYỊ A?

      Weregodị ya na e nwere ndị omekome bịara biri n’obodo unu. O doro anya na egwu ga-adị n’obodo unu, ọtụtụ ndị ga-amalitekwa ịkpa àgwà ọjọọ. Ihe yiri nke a emeela n’ụwa anyị a. A chụdara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, bụ́ ndị dị adị, n’ụwa anyị a n’ihi na ha na-enupụrụ Chineke isi. Gịnị ka nchụda a a chụdara ha n’ụwa na-akpatara ụmụ mmadụ? Chegodị echiche. Olee ihe ị na-anụ na-eme n’obodo unu ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ n’ụwa ma i gee akụkọ ụwa na redio ma ọ bụ kirie televishọn ma ọ bụkwanụ gụọ akwụkwọ akụkọ?

      • Ị̀ na-ahụ na tigbuo zọgbuo na-aka njọ n’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ na-agba n’ụwa niile ka ọ kwụsị?

      • Ị̀ na-ahụ na ime mgbaasị na nsí na àjà na-akarịzi akarị na fim ma ọ bụ na tiivi nakwa n’ihe omume ndị a na-egere egere na redio n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị nne na nna na-eti mkpu na ihe ndị a na-emebi ụmụaka?

      • Ị̀ na-ahụ na a na-emebisị ụwa anyị a n’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ na-agba ka a ghara imebisị ya?

      • Ọ̀ dị gị ka e nwere onye fooro ntutu taa na ọ ga-alarịrị ụwa a n’iyi?

      Legodị onye Baịbụl kwuru na ọ bụ ya na-akpata nsogbu n’ụwa a: “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya. . . . Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:9, 12) Mgbe ọtụtụ ndị chebachaara ihe Baịbụl kwuru na ihe ndị na-eme eme echiche, ha kwetara na Setan bụ mmụọ ọjọọ, kwetakwa na ọ na-akpa ụwa anyị a aka ọjọọ.

      Ma, i nwere ike ịna-eche ihe ị ga-eme ka Setan ghara inweta gị. Mmadụ iche ụdị ihe a adịghị njọ. Isiokwu na-eso nke a ga-agwa gị ihe ị ga-eme.

      a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

  • Ànyị Kwesịrị Ịtụ Setan Egwu?
    Ụlọ Nche—2014 | Nọvemba 1
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | SETAN Ọ̀ DỊ ADỊ?

      Ànyị Kwesịrị Ịtụ Setan Egwu?

      Ebe di na nwunye si n’ụlọ ha ikuku ọjọ batara na-agbapụ n’èzí

      A naghị ahụ ikuku ọjọọ a na-akpọ kabọn monozaịd anya. Otú ahụ ka a na-anaghị ahụ Setan anya

      E nwere ikuku ọjọọ a na-akpọ kabọn monọzaịd. Ọ na-esiri ndị mmadụ ike ịmata ebe ikuku a dị n’ihi na a naghị ahụ ya anya, ọ naghịkwa esi ísì, mmadụ nwekwara ike ikuru ya n’amaghị ama. O nwere ike ịbụ na e kee ndị niile ikuku ọjọọ na-egbu n’ụwa ụzọ abụọ, ọ bụ ikuku a na-egbu ihe karịrị otu ụzọ. Ma, nke a ekwesịghị ime ka obi koro anyị n’elu n’ihi na e nwere otú mmadụ nwere ike isi mata ebe ikuku ọjọọ ahụ dị. E nwekwara ihe ị ga-eme ka ọ ghara imerụ gị ahụ́. Ọtụtụ ndị nwere ihe na-eme ka ha mata ebe ikuku ahụ dị. Ha mata, ha emezie ihe ha kwesịrị ime ka ọ ghara imerụ ha ahụ́.

      Setan dị ka ikuku ọjọọ ahụ. Ndị mmadụ enweghị ike ịhụ ya anya n’ihi na ọ bụ mmụọ, ọ bụkwa onye ọjọọ. Ma, anyị ekwesịghị ịtụ Setan egwu n’ihi na Chineke na-enyere anyị aka. Chineke nyere gị ihe ndị na-esonụ ga-eme ka Setan ghara imeri gị.

      Ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme. Jems 4:7 gwara anyị, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” Ọ bụ eziokwu na Setan dị ike, ma ọ gaghị amanyeli gị ka i mee ihe ị na-achọghị ime. Ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme. Pita nke Mbụ 5:9 sịrị: ‘Guzogidenụ Ekwensu, sienụ ike n’okwukwe.’ Cheta na Setan hapụrụ Jizọs mgbe ọ na-achịtaghị ájá n’ọnwụnwa atọ ọ nwara Jizọs. (Matiu 4:11) Gịnwa nwekwara ike ikpebi na Setan agaghị anwata gị.

      I nwere ike ịbụ enyi Chineke. Jems 4:8 gwara anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso.” Jehova chọrọ ka ị bụrụ ezigbo enyi ya. Ma, olee ihe ị ga-eme ka ị bụrụ enyi ya? Otú kacha mma ị ga-esi amalite bụ isi na Baịbụl mụtakwuo banyere Jehova. (Jọn 17:3) Ihe ndị ị na-amụta banyere Jehova ga-eme ka ị hụ ya n’anya, ọ bụrụ na ị hụ ya n’anya, ị ga na-eme ihe ọ chọrọ. (1 Jọn 5:3) Mgbe ị na-agbalị ka ị bụrụ enyi Nna gị nke eluigwe, olee ihe ọ ga-eme? Jems kwuziri na ‘Chineke ga-abịarukwa gị nso.’

      Ebe nwa okorobịa na-amụ Baịbụl, mechaakwa kpegara Chineke ekpere ma bisisịa ihe o ji eme mgbaasị

      Jehova na-enye gị ihe ga-eme ka Setan ghara imebi ofufe ị na-efe Jehova

      Chineke kwuru na ọ ga-echebe gị. Ilu 18:10 sịrị: “Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.” Ihe a Baịbụl kwuru apụtaghị na aha Chineke bụ ọtụmọkpọ. Kama ọ pụtara na ndị ji obi ha niile na-akwanyere aha Chineke ùgwù nwere ike ịrịọ ya mgbe ọ bụla ka o chebe ha.

      Ihe Ndị Kraịst mere ga-enyere gị aka. Ọrụ Ndịozi 19:19 gwara anyị ihe ndị bi n’Efesọs mere mgbe ha ghọrọ Ndị Kraịst. Ọ sịrị: “N’ezie, ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile. Ha wee gbakọọ ọnụ ahịa ha wee hụ na o ruru puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise.”a Ndị Kraịst ahụ mebisịrị ihe niile ha ji eme mgbaasị n’agbanyeghị ego ole a na-ere ha. Ihe a ha mere nwere ike ịbara anyị ezigbo uru taa. Ndị na-eme anwansi na mgbaasị jụrụ ebe niile n’ụwa anyị a. O nwere ike ịdị mmadụ ka o nwechaghị ihe dị njọ n’ime mgbaasị ma ọ bụ na ihe ndị e ji eme mgbaasị adịchaghị njọ. Ma, ha nwere ike ime ka ndị mmụọ ọjọọ kpatara gị nsogbu. N’ihi ya, i kwesịrị ime ihe niile i nwere ike ime ka i zere ime mgbaasị na ihe ọ bụla e ji eme ya.—Diuterọnọmi 18:10-12.

      Rogelio, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’isiokwu mbụ gbara n’Ụlọ Nche a, ekwetaghị na Ekwensu dị adị ruo mgbe ọ karịrị afọ iri ise. Ma, o mechara gbanwee echiche ya. Gịnị mere o ji gbanwee ya? Rogelio kwuru, sị: “M nwetara Baịbụl, bụ́ ihe m na-emetụbeghị ná ndụ m. Ihe m mụtara na ya mere ka o doo m anya na Ekwensu dị adị. Ihe ahụ m mụtara na-enyere m aka ugbu a ka Ekwensu ghara ịnwata m.”

      ‘Ihe m mụtara na Baịbụl mere ka o doo m anya na Ekwensu dị adị. Ihe ahụ m mụtara na-enyere m aka ugbu a ka Ekwensu ghara ịnwata m’

      Ị̀ ga-achọ ịnọ ndụ mgbe Setan na-agaghịzi adị? I nwere ike ịnọ ndụ mgbe ahụ. Akwụkwọ Nsọ kwuru ihe ga-emecha mee Ekwensu, bụ́ onye na-eduhie ọtụtụ ndị mmadụ. Ọ sịrị na a ga-atụba Ekwensu “n’ime ọdọ ọkụ na sọlfọ.” (Mkpughe 20:10) N’eziokwu, o nweghị ihe ọkụ na sọlfọ nkịtị ga-emeli mmụọ a na-anaghị ahụ anya. Nke a gosiri na ọdọ ọkụ ahụ pụtara mbibi ebighị ebi. A ga-ebibi Setan, ya anwụọ pịị. Ndị niile hụrụ Chineke n’anya ga-enwe ezigbo obi ụtọ n’oge ahụ.

      Ka ọ dị ugbu a, na-agbalị ike gị niile ka ị na-amụtakwu banyere Jehova na iwu ya.b Chegodị otú obi ga-adị gị ịnọ ndụ mgbe a ga-asị n’eziokwu na “Setan adịghị.”

      a Ọ bụrụ na mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ bụ ego ndị Rom a na-akpọ dinarịọs, ọ pụtara na ego ahụ bụ ego ole a ga-akwụ puku ndị ọrụ iri ise n’ụbọchị. Ọ bụghị obere ego.

      b Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere Setan na ime mgbaasị, gụọ isi nke 10 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka o nye gị ya ma ọ bụ gị agụọ ya na www.pr2711.com/ig.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya