-
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị?Ụlọ Nche—2014 | Ọgọst 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị?
“Anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye. Jehova na-echeta m.”a—Ọ BỤ EZE DEVID, ONYE CHỊRỊ IZREL N’OGE OCHIE, KWURU IHE A.
“Mba niile dị ka mmiri si na bọket tapụ.”—AỊZAYA 40:15
Devid ò kwesịrị ichewe na Jehova na-echeta ya? Chineke ọ̀ na-eche banyere gịnwa? Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na Chineke onye pụrụ ime ihe niile ji ha kpọrọ ihe. Gịnị mere o ji esiri ha ike ikweta?
Otu ihe kpatara ya bụ na Chineke abụghị mmadụ, ọ kakwa ụmụ mmadụ. Ọ bụrụ na Chineke anọrọ n’eluigwe lee mba niile anya, ha dị ka “mmiri si na bọket tapụ; ọ na-ewerekwa ha dị ka uzuzu nke dị n’elu ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” (Aịzaya 40:15) E nwere otu nwoke na-ede akwụkwọ n’oge a. O kweghị na Chineke. Ọ sịrị na “ọ bụrụ na mmadụ chere na Chineke dị nakwa na Chineke ji ya kpọrọ ihe, nweekwa mmasị n’ihe ndị ọ na-eme, onye ahụ mụ anya na-arọ nrọ.”
Ma, e nwere ndị chere na Chineke anaghị eche banyere ha n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme. Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Jim kwuru, sị: “M na-ekpe ekpere mgbe niile ka obi ruo m ala nakwa ka m na-ejide onwe m. Ma obere oge, mụ ebidokwa wewa iwe ọkụ. M bịaziri chee na ihe ọjọọ eriela m ahụ́ nke na Chineke enwelighị ike inyere m aka.”
Ebe Chineke nọ ọ̀ dị ezigbo anya nke na ọ naghị ahụ anyị? Olee otú o si were anyị bụ́ ndị na-ezughị okè? A sị na Chineke emeghị ka anyị mata ụdị onye ọ bụ, o nweghị onye gaara aza ajụjụ ndị a. Ma, Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ, ya bụ, Baịbụl, mere ka o doo anyị anya na Chineke anọghị ebe dị anya, ọ bụghịkwa onye ihe gbasara anyị na-anaghị emetụ n’obi. Baịbụl sịrị na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ Ndịozi 17:27) N’isiokwu anọ na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe Chineke gwara anyị gbasara otú o si nwee mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ nakwa otú o sirila gosi na ya nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ ibe anyị nọ, bụ́ ndị dịrị ndụ otú a anyị dị ndụ ugbu a.
a Abụ Ọma 40:17; Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.
-
-
Anya Chineke Dị n’Ebe Ị NọỤlọ Nche—2014 | Ọgọst 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?
Anya Chineke Dị n’Ebe Ị Nọ
‘Anya Chineke na-ahụ ụzọ mmadụ, ọ na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile.’—JOB 34:21.
Nne ma ọ bụ nna hụrụ ụmụ ya n’anya na-aka elebara nwa ya nke dị obere anya
IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: Otu nchọpụta e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọ bụrụ na e buru ihe ruru otu narị ijeri planet (ma ọ bụ ụwa) tinye n’ime ụyọkọ kpakpando nke ụwa anyị a dị na ya, ha niile ga-abanyecha n’ime ya. Ebe ọ bụ na ụyọkọ kpakpando ndị Chineke kere buru ibu otú a, ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: ‘Olee otú Chineke onye pụrụ ime ihe niile ga-esi na-ahụ ihe ụmụ mmadụ na-eme n’ime obere ụwa anyị a?’
IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: Chineke enyeghị anyị Baịbụl ma chefuzie anyị. Kama ime otú ahụ, ọ gwara anyị ihe ga-eme ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: “M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.”—Abụ Ọma 32:8.
Ka anyị leba anya n’ihe mere otu nwaanyị Ijipt aha ya bụ Hega. Nwaanyị a dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ tupu a mụọ Kraịst. Mgbe Hega tụụrụ ime, o bidoro ledawa nne ya ukwu bụ́ Seraị anya. N’ihi ya, Seraị wedara ya ala, nke mere na ọ gbagara n’ala ịkpa. Chineke ò chefuziri Hega maka na o mere ihe na-adịghị mma? Baịbụl sịrị: “Mmụọ ozi Jehova hụrụ ya.” Mmụọ ozi ahụ gwara Hega, sị: “Ahụ́ a na-emekpa gị eruwo Jehova ntị.” Hega gwaziri Jehova, sị: “Ị bụ Chineke nke na-ahụ ụzọ.”—Jenesis 16:4-13.
“Chineke nke na-ahụ ụzọ” na-ahụkwa gịnwa. Dị ka ihe atụ, nwaanyị hụrụ ụmụ ya n’anya na-aka eleru ụmụ ya ndị nke obere anya n’ihi na ọ bụ ha ka e kwesịrị ilebara anya karịa ndị nke totụrụla eto. Chineke na-emekwa otú ahụ. Ọ na-aka elebara anyị anya mgbe anyị nọ ná nsogbu nakwa mgbe anyị chọrọ onye ga-enyere anyị aka. Jehova sịrị: “Ọ bụ ebe dị elu na ebe dị nsọ ka m bi, mụ na onye e gburu mmụọ ya na onye mmụọ ya dị ala bikwa, iji mee ka a tụtee mmụọ nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha, meekwa ka obi nke ndị e gburu mmụọ ha nwee ume.”—Aịzaya 57:15.
Ma, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Olee otú o si bụrụ na anya Chineke dị n’ebe m nọ? Ọ̀ bụ otú m dị n’anya ka ọ na-ahụ, ka ọ̀ na-ahụ ihe dị m n’obi ma ghọta ụdị onye m bụ?’
-
-
Chineke Ma Gị nke ỌmaỤlọ Nche—2014 | Ọgọst 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?
Chineke Ma Gị nke Ọma
“Jehova, i nyochawo m, ị makwaara m.”—ABỤ ỌMA 139:1.
“Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ.”—ABỤ ỌMA 139:16
IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: Ọtụtụ ndị chere na naanị otú Chineke si were ụmụ mmadụ bụ na ha bụ ndị mmehie, ya bụ, ndị na-adịghị ọcha na ndị ọ na-ekwesịghị ilebara anya. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Kendra. E nwere mgbe obi dara ya mbà, obi ana-amakwa ya ikpe maka na ọ naghị emetacha ihe Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ na-eme. Kendra sịrị na ihe a mere ka ya kwụsị ikpe ekpere.
IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: Ihe Jehova na-ahụ abụghị naanị na i zughị okè, ọ na-enyochakwa obi gị, ghọta ụdị mmadụ ị bụ. Baịbụl sịrị: “Ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” Ihe ọzọ bụ na “ọ dịghị emeso anyị dị ka mmehie anyị si dị.” Ọ bụrụ na anyị echegharịa, ọ na-emere anyị ebere ma gbaghara anyị.—Abụ Ọma 103:10, 14.
Ka anyị lebagodị anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara eze Izrel aha ya bụ Devid, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu mbụ gbara n’Ụlọ Nche a. Devid kpegaara Chineke ekpere, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị . . . Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m.” (Abụ Ọma 139:16, 23) N’eziokwu, Devid maara na n’agbanyeghị na o nwere oge ndị ya mere mmehie dị oké njọ, Jehova ga-achọpụtali na ya ji obi ya niile chegharịa.
Jehova ma gị nke ọma karịa otú mmadụ ọ bụla maara gị. Baịbụl sịrị: “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) Chineke ma ihe ndị mere i ji akpa àgwà otú i si akpa. Ihe ndị ahụ bụ: ihe ị ṅụtara n’ara, otú e si zụọ gị, ebe ị nọ too, na ụdị mmadụ ị bụ. Chineke na-ahụkwa ụdị mmadụ ị na-agbalị ka ị bụrụ. O jighị mgbalị a ị na-eme egwu egwu n’agbanyeghị na ị na-emejọ ihe mgbe ụfọdụ.
Ma, oleezi otú Chineke si eji ihe niile a ọ ma banyere gị akasi gị obi?
-
-
Chineke Nwere Ike Ịkasi Gị ObiỤlọ Nche—2014 | Ọgọst 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?
Chineke Nwere Ike Ịkasi Gị Obi
“Chineke, bụ́ onye na-akasi ndị e wedara n’ala obi, kasiri anyị obi.”—2 NDỊ KỌRỊNT 7:6.
“Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.”—NDỊ GALESHIA 2:20
IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-achọ onye ga-akasi ha obi, ha chere na ọ bụrụ na ha arịọ Chineke ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka mgbe ha nọ ná nsogbu, na ọ pụtara na ha na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Raquel. Ọ sịrị: “Ọ na-abụ m lechaa mmadụ ole nọ n’ụwa nakwa nsogbu ndị ha nwere, nsogbu m na-adịzi m ntakịrị nke na obi anaghị ekwe m rịọ Chineke ka o nyere m aka.”
IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: E nwere ụzọ Chineke sirila gbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka ma na-akasi ha obi. Onye ọ bụla dị ndụ n’ụwa taa ketara mmehie. Ọ bụ mmehie ahụ mere na o nweghị ka mmadụ metachaa ihe Chineke chọrọ. Ma, Chineke “hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya [bụ́ Jizọs Kraịst] ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 4:10) Ọ bụ àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere Chineke ji agbaghara anyị mmehie anyị, meekwa ka obi anyị ghara ịna-ama anyị ikpe. Ọ bụkwa ya mere anyị ji nwee olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke udo ga-adị na ya.a Ma, àjà ahụ ọ̀ bụ naanị maka mmadụ niile, ka Chineke ò jikwa ya egosi na ọ hụrụ gịnwa n’anya?
Ka anyị lebagodị anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru. Otú àjà Jizọs chụrụ si metụ ya n’obi mere ka o dee, sị: “Ndụ nke m dị ugbu a n’anụ ahụ́, m dị ya site n’okwukwe nke m nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” (Ndị Galeshia 2:20) Jizọs nwụrụ tupu Pọl aghọọ Onye Kraịst. N’agbanyeghị ya, Pọl weere àjà ahụ ka onyinye Chineke nyere yanwa.
Àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ bụkwa onyinye Chineke nyere gịnwa. Onyinye a gosiri na Chineke ji gị kpọrọ ihe. Àjà ahụ nwere ike inye gị “nkasi obi ebighị ebi,” meekwa ka i nwee “ezi olileanya” ka i wee “guzosie ike n’omume ọma niile nakwa n’okwu ọma niile.”—2 Ndị Tesalonaịka 2:16, 17.
N’eziokwu, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga. Ma, olee ihe Chineke na-eme n’oge a nke gosiri na ọ chọrọ ka gị na ya dịrị ná mma?
a Ị chọọ ịmatakwu banyere àjà Jizọs chụrụ, gụọ isi nke 5 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
-
-
Chineke Chọrọ Ka Gị na Ya Dịrị ná MmaỤlọ Nche—2014 | Ọgọst 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?
Chineke Chọrọ Ka Gị na Ya Dịrị ná Mma
“Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.”—JỌN 6:44.
IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: Ọ na-adị ọtụtụ ndị kweere na Chineke ka ha na ya enweghị ike ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị Ayaland aha ya bụ Christina. Ọ na-aga chọọchị kwa izu. Ma o kwuru, sị: “M weere Chineke ka onye kere ihe niile. Ma, amaghị m onye ọ bụ. O nwetụbeghị mgbe ọ dị m ka mụ na ya ọ̀ dị ná mma.”
IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: Mgbe ọ bụla ọ dị anyị ka o nweghị ihe jikọtara anyị na Chineke, Chineke anaghị elefuru anyị anya. Jizọs mere ihe atụ gosiri na Chineke na-eche banyere anyị. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị atụrụ ma otu n’ime ha akpafuo, ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’elu ugwu wee gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu?” Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe atụ a? Jizọs sịrị: “N’otu aka ahụ, ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.”—Matiu 18:12-14.
Onye ọ bụla “n’ime ndị a dị nta ” bara ezigbo uru n’anya Chineke. Oleekwanụ otú Chineke si achọ “nke ahụ kpafuru akpafu”? Amaokwu Akwụkwọ Nsọ e dere ná mmalite isiokwu a kwuru na Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ.
Ole ndị taa na-aga n’ụlọ ndị mmadụ nakwa n’ebe ọhaneze na-anọ agwa ha ihe Baịbụl kwuru gbasara Chineke?
Ka anyị leba anya n’otú Chineke sirila dọta ndị ji obi ha niile chọọ ife ya. N’oge ndịozi Jizọs nọ n’ụwa, Chineke zipụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst aha ya bụ Filip ka ọ gakwuru otu nwoke na-arụ ọrụ n’obí eze nwaanyị ndị Itiopia ma kọwaara ya amụma Baịbụl ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya ya na-agụ. (Ọrụ Ndịozi 8:26-39) O nwekwara mgbe Chineke gwara Pita onyeozi ka ọ gaa n’ụlọ ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Kọnịliọs. Kọnịliọs na-ekpe ekpere, na-agbalịkwa ike ya niile ka o fee Chineke. (Ọrụ Ndịozi 10:1-48) Chineke mekwara ka Pọl onyeozi na ndị ha na ya so gaa ná mmiri dị nso n’obodo Filipaị. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ otu nwaanyị aha ya bụ Lidia, bụ́ ‘onye na-efe Chineke.’ ‘Jehova meghere obi nwaanyị a, ya anabata ihe Pọl nọ na-ekwu.’—Ọrụ Ndịozi 16:9-15.
Ná nke ọ bụla n’akụkọ ndị a, Jehova mere ka ndị chọrọ ịmata onye ọ bụ mata ya. Ole ndị taa na-aga n’ụlọ ndị mmadụ nakwa n’ebe ọhaneze na-anọ agwa ha ihe Baịbụl kwuru gbasara Chineke? Ọtụtụ ndị ga-asị na ọ bụ “Ndịàmà Jehova.” Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ ga-abụ na Chineke ji ha na-eme ka mụ na ya dịrị ná mma?’ Anyị na-agba gị ume ka ị rịọ Chineke ka o nyere gị aka ka ị nabata mbọ ọ na-agba ka gị na ya dịrị ná mma.a
a Ị chọọ ịmatakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, lee vidio aha ya bụ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ọ dị n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr2711.com/ig.
-