Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Olee Ihe Mere I Kwesịrị Iji Chọọ Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu?
    Ụlọ Nche—2015 | Disemba 1
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị GA-AGHỌTALI IHE BAỊBỤL NA-EKWU

      Olee Ihe Mere I Kwesịrị Iji Chọọ Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu?

      Otu nwaanyị Chaịna aha ya bụ Lin kwuru, sị: “Baịbụl bụ akwụkwọ okpukpe a ma ama. Ma ndị Chaịna amaghị akwụkwọ a, ọ dịghịkwa ha mkpa.”

      Otu nwoke India aha ya bụ Amit kwuru, sị: “Anaghịdị m aghọta akwụkwọ ndị dị́ nsọ ndị okpukpe anyị, bụ́ Hindu, na-eji akụziri anyị ihe. Oleezi otú m ga-esi aghọta Baịbụl Nsọ?”

      Otu nwaanyị Japan aha ya bụ Yumiko kwuru na ya ma na o teela Baịbụl dịwara, nakwa na ya nụrụ na ọ bụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha nwee, ma, na ya ahụtụbeghị Baịbụl mbụ.

      Ọtụtụ ndị nọ́ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-ekwu okwu ọma gbasara Baịbụl. Ma, o nwere ike ha amachaghị ihe dị́ na Baịbụl. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ nde mmadụ bí n’Eshia nakwa ndị bí n’ebe ọtụtụ ndị nwere Baịbụl.

      Ebe otu nwaanyị na-agụ Baịbụl

      Ma, i nwere ike ịna-ajụ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ga-eji chọwa ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu?’ Ọ bụrụ na ị ghọta ihe dị́ n’akwụkwọ a dị́ nsọ, ọ ga-enyere gị aka:

      • Ịna-enwe obi ụtọ

      • Idozi nsogbu ezinụlọ

      • Ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị

      • Ime ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma

      • Iji ego gị eme ihe bara uru

      Ka anyị lebagodị anya n’otú Baịbụl si nyere otu nwaanyị Japan aka. Aha nwaanyị ahụ bụ Yoshiko. Ọ na echekarị ihe ọ ga-abụ ya ka Baịbụl na-ekwu. O mechara kpebie ịgụ Baịbụl ka ọ mata ihe dị́ na ya. Gịnị meziri? O kwuru, sị: “Ihe m gụtara na Baịbụl emeela ka ndụ m nwee isi. O meekwala ka m nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu.” O kwukwara, sị: “Anaghịzi m eche na ndụ m abaghị uru.” Amit, bụ́ nwoke ahụ anyị dere ihe o kwuru ná mbido isiokwu a, kpebikwara ịmụ Baịbụl n’onwe ya. O kwuru, sị: “Ihe m gụtara tụrụ m n’anya. Ihe e dere na Baịbụl ga-abara onye ọ bụla uru.”

      Baịbụl abaarala ọtụtụ nde mmadụ uru. Ọ́ gaghị adị mma ma ị mụọ Baịbụl n’onwe gị, ka ị hụ otú ọ ga-esi baara gị uru?

      Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile

      Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Baịbụl ga-esi baara gị uru, gụọ broshọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

  • Akwụkwọ A Ga-aghọtali Aghọta
    Ụlọ Nche—2015 | Disemba 1
    • Ebe ndị mmadụ na-agụ Baịbụl e biri ebi na nke dị n’ekwentị

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị GA-AGHỌTALI IHE BAỊBỤL NA-EKWU

      Akwụkwọ A Ga-aghọtali Aghọta

      O teela e dere Baịbụl. Ma, olee mgbe e bidoro ide ya? E bidoro ide ya n’Izrel oge ochie n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga. Ọ bụ oge alaeze Shang na-achị n’obodo Chaịna. Ọ bụkwa n’ihe dị ka otu puku afọ tupu okpukpe Buda amalite n’India.—Gụọ ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Gbasara Baịbụl.”

      Baịbụl zara ajụjụ ndị kacha echu ụmụ mmadụ ụra

      Akwụkwọ mmadụ ga-agụ ya abaara ya uru bụ akwụkwọ a na-aghọta nke ọma nakwa nke ihe ọ na-ekwu ga-enyere mmadụ aka ná ndụ. Baịbụl bụ ụdị akwụkwọ ahụ. Ọ zara ajụjụ ndị kacha echu ụmụ mmadụ ụra.

      Dị ka ihe atụ, ò nwetụla mgbe ị jụrụ, sị, ‘Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa a?’ Kemgbe ụwa, ndị mmadụ na-achọ ịma azịza ajụjụ a. Ma, azịza ya dị n’isi nke mbụ na nke abụọ na Jenesis bụ́ akwụkwọ nke mbụ na Baịbụl. N’ebe ahụ, Baịbụl kọrọ otú ihe niile si bido ọtụtụ ijeri afọ gara aga. O kwuru mgbe e kere eluigwe na ụwa, nakwa kpakpando na ụyọkọ ha dị́ iche iche. (Jenesis 1:1) Ọ kọziri otú ụwa si jiri nwayọọ nwayọọ ghọọ ebe a ga-ebi ebi, otú ụmụ mmadụ na ihe dị́ iche iche dị́ ndụ si malite ịdị, na ihe mere e ji kee ha niile.

      E DERE YA OTÚ Ọ GA-ADỊ MFE NGHỌTA

      Baịbụl na-agwa anyị ihe ndị anyị ga-eme gbasara nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị. Ihe ndị ọ na-agwa anyị dịkwa mfe nghọta. Lee ihe abụọ mere o ji dị mfe nghọta.

      Nke mbụ bụ na e dere Baịbụl otú ọ ga-edo anya, ruokwa ndị mmadụ n’obi. E jighị okwu ndị dị́ omimi dee ya, kama, e ji okwu ndị doro anya, anyị maara nke ọma, dee ya. E ji ihe ndị anyị na-ahụ kwa ụbọchị kọwaa ihe ndị gaara esi ike nghọta.

      Dị ka ihe atụ, Jizọs ji ọtụtụ ihe atụ ndị dị́ mfe nghọta na ihe ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị kụzie ihe, ya eruo ndị mmadụ n’obi. Ọ bụ mgbe ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu ka o mere ọtụtụ ihe atụ ndị ahụ. E dekọrọ ha n’akwụkwọ Matiu isi nke 5 ruo isi nke 7. Otu onye gụrụ ihe ndị ahụ Jizọs kwuru n’elu ugwu kwuru na ha “bara ezigbo uru” nakwa na o kwughị ha “iji kọjuo anyị isi, kama, o kwuru ha iji nyere anyị aka ịmụta ịna-akpa àgwà ọma.” O nwere ike iwe gị ihe dị ka nkeji iri na ise ma ọ bụ iri abụọ iji gụchaa ihe ahụ niile Jizọs kụziri n’elu ugwu. Ma, ọ ga-eju gị anya na ihe niile ahụ dị mfe nghọta, baakwa ezigbo uru.

      Ihe ọzọ mere Baịbụl ji dị́ mfe nghọta bụ ụdị ihe ndị e dere na ya. Baịbụl abụghị akwụkwọ akụkọ ifo. Kama, dị ka akwụkwọ a na-akpọ The World Book Encyclopedia si kwuo, ihe kacha dịrị na ya bụ “akụkọ gbasara ụmụ mmadụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, otú ha si gbaa mbọ, ihe ndị ha tụrụ anya ha, ebe ndị ha mejọrọ ihe na ebe ndị ha meziri.” Ebe ọ bụ akụkọ ụmụ mmadụ ka a kọrọ na ya, ọ dịịrị anyị mfe ịghọta akụkọ ndị ahụ na ịmụta ihe na ha.—Ndị Rom 15:4.

      MMADỤ NIILE NWERE IKE INWETA YA

      Ihe ga-eme ka ị ghọta ihe e dere n’akwụkwọ bụ ma ọ bụrụ na e dere ya n’asụsụ ị maara nke ọma. N’agbanyeghị ebe i bi ma ọ bụ obodo i si, o nwere ike ịbụ na e nweela Baịbụl n’asụsụ ị ga-aghọtali. Ka anyị lee ihe mere e ji nwee ike inwe Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ.

      Nsụgharị ya. Asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl bụ Hibru, Arameik, na Grik. O mere ka ọ bụrụ naanị mmadụ ole na ole ma asụsụ ndị a ga-agụli Baịbụl. Ma, ndị sụgharịrị Baịbụl gbara ezigbo mbọ ka ọ dịrị n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere e ji nwee Baịbụl, ma ndị nke zuru ezu ma ndị nke na-ezughị ezu, n’ihe dị ka puku asụsụ abụọ na narị asaa. Ọ pụtara na e kee mmadụ niile bí n’ụwa ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ itoolu nwere ike ịgụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ebe ụfọdụ na Baịbụl n’asụsụ ha.

      Mbipụta ya. N’oge e dere Baịbụl, e dere ya n’ihe nwere ike imebi emebi, dị ka n’akpụkpọ anụ nakwa na papaịrọs. Iji mee ka ọtụtụ ndị nweta ya, a na-eji aka, leziekwa anya, na-edepụtaghachi ihe ndị e dere na ya. Ndị nke a e depụtaghachiri na-adị ezigbo ọnụ, ọ bụkwa mmadụ ole na ole na-azụtali ya. Ma mgbe Gutenberg mepụtara ígwè na-ebi akwụkwọ n’ihe karịrị narị afọ ise na iri afọ ise gara aga, e bipụtara ọtụtụ Baịbụl ma kesaakwa ha. Otu nchọpụta e mere gosiri na e kesaala ihe karịrị ijeri Baịbụl ise, ma ndị nke zuru ezu ma ndị nke na-ezughị ezu.

      Baịbụl bụ akwụkwọ okpukpe a kacha ebipụta ma na-ekesa. O doro anya na Baịbụl bụ akwụkwọ e kwesịrị ịghọta ihe ọ na-ekwu. Ma, o nwere ike ịna-esitụrụ gị ike ịghọta ya. Ọ bụrụ na ọ na-esitụrụ gị ike, e nwere ihe ga-enyere gị aka. Olee ebe ị ga-achọta ya? Oleekwa uru ọ ga-abara gị? Gụọ isiokwu na-eso nke a ka ị mata azịza ajụjụ ndị a.

      Ihe Ndị I Kwesịrị Ịma Gbasara Baịbụl

      • Ihe dị́ na Baịbụl bụ akwụkwọ iri isii na isii ndị dị́ nsọ.

      • Ihe ndị só n’ihe e dere na Baịbụl bụ akụkọ ihe mere eme, iwu, amụma, abụ uri, ilu, abụ na akwụkwọ ozi.

      • E bidoro ide Baịbụl n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, dechaa ya n’afọ 98. Ọ pụtara na o were ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ isii tupu e dechaa Baịbụl.

      • Chineke nyere ihe dị ka ndị ikom iri anọ mmụọ nsọ ya, ha edee Baịbụl.

      Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?

      Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara otú mmadụ si malite ịdị, gụọ broshọ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

      Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?

      Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara Baịbụl, gụọ broshọ bụ́ Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.pr2711.com/ig.

  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu
    Ụlọ Nche—2015 | Disemba 1
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị GA-AGHỌTALI IHE BAỊBỤL NA-EKWU

      Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu

      Weregodị ya na ị gara mba ị na-agatụbeghị mbụ. Mgbe i ruru, gị achọpụta na otú ndị ebe ahụ dị, omenala ha, nri ha, na ego ha dị ezigbote iche. O nwere ike ịgwụ gị ike.

      O nwekwara ike ịdị gị otú ahụ ma ị malite ịgụ Baịbụl. Ka ị na-agụ ya, o nwere ike ịdị gị ka ị̀ banyere n’ụwa ndị oge ochie ị na-amaghị ihe ọ bụla gbasara ya. Ị ga-agụta gbasara ndị a na-akpọ ndị Filistia, gụtakwa gbasara omenala ndị ị na-ahụtụbeghị mbụ, dị ka, mmadụ ‘ịdọwa uwe’ ya, ma ọ bụkwanụ ụdị nri a na-akpọ mana nakwa ego a na-akpọ drakma. (Ọpụpụ 16:31; Jọshụa 13:2; 2 Samuel 3:31; Luk 15:9) Ihe a niile nwere ike ịgbagwoju gị anya. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ka onye maara Baịbụl nke ọma nyere gị aka, otú ahụ onye gara mba ọ na-agatụbeghị mbụ ga-esi chọọ ka e nyere ya aka?

      IHE NYEERE NDỊ MMADỤ AKA N’OGE OCHIE

      N’oge a malitere ide Baịbụl n’ihe dị ka n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst, e nwere ihe ndị nwere ike inyere mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Dị ka ihe atụ, Mozis, bụ́ onye mbụ duru ụmụ Izrel, ‘malitere ịkọwara’ ha ihe e dere na Baịbụl.—Diuterọnọmi 1:5.

      Mgbe ihe dị ka otu puku afọ gachara, a ka nwere ndị na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl. N’afọ 455 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Juu niile na ụmụaka ha zukọrọ n’ọnụ ụzọ ámá dị́ na Jeruselem. Ndị na-akụzi Baịbụl nọkwa ebe ahụ “jiri olu dara ụda na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ ahụ [dị́ nsọ].” Ma ihe ha mere abụghị naanị ịgụpụta ya, kama, “ha nọkwa na-eme ka a ghọta ihe a na-agụpụta.”—Nehemaya 8:1-8.

      Mgbe narị afọ ise gachara, Jizọs Kraịst so kụziere ndị mmadụ Baịbụl. Ihe ndị mmadụ na-akpọdị ya bụ onye ozizi. (Jọn 13:13) Ọ kụziiri ìgwè mmadụ ihe, kụziekwara ndị mmadụ ihe otu otu. N’otu oge, ọ nọ n’elu ugwu kụziere ìgwè mmadụ ihe. “Otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya.” Ọtụtụ ndị taa makwa gbasara ihe ndị ahụ ọ kụziri n’elu ugwu. (Matiu 5:1, 2; 7:28) N’oge opupu ihe ubi nke afọ 33, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya abụọ okwu ka ha nọ n’ụzọ na-aga n’otu obodo dị́ nso na Jeruselem. ‘Ọ nọ na-akọwara ha Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’—Luk 24:13-15, 27, 32.

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs kụzikwaara ndị ọzọ Okwu Chineke. N’otu oge, otu ọnaozi Itiopia nọ na-agụ otu ebe n’Akwụkwọ Nsọ, Filip, onye na-eso ụzọ Jizọs agakwuru ya, jụọ ya, sị: “Ị̀ maara n’ezie ihe ị na-agụ?” Nwoke Itiopia ahụ zara ya, sị: “N’ezie, olee otú m ga-esi mara, ma ọ bụrụ na mmadụ eduzighị m?” Filip kọwaziiri ya ihe ihe ọ na-agụ pụtara.—Ọrụ Ndịozi 8:27-35.

      IHE NA-ENYERE ANYỊ AKA TAA

      Ndịàmà Jehova taa na-akụzikwara ndị mmadụ Baịbụl na narị mba abụọ na iri atọ na itoolu, otú ahụ ndị kụziri Baịbụl n’oge ochie mere. (Matiu 28:19, 20) N’izu ọ bụla, ha na-enyere ihe karịrị nde mmadụ itoolu aka ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Ọtụtụ n’ime ndị ha na-akụziri Baịbụl abụghị Ndị Kraịst. Ha anaghị ana ndị mmadụ ego iji kụziere ha Baịbụl. Ha nwekwara ike ịnọ n’ụlọ onye ha chọrọ ịkụziri Baịbụl, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ dị́ onye ahụ mma, kụziere ya Baịbụl. E nwedịrị ndị ha na-esi na fon ma ọ bụ na kọmputa akụziri ihe.

      Biko, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka gị na ya kwuo otú unu nwere ike isi mụwa Baịbụl. Ị ga-achọpụta na Baịbụl abụtụdịghị akwụkwọ mmadụ na-agaghị aghọtali, chọpụtakwa na ọ “bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume” ka i wee “ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”—2 Timoti 3:16, 17.

      Lee vidio aha ya bụ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ọ dị na www.pr2711.com/ig

      Lee vidio aha ya bụ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl? Ọ dị na www.pr2711.com/ig

      Ihe dị́ n’Ịntanet, nke ga-enyere gị aka

      Ebe otu nwaanyị nọ n’èzí ebe a na-ere nri jiri tablet ya gaa na jw.org

      Ị̀ ga-achọ iji aka gị chọpụta ihe Baịbụl na-ekwu? Ọ bụrụ otú ahụ, gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ọtụtụ ihe gbasara Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ asaa, ị gaghịkwa akwụ ụgwọ. Ị ga-amata gbasara ihe ndị a:

      Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị

      • Oleedị ihe Chineke bu n’obi kee anyị?

      • Gịnị mere mmadụ ji anwụ anwụ?

      • Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

      (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI > pịa ebe e dere AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA)

      Ihe ndị ha na mmadụ na-alụ

      • Ihe i nwere ike ime ma ị daa mbà n’obi

      • Ihe ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala

      • Ihe ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ihe na-esiri gị ike ma ọ bụ na i ji ụgwọ

      (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI > pịa ebe e dere AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA)

      Ihe ndị ga-enyere ezinụlọ aka

      • Otú unu ga-esi kwụsị ịna-esekarị okwu

      • Ịzụlite ụmụaka ịrụ ọrụ dịịrị ha

      • Kụziere ụmụ gị omume ọma

      (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI > pịa ebe e dere NDỊ DI NA NWUNYE NA NDỊ NNE NA NNA)

      Ndụmọdụ maka ndị na-eto eto

      • Ihe ị ga-eme ma mmadụ gwusawa gị egwuregwu iberiibe

      • Ihe ị ga-eme ma a chọwa gị okwu

      • Ihe ị ga-eme ka owu ghara ịna-ama gị?

      (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI > pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO)

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya