-
Ihe Ndị Na-akpata Nchegbu Juru Ebe NiileỤlọ Nche—2015 | Julaị 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?
Ihe Ndị Na-akpata Nchegbu Juru Ebe Niile
Otu nwoke aha ya bụ Paul, onye Zimbabwe, kwuru, sị: “Agara m ịzụ ihe oriri otu ụbọchị, naanị ihe m hụrụ bụ biskit. Ọnụ ahịa biskit jikwa okpukpu puku iri rịa elu. N’echi ya, o nweghịzi ndị nwere ihe mmadụ nwere ike ịzụrụ rie.”
Otu nwaanyị aha ya bụ Janet, onye Amerịka, kwuru, sị: “Di m gwara m otu ụbọchị na ya alụjuola, nakwa na ya ga-ahapụ mụ na ụmụ anyị. Amaghị m otú m ga-esi edi ihe a. Olee otú naanị m ga-esi lekọtawa ụmụ anyị?”
Otu nwaanyị aha ya bụ Alona, onye Izrel, kwuru, sị: “Ọ na-abụ m nụ ụda opi na-egosi na a na-aga ịtụ bọmbụ, mụ agbaba ebe a na-anọ eze mgbọ, makpuru ala ka bọmbụ na-ada. Ihe a niile mechaa, aka ka ga na-ama m jijiji ruo ọtụtụ awa.”
Anyị bi n’oge ọtụtụ ihe na-echegbu ndị mmadụ, ya bụ, “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ụfọdụ ihe na-echegbu ndị mmadụ taa bụ ụkọ ego, nsogbu ezinụlọ, agha, ọrịa ọjọọ, na ọdachi ndị na-emere onwe ha na ndị nke ụmụ mmadụ na-akpata. Ụfọdụ na-echegbukwa onwe ha maka echi. Ha hụ etuto n’ahụ́ ha, ha echewe ma ọ̀ ga-emecha ghọọ ọrịa kansa. Ha nwekwara ike ịna-echegbu onwe ha maka otú ihe ga-adịrị ụmụ ụmụ ha ma ha too.
Iche gbasara ihe ụfọdụ adịghị njọ. Dị ka ihe atụ, anyị chọọ ịga ka e lee anyị ahụ́, ka a gbaa anyị ajụjụ ọnụ tupu e wee anyị n’ọrụ, ma ọ bụ na-akwado ime ihe ọhaneze ga-ekiri, anyị ga na-eche otú ọ ga-esi gaa. Anyị buru ụzọ chee gbasara ihe ndị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu, o nwere ike ime ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu. Ma, anyị ga-akpatara onwe anyị ezigbo nsogbu ma anyị na-echegbu onwe anyị. Na nso nso a, e lere ihe karịrị puku mmadụ iri isii na puku asatọ ahụ́ ma chọpụta na ichetụ oké echiche nwere ike ime ka mmadụ nwụchuo ọnwụ. Ọ bụ ya mere Jizọs ji jụọ, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” N’eziokwu, nchegbu anaghị agbatịkwu ndụ mmadụ. Ọ bụkwa ya mere Jizọs ji gwa anyị, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Matiu 6:25, 27) Ma, olee otú anyị ga-esi kwụsị ichegbu onwe anyị?
Ihe ga-enyere anyị aka bụ inwe ezi amamihe, inwe okwukwe na Chineke nakwa inwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ bụrụgodị na anyị enweghị nsogbu taa, o nwere ike ịbịara anyị echi. N’ihi ya, ka anyị hụ otú ihe atọ ndị ahụ si nyere Paul, Janet, na Alona aka, ha aghara ịna-echegbu onwe ha.
-
-
Nchegbu Gbasara EgoỤlọ Nche—2015 | Julaị 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?
Nchegbu Gbasara Ego
Otu nwoke aha ya bụ Paul, onye ji ụmụ abụọ, kọrọ ihe mere mgbe e nwere ụkọ nri n’obodo ha. O kwuru, sị: “E nwere mgbe ihe niile a na-ere n’obodo anyị na-ada oké ọnụ, nri adịrịkwa ụkọ. Anyị na-akwụ n’ahịrị ruo ọtụtụ awa n’ebe a na-ere nri. Ma, nri na-agwụkarị tupu e rute ebe anyị nọ. Agụụ nyụrụ ndị mmadụ ịkpakwụ. Ọtụtụ bịara dị ka ogwu azụ̀, ụfọdụ ana-adachikwa ụzọ. Ego ole a na-ere ihe ndị dị mmadụ ezigbo mkpa bịara rịa elu ọjị. O nweghịzi uru ego obodo anyị bara. Ego niile m nwere n’ụlọ akụ̀ enweghịzi oké uru ha baara m.”
Paul
Paul ghọtara na ya ga-egosirịrị na ya nwere “ezi amamihe” ma ọ bụrụ na ọ chọghị ka agụụ gụgbuo ndị ezinụlọ ya. (Ilu 3:21) O kwuru, sị: “Abụ m onye ọrụ ngo na-awaya ọkụ. Ma, m bidoro ịna-awayara onye ọ bụla chọrọnụ ọkụ ma onye ahụ ọ̀ kwụrụ m ihe e kwesịrị ịkwụ m ma ọ bụ na ọ kwụrughị ya. Ụfọdụ ndị m rụụrụ ọrụ ji ihe oriri ma ọ bụ ngwá ụlọ kwụọ m ụgwọ. E jiri aka ncha anọ kwụọ m ụgwọ, mụ eree abụọ, dowe abụọ. Ụfọdụ ndị jikwa ụmụ ọkụkọ kwụọ m ụgwọ. Emechara m nwee ụmụ ọkụkọ iri anọ m na-azụ. Mgbe ha toro, erere m ha ma zụta narị ọkụkọ atọ. Eji m ọkụkọ iri ise gbanweta akpa nri ọka abụọ. Akpa nke ọ bụla hà ka akpa simenti n’ịdị arọ. Mụ na ezinụlọ m na ezinụlọ ndị ọzọ anyị nyetụrụ nri ọka a rigidere ya ruo ogologo oge.”
Paul makwa na ihe ga-akacha enyere mmadụ aka ná ndụ bụ ịtụkwasị Chineke obi. Chineke ga-enyere anyị aka ma anyị mee ihe ọ gwara anyị mee. Jizọs gwara anyị ihe ga-enyere anyị aka ma anyị na-achọ inweta ihe e ji ebi ndụ. Ọ sịrị: “Kwụsịkwanụ ịnọ na-echegbu onwe unu; n’ihi na . . . Nna unu maara na ihe ndị a dị unu mkpa.”—Luk 12:29-31.
Ọ dị mwute na Setan, bụ́ ezigbote onye iro Chineke, emeela ka ọtụtụ ndị na-achụ ihe e ji ebi ndụ ka à na-anwụ anwụ. Ọtụtụ ndị na-echegbukarị onwe ha maka ihe ndị dị ha mkpa na ihe ndị ha chere na ọ ga-adị ha mkpa. Ha na-agbalịsi ike ka ha nweta ọtụtụ ihe na-adịghị ha mkpa. Ọtụtụ n’ime ha abanyekwala ná nnukwu ụgwọ. Ọ bụ mgbe ha banyechara n’ụgwọ ka ha na-aghọta na ‘onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’—Ilu 22:7.
E nweekwala ụfọdụ ndị mere ihe kpatakwuuru ha nsogbu. Paul kwuru ihe ụfọdụ ndị agbata obi ya mere mgbe ahụ ihe siri ike n’obodo ha. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị agbata obi anyị hapụrụ ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha gawa mba ọzọ iji lee ma ihe ọ̀ ga-akara ha mma. Ụfọdụ enwelighị ike ịchọta ọrụ n’ihi na ha ejighị akwụkwọ ikike banye n’obodo ndị ahụ. Ha na-ezokarị ezo ka aka ndị uwe ojii ghara ịkpara ha. Ha na-ehikwa n’okporo ụzọ. Ha enyeghị Chineke ohere ka o nyere ha aka. Ma, mụ na ndị ezinụlọ m kpebiri na anyị agaghị ahapụ ibe anyị. Kama, anyị ga-agbakọ mbọ ọnụ n’oge ihe siiri anyị ike ma tụkwasị Chineke obi na ọ ga-enyere anyị aka.”
IME IHE JIZỌS KWURU
Paul sịrị: “Jizọs kwuru, sị: ‘Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.’” Paul kwuziri, sị: “Ọ bụ ya mere ihe m na-arịọ Chineke n’ụbọchị ọ bụla bụ ka o ‘nye anyị nri taa maka ụbọchị taa’ ka anyị nwee ike ịdịrị ndụ na-aga. Chineke nyekwaara anyị aka otú ahụ Jizọs kwuru. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị nwetara ihe anyị chọrọ. E nwere otu ụbọchị m kwụ n’ahịrị na-achọ ịzụta ihe anyị ga-eri. Amaghịkwanụ m ihe a na-ere. Mgbe o mechara rutere m, m chọpụtara na ọ bụ yogọt. Anaghị m enwe mmasị ịracha yogọt. Ma ebe ọ bụ ihe oriri dịnụ, mụ na ezinụlọ m rara ya n’abalị ahụ. Ana m ekele Chineke na ọ gọziri mụ na ezinụlọ m n’oge ahụ niile. O nweghị mgbe anyị gba ọnụ lakpuo.”a
Chineke kwuru, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”—Ndị Hibru 13:5
“Ihe dịtụụrụ anyị mfe ugbu a. Ma, n’oge ahụ ihe siiri anyị ike, anyị mụtara na ịtụkwasị Chineke obi na-akacha enyere mmadụ aka ka ọ ghara ichegbu onwe ya. Ọ bụrụhaala na anyị na-eme uche Jehova,b ọ ga na-enyere anyị aka mgbe niile. Anyị ahụla na ihe Abụ Ọma 34:8 kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: ‘Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma; obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke gbabara n’ime ya.’ Ọ bụ ya mere na anyị anaghị echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eme ma ihe siere anyị ike ọzọ.
Chineke na-enyere ndị na-efe ya aka inweta nri kwa ụbọchị
“Anyị aghọtala na ihe dị mmadụ mkpa iji dịrị ndụ abụghị ọrụ ma ọ bụ ego, kama, ọ bụ nri. Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ mgbe Chineke ga-emezu nkwa a o kwere: ‘Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa.’ Ma, ka ọ dịgodị, ‘ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.’ Obi na-esi anyị ike ma anyị cheta ihe a Baịbụl kwuru: ‘Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a. N’ihi na o kwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” Ka anyị nwee obi ike wee sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu.”’”c
Okwukwe anyị ga-esirịrị ike tupu anyị enwee ike ‘iso Chineke na-eje ije’ otú Paul na ezinụlọ ya na-eme. (Jenesis 6:9) Ma ihe ò siiri anyị ezigbo ike ugbu a ma ọ̀ ga-esiri anyị ike n’ọdịnihu, inwe okwukwe na igosi na anyị nwere ezi amamihe otú Paul mere ga-enyere anyị ezigbo aka.
Ma, gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe na-echegbu anyị bụ nsogbu ezinụlọ?
a Gụọ Matiu 6:11, 34.
b Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.
-
-
Nchegbu Gbasara EzinụlọỤlọ Nche—2015 | Julaị 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?
Nchegbu Gbasara Ezinụlọ
Janet kwuru, sị: “Obere oge papa m nwụchara, di m gwara m na o nwere nwaanyị ya na ya na-akpa. Mgbe obere oge gachara, ọ gwaghị m ihe ọ bụla ọzọ, ya ewekọrọ uwe ya, hapụ mụ na ụmụ anyị abụọ.” Janet chọtara ọrụ, ma, ihe a na-akwụ ya anaghị ezuru ya iji lekọta ụmụaka ha. O nwekwara ihe ọzọ na-aka enye ya nsogbu. Janet kwuru, sị: “Abịara m na-echegbu onwe m n’ihi na naanị m na-arụzi ọrụ nne na nna kwesịrị ịrụ. Ọ na-ewute m na enweghị m ike inye ụmụ m ihe niile dị ha mkpa otú nne na nna ndị ọzọ si enye ụmụ ha. M na-echegbukwa onwe m gbasara otú ndị ọzọ si ele mụ na ụmụ m anya. Amaghị m ma hà na-eche na ihe mere di m ji hapụ anyị si m n’aka.”
Janet
Ekpere nyeere Janet aka ya akwụsị ịna-echegbu onwe ya, ya na Chineke adịkwuokwa ná mma. Janet kwuru, sị: “M na-aka echegbu onwe m n’abalị ma ebe niile daa jụụ. Ma, m kpee ekpere, gụọkwa Baịbụl, m na-enwe ike ihi ụra. Ebe na-akacha atọ m ụtọ na Baịbụl bụ Ndị Filipaị 4:6, 7. Ebe ahụ sịrị: ‘Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.’ Ọ na-abụ m kpechaa ekpere n’abalị, Jehova emee ka obi ruo m ala.”
N’otu oge Jizọs na-ezi ndị mmadụ ihe n’elu ugwu, o kwuru ihe ga-enyere anyị aka ma e nwee ihe na-echegbu anyị. Ọ sịrị: “Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupu unu arịọ ya.” (Matiu 6:8) Anyị kwesịkwara ịrịọ ya ka o nyere anyị aka. Ihe kacha mkpa anyị ga-eme iji ‘bịaruo Chineke nso’ bụ ikpe ekpere. Anyị bịaruo ya nso, ‘ọ ga-abịarukwa anyị nso.’—Jems 4:8.
E nwekwara uru ọzọ ekpere na-abara anyị ma e wezụga ime ka obi ruo anyị ala. Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” na-emekwara ndị niile nwere okwukwe na ya ihe ha na-arịọ ya. (Abụ Ọma 65:2) Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya “ka ha na-ekpe ekpere mgbe niile ma ghara ịda mbà.” (Luk 18:1) Anyị kwesịrị ịnọgide na-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme mgbe ihe siiri anyị ike, ma nwee okwukwe na ọ ga-aza ekpere anyị. Anyị ekwesịghị inwewe obi abụọ ma ọ̀ dịkwa Chineke n’obi ịza ekpere anyị ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ga-azali ya. Anyị si otú a na-ekpe “ekpere n’akwụsịghị akwụsị,” anyị na-egosi na okwukwe anyị siri ike.—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.
OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ NWERE OKWUKWE
Gịnịdị ka mmadụ inwe okwukwe pụtara? Ihe so n’ihe anyị ga-eme tupu a sị na anyị nwere okwukwe bụ ‘ịmata’ onye Chineke bụ. (Jọn 17:3) Anyị ga-ebu ụzọ mụọ Baịbụl mata ihe bụ uche Chineke. Anyị ga-amụta na Chineke na-ahụ onye ọ bụla n’ime anyị nakwa na ọ chọrọ inyere anyị aka. Ma, ọ bụghị naanị ịmụta gbasara Chineke ga-egosi na anyị nwere okwukwe siri ike. Kama, anyị ga na-akwanyekwara Chineke ùgwù ma gbalịa ka anyị na ya bụrụ enyi. Anyị chọọ ka anyị na mmadụ bụrụ enyi, anyị ga-agbarịrị mbọ na-akpakwu ya nso. ‘Okwukwe anyị ga-adị ukwuu karị’ ma ọ bụrụ na anyị na-amụtakwu gbasara Chineke, “na-eme ihe dị ya mma,” ma na-ahụkwa otú o si enyere anyị aka. (2 Ndị Kọrịnt 10:15; Jọn 8:29) Ọ bụ ụdị okwukwe a mere ka Janet kwụsị ịna-echegbu onwe ya.
Janet kwuru, sị: “Ihe kacha nyere m aka inwekwu okwukwe bụ na m na-ahụ otú Jehova si enyere m aka ná nsogbu m niile. O nwere ọtụtụ mgbe a na-emegbu anyị, ya adị m ka nke anyị na-eme ọ̀ gwụla. Ma ọ na-abụ, anyị kọọrọ Jehova mkpa anyị ugboro ugboro, ya esi otú m na-atụghị anya ya za anyị ekpere. Mgbe m na-ekele Jehova, m na-echeta ọtụtụ ihe ọma ndị o meerela m. Ọ na-enye anyị ihe anyị chọrọ mgbe ọ ga-akacha abara anyị uru. O meela ka m nwee ezigbo ndị enyi, ma ụmụnna ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ha na-enyere mụ na ụmụ m aka mgbe niile. Ụmụ m na-amụtakwa ihe n’àgwà ọma ha.”a
“Ama m ihe mere Jehova ji kwuo na Malakaị 2:16 na ya ‘kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị.’ Di ma ọ bụ nwunye hapụ ibe ya, gbakwuru nwoke ọzọ ma ọ bụ nwaanyị ọzọ, obi na-agbawa onye nke aka ya dị ọcha. Ọtụtụ afọ agaala kemgbe di m hapụrụ m, ma owu ka na-ama m, ya ana-adịkwa m ka o nweghị uru m bara. Mgbe ọ bụla ọ dị m otú a, m na-agbalị chọọ ihe m ga-eme ga-abara onye ọzọ uru. Ihe a m na-eme na-enyere m aka.” Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ịna-akpa iche. Ime ihe a Baịbụl kwuru nyeere Janet aka, ya aghara ịna-echegbu onwe ya.b—Ilu 18:1.
Janet kwukwara, sị: “Ihe kacha nyere m aka bụ ịmata na Chineke bụ ‘nna nke ụmụ na-enweghị nna nakwa onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.’ Ama m na o mekataghị hapụ m otú di m mere.” (Abụ Ọma 68:5) Janet ma na Chineke anaghị eji “ihe ọjọọ” ele mmadụ ule. Kama, ọ na-enye anyị niile amamihe na “ike karịrị ike nkịtị” ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka nsogbu ọ bụla bịaara anyị.—Jems 1:5, 13; 2 Ndị Kọrịnt 4:7.
Ma, gịnị ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị maka ihe ọjọọ nwere ike ime anyị?
b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị, gụọ ihe e kwuru n’isiokwu ndị mbụ gbara na Teta! Septemba–Ọktoba 2015, nke isiokwu ya bụ “Ndụ Gị Ọ̀ Dị Otú Ị Chọrọ Ka Ọ Dịrị?” Ọ dịkwa na www.pr2711.com/ig.
Chineke bụ “nna nke ụmụ na-enweghị nna nakwa onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.”—Abụ Ọma 68:5
-
-
Nchegbu Gbasara ỌdachiỤlọ Nche—2015 | Julaị 1
-
-
ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?
Nchegbu Gbasara Ọdachi
Otu nwaanyị aha ya bụ Alona kwuru, sị: “Mgbe m nụrụ ụda opi na-egosi na a na-aga ịtụ bọmbụ, obi malitere ịkụ m kpum kpum, mụ agbaba ebe a na-anọ eze mgbọ. Ma, obi ka ga-anọ na-akụ m kpum kpum n’ebe ahụ. Ọ na-aka njọ ma ọ bụrụ na ahụghị m ebe m ga-anọ eze mgbọ. O nwedịrị otu ụbọchị m nọ na-aga n’okporo ụzọ, opi ahụ egbuwe, mụ ebewe ákwá, begide ákwá tụbọọ. Ọtụtụ awa gafere tupu mụ enweta onwe m. Obere oge, opi ahụ ebidokwa gbuwe ọzọ.”
Alona
E wezụga agha, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-akpata ọdachi ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ibido chegbuwe onwe gị ma ị chọpụta na ị na-arịa ọrịa nwere ike igbu gị ma ọ bụkwanụ ma ị mata na onye ị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa nwere ike igbu ya. E nwekwara ndị ihe na-echegbu ha bụ ma nsogbu ndị dị ka agha, mpụ, mmetọ ikuku na mmiri, oké okpomọkụ, oké mmiri ozuzo, na ajọ ọrịa na-efe efe ọ̀ ga-akpa ụmụ ha aka ọjọọ ma ha too. Olee otú anyị ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe ndị a?
Baịbụl kwuru na “onye maara ihe nke hụrụ ọdachi agawo zoo.” (Ilu 27:12) Otú ahụ anyị na-agba mbọ ka ahụ́ na-agbasi anyị ike, anyị nwekwara ike ime ihe ụfọdụ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. Akụkọ ụwa na fim ndị a na-egosi ndị na-eme ihe ike so eme ka anyị na ụmụaka anyị na-echegbu onwe anyị. Anyị kwụsị ile ihe ndị dị otú ahụ, ọ pụtaghị na anyị achọghịzi ịma ihe ndị na-eme n’ụwa. Chineke ekeghị anyị ka anyị na-eche gbasara ihe ọjọọ. Kama, o kere anyị ka anyị na-eche gbasara “ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, . . . nke ziri ezi, . . . nke dị ọcha, . . . nke na-akpali ịhụnanya.” Ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ndị a, “Chineke nke udo” ga-eme ka obi ruo anyị ala, meekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị.—Ndị Filipaị 4:8, 9.
URU EKPERE BARA
Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘mụrụ anya ka anyị wee na-ekpe ekpere.’ (1 Pita 4:7) Nsogbu bịara anyị, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka, nye anyị amamihe na obi anyị ga-eji die nsogbu ahụ. Obi kwesịkwara isi anyị ike na “ọ na-anụ olu anyị n’ihe ọ bụla anyị na-arịọ.”—1 Jọn 5:15.
Ya na di ya bụ́ Avi
Baịbụl kwuru ihe gosiri na “onye na-achị ụwa a” bụ Setan, ọ bụghị Chineke. O kwukwara na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị ka anyị na-arịọ Chineke ka ọ “napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Matiu 6:13) Alona kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla opi na-egosi na a na-aga ịtụ bọmbụ gbuwere, m na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ka m jide onwe m. Di m na-akpọ m n’ekwentị anyị ekpekọọ ekpere ọnụ. Ekpere na-enyere m ezigbo aka.” Baịbụl kwuru, sị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu.”—Abụ Ọma 145:18.
MGBE IHE NDỊ NA-AKPATA NCHEGBU NA-AGAGHỊZI ADỊ
Mgbe Jizọs nọ n’elu ugwu na-akụziri ndị mmadụ ihe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ Chineke, sị: “Ka alaeze gị bịa.” (Matiu 6:10) Alaeze Chineke ga-eme ka ihe niile na-eme ka ụmụ mmadụ na-echegbu onwe ha kwụsị ruo mgbe ebighị ebi. Chineke ga-esi n’aka Jizọs, bụ́ “Onyeisi Udo,” mee “ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” (Aịzaya 9:6; Abụ Ọma 46:9) Chineke “ga-ekpe ikpe n’etiti ọtụtụ ndị . . . Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha. . . . Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” (Maịka 4:3, 4) Ezinụlọ niile ga na-enwe obi ụtọ. Ha “ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha.” (Aịzaya 65:21) “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”—Aịzaya 33:24.
O nweghị ihe anyị ga-emeli taa ka “ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” kwụsị ma ọ bụkwanụ ka anyị gharazie ịnọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. (Ekliziastis 9:11) Kemgbe ọtụtụ narị afọ ruo taa, agha, ime ihe ike, na ọrịa egbuola ọtụtụ ndị ezigbo mmadụ. Ndị a niile aka ha dị ọcha hà ga-adị ndụ ọzọ?
Ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Ma, ọ bụ naanị Chineke ma ole ha dị. Ka ọ dịgodị, ha na-ehi ụra, Chineke ga na-echetakwa ha, ruo ụbọchị “ndị niile nọ n’ili ncheta” ga-apụta. (Jọn 5:28, 29) O nwere ihe Baịbụl kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ mere ka obi sie anyị ike. Ọ sịrị: “Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka maka mkpụrụ obi. Ọ bụ nke e ji n’aka, nke guzosikwara ike.” (Ndị Hibru 6:19) Chineke ‘enyewokwa mmadụ niile ihe ga-emesi ha obi ike, ebe ọ bụ na o mere ka Jizọs si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’—Ọrụ Ndịozi 17:31.
Ma tupu mgbe ahụ, ihe ndị nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị ga-abịara anyị, ọ bụrụgodị na anyị na-eme uche Chineke. Ihe na-enyere Paul, Janet, na Alona aka ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha bụ ịrịọ Chineke ka o nyere ha aka, inwe okwukwe siri ike na nkwa Chineke kwere anyị ga-emezu, nakwa ime ihe ha nwere ike ime ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha. Chineke meere ha ihe ha rịọrọ ya. ‘Ka Chineke onye na-enye olileanya meekwa ka i jupụta n’ọṅụ niile na udo niile n’ihi na i kwere ekwe.’—Ndị Rom 15:13.
-