Abụ nke 64
Mee Eziokwu ahụ nke Gị
1. Ụzọ eziokwu bụ ụzọ ndụ kacha mma,
’Madụ agagh’ebiri gị ndụ gị.
N’ihi ya, gee ntị na ndụmọdụ Jehova;
Kwere n’ọ n’agwa gị eziokwu.
(KORỌS)
Me’eziokwu nke gị.
Mee k’ọ bụrụ nke gị.
Ị g’enwet’ọṅụ
Jehova n’enye
Ma eziokwu bụrụ nke gị.
2. N’ihi mgbalị gị na oge ị n’etinye
N’ozi Chineke na Al’eze ya,
Ị g’erit’uru, nweta ndụ ebigh’ebi,
Nwetakwa ọtụtụ ih’ọma.
(KORỌS)
Me’eziokwu nke gị.
Mee k’ọ bụrụ nke gị.
Ị g’enwet’ọṅụ
Jehova n’enye
Ma eziokwu bụrụ nke gị.
3. Anyị b’ụmụaka n’ebe Chinek’anyị nọ,
Ndụmọdụ ya dị anyị mkpa.
Soro Jehova n’eje ije kw’ụbọchị;
Ọ g’agọzi gị nk’ukwuu.
(KORỌS)
Me’eziokwu nke gị.
Mee k’ọ bụrụ nke gị.
Ị g’enwet’ọṅụ
Jehova n’enye
Ma eziokwu bụrụ nke gị.
(Gụọkwa Ọma 26:3; Ilu 8:35; 15:31; Jọn 8:31, 32.)