Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-akwụwa Aka Ọtọ?
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 1
    • Ebe onye were mmadụ n’ọrụ na-atụ onye o were n’ọrụ aka n’ihu, na-abara ya mba

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỊKWỤWA AKA ỌTỌ Ọ̀ BARA URU?

      Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-akwụwa Aka Ọtọ?

      E nwere otu nwoke aha ya bụ Hitoshi. Ọ na-arụ na ngalaba na-edekọ mkpata na mmefu n’otu ụlọ ọrụ na-achọtara ndị mmadụ ọrụ na Japan. Mgbe ya na otu n’ime ndị isi ha na-eleba anya n’akwụkwọ ha ji edekọ ego, onyeisi ha ahụ gwara ya ka o dee ego ole dị́ iche n’ihe ha gbakọtara. Hitoshi gwara ya na akọnuche ya agaghị ekwe ya dee ihe na-abụghị eziokwu. Onyeisi ya ahụ gwaziri ya na ọ ga-achụ ya n’ọrụ. O mechakwara chụọ ya n’ọrụ.

      Mgbe ọnwa ole na ole gachara, obi jọwara Hitoshi njọ n’ihi na ọ maghị ma ọ̀ ga-achọtakwa ọrụ ọzọ. N’otu oge ọ gara ka ụlọ ọrụ na-ewe mmadụ n’ọrụ gbaa ya ajụjụ ọnụ, ọ gwara onye na-agba ya ajụjụ ọnụ na ya agaghị arụ ọrụ ọ bụla a na-anaghị akwụwa aka ọtọ na ya. Onye ahụ gwara ya na ọ maghị ebe a nọ. Ndị ezinụlọ Hitoshi na ndị enyi ya gbara ya ume ka ọ nọgide na-akwụwa aka ọtọ. Ma, o bidoro nwewe obi abụọ. O kwuru, sị: “M bịara na-eche ma ọ̀ ka baara m uru ịna-agwa ndị ọzọ na m na-enwe mmasị ịkwụwa aka ọtọ.”

      Ihe a mere Hitoshi gosiri na ọ bụghị mmadụ niile na-enwe mmasị ịkwụwa aka ọtọ. Ụfọdụ ndị na-ewere na ịkwụwa aka ọtọ ga-eme ka ahịa ha ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ha na-eme na-agba ọnyụpaa. Otu nwaanyị na Saụt Afrịka kwuru na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ anaghị akwụwa aka ọtọ nakwa na mgbe ụfọdụ, ọ na-afọ obere ka o mee ka ọ ghara ịkwụwa aka ọtọ.

      O nwere ọtụtụ ihe mmadụ ga-eme, a sị na onye ahụ akwụwaghị aka ọtọ. Otu n’ime ha ndị mmadụ kacha eme bụ ịgha ụgha. O nwere ihe Robert S. Feldman na ndị òtù ya chọpụtara n’otu nchọnchọ ha mere n’afọ ole na ole gara aga. Nwoke a bụ ọkà n’akparamàgwà mmadụ. Ha chọpụtara na ụzọ isii n’ime ụzọ iri ndị dimkpa nọ́ n’ụwa na-agha ụgha, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu ugboro n’ime nkeji iri ọ bụla ha na mmadụ kparịtara ụka. Feldman kwuru, sị: “Ihe a anyị chọpụtara tụrụ m n’anya. O nweghị onye n’ime anyị tụrụ anya na ndị mmadụ ga na-agha ụgha otú a.” Ị̀ hụlanụ na ụgha a ndị mmadụ na-anaghị achọ ka a ghaara ha, so n’ihe ọjọọ ha kacha eme taa?

      Gịnị mere ọtụtụ ndị taa ji agha ụgha, ezu ohi, emekwa ihe ndị ọzọ na-egosi na ha anaghị akwụwa aka ọtọ? Olee ihe akwụwaghị aka ọtọ nwere ike ịkpatara anyị? Ajụjụ kadị mkpa bụ, olee otú anyị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile?

  • Ihe Akwụwaghị Aka Ọtọ Ga-akpatara Gị
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 1
    • Ebe ụmụ nwaanyị abụọ na-agwa ibe ha okwu

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỊKWỤWA AKA ỌTỌ Ọ̀ BARA URU?

      Ihe Akwụwaghị Aka Ọtọ Ga-akpatara Gị

      Otu nwaanyị Saụt Afrịka aha ya bụ Samantha kwuru, sị: “A na-enwekarị nsogbu ndị ọ na-abụ, anyị ghatụ obere ụgha, anyị esi na ha pụta.”

      Ì kwetara ihe a Samantha kwuru? N’eziokwu, onye ọ bụla n’ime anyị enweela oge otu nsogbu ma ọ bụ ọzọ bịaara ya. Ma, ihe anyị ga-eme ma anyị nwee ụdị nsogbu nwere ike ime ka anyị ghara ịkwụwa aka ọtọ ga-egosi ihe anyị ji kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa ná ndụ bụ ka a ghara imenye anyị ihere, anyị nwere ike iwere na o nweghị ihe o mere ma anyị ghara ịkwụwa aka ọtọ mgbe ụfọdụ. Ma, n’ikpeazụ, anyị na-ahụ na akwụwaghị aka ọtọ na-aghọkarị ahịa. Ka anyị lee otú o si aghọ ahịa.

      MMADỤ AKWỤWAGHỊ AKA ỌTỌ GA-EME KA NDỊ ỌZỌ KWỤSỊ ỊTỤKWASỊ YA OBI

      Ọ bụrụ na mmadụ abụọ tụkwasịrị ibe ha obi, ha ga na-adị ná mma. Ha agaghị na-enyo ibe ha enyo. Ma, ọ naghị abụ mmadụ hụhaala ibe ya, ya ebido ozugbo tụkwasịwa ya obi. Mmadụ na-ebido ịtụkwasị ibe ya obi ma ha na-anọkọ, na-akọrọ ibe ha obi ha, ma na-achọkwa ọdịmma ibe ha. Ma, mmadụ nwere ike ịkwụsị ịtụkwasị enyi ya obi ma ọ ghọọ ya aghụghọ naanị otu ugbo. Ụdị ihe a mee, ọ na-esi ezigbo ike ịtụkwasị onye ahụ obi ọzọ.

      Ezigbo enyi gị ọ̀ ghọtụla gị aghụghọ? Olee otú obi dị gị mgbe ahụ? Ọ ga-abụ na o wutere gị, ma ọ bụdị na i weere ya na enyi gị ahụ mechuru gị ihu. Ọ bụ otú ọ na-adị. O doro anya na mmadụ abụọ dị́ n’ezigbo mma nwere ike kwụsị ịdị ná mma n’ihi na otu onye n’ime ha akwụwaghị aka ọtọ.

      I SORO NDỊ NA-ANAGHỊ AKWỤWA AKA ỌTỌ NA-AKPA, Ị GA-EMEWE KA HA

      N’otu nchọpụta otu prọfesọ aha ya bụ Robert Innes mere, ọ chọpụtara na “n’eziokwu, akwụwaghị aka ọtọ dị ka ọrịa na-efe efe.” Onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ dị ka onye bú ọrịa na-efe efe. Ọ bụrụ na gị na onye na-anaghị akwụwa aka ọtọ na-akpachi anya, i nwere ike ibido mewe ka ya.

      Olee ihe ga-enyere gị aka ịna-akwụwa aka ọtọ mgbe niile? Ọ bụ Baịbụl. Ka anyị lebazie anya n’ihe ole na ole Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka.

      Ihe Akwụwaghị Aka Ọtọ Pụtara

      Ịgha Ụgha

      Ebe otu nwoke na-agbapụ ọla o ji gbaa akwụkwọ

      GỊNỊ KA Ọ PỤTARA? Ọ pụtara ịgwa onye kwesịrị ịma eziokwu ihe na-abụghị eziokwu. Ọ pụtakwara ikwu ihe na-abụchaghị otú o si mee iji duhie mmadụ, na ịghara ikwu ihe ụfọdụ iji duhie mmadụ, nakwa mmadụ ime ka ọ̀ bụ ihe ọ na-abụghị.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.” (Ilu 3:32) “Ebe unu hapụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”—Ndị Efesọs 4:25.

      Nkwutọ

      Ebe ụmụ nwoke abụọ na-atakwụnyere ibe ha okwu mgbe otu nwoke na-abata n’ụlọ ha nọ

      GỊNỊ KA Ọ PỤTARA? Ọ pụtara ịgha ụgha ma ọ bụ ikwu ihe na-abụghị eziokwu iji mebie aha mmadụ.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye aghụghọ na-ezisa esemokwu, onye nkwutọ na-ekewakwa ndị ha na ibe ha dị ná mma.” (Ilu 16:28) “Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ, ọ bụrụkwa na e nweghị onye nkwutọ, esemokwu na-akwụsị.”—Ilu 26:20.

      Irigbu Mmadụ

      Ebe otu nwoke na-atụ aka n’elekere ndị a na-agba n’aka o zoro na kootu ya

      GỊNỊ KA Ọ PỤTARA? Ọ pụtara ịghọgbu mmadụ rie ego ya ma ọ bụ nara ya ihe ndị o nwere.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Erigbula onye ọrụ e goro ego nke nọ ná nsogbu, nke dakwara ogbenye.” (Diuterọnọmi 24:14, 15) “Onye na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya akọchawo Onye kere ya, ma onye na-emere ogbenye amara na-enye Ya otuto.”—Ilu 14:31.

      Izu Ohi

      Ebe otu onye na-ezuru wọlet dị́ n’akpa onye ọzọ

      GỊNỊ KA Ọ PỤTARA? Ọ pụtara iwere ihe mmadụ n’anataghị ya ikike.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ ọma, ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.” (Ndị Efesọs 4:28) “Unu ekwela ka e duhie unu. . . . Ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.

  • Ihe Mere Ịkwụwa Aka Ọtọ Ji Aba Uru
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 1
    • Ebe otu nwoke na-enye onye nwe wọlet ọ tụtara wọlet ahụ

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỊKWỤWA AKA ỌTỌ Ọ̀ BARA URU?

      Ihe Mere Ịkwụwa Aka Ọtọ Ji Aba Uru

      “Anyị kwenyesịrị ike na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.

      Na Baịbụl, otu ihe okwu Grik a na-asụgharị “ime ihe n’eziokwu” ma ọ bụ ịkwụwa aka ọtọ pụtara bụ “ime ihe dị ezigbo mma.” O nwekwara ike ịpụta ịkpa àgwà ọma.

      Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” Ndị Kraịst ji ihe a o kwuru kpọrọ ihe. Ma, gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

      ỌGỤ ANYỊ NA MMEHIE ANYỊ BU PỤTA ỤWA NA-ALỤ

      Ọtụtụ ndị na-ele onwe ha n’enyo n’ụtụtụ ọ bụla tupu ha apụọ. Maka gịnị? Maka na ha chọrọ ịdị nnọọ mma n’anya tupu ha apụwa. Ma, o nwere ihe ka mkpa karịa ịkpụ isi mara mma ma ọ bụ iyi uwe dị́ sam. Àgwà anyị nwere ike ime ka otú anyị dị n’anya na-amasịkwu ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ ghara ịna-amasị ha.

      Okwu Chineke kwuru hoo haa na ime ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. Jenesis 8:21 sịrị: “Ọchịchọ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa.” N’ihi ya, iji nwee ike ịna-akwụwa aka ọtọ, anyị ga na-alụso ọchịchọ ọjọọ a anyị bu pụta ụwa ọgụ. Pọl onyeozi kọwara otú yanwa si na-alụso mmehie o bu pụta ụwa ọgụ. O kwuru, sị: “N’ezie, iwu Chineke na-eme m obi ụtọ, dị ka mmadụ m bụ n’ime si dị, ma ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.”—Ndị Rom 7:22, 23.

      Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na obi anyị na-agwa anyị mee ihe ọjọọ, ya abụrụkwa na ọ na-agụsi anyị ike ịghara ịkwụwa aka ọtọ, anyị ga-ajụli ime ihe ọjọọ ahụ obi anyị na-agwa anyị mee. Anyị gbaa mbọ ghara ịna-eche ihe ọjọọ, anyị ga-anọgide na-akwụwa aka ọtọ n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị anaghị akwụwa aka ọtọ.

      OTÚ ANYỊ GA-ESI EMERI N’ỌGỤ A

      Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-akwụwa aka ọtọ, anyị agaghị na-akpa àgwà otú masịrị anyị. Ọ dị mwute na oge ọtụtụ ndị na-ewepụta iji kpebie ụdị ejiji ha ga-eji karịrị oge ha na-ewepụta iji chọpụta ma àgwà ha ọ̀ dịkwa mma. Ọ bụ ya mere ha ji ewere na o nweghị ihe o mere ma ha ghara ịkwụwa aka ọtọ mgbe ụfọdụ. Legodị otú otu akwụkwọ kwuru gbasara akwụwaghị aka ọtọ si kọwaa ihe a ọtụtụ ndị na-eme. O kwuru, sị: “Anyị na-agbalị akwụwa aka ọtọ ka ndị mmadụ nwee ike ịna-akwanyere anyị ùgwù. Ma, anyị na-aghọ aghụghọ ma anyị chọpụta na ndị mmadụ agaghị ama.” Ma, è nwere ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ma ànyị kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ mgbe niile? Obi dị anyị ụtọ na e nwere.

      Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile achọpụtala na Baịbụl ga-enyeliri anyị aka ikpebi ma ànyị kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ mgbe niile. N’ime akwụkwọ niile na-ekwu gbasara otú mmadụ kwesịrị isi na-akpa àgwà, o nweghị nke dị ka Baịbụl. (Abụ Ọma 19:7) Anyị gụọ Baịbụl, anyị ga-amata ihe anyị ga-eme ka ezinụlọ anyị dịrị n’otu, ọrụ anyị ana-eme anyị obi ụtọ, anyị ana-akpa àgwà ọma, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ. Baịbụl na-abara ndị mmadụ uru kemgbe ụwa. N’agbanyeghị mba ma ọ bụ agbụrụ mmadụ si, onye ahụ mehaala ihe Baịbụl kwuru, ọ na-abara ya uru. Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl, na-echebara ihe anyị na-agụ echiche, ma na-eme ihe anyị gụtara, obi anyị ga na-agwa anyị ka anyị na-akwụwa aka ọtọ ma na-eme ihe ziri ezi.

      Ma, e wezụga ịmụ Baịbụl nke ọma, o nwere ihe ọzọ anyị ga-eme iji nwee ike ịna-akwụwa aka ọtọ. Anyị kwesịrị ịna-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịkwụwa aka ọtọ, ebe anyị bi n’ụwa retọrọ eretọ, a na-anwakwa anyị ime ka ha. (Ndị Filipaị 4:6, 7, 13) Chineke ga-enyere anyị aka ịkata obi na-eme ihe dị́ mma ma na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile anyị na-eme.

      URU ỊKWỤWA AKA ỌTỌ BARA

      Otú Hitoshi anyị kọrọ gbasara ya n’isiokwu mbụ n’akwụkwọ a si kwụwa aka ọtọ mechara baara ya uru. O mechara nweta ọrụ n’ebe onyeisi ọrụ ya ji ya kpọrọ ihe maka na ọ na-akwụwa aka ọtọ. Hitoshi kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na m mechara nweta ọrụ mere ka m nwee ike ịnọgide na-akwụwa aka ọtọ.”

      O nweekwala ndị ọzọ chọpụtara na ịkwụwa aka ọtọ bara uru. Ha “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile” dị ka Baịbụl kwuru ka anyị na-eme. Ka anyị lee otú ụfọdụ n’ime ha sirila rite uru.

      • Ọ Na-eme Ka Mmadụ Nwee Akọnuche Dị Ọcha

        Foto Cheryl

        Otu nwaanyị Ayaland aha ya bụ Cheryl kwuru, sị: “M kwụsịrị ịga ụlọ akwụkwọ mgbe m dị afọ iri na atọ, ma soro ndị ohi gawa ohi. E kee ihe niile m nwere n’oge ahụ ụzọ iri, ụzọ itoolu na ọkara bụ ihe ndị m zutere ezute. Emechara m lụọ di, mụ na ya amalitekwa iso Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Anyị kpebiri ịkwụsị izu ohi mgbe anyị mụtara na Jehovaa Chineke kpọrọ ndị na-anaghị akwụwa aka ha ọtọ asị. N’afọ 1990, anyị nyefere Jehova onwe anyị, e meekwa anyị baptizim, anyị aghọọ Ndịàmà Jehova.”—Ilu 6:16-19.

        “N’oge mbụ, ihe juru n’ụlọ m bụ ihe ndị e zutere ezute. Ma ugbu a, ụdị ihe ndị ahụ adịghịzi na ya. O meela ka akọnuche m dị ọcha. Ọ na-abụ m cheta ọtụtụ afọ m nọbu na-ezu ohi, mụ ekelee Jehova maka otú o si meere m ebere. Obi na-abụ m sọ aṅụrị tupu mụ alaba ụra n’ụbọchị ọ bụla n’ihi na m ma na ihe m na-amasị Jehova ugbu a.”

        Foto Sonny

        Otu nwoke Họng Kọng aha ya bụ Sonny kwuru, sị: “O nwere otu ụbọchị ọga m chọpụtara na m jụrụ ịnara aka azụ onye chọrọ ka anyị na ya zụkọwa ahịa nyere m, ya asị m: ‘N’eziokwu, Chineke gị kere gị ka ị bụrụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ị baara anyị ezigbo uru n’ụlọ ọrụ a.’ Ịkwụwa aka ọtọ n’ihe niile m na-eme emeela ka m nwee akọnuche dị ọcha, mụ na Jehova Chineke adịrịkwa ná mma. O meekwala ka m nwee ike inyere ndị ezinụlọ m na ndị enyi m aka ịna-akwụwa aka ọtọ.”

      • Ọ Na-eme Ka Obi Ruo Mmadụ Ala

        Foto Tom

        Otu nwoke Amerịka aha ya bụ Tom kwuru, sị: “Abụ m osote onyeisi n’otu ụlọ akụ̀ ngalaba ya dị n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ihe ka ọtụtụ ndị ọrụ anyị mkpa bụ ịfọju akpa ha, ọ bụghị ịkwụwa aka ọtọ. Otu ihe ha na-ekwukarị bụ na o nweghị ihe dị njọ ma a na-aghatụ obere ụgha iji nweta nnukwu ego, e jirikwa ego ahụ na-akwalite akụnụba obodo. Ma, obi na-eru m ala maka na m na-akwụwa aka ọtọ. Ekpebiekwala m na m ga-anọgide na-akwụwa aka ọtọ ihe ọ sọkwara ya ya mee. Ndị m na-arụrụ ọrụ ma na agaghị m aghara ha ụgha ma ọ bụ jiri maka ha ghaa ụgha.”

      • Ọ Na-eme Ka A Na-asọpụrụ Mmadụ

        Foto Kaori

        Otu nwaanyị Japan aha ya bụ Kaori kwuru, sị: “Onyeisi ná ngalaba m na-arụ gwara m ka m ghaa ụgha gbasara ihe a na-achọ achọ n’ụlọ ọrụ anyị, mụ ajụ. Mgbe e mechara mata ndị zuuru ihe ahụ, onye m na-arụrụ ọrụ kelere m maka ikwu eziokwu. Mmadụ ga-akatarịrị obi tupu ya enwee ike ịkwụwa aka ọtọ n’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị akwụwa aka ha ọtọ. Ma mmadụ kata obi na-akwụwa aka ọtọ, ndị ọzọ ga na-atụkwasị ya obi, na-asọpụkwara ya.”

      Onye na-akwụwa aka ọtọ ga-enwe akọnuche dị́ ọcha, obi eruo ya ala, ndị ọzọ ana-asọpụkwara ya. Ihe ndị a na-egosi na ọ bara uru ịna-akwụwa aka ọtọ. Gịnị ka i chere?

      a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya