Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Ị Ga-eme Ma Mmadụ Nwụnahụ Gị
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 3
    • Ebe otu nwaanyị na-ebe ákwá

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

      Ihe Ị Ga-eme Ma Mmadụ Nwụnahụ Gị

      “Nne ebezila ị̀ nụ? . . . Chukwu ma nke ka mma.”

      Ihe a ka mmadụ takwunyeere otu nwaanyị aha ya bụ Bebe. Onye ahụ gwara ya ihe a mgbe a na-eli papa ya nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ.

      Bebe na papa ya dị n’ezigbo mma. Onye gwara Bebe ihe ahụ iji kasie ya obi bụ otu nwaanyị ya na ezinụlọ Bebe hà dị ná mma. Ma, ihe ahụ ọ gwara Bebe gbawara ya obi. Ihe Bebe nọ na-ajụ onwe ya bụ, “ọnwụ papa m ọ̀ bụnụ ihe ọma?” Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Bebe dere ihe a merenụ n’akwụkwọ. Ihe o dere gosiri na ọ ka na-eru uju ọnwụ papa ya.

      Otu ihe Bebe bịara chọpụta bụ na ọ naghị adị mfe mmadụ ịkwụsị iru uju ọnwụ onye nwụnahụrụ ya, karịchaa, ma ọ bụrụ na ya na onye ahụ dị n’ezigbo mma. Baịbụl kpọrọ ọnwụ “onye iro ikpeazụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Onye anyị hụrụ n’anya nwụọ, ọ na-akpaghasị ndụ anyị, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ na mberede. O nweghị onye n’ime anyị ọnwụ na-anaghị akpa aka ọjọọ. Ọ bụ ya mere o ji esiri anyị ike mgbe ụfọdụ ịma ihe anyị ga-eme ma mmadụ nwụnahụ anyị.

      I nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ̀ ga-ewe mmadụ afọ ole tupu ya akwụsị iru uju onye nwụnahụrụ ya? Olee ihe ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ onye nwụnahụrụ ya? Olee otú m ga-esi kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi? Ndị nwụnahụrụ anyị, hà ga-adị ndụ ọzọ?’

  • Mmadụ Iru Uju Ọ̀ Dị Njọ?
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 3
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

      Mmadụ Iru Uju Ọ̀ Dị Njọ?

      Ò nwetụla mgbe ị rịara obere ọrịa? Ọ bụrụ na o nwetụla, ikekwe, ị gbakere ngwa ngwa nke na i chefuodịla nsogbu o nyere gị. Ma, ọ bụghị otú ọ na-adị ma mmadụ ruwe uju. Otu dọkịta aha ya bụ Alan Wolfelt kwuru ihe ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ di ma ọ bụ nwunye ya. Ọ sịrị: “Mmadụ anaghị akwụsị iru uju akwụsị.” Ma, o kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na ndị ọzọ ana-agbalị akasi onye ahụ obi, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ nwetawa onwe ya.”

      Ka anyị legodị ihe Ebreham mere mgbe nwunye ya nwụrụ. Baịbụl kwuru na o “bidoro ịkwara Sera ákwá arịrị na ibere ya ákwá.” (Jenesis 23:2; Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, nke afọ 2013, Bekee) Mgbe Baịbụl kwuru na Ebreham “bidoro” ịkwara nwunye ya ákwá arịrị, ọ na-egosi na o were ya oge tupu ya enwee ike idi ọnwụ nwunye ya.a Jekọb rutekwara uju aka mgbe ụmụ ya ghọgburu ya, mee ka o were ya na anụ ọhịa adọgbuola Josef nwa ya. O ruuru ya uju ruo “ọtụtụ ụbọchị.” Ndị ezinụlọ ya enwelighịkwa ike ịkasi ya obi. Mgbe ọtụtụ afọ gachakwara, ọnwụ Josef ka nọ na-ewute ya.—Jenesis 37:34, 35; 42:36; 45:28.

      Ebe Ebreham na-ebe ákwá n’akụkụ ozu Sera nwunye ya

      Ebreham ruru uju mgbe Sera nwunye ọma ya nwụrụ

      Ọ bụkwa otú ọ na-adị ọtụtụ ndị taa ma onye ha na ha dị n’ezigbo mma nwụọ. Ka anyị leba anya n’akụkọ mmadụ abụọ.

      • Otu nwaanyị aha ya bụ Gail, onye dị́ afọ iri isii, kwuru, sị: “Robert di m nwụrụ n’otu ihe mberede mere n’abalị itoolu n’ọnwa Julaị afọ 2008. Mgbe anyị richara nri ụtụtụ n’ụbọchị ahụ, anyị mere ihe anyị na-emekarị tupu ya agawa ọrụ. Anyị susuru ibe anyị ọnụ, makụọ ibe anyị, sịkwa ibe anyị, ‘ahụrụ m gị n’anya.’ Afọ isii ọ nwụchara, ọnwụ ya ka na-agbawa m obi. Echeghị m na ọ ga-apụli m apụ n’obi.”

      • Otu nwoke aha ya bụ Etienne, onye dị́ afọ iri asatọ na anọ, kwuru, sị: “N’agbanyeghị na ọ karịala afọ iri na asatọ nwunye ọma m nwụrụ, agụụ ịhụ ya na-agụ m, m ka na-erukwara ya uju. M hụ ihe mara mma, mụ echeta ya, na-echekwa otú obi gaara adị ya ma á sị na ọ hụrụ ihe ahụ m hụrụ.”

      N’eziokwu, o nweghị onye ọ na-adịrị mfe idi ọnwụ mmadụ. Otú ndị mmadụ si eru uju dị iche iche, ọ dịghịkwa mma ịta mmadụ ụta maka otú o si eru uju. Anyị ekwesịghịkwa ịtawa onwe anyị ụta ma o siwere anyị ike idi ọnwụ onye nwụnahụrụ anyị. Ma, olee ihe ga-enyere anyị aka idi ya?

      a Aịzik nwa Ebreham bụkwa onye ọzọ ruru uju ruo ogologo oge. N’isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha,” nke dị́ n’Ụlọ Nche a, e kwuru na mgbe ihe dị ka afọ atọ Sera nne ya nwụchara, ọ ka na-eru uju ọnwụ ya.—Jenesis 24:67.

  • Ihe Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Nwụnahụrụ Gị
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 3
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

      Ihe Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Nwụnahụrụ Gị

      Ndị mmadụ ekwuola ọtụtụ ihe ha chere ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ onye nwụnahụrụ ya. Ma, ọ bụghị ha niile na-enyere mmadụ aka. O nwere ike ịbụ na ị nụtụla ebe a na-agwa onye mmadụ nwụnahụrụ ka ọ ghara ibe ákwá ma ọ bụ ime ka ọnwụ ahụ ọ̀ na-ewute ya. O nwekwara ndị nke na-asị onye ahụ besiwe ákwá ike, sịkwa ya mee ihe niile ga-egosi na ihe merenụ na-ewute ya. Ma, Baịbụl kwuru ihe dabara adaba, nke ndị ọkachamara taa chọpụtakwarala na ọ na-enye aka.

      N’ebe ụfọdụ, a na-ekwu na nwoke ekwesịghị ibe ákwá. Ma, mmadụ ò kwesịdịrị ime ihere ibe ákwá ma mgbe naanị ya nọ ma n’ihu ọha? Ndị dọkịta kwuru na ọ dịghị njọ ma onye mmadụ nwụnahụrụ bee ákwá. Mgbe ụfọdụ, ọ na-enyere onye ahụ aka inwetatụ onwe ya, ya emewekwa ihe ndị ọzọ o kwesịrị ime. Ma, onye ahụ na-akpachi ákwá na-agụ ya, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu. Baịbụl akwadoghị na ọ dị njọ ibe ákwá ma ọ bụkwanụ na nwoke ekwesịghị ibe ákwá. Ka anyị legodị ihe Jizọs mere n’otu oge. Mgbe Lazarọs enyi ya nwoke nwụrụ, o bere ákwá n’ihu ọha n’agbanyeghị na o nwere ike ịkpọlite ya.—Jọn 11:33-35.

      O nwere ndị na-ewe ezigbo iwe ma mmadụ nwụnahụ ha, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ na mberede. Ọtụtụ ihe nwere ike ịkpasu onye mmadụ nwụnahụrụ iwe. O nwere ike ịbụ na onye ọ na-akwanyere ùgwù kwuru okwu gbawara ya obi. Otu nwoke onye Saụt Afrịka aha ya bụ Mike kwuru ihe mere mgbe papa ya nwụrụ. Ọ sịrị: “Adị m naanị afọ iri na anọ mgbe papa m nwụrụ. Mgbe a na-eli ya, onye ụkọchukwu Anglịkan kwuru na Chineke chọrọ ndị ezi mmadụ nakwa na ọ na-akpọrọ ha ngwa ngwa.a Ihe a o kwuru were m ezigbo iwe n’ihi na papa anyị dị anyị ezigbo mkpa. O ruola afọ iri isii na atọ ihe a mere, ma ọ ka na-ewute m.”

      Ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-ata onwe ha ụta, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ na mberede. Ha nwere ike ịna-eche na á sị na ha mere nke a ma ọ bụ nke ọzọ na onye ahụ agaraghị anwụ. O nwekwara ndị na-akwa ezigbo ụta ma ha cheta na mgbe ikpeazụ ha na onye ahụ kwuru okwu, ha barịtara mba.

      Ọ bụrụ na ị na-ewe iwe ma ọ bụ na-ata onwe gị ụta maka ihe merenụ, kọọrọ ya otu enyi gị ga-ege gị ntị ma nyere gị aka ịghọta na otú ọ dị gị ka ọ na-adị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.

      Enyi kacha mma onye mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ịkọrọ otú obi dị ya bụ Onye kere anyị, bụ́ Jehova. Kpee ekpere, kọọrọ ya otú obi dị gị n’ihi na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) O kwere nkwa na ọ ga-eji “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” mee ka obi ruo gị ala ma ị kọọrọ ya ihe na-enye gị nsogbu n’obi. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ihe ọzọ ọ ga-eji kasie gị obi bụ Baịbụl. Gbalịsie ike na-agụ ya. Depụta amaokwu ndị nwere ike ịkasi gị obi. (Gụọ ihe dị n’igbe dị n’isiokwu a.) I nwedịrị ike ibu ụfọdụ n’ime ha n’isi. Icheta ihe amaokwu ndị ahụ kwuru ga-enyere gị aka, karịchaa, n’abalị naanị gị nọ, ụra na-ekweghịkwa atụ gị.—Aịzaya 57:15.

      O nwere otu nwoke dị́ afọ iri anọ anyị ga-akpọ Jack. Ọrịa kansa gburu nwunye ya n’oge na-adịbeghị anya. Jack sịrị na owu na-achọ ịmagbu ya mgbe ụfọdụ. Ma, ekpere nyeere ya aka. Ọ sịrị: “M kpee ekpere, Jehova na-eme ka owu kwụsị ịma m. Ọ na-abụ ụra pụọ m n’anya n’ime abalị, mụ ebilie, gụọ ebe ụfọdụ na Baịbụl, chebara ihe m gụrụ echiche, gwakwa Jehova ihe na-enye m nsogbu n’obi. Obi na-eruzi m ala, ụra atụwakwa m ọzọ.”

      Mama otu nwaanyị aha ya bụ Vanessa rịagidere ọrịa nwụọ. Vanessa achọpụtakwala na ekpere na-akpa ike dị egwu. Ọ sịrị: “Ọ na-abụ obi jọwa m njọ n’ihi ihe a mere m, mụ akpọkuo Chineke, bewekwa ezigbo ákwá. Jehova na-enyekwa m ike idi ya.”

      Ụfọdụ ndị gụrụ gbasara inye ndị mmadụ nwụnahụrụ ndụmọdụ na-agwa ndị ọ na-esiri ike idi ọnwụ onye nwụnahụrụ ha ka ha na-enyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ na-arụ ụfọdụ ọrụ ga-abara obodo ha uru. Ha na-eme ha, obi ga na-adị ha ụtọ, ha ana-enwetatụkwa onwe ha. (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ọtụtụ Ndị Kraịst mmadụ nwụnahụrụ achọpụtakwala na inyere ndị ọzọ aka na-akasi ha obi.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.

      a Ihe a abụghị ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara anyị ihe atọ mere mmadụ ji anwụ anwụ.—Ekliziastis 9:11; Jọn 8:44; Ndị Rom 5:12.

      AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ GA-AKASI GỊ OBI

      • Ihe na-ewute gị na-ewutekwa Chineke.​—Abụ Ọma 55:22; 1 Pita 5:7.

      • Chineke na-emere ndị ohu ya ihe ha na-arịọ ya.​—Abụ Ọma 86:5; 1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

      • Ọ na-agụsi Chineke agụụ ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.​—Job 14:13-15.

      • Chineke kwere nkwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.​—Aịzaya 26:19; Jọn 5:28, 29.

  • Otú Ị Ga-esi Akasi Mmadụ Obi
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 3
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

      Otú Ị Ga-esi Akasi Mmadụ Obi

      Ebe otu nwoke na nwa ya nwoke guzo n’ebe a na-eli ozu

      Ò nwetụla mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-eme ma ọ bụ ihe ị ga-ekwu iji kasie onye mmadụ nwụnahụrụ obi? Ya dị ụfọdụ ndị otú a, ha agaghị eme ihe ọ bụla iji kasie onye ahụ obi. Ma, lee ihe ụfọdụ i nwere ike ime iji nyere onye ahụ aka.

      Ihe na-akasikarị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ obi bụ ịga na nke ha ma sị ha “ndo.” N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ịmakụ onye ahụ ma ọ bụ ikonye ya aka ga-eme ka onye ahụ mara na ihe mere ya wutere anyị. Onye ahụ chọọ ikwu okwu, gee ya ntị nke ọma. Ihe kacha mkpa i nwere ike imere ezinụlọ ihe ahụ mere bụ imere ha ihe ụfọdụ ha na-enweghị ike ime, dị ka isi nri, ilekọta ụmụaka ha, ma ọ bụ inyeaka n’olili ozu ma ọ bụrụ na ọ ga-amasị ha. Imere ha ihe ndị ahụ nwere ike iru ha n’obi karịa okwu nkịtị ị gwara ha.

      Ka oge na-aga, i nwere ike ikwuwe gbasara onye ahụ nwụrụ anwụ, ikekwe, na-akọ gbasara àgwà ọma ụfọdụ onye ahụ nwere ma ọ bụ ihe ndị o mere mere gị obi ụtọ. Ịkọrọ onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ ihe ndị a nwedịrị ike ime ka o bido mụmụwa ọnụ ọchị. Dị ka ihe atụ, di otu nwaanyị aha ya bụ Pam nwụrụ afọ isii gara aga. Aha di ya a bụ Ian. Pam kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-agwa m gbasara ihe ọma di m mere m na-amaghịdị. Ọ na-emekwa m obi ụtọ.”

      Ndị na-eme nchọpụta kwuru na oge mmadụ nwụrụ ọhụrụ, ndị mmadụ na-abịa akasi ndị ezinụlọ ya obi. Ma, obere oge gachaa, onye ọ bụla ebidokwa mewe ihe ndị dịịrị ya, o nweghịzi onye ga-echeta bịa nyere ndị ahụ ihe mere aka. N’ihi ya, gbalịa ka gị na enyi gị mmadụ nwụnahụrụ na-ekwurịta okwu ọtụtụ mgbe.a Ụdị ihe a na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ n’ihi na ọ na-eme ka ha nwee ike ikwu otú nsogbu ahụ dị ha n’obi, ha enwetakwa onwe ha.

      Legodị ihe mere Kaori. Ọ bụ nwa agbọghọ onye Japan. Mama ya nwụrụ, n’ime otu afọ na ọnwa atọ kwa, nwanne ya nwaanyị anwụọ. Obi gbawara ya. Ma ndị enyi ya nọgidere na-enyere ya aka. Aha otu n’ime ha bụ Ritsuko. Ritsuko tọrọ Kaori ọfụma. Ọ kpawara Kaori nso. Kaori kwuru, sị: “Ịgwa gị eziokwu, obi adịghị mụ mma maka otú o si na-eme ka ọ̀ bụ mama m. Achọghị m ka onye ọ bụla nọchie mama m, echeghịkwa m na onye ọ bụla ga-anọchili ya. Ma n’ihi otú mama a si na-egosi m na ya hụrụ m n’anya, mụ na ya bịara dị n’ezigbo mma. Mụ na ya na-eso aga ozi ọma na ọmụmụ ihe n’izu ọ bụla. Ọ na-akpọ m ka mụ na ya ṅụkọọ tii ma ọ bụ rikọọ nri. Ọ na-edetara m akwụkwọ ozi, na-ezitekwara m kaadị ọtụtụ oge. Àgwà ọma mama a nyeere m ezigbo aka.”

      Afọ iri na abụọ agaala kemgbe mama Kaori nwụrụ. Taakwa, Kaori na di ya na-ezisa ozi ọma oge niile. Kaori kwuru, sị: “Mama Ritsuko nọgidere na-egosi m na ya hụrụ m n’anya. Mgbe ọ bụla m gara ụlọ anyị, m na-aga eleta ya. Mụ na ya kparịtachaakwa, obi na-adị m ụtọ.”

      Onye ọzọ ndị mmadụ kasiri obi mgbe mmadụ nwụnahụrụ ya bụ otu nwaanyị Saịprọs aha ya bụ Poli. Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Aha di ya bụ Sozos. Di ya ejighị ya egwu egwu. Ọ bụkwa okenye e ji ama atụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ na-akpọkarị ụmụ mgbei na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ka ha bịa n’ụlọ ha, ha esoro ha kparịta ụka, rikọọkwa nri. (Jems 1:27) Ma ọrịa akpụ ụbụrụ gburu Sozos mgbe ọ dị afọ iri ise na atọ. Poli sịrị: “Ọnwụ egbuola ezigbo di m mụ na ya lụrụla ruo afọ iri atọ na atọ.”

      Ebe otu di na nwunye buteere otu nwoke na nwa ya nri

      Chọọ otú ị ga-esi na-enyere ndị mmadụ nwụnahụrụ aka

      Mgbe e lichara Sozos, Poli kpọọrọ Daniel nwa ha nwoke nke nta dị́ afọ iri na ise kwaga Kanada. Mgbe ha rutere, ha malitere iso ọgbakọ Ndịàmà Jehova nọ́ ebe ahụ na-amụ ihe. Poli kwuru, sị: “Ụmụnna anyị na ha nọ n’ọgbakọ a amaghị gbasara ihe mere anyị na nsogbu anyị na ya na-alụ. Ma, ha bịara na-akpa anyị nso, na-agwa anyị okwu ndị na-eru anyị n’obi, na-enyekwara anyị aka n’ihe ụfọdụ. Aka ahụ ha nyeere anyị baara anyị ezigbo uru, karịchaa, n’ihi na o mere ka nwa m nwoke ghara ịna-echegbukarị onwe ya maka ọnwụ papa ya. Ụmụnna ndị na-elekọta ọgbakọ anyị ejighị Daniel egwu egwu. Otu n’ime ha na-akpọ ya aga ebe ọ bụla ya na ndị enyi ya chọrọ ịga nọrịa. Ọ na-akpọkwa ya aga agba bọl.” Poli na nwa ya nwoke na-enwe obi ụtọ taa.

      Otu ihe doro anya bụ na e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị mmadụ nwụnahụrụ aka ma kasie ha obi. Ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu na-akasikwa anyị obi.

      a Ụfọdụ ndị na-akanye akara ụbọchị onye ahụ nwụrụ na kalenda ha, ka ha nwee ike icheta ịkasi ndị ọ nwụnahụrụ obi n’ụbọchị ọ bụla ọ manyere n’afọ ma ọ bụ ma ụbọchị ahụ ruwe.

  • Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 3
    • ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

      Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ

      N’isiokwu nke abụọ n’Ụlọ Nche a, Gail kwuru na ya echeghị na ọnwụ Rob di ya ga-apụli ya apụ n’obi. Ma, ọ na-atụ anya ịhụ ya ọzọ n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere nkwa ya. Gail sịrị: “Amaokwu Baịbụl kacha amasị m bụ Mkpughe 21:3, 4.” Ebe ahụ sịrị: “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”

      Gail kwuru, sị: “Ọ bụ nkwa a na-akasi m obi. Ndị m na-emetere ebere ugbu a bụ ndị na-amaghị na ha nwere ike ịhụ onye nwụnahụrụ ha ọzọ.” Gail na-eme ihe gosiri na o kwenyesiri ike na nkwa a Chineke kwere ga-emezu. Ọ na-aga ozi ọma oge niile, na-akọrọ ndị mmadụ na Chineke kwere nkwa na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.”

      Ebe etuto tokasịrị Job n’ahụ́

      Obi siri Job ike na ọ ga-adị ndụ ọzọ

      I nwere ike ịna-eche ma ihe a ọ̀ ga-ekwekwa omume. Ma, legodị ihe mere otu nwoke a na-akpọ Job. Ezigbo ọrịa jidere ya n’otu oge. (Job 2:7) Ọ bụ eziokwu na o weere na ọ ga-akara ya mma ịnwụ, ma o nwere okwukwe na ya nwụọ, Chineke ga-akpọliteli ya n’ọnwụ, ya adịrịkwa ndụ ọzọ n’ụwa a. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” (Job 14:13, 15) Obi siri Job ike na ya nwụọ, ọ ga-agụsi Chineke agụụ ike ịhụ ya ọzọ na ịkpọlite ya n’ọnwụ.

      N’oge na-adịghị anya, mgbe Chineke ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs, ọ ga-akpọlite ma Job ma ọtụtụ ndị ọzọ nwụrụ anwụ. (Luk 23:42, 43) Baịbụl kwuru n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi 24:15 na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ.” Jizọs gwakwara anyị, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya, wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Job ga-eso ná ndị Chineke ga-emere ihe a. Ọ ga-enweghachikwa “ike okorobịa” ya, ‘ahụ́ ya adịkwa ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata’ ruo mgbe ebighị ebi. (Job 33:24, 25) Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka a ga-emere ndị niile ga-egosi na ha nwere okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.

      Ọ bụrụ na o nweela onye nwụnahụrụ gị, ime ihe ndị anyị kwuru n’akwụkwọ a nwere ike ọ gaghị eme ka ị kwụsị iru uju kpamkpam. Ma, ịtụgharị uche ná nkwa ndị Chineke kwere na Baịbụl nwere ike ime ka i nwee olileanya na ihe ga-aka mma, meekwa ka i nwee ike ị ga-eji na-eme ihe ndị ọzọ i kwesịrị ime.—1 Ndị Tesalonaịka 4:13.

      Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu ihe ga-enyere gị aka idi ọnwụ onye nwụnahụrụ gị, ma ọ bụkwanụ na ị ga-achọ ịmata ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ na ahụhụ dịrị, biko, gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. Ị ga-ahụ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ma kasie gị obi.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya