Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Ndị A Kọrọ Gbasara Jizọs Hà Mere Eme n’Eziokwu?
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 2
    • Ebe a na-ebutu ozu Jizọs n’osisi e ji kpọgbuo ya, ndị na-eso ụzọ ya ana-ele ihe na-emenụ

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE JIZỌS JI TAA AHỤHỤ MA NWỤỌ?

      Ihe Ndị A Kọrọ Gbasara Jizọs Hà Mere Eme n’Eziokwu?

      E gburu Jizọs onye Nazaret n’oge opupu ihe ubi n’afọ 33. E boro ya ebubo ụgha na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru. A kụrụ ya isi aba okpu, kpọgidekwa ya n’elu osisi. Ọ nụrụ ụfụ ọnwụ. Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, mgbe ụbọchị iri anọ gachakwara, Jizọs laghachiri n’eluigwe.

      Ị ga-agụta akụkọ a n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ha dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ. Ma, ihe ndị ahụ a kọrọ hà mere eme n’eziokwu? Ajụjụ a dị oké mkpa. Ọ bụrụ na ha emeghị eme, o nweghị uru mmadụ ịghọ Onye Kraịst bara, olileanya anyị nwere na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs dịkwa ka mmadụ ịmụ anya na-arọ nrọ. (1 Ndị Kọrịnt 15:14) Ma ọ bụrụkwanụ na ha mere eme n’eziokwu, ọ pụtara na ọtụtụ ihe ọma ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu, i nwekwara ike iso ná ndị ọ ga-emere. Ka anyị chọpụtazie ma ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn hà mere eme ka hà bụ akụkọ ifo.

      IHE IHE NDỊ MERE EME NA-EGOSI

      Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn adịghị ka akụkọ ifo. Ị gụọ ha, ị ga-ahụ na ndị dere ha kpachapụrụ anya dee ihe ndị merenụ otú ha si mee. Dị ka ihe atụ, ha kpọrọ aha obodo ndị dị adị, ọtụtụ n’ime obodo ndị ahụ dịkwa ruo taa. Ha kọrọ gbasara ndị dịrị ndụ n’ụwa a, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme achọpụtakwala na ndị ahụ ha kọrọ akụkọ ha dịrị ndụ n’ụwa n’oge ahụ.—Luk 3:1, 2, 23.

      N’oge ndịozi Jizọs nakwa mgbe ihe dị ka otu narị afọ gachara, ụfọdụ ndị na-ede akụkọ ihe mere eme biri n’oge ahụ dere gbasara Jizọs.a Ihe Matiu, Mak, Luk na Jọn dekwara gbasara otú e si kpọgide ya n’osisi dabara n’otú ndị Rom oge ahụ si egbu onye a mara ikpe ọnwụ. Matiu, Mak, Luk na Jọn kọrọ ihe ndị ha kọrọ otú gosiri na ha mere eme n’eziokwu. Ha kọdịrị ihe ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-emetaghị. (Matiu 26:56; Luk 22:24-26; Jọn 18:10, 11) Ihe a niile gosiri na ha kwuru eziokwu nakwa na ihe niile ha dere gbasara Jizọs bụ eziokwu.

      JIZỌS Ò BILITERE N’ỌNWỤ N’EZIOKWU?

      E nwere ọtụtụ ndị kweere na Jizọs dịrị ndụ ma mechaa nwụọ, ma ụfọdụ ekwetaghị na o bilitere n’ọnwụ. Ndịozi ya ekwetadịghị mgbe mbụ a gwara ha na o bilitela n’ọnwụ. (Luk 24:11) Ma ha na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs mechara kweta mgbe ha hụrụ Jizọs ugboro ugboro mgbe o bilitechara n’ọnwụ. O nwedịrị mgbe Jizọs pụtara n’ihu ihe karịrị narị mmadụ ise.—1 Ndị Kọrịnt 15:6.

      Ndị na-eso ụzọ Jizọs katara obi na-agwa mmadụ niile, ọbụnadị ndị ahụ gburu Jizọs, na a kpọlitela ya n’ọnwụ n’agbanyeghị na e nwere ike ịtụ ha mkpọrọ ma ọ bụdị gbuo ha. (Ọrụ Ndịozi 4:1-3, 10, 19, 20; 5:27-32) Hà gaara akata obi otú a ma ọ bụrụ na ha ejighị n’aka na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ? Ihe mere ọtụtụ ndị ji ghọọ Ndị Kraịst, ma n’oge ahụ ma taa, bụ n’ihi na obi siri ha ike na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ.

      Ị gụọ ihe ndị Matiu, Mak, Luk na Jọn dere gbasara ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs, ị ga-ama na ha bụ eziokwu. Ọ bụrụkwa na i jiri nwayọọ gụọ ha, ọ ga-edo gị anya na ihe ndị a mere eme. Ha ga-edokwu gị anya ma ị ghọta ihe mere ha ji mee. Isiokwu na-eso nke a ga-akọwa ya.

      a E nwere otu nwoke aha ya bụ Tasitọs. A mụrụ ya mgbe ndịozi Jizọs ka nọ ndụ. O kwuru, sị: “Ọ bụ mgbe Taịbiriọs na-achị ka otu n’ime ndị ọchịchị anyị aha ya bụ Pọntiọs Paịlet mara Kraịst ikpe ọnwụ, onye e si n’aha ya nweta aha bụ́ [Ndị Kraịst].” Ndị ọzọ kọrọ gbasara Jizọs bụ Switoniọs (ọ dịrị ndụ n’oge ndịozi Jizọs); Josifọs bụ́ onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme (ọ dịrị ndụ n’oge ndịozi Jizọs); nakwa Plini nke Nta, bụ́ gọvanọ Bitinia (obere oge ndịozi Jizọs nwụchara).

      Gịnị Mere na E Nweghị Akwụkwọ Ọzọ E Dere n’Oge Ndịozi Kwuru Ihe Gosiri na Jizọs Si n’Ọnwụ Bilie?

      Ọ bụ eziokwu na Jizọs bụ onye a ma ama, ma, anyị ekwesịghị ịtụ anya na anyị ga-ahụ akwụkwọ ndị e dere n’oge ndịozi Jizọs, ma e wezụga akwụkwọ ndị dị na Baịbụl, kwuru ihe mere anyị kwesịrị iji kwere na Jizọs dịrị ndụ, nwụọ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ. Otu ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ bụ na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ kemgbe e dere akwụkwọ Matiu, Mak, Luk na Jọn. Ha so n’akwụkwọ ole na ole n’ime akwụkwọ ndị e dere n’oge ahụ ka dị taa. (1 Pita 1:24, 25) Ihe ọzọkwa bụ na ọtụtụ ndị iro Jizọs n’oge ahụ agaghị anọkata dee ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ kweta na ihe ndị a na-akọ gbasara Jizọs bụ eziokwu.

      Otu n’ime ndịozi Jizọs aha ya bụ Pita kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ Jizọs, sị: “Chineke kpọlitere Onye a n’ụbọchị nke atọ ma mee ka ọ pụta ìhè, ọ bụghị nye mmadụ niile, kama nye ndị àmà Chineke họpụtara tupu oge eruo, nye anyị, bụ́ ndị anyị na ya riri ma ṅụọ mgbe o bilitesịrị ná ndị nwụrụ anwụ.” (Ọrụ Ndịozi 10:40, 41) Gịnị mere na ọ bụghị mmadụ niile ma na Jizọs ebilitela n’ọnwụ? Akwụkwọ Matiu gwara anyị otu n’ime ihe ndị kpatara ya. O kwuru na mgbe ndị Juu bụ́ ndị iro Jizọs nụrụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ, ha gbara mbọ ka ndị mmadụ kwụsị ịkọsa ya.—Matiu 28:11-15.

      Ọ̀ pụtara na Jizọs achọghị ka ndị mmadụ mara na a kpọlitere ya n’ọnwụ? Mba. Pita sịrị: “O nyekwara anyị iwu ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịgba àmà nke ọma na onye a bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” Ezigbo Ndị Kraịst kwusara ya, ha ka na-ekwusakwa ya.—Ọrụ Ndịozi 10:42.

  • Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ Ma Nwụọ?
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2016 | Nke 2
    • Ebe ndị si n’agbụrụ dị iche iche na-enwe obi ụtọ na paradaịs

      ISIOKWU ỤLỌ NCHE A

      Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ Ma Nwụọ?

      “Mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ, Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.”—Ndị Rom 5:12

      Ebe Adam na Iv nọ na-ele mkpụrụ osisi a sịrị ha erila anya; mgbe Adam na Iv kara nká; ebe e bu igbe ozu na-aga n’ebe a na-eli ozu

      Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị ma ị̀ ga-achọ ịdị ndụ ebighị ebi, gịnị ka ị ga-aza? Ọtụtụ ndị ga-asị na ha ga-achọ, mana, ha echeghị na ọ ga-ekwe omume. Ha ga-asịkwa na onye ọ bụla dị ndụ ga-anwụrịrị otu ụbọchị.

      Ma ọ bụrụkwanụ na a jụọ gị ma ị̀ chọrọ ịnwụ, gịnị ka ị ga-aza? Ọtụtụ ndị ga-asị mba. Gịnịdị ka anyị na-ekwu? Anyị na-achọ ịdịrị ndụ na-aga n’agbanyeghị ọtụtụ nsogbu ndị na-abịara anyị. Baịbụl kwuru ihe gosiri na Chineke kere anyị ka ịdị ndụ na-agụ anyị agụụ. O kwudịrị na “o tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi [anyị].”—Ekliziastis 3:11.

      Ma, ụmụ mmadụ anaghị adị ndụ ebighị ebi taa. Gịnị meziri? Ò nweela ihe Chineke mere iji napụta anyị? Anyị mata ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ ndị a, obi ga-adị anyị ụtọ, anyị ga-amatakwa ihe mere Jizọs ji taa ahụhụ ma nwụọ.

      GỊNỊ MERE NA ANYỊ ANAGHỊ ADỊ NDỤ EBIGHỊ EBI?

      Jenesis isi nke mbụ ruo nke atọ gwara anyị na Chineke gwara Adam na Iv ihe ha ga-eme iji dịrị ndụ ebighị ebi. Ebe ahụ kọkwara otú ha si nupụrụ Chineke isi nke mere ka ha gharazie ịdị ndụ ebighị ebi. Otú e si kọọ akụkọ a dị nnọọ mfe nghọta nke na ụfọdụ ndị na-asị na ọ bụ akụkọ ifo. Ma, ị gụọ akwụkwọ Jenesis, ị ga-ahụ na ọ kọrọ ihe ndị mere eme otú ahụ Matiu, Mak, Luk na Jọn si kọọ ihe mere eme.a

      Gịnị ka nnupụisi Adam kpatara? Baịbụl kwuru, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [ya bụ, Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Adam ghọrọ onye mmehie mgbe o nupụụrụ Chineke isi. Ọ bụ ya mere na ọ dịghịzi ndụ ebighị ebi. Ebe anyị bụ ụmụ ya, anyị ketakwara mmehie ya. Ọ bụ ya mere anyị ji arịa ọrịa, na-aka nká ma na-anwụkwa anwụ. Otú a anyị si keta mmehie n’aka Adam dabara n’ihe ndị sayensị chọpụtara gbasara otú ụmụ si eyi ndị mụrụ ha. Ma, ò nweela ihe Chineke mere iji napụta anyị?

      IHE CHINEKE MERELA IJI NAPỤTA ANYỊ

      N’eziokwu, Chineke emeela ndokwa ka ụmụ Adam nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi nke Adam na-adịlighị n’ihi nnupụisi ya. Olee otú Chineke si mee ya?

      Baịbụl kwuru ná Ndị Rom 6:23 na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” Ọ pụtara na onye mehierenụ ga-anwụ. Adam nwụrụ n’ihi na o mehiere. Anyịnwa na-anwụkwa anwụ n’ihi na anyị na-eme mmehie. Ma, ọ bụghị anyị kpatara ihe mere anyị ji anwụ, kama, anyị ketara mmehie n’aka Adam. N’ihi ya, Chineke gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya zite Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ọ bịa jiri ndụ ya kwụọ ụgwọ mmehie anyị. Olee otú ọ ga-esi eme ya?

      Ebe ndị si n’agbụrụ dị iche iche na-enwe obi ụtọ na paradaịs

      Ọnwụ Jizọs mere ka anyị nwee olileanya na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi, na-enwe obi ụtọ

      Ebe ọ bụ na Adam bụ mmadụ zuru okè tupu ya enupụ isi, mezie ka anyị bụrụ ndị mmehie ma na-anwụ anwụ, onye ga-enweli ike ịnapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ ga-abụ mmadụ zuru okè, nke na-agaghị enupụ isi ruo mgbe ọ nwụrụ. Baịbụl si otú a kọwaa ya: “Ebe ọ bụ na e mere ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị mmehie site ná nnupụisi nke otu onye ahụ, otú ahụkwa ka a ga-eme ka ọtụtụ mmadụ ghọọ ndị ezi omume site ná nrubeisi nke otu onye ahụ.” (Ndị Rom 5:19) Ọ bụ Jizọs bụ “otu onye ahụ” rubere isi. O si n’eluigwe bịa ghọọ mmadụ zuru okè n’ụwa,b nwụọkwa maka anyị. Ọ bụ ya mere anyị ga-eji nwee ike ịbụ ndị ezi omume n’anya Chineke ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.

      IHE MERE JIZỌS JI TAA AHỤHỤ MA NWỤỌ

      Ma, gịnị mere Jizọs ji kwesị ịnwụ tupu ya enwee ike ịnapụta anyị? Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ó nweghị ike ikwu ka ụmụ Adam dịrị ndụ ebighị ebi n’enweghị onye ga-anwụ maka ha? O doro anya na o nwere ikike ime ya. Ma, o mee ya, ihe ọ na-ekwu bụ na iwu ya, bụ́ na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, enweghịzi isi. Ma, ọ gaghịnụ eji maka otú ihe si dapụta megharịa iwu a dị ezigbo mkpa. Ọ bụ n’iwu a ka ikpe ziri ezi hiwere isi.—Abụ Ọma 37:28.

      Á sị na Chineke ekpeghị ikpe ziri ezi n’okwu a, obi agaaraghị na-esi ụmụ mmadụ ike na ọ ga na-ekpe ikpe ziri ezi n’okwu ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, olee ihe ọ ga-agbakwasị ụkwụ na ya kpebie nwa Adam nke ruru eru ịdị ndụ ebighị ebi? Ya kwe nkwa, à ga-atụkwasịli ya obi na ọ ga-emezu ya? Ebe ọ bụ na Chineke mere ihe ziri ezi iji gbapụta anyị, obi siri anyị ike na ọ ga na-eme ihe ziri ezi mgbe niile.

      Chineke ji àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mee ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs. Legodị ihe a Jizọs kwuru na Jọn 3:16: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ihe a Jizọs kwuru pụtara na ọnwụ ya gosiri na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile. Ma, nke ka nke bụ na o gosiri na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu.

      Oleekwanụ ihe mere Jizọs ji taa ezigbo ahụhụ tupu ya anwụọ dị ka Matiu, Mak, Luk na Jọn si kọọ? Otú ahụ Jizọs si die ahụhụ niile ọ tara, rubere Chineke isi ruo mgbe ọ nwụrụ, gosiri na Ekwensu ghara ụgha mgbe ọ sịrị na o nweghị mmadụ ọ bụla ga-erubeliri Chineke isi ma ọ na-ata ahụhụ. (Job 2:4, 5) E nwere ike iche na ihe Setan kwuru bụ eziokwu mgbe ahụ o mere ka Adam, bụ́ onye zuru okè, mehie. Ma, Jizọs, bụ́kwa onye zuru okè ka Adam, rubeere Chineke isi n’agbanyeghị ahụhụ ndị ọ tara. (1 Ndị Kọrịnt 15:45) O si otú ahụ gosi na Adam n’onwe ya gakwaara erubere Chineke isi ma á sị na ọ chọrọ. Jizọs diri ahụhụ ndị ọ tara, si otú ahụ kụziere anyị ihe anyị kwesịrị ịna-eme. (1 Pita 2:21) Chineke gọziri Ọkpara ya maka otú o si rubere ya isi. O nyere ya ndụ na-enweghị ọgwụgwụ n’eluigwe.

      OTÚ ỌNWỤ JIZỌS GA-ESI ABARA GỊ URU

      Jizọs nwụrụ anwụ n’eziokwu. Ọnwụ ya mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ị̀ ga-achọ ịdị ndụ ebighị ebi? Jizọs kwuru ihe anyị ga-eme iji dịrị ndụ ebighị ebi. Ọ sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

      Ndị bipụtara Ụlọ Nche a dị njikere inyere gị aka ka ị matakwuo Jehova, bụ́ ezi Chineke, na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova nọ́ n’obodo unu ụtọ inyere gị aka ma ị chọọ. Ị ga-ahụkwa ihe ga-enyere gị aka ma ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig.

      a Gụọ Ụlọ Nche Septemba 1, 2009, peeji nke 13. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

      b Chineke si n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’afọ Meri, Meri adịrị ime. Mmụọ nsọ Chineke mekwara ka Jizọs ghara ibute mmehie n’aka Meri.—Luk 1:31, 35.

      Ebe a na-ebugharị achịcha ná Ncheta Ọnwụ Jizọs

      “Na-emenụ Nke A”

      Mgbe Jizọs na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya, ọ malitere ihe a ga-eji na-echeta ọnwụ ya. Ọ gwara ha, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-eme ihe a Jizọs kwuru. Ha na-ezukọ n’afọ ọ bụla iji cheta ọnwụ Jizọs. N’afọ gara aga, ndị bịara maka Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụwa niile dị 19,862,783.

      N’afọ a, a ga-echeta ọnwụ Jizọs na Wenezdee, abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach, mgbe anyanwụ dachara. Ndịàmà Jehova na-akpọ gị na ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị ka unu bịa, nakwa ka unu gere okwu a ga-eji Baịbụl kwuo. A ga-akọwa ihe mere o ji dị mkpa ka Jizọs nwụọ na uru ọnwụ ya ga-abara gị. O nweghị onye a ga-ana ego. Biko, jụọ Ndịàmà Jehova nọ́ n’ebe i bi oge na ebe a ga-eme ya. I nwekwara ike ịmata ya ma ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya