Igbe Ajụjụ
◼ Olee mgbe anyị na onye anyị na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ịmụru ihe?
Ọ kacha mma ka anyị na onye anyị na-amụrụ Baịbụl, bụ́ onye na-eme nke ọma, na-amụ ihe ruo mgbe ọ mụchara akwụkwọ abụọ anyị kwesịrị ịmụrụ ya, ya bụ, akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? na “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” Anyị na onye ahụ kwesịrị ịna-amụ ihe a sịgodị na e mere ya baptizim tupu ya amụchaa akwụkwọ abụọ ahụ. E mechaa ya baptizim, anyị nwere ike ịna-agụrụ awa anyị na ya ji na-amụ ihe. Anyị nwekwara ike gụọ onye ahụ n’otu n’ime ndị anyị na-agara nletaghachi na otu n’ime ndị anyị na-amụrụ Baịbụl. Ọ bụrụ na onye nkwusa so anyị mgbe anyị gara mụọrọ onye ahụ ihe, ọ bụrụkwa na o tinyere ọnụ n’ọmụmụ ihe ahụ, o nwere ike ịgụrụ awa.—Gụọ Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa March 2009, peeji nke 2.
Ọ dị mkpa ka ndị ọhụrụ ghọta ihe Baịbụl na-akụzi nke ọma tupu a kwụsị ịmụrụ ha ihe. Ha kwesịrị ‘ịgbanye mgbọrọgwụ’ n’ime Kraịst ma “gbasie ike n’okwukwe,” ka ha nwee ike kwụrụ chịm ma nsogbu bịara ha. (Kọl. 2:6, 7; 2 Tim. 3:12; 1 Pita 5:8, 9) Ihe ọzọ bụ na hanwa kwesịrị inwe “ezi ihe ọmụma nke eziokwu” ka ha nwee ike kụziere ndị ọzọ Baịbụl nke ọma. (1 Tim. 2:4) Ọ bụrụ na anyị na ndị anyị na-amụrụ ihe amụchaa akwụkwọ abụọ ahụ, anyị na-enyere ha aka ịnọsi ike ‘n’ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ.’—Mat. 7:14.
Tupu ndị okenye ekwuo na mmadụ ruru eru ka e mee ya baptizim, ha kwesịrị ịhụ na onye ahụ ghọtara ozizi ndị bụ́ isi dị na Baịbụl nke ọma ma na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ndị okenye kwesịrị ilezikwu anya mgbe ha na-atụle ma onye na-amụchabeghị akwụkwọ Bible Na-akụzi ò ruru eru ka e mee ya baptizim. Ọ bụrụ na mmadụ erughị eru ka e mee ya baptizim, ndị okenye kwesịrị ịhụ na e nyeere onye ahụ ezigbo aka, ka o nwee ike ruo eruo n’ọdịnihu.—Gụọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 217-218.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 2]
Ọ dị mkpa ka ndị ọhụrụ ghọta ihe Baịbụl na-akụzi nke ọma