Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnwụ Na-agbawa Obi
    Teta!—2018 | No. 3
    • Ebe otu nwoke na-eru uju nọ naanị ya n’ebe a na-ere nri

      IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA

      Ọnwụ Na-agbawa Obi

      Otu nwoke aha ya bụ Kostas kwuru, sị: “Mụ na Sophiaa nwunye m lụrụ ihe karịrị afọ iri atọ na itoolu tupu ọrịa ọjọọ ọ na-arịa egbuo ya. Ndị enyi m nyeere m ezigbo aka idi ya. M gbalịkwara ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ọ na-apụ m n’obi. Ma ruo otu afọ, obi nọ na-agbawa m. Ọ dị m ka agaghị m edili ya. Ugbu a, n’agbanyeghị na o ruola afọ atọ ọ nwụrụ, obi ka na-agbawa m mgbe ụfọdụ, ma mgbe m na-anaghị eche gbasara ya.”

      Mmadụ ọ̀ nwụnahụtụla gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta otú obi dị Kostas. Ọnwụ di ma ọ bụ nwunye, onye ikwu na ezigbo enyi so n’ihe kacha akpatara ndị mmadụ obi mgbawa n’ụwa a. Ndị ọkachamara na-amụ gbasara otú ọ na-adị ndị mmadụ nwụnahụrụ kwetara na ọ bụ eziokwu. Otu akwụkwọ aha ya bụ The American Journal of Psychiatry kwuru na “ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ na-adị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ ka ha agaghị ahụ onye ahụ ọzọ. Ọ na-agbawakwa ha obi.” Ụdị ihe a mee mmadụ, onye ahụ nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee mgbe m ga-ediru ihe a? M̀ ga-enweli obi ụtọ ọzọ? Gịnị ga-enyere m aka idi ya?’

      A zara ajụjụ ndị ahụ na Teta! a. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe i nwere ike ịtụ anya ya ma ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị na nso nso a. Isiokwu ndị na-eso ya ga-ekwu ihe ndị nwere ike inyere gị aka idi ya.

      Anyị nwere olileanya na ihe ndị e dere n’isiokwu ndị a na-esonụ ga-akasi onye ọ bụla mmadụ nwụnahụrụ obi, nyekwara ya aka idi ya.

      a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

  • Ihe Ndị Ị Ga-atụ Anya Ya
    Teta!—2018 | No. 3
    • Di na nwunye na-eru uju

      IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA

      Ihe Ndị Ị Ga-atụ Anya Ya

      Onye ọ bụla n’ime anyị dị iche, n’ihi ya, mmadụ nwụnahụ anyị, otú onye ọ bụla si eru uju anaghị abụ otu. O nwere ike ịna-ewute ụfọdụ ma ha ana-eme ka ọ naghị ewute ha. Ọ bụ eziokwu na iru uju nwere ike ime ka onye mmadụ nwụnahụrụ nwetatụ onwe ya, anyị kwesịrị ịma na e nweghị otu ụzọ a ga-asị na ọ bụ ya “kacha mma” e si eru uju. Otú mmadụ si eru uju nwere ike ịdabere n’ebe o toro, ụdị onye ọ bụ, ihe ndị merela ná ndụ ya, nakwa otú onye ya si nwụọ.

      OLEE OTÚ O NWERE IKE ỊDỊRU NÁ NJỌ?

      Ndị mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ha agaghị ama ihe ha ga-atụ anya ya. Ma, e nwere otú obi na-adịkarị ndị mmadụ nwụnahụrụ, nweekwa nsogbu ndị ha nwere ike ịtụ anya ha. Ka anyị tụlegodị ụfọdụ n’ime ha:

      Obi nwere ike ịna-ajọ ha njọ. Onye mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ibe ákwá, na-achọ ka ọ hụ onye ahụ ọzọ. Obi nwekwara ike ịmalite ịjọ ya njọ n’enweghị ihe kpatara ya. Ihe ọzọ nwekwara ike ime ka obi na-ajọ ya njọ bụ ma o cheta ihe ụfọdụ gbasara onye ahụ ma ọ bụ rọta ya ná nrọ. Mgbe mbụ mmadụ nụrụ na onye ya nwụrụ, akpata oyi nwere ike ịwụ ya, ya adị ya ka ọ̀ nọ ná nrọ. Otu nwaanyị aha ya bụ Tiina kwuru ihe merenụ mgbe di ya bụ Timo gbabiiri nwụọ. O kwuru, sị: “O riri m ọnụ ná mmalite, ike ákwá adịdịghị m. Ọ gwụrụ m ike nke na o siiri m ike iku ume. Ọ dị m ka ọ̀ na-eme ná nrọ.”

      Ha nwere ike ịna-echegbu onwe ha, na-ewe iwe, obi ana-amakwa ha ikpe. Otu nwoke aha ya bụ Ivan kwuru, sị: “Mgbe Eric nwa anyị dị afọ iri abụọ na anọ nwụrụ, ezigbo iwe nọ na-ewe mụ na Yolanda nwunye m ruo oge ụfọdụ. O juru anyị anya n’ihi na anyị abụghị ndị iwe kemgbe ụwa. Obi anyị nọ na-ama anyị ikpe, anyị ana-echekwa ma ànyị mere ihe niile anyị kwesịrị ime iji nyere nwa anyị nwoke aka.” Obi otu nwoke aha ya bụ Alejandro makwara ya ikpe mgbe nwunye ya rịachara ọrịa ogologo oge nwụọ. Ọ sịrị: “Ná mmalite, m nọ na-eche na m bụ onye ọjọọ, ebe Chineke hapụrụ m ka m taa ụdị ahụhụ a. O mere ka obi m na-ama m ikpe, ya adị m ka m̀ na-ata Chineke ụta maka ihe mere m.” Kostas anyị kwuru gbasara ya ná mmalite kwuru, sị: “O nwedịrị oge ndị m na-ewere Sophia iwe na ọ nwụrụ. M mechaa, ya ewutewa m na m chere otú ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ bụghị ya kpatara ọnwụ ya.”

      Uche ịna-awagharị. E nwere ike inwe oge uche na-agaghị akpakọ onye mmadụ nwụnahụrụ ọnụ. Dị ka ihe atụ, onye mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ịna-eche na o nwere ike ịhụ onye ya nwụrụ anwụ, metụ ya aka, ma ọ bụ nụ ihe ọ na-ekwu. O nwekwara ike isiri ya ike itinye uche ya n’ihe ọ na-eme ma ọ bụ icheta ihe. Tiina kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, mụ na mmadụ nwere ike ịna-ekwu okwu, mụ achọpụta na obi m adịghị n’ihe anyị na-ekwu. Ọ ga na-awagharị n’ihe niile mere tupu Timo anwụọ na mgbe ọ nwụchara. Uche akpakọghị mmadụ ọnụ bụ nsogbu nke ya.”

      Ha nwere ike ịna-achọ ịnọrọ onwe ha. Ịnọ ebe ndị mmadụ nọ mgbe ụfọdụ nwere ike ịna-agbakasị onye mmadụ nwụnahụrụ ahụ́. Kostas kwuru, sị: “Mụ na ndị di na nwunye nọrọ, ahụ́ anaghị eru m ala. Ọ na-adịkwa m otú ahụ ma mụ na ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nọrọ.” Yolanda, nwunye Ivan kwuru, sị: “Ahụ́ anaghị eru m ala ma ndị mụ na ha nọ na-akọ banyere nsogbu ha nwere, nke m chere na o nweghị ihe ha bụ ma e jiri ya tụnyere nke anyị, ma ọ bụkwanụ ha ana-akọ banyere otú ụmụ ha si na-eme nke ọma. Ọ bụ eziokwu na obi dị m ụtọ maka ihe ọma meere ha, ọ na-esiri m ike ige ihe ha na-ekwu. Mụ na di m ma na anyị kwesịrị iwere ụwa otú anyị si hụ ya, ma ihe ndị ha na-akọ na-agbakasị anyị ahụ́.”

      Ọrịa. Afọ nwere ike ịmachi ha, ha atawa ahụ́ ma ọ bụ ghara ịna-ehi ụra nke ọma. Aaron kwuru ihe mere mgbe otu afọ gachara mpa ya nwụchara. O kwuru, sị: “Ụra anaghị ekwe m ohihi. O nwere otu oge ụra na-ejikarị apụ m n’anya n’abalị ọ bụla, mụ echewe gbasara mpa m.”

      Alejandro chetara ọrịa ọ na-amaghị isi ya bidoro ịrịa ya. Ọ sịrị: “Dọkịta lere m ahụ́ ọtụtụ ugboro ma gwa m na o nweghị ihe na-eme m. Obi m gwara m na ọ ga-abụ uju m na-eru na-eme ka ọ dị m ka m̀ na-arịa ọrịa.” Ahụ́ ahụ na-enye ya nsogbu mechara kwụsị. Ma ọ dịkwa mma na Alejandro gara hụ dọkịta. Iru uju nwere ike ime ka ihe na-alụso ọrịa ọgụ n’ime ahụ́ anyị ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma, mee ka ọrịa anyị na-arịa kakwuo njọ, ma ọ bụdị mee ka anyị rịawa ọrịa ọhụrụ.

      O nwere ike ịna-esiri ha ike ime ihe ndị dị mkpa. Ivan kwuru, sị: “Mgbe Eric nwa anyị nwụchara, anyị mere ka ndị enyi anyị na ndị ikwu anyị mara. Ma anyị mekwara ka ọtụtụ ndị ọzọ mara gbasara ya, dị ka, onye ọ na-arụrụ ọrụ na onye nwe ụlọ ebe o bi. E nwekwara ọtụtụ akwụkwọ ikike anyị kwesịrị idejupụta. Anyị mechakwara gaa lee ihe ndị Eric nwere mara ihe ndị a ga-atụfu na ndị a ga-edowe. Ihe ndị a niile chọrọ mkpachara anya. Ma, isi nọ na-agba anyị ghara ghara, ike ana-agwụ anyị, obi anaghịkwa eru anyị ala.”

      O nwere ndị nsogbu nke ha na-abịa mgbe ha ga-emecha mewazie ihe onye ahụ nwụrụ anwụ na-emebu. Ọ bụ ihe mere Tiina. O kwuru, sị: “Ọ bụ di m na-ahụ maka ihe niile gbasara ego anyị dị n’ụlọ akụ̀ na azụmahịa anyị. Ma ọ bụzi m na-eme ihe a niile, nke mere ka isi na-agba m ghara ghara karịa. M nọ na-ajụ onwe m ma m̀ ga-emetalikwa ihe a niile.”

      Ihe ndị a anyị kọrọ n’elu nwere ike ime ka ị ghọta na ọ naghị adịrị ndị mmadụ nwụnahụrụ mfe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnwụ na-agbawa obi, ma ịmara ihe ndị a nwere ike inyere ndị mmadụ nwụnahụrụ na nso nso a aka idi ya. Chetakwa na ọ bụghị onye ọ bụla ka ihe niile a a kọrọ na-eme onye na-eru uju na-eme. Ihe ọzọkwa bụ na ndị mmadụ nwụnahụrụ ịma na mmadụ iru uju abụghị ihe ọjọọ, ga-akasi ha obi.

      M̀ GA-EMECHA NWEWA OBI ỤTỌ ỌZỌ?

      Ihe ndị ị ga-atụ anya ya: Obi mgbawa mmadụ na-enwe ma onye ya nwụọ anaghị adịgide, ọ na-emecha belata. Ọ pụtaghị na “ọ na-apụ onye ahụ n’obi” kpamkpam ma ọ bụ na ọ ga-echefuzi onye ahụ nwụrụ anwụ. Ma, nwayọọ nwayọọ, ọ gaghịzi na-afụ onye ahụ ụfụ n’obi otú o sibu afụ ya. Ma, obi nwekwara ike ịjọwa onye ahụ njọ ma o cheta ihe ụfọdụ gbasara onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ma oge ha ji eme ememme ụfọdụ ruo. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-enweta onwe ha, nweekwa ike ịna-eme ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị. Ọ na-aka adịrị ha mfe idi ya ma ọ bụrụ na ndi enyi na ndị ikwu ha enyere ha aka, hanwa agbalịakwa ịchọ otú ha ga-esi edi ya.

      Olee mgbe m ga-ediru ya? Ụfọdụ ndị na-enweta onwe ha ma otu ọnwa ma ọ bụ karịa gachaa. Ma, ọ na-ewe ụfọdụ ndị otu afọ ma ọ bụ abụọ tupu ha enwetawa onwe ha. O nwedịrị ndị nke ha nwere ike ịkarị otú ahụ.a Alejandro kwuru, sị: “Ọnwụ nwunye m gbawagidere m obi ruo ihe dị ka afọ atọ.”

      Nweere onwe gị ndidi. Were ya nwayọọ, ejikwala onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ. Marakwa na obi mgbawa ahụ agaghị adịgide. Ajụjụ bụzi: “Ò nwere ihe ndị ị ga-eme ka uju ị na-eru ugbu a belata ma ọ bụkwanụ mee ka ị ghara iru uju ruo ogologo oge?”

      Mmadụ iru uju abụghị ihe ọjọọ

      a E nwere ụfọdụ ndị na-erugide uju ya akpatara ha ọrịa. O nwere ike ịdị mkpa ka ha gaa hụ dọkịta.

  • Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Mmadụ—Ihe I Nwere Ike Ime
    Teta!—2018 | No. 3
    • Ebe ndị mmadụ nọ n’akụkụ oké osimiri na-efe kaịt, na-esekwa foto

      IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA

      Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Mmadụ—Ihe I Nwere Ike Ime

      Ọ bụrụ na mmadụ nwụnahụrụ gị, gị achọwa ịmata ihe ga-enyere gị aka idi ya, ị ga-ahụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ kwurula nwere ike inyere onye mmadụ nwụnahụrụ aka. Ụfọdụ nwere ike ịbara gị uru, ndị ọzọ nwere ike ha agaghị abachara gị uru. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ ihe anyị kwuburu, ya bụ, na otú onye ọ bụla si eru uju abụghị otu. Ihe nyeere otu onye aka nwere ike ọ gaghị enyere onye nke ọzọ aka.

      N’agbanyeghị ya, e nwere ihe ndị bụ́ isi nyerela ọtụtụ ndị aka. Ndị ọkachamara na-enye ndị na-eru uju ndụmọdụ na-ekwukarị gbasara ya. Ihe ndị ahụ si n’otu akwụkwọ merela ochie nke amamihe juru na ya, aha ya bụ Baịbụl.

      1: KWE KA NDỊ ENYI GỊ NA NDỊ IKWU GỊ NYERE GỊ AKA

      • Ebe ndị mmadụ nọ n’akụkụ oké osimiri na-efe kaịt, na-esekwa foto

        Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na mmadụ ikwe ka ndị enyi na ndị ikwu ya nọrọ ya nso bụ ihe na-akacha enyere onye na-eru uju aka. Ma, e nwere mgbe ụfọdụ ị ga-achọ ịnọrọ onwe gị. I nwedịrị ike wesawara ndị chọrọ inyere gị aka iwe. Ọ bụghị naanị gị ka ọ na-adị otú ahụ.

      • Echekwala na ọ bụ iwu na gị na ndị mmadụ ga na-anọ mgbe niile, ma i kwesịghịkwa ịgbara ha ọsọ. A sị kwuwe, i nwere ike ịchọ ka ha nyere gị aka n’ọdịnihu. N’ihi ya, medaa obi gwa ndị bịaara gị mgbaru mgbe ị chọrọ ịnọrọ onwe gị na mgbe ị chọrọ ka gị na ha nọrọ.

      • Dabere n’otú ahụ́ dị gị, mara mgbe gị na ndị mmadụ kwesịrị ịnọ na mgbe ị ga-achọ ịnọrọ onwe gị.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Abụọ dị mma karịa otu . . . N’ihi na ọ bụrụ na otu onye n’ime ha adaa, onye nke ọzọ ga-enyere ya aka ka o bilie.”—Ekliziastis 4:9, 10.

      2: NA-ERI EZIGBO NRI, NA-EMEGAKWA AHỤ́

      • Iri ezigbo nri na-eme ka ahụ́ na-adịtụ onye na-eru uju mma. Na-eri mkpụrụ osisi dị iche iche, akwụkwọ nri na anụ ndị na-enweghị abụba buru ibu.

      • Na-aṅụ mmiri na ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ́.

      • Ọ bụrụ na nri anaghị ekwecha gị oriri, na-eritụ obere ugboro ugboro. I nwekwara ike ịga hụ dọkịta ka ọ gwa gị ọgwụ ndị na-edozi ahụ́ i nwere ike ịṅụ.a

      • Ịgasi ije ike na ụdị mmega ahụ́ ndị ọzọ nwere ike ime ka mmadụ ghara ịna-echegbu onwe ya. Mmega ahụ́ na-eme ka ụfọdụ ndị nwee ohere iche banyere ihe mere ha. O nwekwara ndị ọ na-enyere aka ichefutụ ihe mere ha.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla kpọtụrụla ahụ́ ya asị, kama ọ na-azụ ahụ́ ya, na-elekọtakwa ya.”—Ndị Efesọs 5:29.

      3: NA-EHI ỤRA NKE ỌMA

      • Àkwà

        Ihi ụra bara ezigbo uru. Ndị mmadụ nwụnahụrụ kwesịrị ịna-ehi ụra nke ọma, karịchaa n’ihi na iru uju nwere ike ime ka ike na-agwụ ha.

      • Kpachara anya n’otú i si eri ma ọ bụ aṅụ ihe ọ bụla na-egbochi mmadụ ihi ụra nakwa otú i si aṅụ mmanya na-aba n’anya.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.”—Ekliziastis 4:6.

      4: CHỌPỤTA OTÚ Ị GA-ESI EDI YA

      • Ebe otu nwaanyị mmadụ nwụnahụrụ na-akọrọ enyị ya otú obi dị ya

        Cheta na otú onye ọ bụla si eru uju abụghị otu. N’ihi ya, i kwesịrị ịchọpụta otú ga-akara gị mma ị ga-esi edi ihe mere gị.

      • Ọtụtụ ndị achọpụtala na ime ka ndị ọzọ mata otú obi dị ha na-enyere ha aka idi ya. Ma, e nwere ndị nke ọ na-akara mma ịghara ime ka ndị ọzọ mara. Ndị ọkachamara enweghị otu olu n’otú kacha mma e si edi ọnwụ mmadụ. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgwa mmadụ otú obi dị gị, i nwere ike ịgakwuru ezigbo enyi gị, kọtụrụ ya otú obi dị gị.

      • Ibe ezigbo ákwá na-enyere ụfọdụ ndị aka idi ihe mere ha, ma e nwekwara ndị nke na-edi ya ọ bụrụgodị na ha ebeghị ezigbo ákwá.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ọ bụla ma ihe bụ́ nsogbu ya na ahụhụ ọ na-ata.”—2 Ihe E Mere 6:29.

      5: EMEKWALA IHE NDỊ GA-AKPATARA GỊ NSOGBU

      • Nwoke na-aṅụ mmanya na-aba n’anya

        Ụfọdụ ndị na-eru uju na-amalite ịṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ike ka ha nwee ike ichefutụ ụwa ha. Ma, ime otú ahụ bụ mmadụ iji aka ya egbu onwe ya. O nwere ike iyi ha ka hà nwetatụrụ onwe ha, ma ọ naghị adịgide, kama, ọ na-akpatara ha ọtụtụ nsogbu. Chọọ otú ị ga-esi edi ihe mere gị ma ghara ịkpatara onwe gị nsogbu.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka anyị sachapụ ihe niile na-emerụ . . . anyị.”—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

      6: GBANWEE IHE I JI OGE GỊ NA-EME

      • Ọtụtụ achọpụtala na ihe ga-enyere ha aka ịghara ịna-eche banyere ihe mere ha mgbe niile bụ iji oge ha ụfọdụ na-eme ihe ga-eme ka ha wepụtụ obi na ya.

      • I nwere ike imeta ndị enyi ọhụrụ ma ọ bụkwanụ chọọ ihe ị ga-eme ka gị na ndị enyi gị dịkwuo ná mma. I nwekwara ike ịmụ otú e si eme ihe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ gị esoro ndị ọzọ gwuo egwuregwu.

      • Ka oge na-aga, ihe nwere ike ịgbanwe. I nwere ike ịchọpụta na i jirila nwayọọ nwayọọ kwụsịwa iru uju.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla, . . . oge ibe ákwá na oge ịchị ọchị; oge ibe ákwá arịrị na oge ịgba egwú.”—Ekliziastis 3:1, 4.

      7: NWEE OGE A KAPỊRỊ ỌNỤ I JI EME IHE

      • Ebe nwaanyị ji kalenda na-ahazi ihe ndị ọ ga-eji oge ya eme

        Ozugbo o kwere gị mee, malite ime ihe ndị ị na-emebu.

      • O nwere ike ịdịrị gị mfe inweta onwe gị ma ọ bụrụ na i nwee oge a kapịrị ọnụ i ji ehi ụra, arụ ọrụ ma ọ bụ eme ihe ndị ọzọ dịịrị gị.

      • Ọ bụrụ na i jiri oge gị na-eme ihe ndị bara uru, ọ ga-eme ka obi ghara ịna-ajọkarị gị njọ.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “N’ihi na ọ gaghị dị ama na ụbọchị ndụ ya na-agwụ n’ike n’ike, maka na ezi Chineke na-eme ka aṅụrị ju ya obi.”—Ekliziastis 5:20.

      8: EMEKWALA MKPEBI NDỊ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ ỌKỤ ỌKỤ

      • Ọtụtụ ndị mere mkpebi gbara ọkpụrụkpụ ozugbo onye ha nwụchara na-emecha kwaara ya mmakwara.

      • Ọ bụrụ na o kwe mee, chere ka oge gatụ tupu gị ekpebiwe ịkwapụ n’ebe i bi, ịgbanwe ọrụ ị na-arụbu, ma ọ bụ ịtụfu ihe ụfọdụ onye ahụ nwụrụ anwụ nwere.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya, ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.”—Ilu 21:5.

      9: NA-ECHETA ONYE AHỤ NWỤNAHỤRỤ GỊ

      • Ebe otu nwoke na-ezi ndị enyi ya foto nwunye ya nwụrụ anwụ

        Ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-ekwu na ime ihe ndị na-eme ka ha na-echeta onye ahụ nwụrụ anwụ na-enyere ha aka idi ọnwụ ya.

      • Idowe foto onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ị ga-eji na-echeta ya ebe ị ga na-ahụ ya nwere ike ịkasi gị obi. I nwekwara ike inwe akwụkwọ ebe ị ga na-ede ihe ụfọdụ banyere onye ahụ ma ọ bụ banyere ihe ndị unu mekọrọ ọnụ tọrọ gị ụtọ, ndị ị ga-achọ ịna-echeta.

      • Dowe ihe ndị ga-enyere gị aka icheta oge ndị gị na onye ahụ nwere obi ụtọ. E mechaa, gị elee ha.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Cheta nụ oge ochie.”—Diuterọnọmi 32:7.

      10: ANỌLA OTU EBE

      • I nwere ike ime njem gaa nọtụ na nke mmadụ ma ọ bụ gaa n’ebe a na-elegharị anya.

      • Ọ bụrụ na ị gaghị emeli njem ruo ogologo oge, i nwere ike iwere otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ gaa legharịa anya n’ebe a na-egosi ihe mgbe ochie, ma ọ bụkwanụ gị ejiri ụkwụ ma ọ bụ ụgbọala gaa ebe dịtụ anya legharịa anya.

      • Ime naanị obere mgbanwe n’ihe ndị ị na-emebu nwere ike inyere gị aka idi ihe mere gị.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Bịanụ ka anyị gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.”—Mak 6:31.

      11: NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

      • Ebe otu nwaanyị na-akatabeghi ahụ́ na-enyere onye nke katarala ahụ́ aka ịzụta ihe e ji esi nri

        Cheta na oge ọ bụla i ji nyere ndị ọzọ aka ga-eme ka i nwetatụ onwe gị.

      • I nwere ike bido inyere ndị ọzọ ọnwụ onye ahụ metụtara aka, dị ka ndị enyi na ndị ikwu gị. I nwere ike ịga nọnyere ha ma ọ bụ kasie ha obi, n’ihi na ha nwekwara ike ịna-achọ onye ga-eso ha akwa ụwa.

      • Inyere ndị ọzọ aka na ịkasi ha obi nwere ike ime ka i nwewakwa obi ụtọ, meekwa ka ike ndụ ghara ịgwụ gị.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ Ndịozi 20:35.

      12: LEBAGHARỊA ANYA N’IHE NDỊ I WEERE KA IHE NDỊ KA MKPA

      • Mmadụ nwere ike ịghọtakwu ihe ka mkpa ná ndụ n’oge ọ na-eru uju.

      • Jiri oge ahụ ị na-eru uju chebara ihe i ji ndụ gị na-eme echiche.

      • Mee mgbanwe n’ihe ndị i weere ka ihe ka mkpa ná ndụ gị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

      IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ dị mma ịga n’ebe a na-eru uju karịa ịga n’ebe a na-eri oriri, n’ihi na mmadụ niile na-anwụ anwụ, ndị dị ndụ kwesịkwara iburu ya n’obi.”—Ekliziastis 7:2.

      IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA IDI ỌNWỤ MMADỤ | NCHỊKỌTA

      • 1: KWE KA NDỊ ENYI GỊ NA NDỊ IKWU GỊ NYERE GỊ AKA

        Dabere n’otú ahụ́ dị gị, mara mgbe gị na ndị mmadụ kwesịrị ịnọ na mgbe ị ga-achọ ịnọrọ onwe gị.

      • 2: NA-ERI EZIGBO NRI, NA-EMEGAKWA AHỤ́

        Na-eri ezigbo nri, na-aṅụ mmiri nke ọma, na-emegakwa ahụ́ otú kwesịrị ekwesị.

      • 3: NA-EHI ỤRA NKE ỌMA

        Cheta na ihi ụra nke ọma ga-enyere gị aka idi ọnwụ onye gị, meekwa ka ike ghara ịna-agwụcha gị.

      • 4: CHỌPỤTA OTÚ Ị GA-ESI EDI YA

        Ebe ọ bụ na otú onye ọ bụla si eru uju abụghị otu, chọpụta otú ga-akara gị mma ị ga-esi edi ihe mere gị.

      • 5: EMEKWALA IHE NDỊ GA-AKPATARA GỊ NSOGBU

        Zere ịṅụbiga mmanya ókè ma ọ bụkwanụ ịṅụ ọgwụ ike n’ihi na nsogbu ha ga-akpatara gị ga-akarị aka ha ga-enyere gị.

      • 6: GBANWEE IHE I JI OGE GỊ NA-EME

        Kama ịnọ na-eru uju, i nwere ike iji oge ahụ soro ndị ọzọ gwuo egwuregwu ma ọ bụ gaa ka gị na ha nọrịa.

      • 7: NWEE OGE A KAPỊRỊ ỌNỤ I JI EME IHE

        I nwere ike inweta onwe gị ma i nwee ezigbo ihe i ji oge gị na-eme.

      • 8: EMEKWALA MKPEBI NDỊ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ ỌKỤ ỌKỤ

        Ọ bụrụ na o kwe mee, chere ka otu afọ ma ọ bụ karịa gafee tupu gị ekpebie ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ka ị ghara imecha kwaa mmakwara.

      • 9: NA-ECHETA ONYE AHỤ NWỤNAHỤRỤ GỊ

        Dowe foto na ihe ndị ọzọ ga-eme ka ị na-echeta onye ahụ. I nwekwara ike inwe akwụkwọ ị ga na-ede ihe ụfọdụ ị ga-achọ icheta gbasara ya.

      • 10: ANỌLA OTU EBE

        I nwere ike iwere otu ụbọchị ma ọ bụ ọkara gaa legharịa anya ma ọ bụ mee ihe ndị ọzọ.

      • 11: NA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

        Inyere ndị ọzọ aka, ma ndị ọzọ ọnwụ onye ahụ metụtara, ga-eme ka ike ndụ ghara ịna-agwụ gị.

      • 12: LEBAGHARỊA ANYA N’IHE NDỊ I WEERE KA IHE NDỊ KA MKPA

        Were oge a ị na-eru uju ghọtakwuo ihe ka mkpa ná ndụ gị. Meekwa mgbanwe n’ihe ndị i weere ka ihe ka mkpa ná ndụ gị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.

      N’eziokwu, e nweghị ihe ga-eme ka mwute ị na-enwe pụchaa gị n’obi kpamkpam. Ma, ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụla ga-ekweta na ime ihe ndị ga-enyere ha aka idi ọnwụ onye ha, dị ka ndị a e kwuru n’isiokwu a, kasiri ha obi. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ihe niile ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ mmadụ ka e dere ebe a, ma ọ bụrụ na ị gbalịa mee ụfọdụ n’ime ha, ọ ga-enyere gị aka.

      a Teta! anaghị agwa mmadụ otú ọ ga-ahọrọ ka e si gwọọ ya.

  • Ihe Ga-akacha Enyere Onye Na-eru Uju Aka
    Teta!—2018 | No. 3
    • Ebe ndị nọ na Paradaịs na-aga ịnabata ndị ha hụrụ n’anya a kpọlitere n’ọnwụ

      IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA

      Ihe Ga-akacha Enyere Onye Na-eru Uju Aka

      NA NSO NSO A, ỌTỤTỤ NDỊ EDEELA ỌTỤTỤ IHE GBASARA OTÚ NDỊ ỌNWỤ MMADỤ GBAWARA OBI GA-ESI EDI YA. Ma dị ka anyị kwuburu, ndụmọdụ ọ bụla kacha mma ha nyere na-ekwekọ n’ihe Baịbụl kwuru. Nke a gosịrị na ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl na-aba uru mgbe niile. Ọ bụghị naanị na Baịbụl na-enye anyị ndụmọdụ na-abara anyị uru, kamakwa, ọ na-agwa anyị ihe ndị anyị na-enweghị ike ịgụta ebe ọzọ, nke nwere ike ịkasị onye na-eru uju obi.

      • Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ndị nwụnahụrụ anyị anaghị ata ahụhụ

        Ekliziastis 9:5 kwuru, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.” Baịbụl kwukwara na ha “na-akwụsị iche echiche.” (Abụ Ọma 146:4) Ọ bụkwa ihe a ka Baịbụl na-ekwu mgbe o ji ọnwụ tụnyere ụra.—Jọn 11:11.

      • Ikwetasi ike na Chineke hụrụ anyị n’anya na-akasi anyị obi

        Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 34:15, sị: “Anya Jehovaa dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya na-anụkwa ákwá ha na-ebe ka e nyere ha aka.” Ịgwa Chineke otú obi dị anyị na-abara anyị uru karịa nkasi obi ọ bụla anyị na-enweta ma anyị gwa ya onye ọzọ ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ọzọ iji die ihe mere anyị. Ọ na-eme ka anyị na Onye kere anyị dịrị ná mma, bụ́kwanụ onye ga-eji ike ya kasie anyị obi.

      • Anyị na-atụ anya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu

        Chegodị otú ihe ga-adị n’ọdịnihu mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha adịrị ndụ n’ụwa a. Baịbụl kwuru banyere otú oge ahụ ga-adị ugboro ugboro. O kwuru na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị [anyị] n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”—Mkpughe 21:3, 4.

      Ndị kweere na Jehova bụ́ Chineke, onye nwe Baịbụl, na-enweta nkasi obi n’aka ya n’ihi na ha kweere na ọ ga-emezu nkwa o kwere ịkpọlite ndị ha nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị aha ya bụ Ann, onye ya na di ya lụrụ afọ iri isii na ise tupu di ya anwụọ, kwuru, sị: “Baịbụl mere ka obi sie m ike na ndị nwụnahụrụ anyị anaghị ata ahụhụ nakwa na Chineke ga-akpọlite ndị niile nọ ná ncheta ya. Ọnwụ di m bụ ihe ọjọọ kachanụ metụrụla m. Mgbe ọ bụla m chetara ya, nkwa ndị a Chineke kwere na-agbata m n’obi, ha na-enyekwara m aka idi ya.”

      Tiina anyị kọrọ banyere ya ná mbido akwụkwọ a kwuru, sị: “Kemgbe di m nwụrụ, achọpụtala m na Chineke na-enyere m aka idi ya. N’oge ahụ ọ gbajuru dọrọ, m hụrụ otú Jehova si nyere m aka. Ekwetasikwara m ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ otú ahụ Baịbụl kwuru. Ọ na-enyere m aka idi ọnwụ Timo di m, ruo mgbe m ga-ahụ ya ọzọ.”

      Ọtụtụ nde mmadụ ndị kweere na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu kwetara n’ihe a ha kwuru. Ọ bụrụ na i chere na ihe Baịbụl kwuru agaghị eme ma ọ bụkwanụ na ọ bụ nrọ efu, ọ dịzi gị n’aka ịchọpụta ma ihe ndị Baịbụl kwuru ọ̀ na-aba uru nakwa ma hà bụ eziokwu. I nwere ike ịchọpụta na ọ bụ Baịbụl ga-akacha enyere onye na-eru uju aka.

      MỤTAKWUO BANYERE OLILEANYA DỊỊRỊ NDỊ NWỤRỤ ANWỤ

      I nwere ike ile vidio ndị kwuru gbasara ya na jw.org/ig

      Ebe ndị nọ na Paradaịs na-aga ịnabata ndị ha hụrụ n’anya a kpọlitere n’ọnwụ

      Baịbụl kwuru na oge na-abịa mgbe anyị ga-anabata ndị nwụnahụrụ anyị

      GỊNỊ NA-EME NDỊ MMADỤ MA HA NWỤỌ?

      Gịnị Na-eme Ndị Mmadụ Ma Ha Nwụọ?

      Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? Ihe Baịbụl kwuru na-akasi anyị obi, na-emekwa ka obi sie anyị ike

      Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ebe e dere VIDIO (Vidio: Pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI)

      Ị̀ GA-ACHỌ ỊNỤ OZI ỌMA

      Ị̀ Ga-achọ Ịnụ Ozi Ọma?

      Olee ebe anyị ga-anụ ozi ọma n’ụwa a akụkọ ọjọọ juru?

      Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie ebe e dere UDO NA OBI ỤTỌ

      a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya