Bụrụnụ Ndị Na-eme Eme—Ọ Bụghị Nanị Ndị Na-anụ Anụ
1 Ezi ndị Kraịst taa na-eburu n’obi okwu ịdọ aka ná ntị Bible ịbụ ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị nanị ndị na-anụ anụ. (Jes. 1:22) Nke a na-esetịpụ ha nnọọ iche n’ebe ndị, ọ bụ ezie na ha na-asị na ha bụ ndị Kraịst, na-efe Chineke nanị n’egbugbere ọnụ. (Aịsa. 29:13) Jisọs kwuru n’ụzọ doro anya na nanị ndị na-eme ihe Chineke na-achọ ka a ga-azọpụta.—Mat. 7:21.
2 Ofufe na-enweghị ọrụ nsọpụrụ Chineke enweghị isi. (Jes. 2:26) Ya mere anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị sị, ‘Olee otú ọrụ m si anwapụta na okwukwe m bụ nke ezigbo ya? Gịnị na-egosi na n’ezie ana m ebi ndụ kwekọrọ n’ihe m kwenyere? Olee otú m pụrụ isi ṅomikwuo Jisọs n’ụzọ zuru ezu?’ Azịza eziokwu nye ajụjụ ndị a ga-enyere anyị aka ịhụ ọganihu anyị nweworo ma ọ bụ nke ọ ka dị mkpa ka anyị nwee n’ime ihe Chineke na-achọ.
3 Dị ka ụmụazụ Jisọs, anyị aghaghị inwe otu ihe mgbaru ọsọ ahụ bụ isi ná ndụ dị ka nke ọbụ abụ ahụ kwupụtara: “Chineke ka anyị jiworo nyaa isi ogologo ụbọchị nile, ọ bụkwa aha Gị ka anyị ga-ekele ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 44:8) Iso Ụzọ Kraịst bụ ụzọ ndụ nke na-egosipụta onwe ya kwa ụbọchị na n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Lee afọ ojuju anyị na-enweta ka anyị na-egosipụta ọchịchọ anyị sitere n’obi ito Jehova n’ihe omume anyị nile!—Fil. 1:11.
4 Ito Jehova Gụnyere Ihe Karịrị Ibi Ndụ Kwụ Ọtọ: Ọ bụrụ na àgwà ọma agwụla ihe Chineke na-achọ, anyị pụrụ nnọọ itinye uche n’imeziwanye ọdịdị mmadụ anyị. Otú ọ dị, ofufe anyị gụnyekwara ikwusa ịdị mma nile nke Jehova na ime nkwupụta ihu ọha nye aha ya!—Hib. 13:15; 1 Pita 2:9.
5 Nkwusa ihu ọha nke ozi ọma ahụ bụ otu n’ime n’ọrụ kasị mkpa anyị na-arụ. Jisọs tinyere onwe ya n’ọrụ a n’ihi na ọ maara na ọ pụtara ndụ ebighị ebi nye ndị ga-ege ntị. (Jọn 17:3) Taa ‘ije ozi nke okwu ahụ’ ka dịkwa oké mkpa; ọ gwụla ya bụ ụzọ a ga-esi zọpụta ndị mmadụ. (Ọrụ 6:4; Rom 10:13) Ịmata uru ya ndị na-adịte anya, anyị pụrụ ịghọta ihe mere Pọl ji nye anyị okwu ịdọ aka ná ntị ‘ikwusa okwu Ya’ na ‘ịtụkwasị uche na ya.’—2 Tim. 4:2.
6 Ruo ókè hà aṅaa ka ito Jehova kwesịrị ijupụta ná ndụ anyị? Ọbụ abụ ahụ kwuru na ọ dị ya n’uche ogologo ụbọchị nile. Ọ́ dịghị adị anyị otú ahụ? Ee, anyị ga-ewerekwa nzute nke ọ bụla anyị zutere onye ọzọ dị ka ohere dịnụ iji kwuo banyere aha Jehova. Anyị ga-achọ ohere ndị kwesịrị ekwesị iji duru mkparịta ụka anyị gaa n’ihe ime mmụọ. Anyị ga-agbalịsikwa ike ikere òkè mgbe nile n’ọrụ ije ozi ubi nke ọgbakọ na-ahazi. Ndị ọnọdụ ha nyere ohere pụrụ ịtụlesi ozi ọsụ ụzọ ike, n’ihi na nke a na-enyere anyị aka idebe ọrụ nkwusa ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị kwa ụbọchị. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na site n’ịnọgidesi ike bụrụ ndị na-eme ihe Chineke na-achọ, anyị ga-enwe obi ụtọ.—Jes. 1:25.