Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 86
  • Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Chebere Jizọs
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Jisọs na Ndị Na-agụ Kpakpando
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta Jizọs
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ònye Zitere “Kpakpando” Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 86
Mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando na-eso otu kpakpando na-egbuke egbuke

AKỤKỌ NKE 86

Ndị Ikom Otu Kpakpando Duziri

Ị̀ NA-AHỤ kpakpando ahụ na-egbuke egbuke nke otu n’ime ndị ikom a na-atụ aka? Ọ bụ mgbe ha hapụrụ Jeruselem ka kpakpando a pụtara. Ndị ikom a si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ha na-amụ banyere kpakpando. Ha kweere na kpakpando ọhụrụ nke a na-eduga ha n’ebe otu onye dị mkpa nọ.

Kpakpando ahụ na-egbuke egbuke kwụ na Betlehem

Mgbe ndị ikom ahụ ruru Jeruselem, ha jụrụ, sị: ‘Olee ebe nwata ahụ nke ga-abụ eze ndị Juu nọ? “Ndị Juu” bụ aha ọzọ nke ndị Izrel. ‘Anyị hụrụ kpakpando nke nwata ahụ na nke mbụ ya n’oge anyị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ,’ ka ndị ikom ahụ sịrị, ‘anyị abịawokwa ịkpọrọ ya isi ala.’

Mgbe Herọd, bụ́ eze Jeruselem, nụrụ ya, obi ezughị ya ike. Ọ chọghị ka eze ọzọ weghara ọkwá ya. N’ihi ya, Herọd kpọrọ ndị isi nchụàjà wee jụọ ha, sị: ‘Olee ebe a ga-amụ eze ahụ e kwere ná nkwa?’ Ha zara ya, sị: ‘Bible sịrị na ọ bụ na Betlehem.’

Herọd wee kpọọ ndị ikom ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, sị ha: ‘Gaanụ chọpụta nwa ọhụrụ ahụ. Ọ bụrụ na unu ahụ ya, meenụ ka m mara. M chọrọ ijekwa kpọọrọ ya isi ala.’ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Herọd chọrọ ịhụ nwata ahụ ma gbuo ya!

Mgbe ahụ, kpakpando ahụ jere n’ihu ha ruo Betlehem, kwụsị n’ebe nwata ahụ nọ. Mgbe ndị ikom ahụ bara n’ime ụlọ ahụ, ha hụrụ Meri na obere Jizọs. Ha nyere Jizọs onyinye dị iche iche. Ma mgbe e mesịrị, Jehova dọrọ ndị ikom ahụ aka ná ntị ná nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd. Ya mere, ha si ụzọ ọzọ laghachi n’ala ha.

Mgbe Herọd nụrụ na ndị ikom ahụ si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ alawo, ezigbo iwe were ya. O wee nye iwu ka e gbusịa ụmụntakịrị nwoke niile nọ na Betlehem, site ná ndị gbara afọ abụọ gbadata. Ma Jehova ebuwo ụzọ dọọ Josef aka ná ntị ná nrọ, ya na ezinụlọ ya wee gbalaa Ijipt. E mesịa, mgbe Josef nụrụ na Herọd anwụwo, o duuru Meri na Jizọs laghachi Nazaret. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jizọs nọ tolite.

Ònye ka i chere na ọ bụ ya mere ka kpakpando ọhụrụ ahụ pụta? Cheta na ndị ikom ahụ bu ụzọ jee Jeruselem mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. Setan bụ́ Ekwensu chọrọ igbu Ọkpara Chineke, ọ makwaara na Eze Herọd nke Jeruselem ga-anwa igbu ya. N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ Setan mere ka kpakpando ahụ pụta.

Matiu 2:1-23; Maịka 5:2.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya