Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 88
  • Jọn Emee Jizọs Baptizim

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jọn Emee Jizọs Baptizim
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Mee Jizọs Baptizim
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Amalite Ịchọ Ndị Ga-abụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Baptism Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ndị Na-eso Ụzọ Mbụ nke Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 88
Mgbe Jizọs si n’ime Osimiri Jọdan na-apụta ka Jọn mechara ya baptizim

AKỤKỌ NKE 88

Jọn Emee Jizọs Baptizim

LEE nduru ahụ ka ọ na-ebekwasị n’isi nwoke a. Nwoke ahụ bụ Jizọs. Ọ gbaala ihe dị ka afọ iri atọ ugbu a. Nwoke ahụ ya na ya nọ bụ Jọn. Anyị amụwo ihe banyere ya. Ì chetara oge Meri jere ileta Elizabet onye ikwu ya, nwa nọ n’afọ Elizabet ewee wụlie elu n’ọṅụ? Nwa ahụ nọ n’afọ mgbe ahụ bụ Jọn. Ma, gịnị ka Jọn na Jizọs na-eme ugbu a?

Jọn ka mikpusịrị Jizọs n’ime Osimiri Jọdan. Ọ bụ otú ahụ ka e si eme mmadụ baptizim. A na-ebu ụzọ emikpu onye ahụ n’ime mmiri, ma kulitezie ya. Ebe ọ bụ na nke a bụ ihe Jọn na-eme ndị mmadụ, a na-akpọ ya Jọn Onye Na-eme Baptizim. Gịnịzi mere Jọn ji mee Jizọs baptizim?

Jọn mere ya n’ihi na Jizọs bịara rịọ Jọn ka o mee ya baptizim. Ndị Jọn na-eme baptizim bụ ndị chọrọ igosi na ihe ọjọọ ndị ha mere wutere ha. Ma ọ̀ dị ihe ọjọọ ọ bụla Jizọs mere nke ọ ga-egosi mwute maka ya? Mba, Jizọs emeghị ihe ọjọọ ọ bụla, n’ihi na ọ bụ Ọkpara Chineke nke si n’eluigwe bịa. E nwere nzube dị iche mere Jizọs ji rịọ Jọn ka o mee ya baptizim. Ka anyị hụ ihe bụ́ nzube ya.

Tupu Jizọs abịakwute Jọn n’ebe a, ọ bụ kapịnta. Kapịnta bụ onye na-eji osisi emepụta ihe, dị ka tebụl na oche. Josef di Meri bụ kapịnta, ọ kụzikwaara Jizọs ọrụ kapịnta. Ma Jehova eziteghị Ọkpara ya n’ụwa ịbụ kapịnta. O nwere ọrụ pụrụ iche ọ chọrọ ka ọ rụọ, oge eruwokwa ka Jizọs malite ịrụ ya. Iji gosi na ọ bịawo ime uche Nna ya, Jizọs rịọrọ Jọn ka o mee ya baptizim. Nke a ọ̀ dị Chineke ezi mma?

Mmụọ nsọ dị n’ụdị nduru si n’eluigwe na-efedata

Ee, ọ dị ya, n’ihi na mgbe Jizọs si na mmiri pụta, olu si n’eluigwe kwuru, sị: ‘Nke a bụ Ọkpara m, onye ihe ya dị m ezi mma.’ Ọzọkwa, o yiri ka eluigwe ò meghere, nduru a wee fedata ma bekwasị n’isi Jizọs. Ma n’agbanyeghị na o yiri nduru, ọ bụghị nduru nkịtị. Ọ bụ n’ezie mmụọ nsọ nke Chineke.

Jizọs nwere ọtụtụ ihe ọ ga-echebara echiche ugbu a, n’ihi ya, o jere n’ebe ndị mmadụ na-anọghị, nọrọ ebe ahụ ruo ụbọchị iri anọ. Setan wee bịakwute ya n’ebe ahụ. Ugboro atọ ka Setan nwara ime ka Jizọs mee ihe megidere iwu Chineke. Ma Jizọs emeghị ya.

Mgbe nke ahụ gasịrị, Jizọs lọtara wee zute ndị ikom ndị ghọrọ ndị mbụ na-eso ụzọ ya, ma ọ bụ ụmụazụ ya. Aha ụfọdụ n’ime ha bụ Andru, Pita (onye a na-akpọkwa Saịmọn), Filip na Nataniel (onye a na-akpọkwa Batọlọmiu). Jizọs na ụmụazụ ọhụrụ ya ndị a gawara ógbè Galili. Na Galili, ha kwụsịrị na Kena, obodo Nataniel. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jizọs gara nnukwu ememe alụmdi na nwunye, wee rụọ ọrụ ebube mbụ ya. Ị̀ ma ihe ọ bụ? O mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya.

Matiu 3:13-17; 4:1-11; 13:55; Mak 6:3; Jọn 1:29-51; 2:1-12.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya