Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 93
  • Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jisọs Esite n’Ọrụ Ebube Zụọ Ọtụtụ Puku Mmadụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Ejiri Ogbe Achịcha Ole na Ole na Azụ̀ Nyejuo Ọtụtụ Puku Mmadụ Afọ
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Nyere Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Jizọs Pụrụ Ichebe Anyị
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 93
Jizọs ejiri ogbe achịcha ole na ole na azụ ole na ole zụọ ìgwè mmadụ nri

AKỤKỌ NKE 93

Jizọs Enye Ọtụtụ Mmadụ Nri

IHE jọgburu onwe ya emewo. Ọ dịbeghị anya e gburu Jọn Onye na-eme baptizim. Herọdịas, nwunye eze, achọghị iji anya ahụ Jọn. O mere ka eze gbupụ Jọn isi.

Mgbe Jizọs nụrụ ya, o wutere ya nke ukwuu. O jere ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị ma nọrọ naanị ya. Ma ndị mmadụ sooro ya. Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha. O wee na-agwa ha okwu banyere alaeze Chineke, na-agwọkwa ndị ọrịa nọ n’etiti ha.

N’anyasị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, sị ya: ‘Chi ejiwela, ndị mmadụ adịghịkwa anọkarị n’ebe a. Zipụ ndị a ka ha nwee ike ịga zụrụ ihe oriri n’obodo nta ndị dị nso.’

Jizọs sịrị: ‘Ọ dịghị mkpa ka ha laa. Nyenụ ha ihe ka ha rie.’ O chigharịkwuuru Filip, jụọ ya, sị: ‘Olee ebe anyị pụrụ ịzụta nri ga-ezu ndị a niile?’

Filip wee sị ya: ‘Ọ ga-ewe ego hiri nne iji zụta nri ga-ezu mmadụ niile a iri ọbụna ntakịrị ntakịrị.’ Andru wee sị: ‘Nwata nwoke a nwere ogbe achịcha ise na azụ abụọ. Ma ọ gaghị ezuru mmadụ niile a.’

‘Gwanụ ha ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa,’ ka Jizọs sịrị. O kelee Chineke n’ihi nri ahụ, wee malite ịnyawa ya. Ndị na-eso ụzọ ya wee nyezuo mmadụ niile achịcha na azụ ahụ. Ha dị puku ndị ikom ise na ọtụtụ puku ndị inyom na ụmụntakịrị. Ha niile rijuru afọ. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs chịkọtara ihe fọdụrụ, o juru nkata iri na abụọ!

Jizọs meziri ka ndị na-eso ụzọ ya baa n’ụgbọ gabiga Osimiri Galili. N’abalị, oké ifufe malitere ife, ebili mmiri wee na-ebugharị ụgbọ ahụ ihu na azụ. Ndị na-eso ụzọ ya wee tụọ nnọọ egwu. N’etiti abalị ahụ, ha hụrụ onye na-eje ije n’elu mmiri na-abịakwute ha. Ha wee tie mkpu n’ụjọ, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-ahụ.

Jizọs wee sị ha: ‘Unu atụla egwu. Ọ bụ m!’ Ha ekwetaghị. Pita wee sị ya: ‘Ọ bụrụ na ọ bụ gị, Onyenwe anyị, gwa m ka m jee ije n’elu mmiri bịakwute gị.’ Jizọs wee sị ya: ‘Bịa!’ Pita wee pụta jee ije n’elu mmiri! Ma ọ tụrụ egwu wee malite imikpu, ma Jizọs zọpụtara ya.

E mesịa, Jizọs nyere ọtụtụ puku mmadụ nri ọzọ. N’oge nke a, o ji ogbe achịcha asaa na azụ nta ole na ole mee nke ahụ. Ọzọkwa, mmadụ niile rijuru afọ. Otú Jizọs si elekọta ndị mmadụ ọ́ dịghị ịtụnanya? Mgbe ọ ga na-achị dị ka eze nke Chineke, anyị agaghị echegbu onwe anyị maka ihe ọ bụla!

Matiu 14:1-32; 15:29-38; Jọn 6:1-21.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya