Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 60
  • Abigel na Devid

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Abigel na Devid
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Ka Ezi Uche Gị Bụrụ Ihe A Gọziri Agọzi”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Nwanyị Nwere Ezi Uche Egbochie Ọdachi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 60
Mgbe Abigel na-ewetara Devid na ndị òtù ya ihe oriri na ihe ndị ọzọ

AKỤKỌ NKE 60

Abigel na Devid

Ị̀ MA nwaanyị ọma a nke na-abịakwute Devid? Aha ya bụ Abigel. Ọ bụ nwaanyị nwere ezi uche, o gbochikwara Devid ime otu ihe ọjọọ. Ma tupu anyị amụọ ihe banyere nke a, ka anyị hụ ihe nọworo na-eme Devid kemgbe.

Mgbe Devid si n’ebe Sọl nọ gbapụ, ọ gara zoo n’ọgba nkume. Ụmụnne ya na ndị ezinụlọ ya gakwuuru ya n’ebe ahụ. Ọnụ ọgụgụ ndị niile gakwuuru ya dị ihe dị ka narị mmadụ anọ, Devid wee bụrụ onye ndú ha. Devid jekwuuru eze Moab, sị ya: ‘Biko ka ndị mụrụ m soro gị nọrọ, ruo mgbe m ga-amata ihe ga-abụ ọnọdụ m.’ E mesịa, Devid na ndị ikom ya malitere izogharị n’ugwu.

Ọ bụ mgbe nke a gasịrị ka Devid zutere Abigel. Nebal di ya bụ ọgaranya nwere nnukwu ala. O nwere puku atụrụ atọ, nweekwa otu puku ewu. Nebal nwere obi ọjọọ. Ma Abigel nwunye ya mara ezigbo mma. Ọ makwaara otú e si eme ihe ziri ezi. Ọ dị mgbe ọ zọpụtara ezinụlọ ya. Ka anyị hụ otú o si mee.

Devid na ndị ya emeworo Nebal ihe ọma. Ha enyewo aka ichebe atụrụ ya. Ya mere, otu ụbọchị, Devid zigara ụfọdụ n’ime ndị ya ịrịọta ihe n’aka Nebal. Ndị ikom Devid jekwuuru Nebal mgbe ya na ndị na-enyere ya aka na-akpacha ajị atụrụ. Ọ bụ ụbọchị oriri, Nebal nwekwara ọtụtụ ezi ihe iri. Ndị ikom Devid gwara ya, sị: ‘Anyị emeworo gị ihe ọma. Anyị ezurughị atụrụ gị ọ bụla, kama anyị enyewo aka ịzụ ha. Ugbu a, biko, nyetụ anyị ihe oriri.’

Nebal wee sị ha: ‘M gaghị enye ndị dị ka unu ihe oriri m.’ O kwuru nnọọ okwu n’ụzọ mkparị, kwuokwa ọtụtụ ihe ọjọọ banyere Devid. Mgbe ndị ikom ahụ lara kọọrọ Devid ihe merenụ, ezigbo iwe were ya. O wee sị ha: ‘Werenụ mma agha unu!’ Ha gawakwara igbu Nebal na ndị ya.

Otu n’ime ndị ikom Nebal nke nụrụ okwu ọjọọ ahụ o kwuru kọọrọ Abigel ihe merenụ. Ngwa ngwa, Abigel kwakọtara ihe oriri. O dokwasịrị ha n’elu ịnyịnya ibu ma jewe ịhụ Devid. Mgbe o zutere Devid, o siri n’elu ịnyịnya ibu ya rịdata, kpọọ isiala sị ya: ‘Biko nna anyị ukwu, etinyela uche n’ihe di m bụ́ Nebal kwuru. Ọ bụ onye iberibe nke na-eme ihe nzuzu. Lee onyinye m wetara. Biko, were ya ma gbaghara anyị n’ihi ihe merenụ.’

‘Ị bụ nwaanyị maara ihe,’ ka Devid kwuru. ‘I gbochiwo m igbu Nebal iji kwụghachi ya ụgwọ maka obi ọjọọ ya. Laa nke ọma.’ Mgbe Nebal nwụrụ n’ikpeazụ, Abigel ghọrọ otu n’ime ndị nwunye Devid.

1 Samuel 22:1-4; 25:1-43.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya