Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 63
  • Eze Solomọn nke Maara Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eze Solomọn nke Maara Ihe
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Sọlọmọn Bụ Eze Maara Ihe
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Gịnị Ka Ị Na-amụta N’àgwà Ọma Ya Nakwa N’àgwà Ọjọọ Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ụlọ Nsọ A Rụụrụ Jehova
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Solomọn Ewuo Ụlọ Nsọ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 63
Mgbe Eze Solomọn nọ ọdụ n’ocheeze ya

AKỤKỌ NKE 63

Eze Solomọn nke Maara Ihe

SOLOMỌN dị afọ iri na ụma mgbe e chiri ya eze. Ọ hụrụ Jehova n’anya, gbasookwa ezi ndụmọdụ nke Devid nna ya nyere ya. Jehova nwere mmasị n’ebe Solomọn nọ, n’ihi ya, ọ gwara ya ná nrọ otu abalị, sị: ‘Solomọn, gịnị ka ị ga-achọ ka m nye gị?’

Solomọn sịrị ya: ‘Jehova, Chineke m, abụ m nwata, amaghịkwa m otú e si achị ndị mmadụ. Biko nye m amamihe iji chịa ndị gị n’ụzọ ziri ezi.’

Jehova nwere obi ụtọ n’ihe Solomọn rịọrọ. O wee sị: ‘Ebe ọ bụ na ị rịọrọ amamihe kama ịrịọ ogologo ndụ na akụ̀, M ga-enye gị amamihe karịa onye ọ bụla dịworo ndụ. M ga-enyekwa gị ihe ị na-arịọghị, ma akụ̀ ma ebube.’

Ọ dịghị anya, ụmụ nwaanyị abụọ ewere esemokwu tara akpụ jekwuru Solomọn. Otu n’ime ha wee sị: ‘Mụ na nwaanyị a bi n’otu ụlọ. Amụrụ m nwa nwoke, mgbe ụbọchị abụọ gasịrị, ya amụọkwa nwa nwoke. O ruo n’otu abalị, nwa ya wee nwụọ. Mgbe m na-arahụ ụra, o nyiwere nwa ya nwụrụ anwụ n’akụkụ m, wee kuru nwa nke m. Mgbe m tetara wee lee nwa ahụ nwụrụ anwụ, ahụrụ m na ọ bụghị nke m.’

Mgbe o kwuru nke a, nwaanyị nke ọzọ sịrị: ‘Ee e! Nwa nke dị ndụ bụ nke m, nwa nwụrụ anwụ bụ nke ya!’ Nwaanyị mbụ wee sị: ‘Ee e! Nwa nwụrụ anwụ bụ nke gị, nwa nke dị ndụ bụ nke m!’ Otú a ka ha nọ na-arụrịta ụka. Ma gịnị ka Solomọn ga-eme?

O ziri ozi ka e weta mma agha, mgbe e wetara ya, ọ sị: ‘Gbubie nwa nke dị ndụ abụọ, nye nwaanyị nke ọ bụla ọkara ya.’

Otu onye na-ejere Solomọn ozi ji nwa ọhụrụ na mma agha, ụmụ nwaanyị abụọ nọ ya n’akụkụ

Onye nke bụ́ nne nwata ahụ n’ezie tiri mkpu, sị: ‘Ee e! Biko egbula ya. Were ya nye ya!’ Nwaanyị nke ọzọ wee sị: ‘Enyela onye ọ bụla n’ime anyị, Gbubie ya abụọ.’

N’ikpeazụ, Solomọn wee sị: ‘Egbula nwa ahụ! Were ya nye nwaanyị mbụ ahụ. Ọ bụ ya bụ nne ya n’ezie.’ Solomọn matara nke a n’ihi na onye bụ́ nne nwata ahụ n’ezie hụrụ ya n’anya nke ukwuu nke na ọ dị njikere ikwere ka e nye ya nwaanyị nke ọzọ ka a ghara igbu ya. Mgbe ndị Izrel nụrụ otú Solomọn si kpee ikpe ahụ, obi tọrọ ha ụtọ inwe eze maara ihe otú ahụ.

N’oge ọchịchị Solomọn, Chineke gọziri ndị Izrel site n’ime ka ala pupụta ọtụtụ wit na bali na grep na fig na ihe oriri ndị ọzọ. Ha na-eyi ezigbo uwe, na-ebikwa n’ụlọ ọma. Mmadụ niile nwere ezi ihe niile nke zuuru ha.

1 Ndị Eze 3:3-28; 4:29-34.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya