Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 72
  • Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Nye Ụgwọ Ọrụ Maka Okwukwe nke Otu Eze
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Ọ Kwanyeere Anyị Ùgwù Site n’Inye Anyị Ikike Ikpebiri Onwe Anyị Ihe Anyị Ga-eme
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Onye M Ga-eṅomi—Hezekaya
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 72
Mgbe Hezekaya weere akwụkwọ ozi eze Asiria ziteere ya chịsa n’ihu ebe ịchụàjà Jehova ma na-ekpe ekpere

AKỤKỌ NKE 72

Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka

Ị̀ MA ihe mere nwoke a ji ekpegara Jehova ekpere? Gịnị mere o ji chịsa akwụkwọ ozi ndị a n’ihu ebe a na-achụrụ Jehova àjà? Nwoke ahụ bụ Hezekaya. Ọ bụ eze nke ebo abụọ nke Izrel nke dị n’ebe ndịda. Ma, ọ nọ ná nnukwu nsogbu. N’ihi gịnị?

Ọ bụ n’ihi na ụsụụ ndị agha Asiria ebibiworị ebo iri nke dị n’ebe ugwu. Jehova kwere ka nke a mee n’ihi na ndị ahụ jọrọ njọ. Ma ugbu a, ụsụụ ndị agha Asiria abịawo ibuso alaeze ebo abụọ ahụ agha.

Eze Asiria ziteere Eze Hezekaya akwụkwọ ozi. Ọ bụ akwụkwọ ozi ndị ahụ ka Hezekaya chịsara n’ebe a n’ihu Chineke. N’akwụkwọ ozi ndị ahụ, e ji Jehova mee ihe ọchị ma gwa Hezekaya ka ọ chịlie aka elu. Ọ bụ nke a mere Hezekaya ji na-ekpe ekpere, sị: ‘Biko, Jehova, zọpụta anyị n’aka eze Asiria. Mgbe ahụ ka mba niile ga-amara na naanị gị bụ Chineke.’ Jehova ọ̀ ga-aza ekpere Hezekaya?

Hezekaya bụ eze ọma. Ọ dịghị ka ajọ ndị eze ebo iri nke Izrel, ma ọ bụ dị ka ajọ Eze Ehaz bụ́ nna ya. Hezekaya kpachapụrụ anya iji hụ na o gere ntị n’iwu Jehova niile. Ma mgbe Hezekaya kpesịrị ekpere, Aịzaya onye amụma ziri ya ozi nke a sitere n’aka Jehova: ‘Eze Asiria agaghị abata Jeruselem. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị agha ya ga-abịaru ya nso. Ha agaghị agba otu akụ́ ọ bụla n’obodo a.’

Ndị agha ndị Asiria nwụrụ anwụ juru n’ala ebe ha bi

Lee foto dị na peeji a. Ị̀ ma ndị agha ndị a nwụrụ anwụ? Ha bụ ndị Asiria. Jehova zipụrụ otu mmụọ ozi ya, n’ime otu abalịkwa, mmụọ ozi ahụ gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na puku iri asatọ na ise. N’ihi ya, ike gwụrụ eze Asiria, o wee laa n’ebe obibi ya.

A zọpụtara alaeze ebo abụọ ahụ, ndị ya wee nwee udo ruo oge ụfọdụ. Ma mgbe Hezekaya nwụrụ, Manase nwa ya wee bụrụ eze. Ma Manase ma nwa ya, bụ́ Emọn, nke nọchiri ya, bụcha ajọ ndị eze. Mmebi iwu na ihe ike jupụtara n’ala ahụ ọzọ. Mgbe ndị ohu Eze Emọn gburu ya, e chiri Josaya nwa ya eze ịchị alaeze ebo abụọ ahụ.

2 Ndị Eze 18:1-36; 19:1-37; 21:1-25.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya