Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 82
  • Mọdekaị na Esta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mọdekaị na Esta
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Naanị Ọdịmma Onwe Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Esta Napụtara Ndị Obodo Ha
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Ihe Ga-abara Naanị Ya Uru
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Ọ Gbachiteere Ndị Chineke
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 82
N’oriri Esta kpọrọ Eze Ahazuirọs na Heman ka Esta nọ gwa eze nkata ọjọọ Heman kpara igbukpọ ndị Izrel

AKỤKỌ NKE 82

Mọdekaị na Esta

KA ANYỊ laghachi azụ n’afọ ole na ole tupu Ezra agaa Jeruselem. Mọdekaị na Esta bụ ndị Izrel a ma nnọọ ama n’alaeze Peshia. Esta bụ nwunye eze, nwa nwanne nna ya, bụ́ Mọdekaị, bụ onye na-esote eze n’ọchịchị. Ka anyị hụ otú ihe si bịa dịrị otú ahụ.

Ndị mụrụ Esta nwụrụ mgbe ọ bụ nwata, Mọdekaị wee zụlite ya. Ahazuirọs, bụ́ eze Peshia, nwere obí n’obodo ukwu bụ́ Shushan, Mọdekaị bụkwa otu n’ime ndị ohu ya. Otu ụbọchị, Vashtaị, bụ́ nwunye eze, nupụụrụ eze isi, eze wee họrọ nwunye ọhụrụ ịbụ lọọlọ ya. Ị̀ ma nwaanyị ọ họọrọ? Ọ bụ Esta, bụ́ nwa agbọghọ mara mma.

Mgbe iwe na-ewe Heman na Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isi ala

Ị̀ na-ahụ nwoke mpako a ndị mmadụ na-akpọrọ isi ala? Aha ya bụ Heman. Ọ bụ nwoke a ma ama na Peshia. Heman na-achọkwa ka Mọdekaị, bụ́ onye ahụ ị na-ahụ nọdụrụ ala n’ebe ahụ, kpọọrọ ya isi ala. Ma Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isi ala. Mọdekaị echeghị na o ziri ezi ịkpọrọ ajọ mmadụ dị otú ahụ isi ala. Nke a kpasuru Heman iwe. N’ihi ya, lezienụ ihe o mere.

Heman gwara eze okwu ụgha banyere ndị Izrel. Ọ sịrị: ‘Ha bụ ndị ọjọọ, ndị na-adịghị erube isi n’iwu gị. Ha kwesịrị ogbugbu.’ Ahazuirọs amaghị na Esta nwunye ya bụ onye Izrel. Ya mere, o gere Heman ntị wee mee iwu na a ga-egbu ndị Izrel niile n’otu ụbọchị a kara aka.

Mgbe Mọdekaị nụrụ banyere iwu ahụ, o wutere ya nke ukwuu. O wee zigara Esta ozi, sị ya: ‘Ị ghaghị ịgwa eze, rịọ ya ka ọ zọpụta anyị.’ O megidere iwu n’ala Peshia bụ́ mmadụ ịga n’ihu eze ọ gwụla ma ọ kpọrọ onye ahụ. Ma Esta gara n’ihu eze mgbe ọ na-akpọghị ya. Eze matịrị mkpọ ọlaedo ya, bụ́ nke na-egosi na a gaghị egbu ya. Esta kpọrọ eze na Heman oké oriri. N’ebe ahụ ka eze nọ jụọ Esta ihe ọma ọ chọrọ ka ya meere ya. Esta wee sị na ya ga-agwa ya ma ọ bụrụ na ya na Heman ga-abịa n’oriri ọzọ n’echi ya.

N’oriri ahụ, Esta gwara eze, sị: ‘A na-aga igbu mụ na ndị m.’ Iwe were eze. ‘Ònye na-anwa ime ihe nke a?’ ka ọ jụrụ ya.

Esta wee sị ya: ‘Onye iro ahụ bụ ajọ nwoke a bụ́ Heman?’

Ezigbo iwe ji eze ugbu a. O wee nye iwu ka e gbuo Heman. N’ikpeazụ, eze mere Mọdekaị onye na-esote ya n’ọchịchị. Mgbe ahụ, Mọdekaị hụrụ na e mere iwu ọhụrụ nke nyere ndị Izrel ikike ịlụ ọgụ maka ndụ ha n’ụbọchị ahụ e zubere igbusị ha. Ebe ọ bụ na Mọdekaị bụ nwoke a ma ama ugbu a, ọtụtụ ndị nyeere ndị Izrel aka, e wee zọpụta ha n’aka ndị iro ha.

Akwụkwọ Bible bụ́ Esta.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya