Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/97 p. 7
  • Ị̀ Bụ Onyeàmà Oge Nile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Bụ Onyeàmà Oge Nile?
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Gịnị Ka Ị Na-ewere Dị Ka Inwe Ihe Ịga nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • ‘Ka O Mezuo Ebumnobi Gị Niile’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • “Na-emenụ Ihe Niile Iji Nye Chineke Otuto”
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 10/97 p. 7

Ị̀ Bụ Onyeàmà Oge Nile?

1 Ị̀ ga-aza ee nye ajụjụ a? Ọ bụ ezie na a pụghị idebanye aha ndị ohu Jehova nile raara onwe ha nye n’ozi oge nile, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na anyị nile kwesịrị ile onwe anyị anya dị ka Ndịàmà ya nke oge nile? N’ezie anyị kwesịrị.

2 E nweghị ihe dị ka onye Kraịst nwa oge. Jisọs kwuru banyere Nna ya, sị: “Mụ onwe m na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ mgbe nile.” (Jọn 8:29) Pọl, onye nwere otu mmetụta ahụ, gbara anyị ume ‘ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.’ (1 Kọr. 10:31) N’ihi ya, anyị nile kwesịrị iwere onwe anyị dị ka Ndịàmà oge nile nke Jehova. Anyị iche echiche n’ụzọ dị otú a ga-emetụta anyị n’ụzọ dị mma n’ihe omume ọ bụla anyị na-achụso.

3 Tụlee Ihe Àmà Ahụ: Ọdịdị, okwu ọnụ, na omume anyị pụrụ igosi ndị ọzọ na anyị bụ n’ezie Ndịàmà Jehova. Anyị na-eche echiche banyere mkpa nke ọdịdị kwesịrị ekwesị, okwu dị mma, na àgwà kwesịrị ekwesị mgbe ọ bụla anyị nọ n’ozi ubi ma ọ bụ na-aga nzukọ ndị Kraịst. Otú ọ dị, ma ànyị na-aga akwụkwọ, na-arụ ọrụ ego, ma ọ bụ na-atụrụ ndụ, ihe nile banyere anyị kwesịrị inye ihe àmà na anyị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova.

4 Jisọs sịrị: “A pụghị izo obodo nke e wuworo n’elu ugwu. . . . Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” (Mat. 5:14-16) Nke a kwesịrị ịbụ eziokwu n’ihe ọ bụla anyị na-eme na n’oge nile. Ọ bụrụ na anyị achọpụta mgbe ọ bụla na anyị na-ala azụ ịgba àmà n’ihi ebe anyị nọ ma ọ bụ ihe anyị na-eme, ọ dị anyị mkpa ịjụ onwe anyị sị, ‘M̀ na-ejere Jehova ozi nwa oge ka ọ̀ bụ oge nile?’ Ya adịla mgbe anyị ga-ekwe ka ohere ịgwa ndị ọzọ banyere ozi ọma nke Alaeze Chineke gafenahụ anyị.

5 Cheta, anyị na-asọpụrụ ma na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ mgbe anyị pụrụ iji “ee” dara ụda zaa ajụjụ ahụ bụ́, “Ị̀ bụ Onyeàmà oge nile?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya