Jiri Ohere A Pụrụ Iche Mee Ihe!
PETER agamiela n’ihe ọmụmụ nkà mmụta ọgwụ ya mgbe ozi nzọpụta nke Bible dọọrọ mmasị ya. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ wee malite ịrụ ọrụ dị ka dọkịta n’otu ụlọ ọgwụ, ndị isi ya nọgidere na-agba ya ume ịghọ ọkachamara n’ịwa ahụ metụtara akwara na ụbụrụ. Ihe a bụ ohere nke ọtụtụ ndị dọkịta ga-eji mee ihe n’egbughị oge.
Ma, Petera kpebiri ịhapụ ohere a. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ nnọọ na o nweghị oké ọchịchọ na mkpali dị mkpa? Ee e, n’ihi na Peter ji nlezianya chebara onyinye ahụ echiche. Mgbe ọ ghọsịrị Onyeàmà Jehova raara onwe ya nye, e mere baptism, ọ chọrọ itinye oge dị ukwuu ruo n’ókè o kwere mee n’akụkụ dị iche iche nke ozi ndị Kraịst. Ozugbo o ruru eru dị ka ọkà n’ịwa ahụ metụtara akwara na ụbụrụ, ka ọ tụgharịrị n’uche ya, ọrụ ya ga-ewerekwu oge ya na ume ya. Ọ̀ dị nzuzu ịhapụ olileanya a pụrụ iche, ka ọ̀ maara ihe?
Nye ụfọdụ ndị, mkpebi Peter pụrụ iyiworị ihe nzuzu. Otú ọ dị, ọ tụlere akụkụ Bible ndị dị ka Ndị Efesọs 5:15, 16. N’ebe ahụ Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.”
Biko rịba okwu bụ́ “oge a nile” ama. A sụgharịtara ya n’okwu Grik e ji mee ihe n’ime Bible karịsịa n’izo aka na mgbe ma ọ bụ oge nke e ji ihe ụfọdụ kaa akara ma ọ bụ nke kwesịrị ekwesị maka otu ihe omume kpọmkwem. N’ebe a Pọl mesiri ya ike na ndị Kraịst kwesịrị iwepụta oge maka ihe ndị dị mkpa. N’ezie, ọ dị ha mkpa ‘ijide n’aka ihe ndị ka mkpa.’ (Ndị Filipaị 1:10, NW) Ọ bụ okwu banyere isetịpụ ihe ndị ka mkpa.
Ya mere, mgbe ahụ, gịnị bụ nzube Chineke maka oge anyị? Gịnị bụ uche Chineke maka ndị hụrụ ya n’anya? Amụma dị iche iche nke Bible na-eme ka a mata oge anyị a n’ụzọ doro anya dị ka “mgbe ọgwụgwụ,” ma ọ bụ “mgbe ikpeazụ.” (Daniel 12:4; 2 Timoti 3:1) Kraịst Jisọs ahapụghị obi abụọ ọ bụla banyere ihe ga-akasị mkpa maka oge anyị. O kwuru kpọmkwem na tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a, “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-eru.—Matiu 24:3, 14.
Ya mere, ọ dị anyị mkpa iji ohere ọ bụla kwusaa ozi ọma nke Alaeze ahụ ma mee ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20) Ebe ọ bụ na a gaghị arụghachikwa ọrụ ndị a ọzọ, nke a bụ ohere ikpeazụ e nwere iji tinye ihe nile anyị nwere n’ọrụ a nke ịzọpụta ndụ. “Ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma.” N’ezie, “ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.”—2 Ndị Kọrint 6:2.
Ime Mkpebi Amamihe Dị na Ya
Peter—nwa okorobịa ahụ e hotara ná mmalite—ji nlezianya chebara mkpebi ya echiche ma tụlee nhọrọ ndị o nwere. Ọ chọpụtara na ọ gaghị abụrụ ya ihe ọjọọ ịmụ ihe n’ebumnobi nke ịghọ onye ọkà n’ịwa ahụ metụtara akwara na ụbụrụ. Ma gịnị kasị mkpa nye ya? Ọ bụ ọrụ ya n’ozi ndị Kraịst, na-eburu n’uche ịdị ngwa nke ọrụ a. N’otu mgbe ahụ, o nwere ibu ọrụ ndị ọ na-aghaghị imezu. O ji nwanyị, ọ ghaghịkwa ịkwado nwunye ya, bụ́ onye na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ oge nile. (1 Timoti 5:8) Peter aghaghịkwa ịkwụghachi ụgwọ ndị metụtara agụmakwụkwọ ya. Gịnịzi ka o kpebiri ime?
Peter kpebiri ịbụ ọkà ná mmụta iji foto ime ahụ agwọ ọrịa na ime nnyocha ụda ime ahụ. Nke a bụ ọrụ ga-ewe ọrụ ụbọchị dị ka o kwesịrị. Ọ ga-anatakwa ọzụzụ ya n’oge ọrụ. Ee, ụfọdụ pụrụ ile nke a anya dị ka ọkwá ùgwù na-adịchaghị, ma ọ ga-enye ya oge ka ukwuu itinye ná nchụso ime mmụọ.
Ihe ọzọ kpaliri mkpebi Peter. N’ekpeghị ndị ọzọ ikpe bụ́ ndị pụrụ imeworị mkpebi dị iche, ọ maara na itinyebiga aka ókè n’ihe ụwa na-abụrụ onye Kraịst ihe ize ndụ. Ọ pụrụ ịkpatara ya ileghara ibu ọrụ ime mmụọ anya. Ihe atụ ọzọ mere ka nke a pụta ìhè nke metụtakwara ọrụ.
Otu onye nkwusa Alaeze oge nile bụ onye a zụrụ azụ n’ise ihe. O nwere ike ịkwado onwe ya n’ụzọ ego site n’ire ihe ndị o sere. Ka ọ na-etinye ihe ka ukwuu n’oge ya n’ozi ndị Kraịst ahụ kasị mkpa, ọ pụrụ isi otú a na-akwado onwe ya nke ọma. Otú ọ dị, ọchịchọ inwekwu ọganihu n’ọrụ ise ihe ya malitere ito. O mikpukwuru onwe ya n’ise ihe na ọrụ nkà, hapụ ozi oge nile, ma mesịa ghọọ onye na-adịghị ejekwa ozi ma ọlị n’ihe banyere ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Ka oge na-aga, o tinyere aka n’omume Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, na-akpata ya ịkwụsị ịbụ akụkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 5:11-13.
Oge Anyị Pụrụ Iche
Dị ka ndị na-ejere Jehova ozi ugbu a, n’ezie anyị chọrọ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya. Anyị maara na anyị na-ebi n’oge kasị pụọ iche n’akụkọ ihe mere eme mmadụ. Iji nọgide na-ejere Chineke ozi na ịnagide ọnọdụ ndị dị n’oge a n’ụzọ dị irè, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime mgbanwe dị iche iche. Anyị pụrụ iji nke a tụnyere oge owuwe ihe ubi nye onye ọrụ ugbo. Nke ahụ bụ oge ọrụ pụrụ iche, mgbe a na-atụ anya ka ndị na-arụ ọrụ ubi dọgbukwuo onwe ha n’ọrụ karịa otú ha na-emekarị ma tinye ọrụ ụbọchị dị ogologo karị. N’ihi gịnị? N’ihi na a ghaghị ịchịkọtacha ihe ubi ahụ ná mkpirikpi oge.
E nwere nnọọ nanị mkpirikpi oge fọdụụrụ ajọ usoro ihe dị ugbu a. Ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ dị ezi onye Kraịst mkpa ịdọgbu onwe ya n’ọrụ ịgbaso ihe nlereanya Jisọs na ije ije na nzọụkwụ ya. Ụzọ ndụ ya n’elu ala gosiri n’ụzọ doro anya ihe dị ya mkpa karịsịa. Ọ sịrị: “Anyị aghaghị ịrụ ọrụ Onye zitere m, mgbe ụbọchị fọdụrụ: abalị na-abịa, mgbe ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịrụ ọrụ.” (Jọn 9:4) Site n’ikwu na abalị na-abịa, Jisọs na-ezo aka n’oge ule, mkpọgbu, na ọnwụ ya, mgbe ozi elu ala ya ga-akwụsị, ọ gaghịkwa enwe ike ịrụ ọrụ Nna ya nke eluigwe.
N’eziokwu, n’oge ozi ya were afọ atọ na ọkara, Jisọs tinyere oge ya ụfọdụ n’ịrụ ọrụ ebube na ịgwọ ndị ọrịa. Ka o sina dị, o ji ihe ka ukwuu n’oge ya kwusaa ozi Alaeze ahụ na “ikwusa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha” n’okpukpe ụgha. (Luk 4:18; Matiu 4:17) Jisọs tinyere mgbalị siri ike n’ozi ya, wepụtakwa oge iji zụọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha wee nwee ike ịdabere na ntọala ọ tọworo wee gaa n’ihu n’ụzọ gara nke ọma n’ọrụ nkwusa ahụ. Jisọs jiri ohere ọ bụla mee ihe iji kwalite ọdịmma nile nke Alaeze ahụ, chọọkwa ka ndị na-eso ụzọ ya mee otu ihe ahụ.—Matiu 5:14-16; Jọn 8:12.
Dị ka Jisọs, ọ dị anyị bụ́ ụmụazụ ya nke oge a mkpa ịhụ ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ dị ka Jehova Chineke si ahụ ya. Oge na-agwụnarị usoro ihe a, Chineke jikwa obi ebere chọọ ka mmadụ nile nwee ohere inweta nzọpụta. (2 Pita 3:9) Ya mere, ọ́ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya itinye nchụso nile ọzọ n’ọnọdụ nke abụọ n’ebe ime uche Jehova dị? (Matiu 6:25-33) Karịsịa n’oge pụrụ iche dị ka nke a, ihe a na-ewerekarị dị ka ihe dị mkpa pụrụ nnọọ ịghọ ihe na-adịchaghị mkpa ná ndụ anyị dị ka ndị Kraịst.
Ọ̀ dị onye ọ bụla n’ime anyị ga-akwa ụta maka ibute uche Chineke ụzọ ná ndụ anyị? Ee e n’ezie, n’ihi na ụzọ ndị Kraịst nke ịchụ onwe onye n’àjà na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ụba. Dị ka ihe atụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ezie asị m unu, Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị otu narị] ugbu a n’oge a, ụlọ, na ụmụnne ndị ikom, na ụmụnne ndị inyom, na nne, na ụmụ, na ubi, ha na nsogbu; ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.”—Mak 10:29, 30.
Ọ dịghị onye pụrụ ịtụ nkwụghachi ụgwọ nke ndị ji oge ha na-eto Jehova ma na-akpọsa ozi Alaeze ahụ na-enweta n’ọnụ ego. Ha na-enweta ọtụtụ ngọzi! Ndị a na-agụnye ezi ndị enyi, afọ ojuju nke ime uche Chineke, nnwapụta Chineke, na olileanya nke ndụ n’enweghị ngwụsị. (Mkpughe 21:3, 4) Leekwa ngọzi ọ bụ inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ ma wetara aha nsọ Jehova nsọpụrụ dị ka Ndịàmà ya! N’enweghị obi abụọ ọ bụla, ‘ịzụchapụta oge a nile’ bụ n’ezie ụzọ amamihe dị na ya na nke na-akwụghachi ụgwọ ọrụ. Ugbu a dị ka ọ na-adịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ bụ oge ikere òkè n’ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ị̀ ga-eji ohere a pụrụ iche mee ihe ma jigidesie ya ike?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aha ndochi anya.