Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mee Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Site n’Igosi Obi Ọma
    Ụlọ Nche—1991 | Julaị 15
    • n’ọnọdụ Kraịst, dị ka à ga-asị na Chineke na-arịọ arịrịọ site n’aka anyị: anyị nọ n’ọnọdụ Kraịst na-arịọ unu, meenụ ka unu na Chineke dị n’otu. Onye ahụ nke na-amaghị mmehie ka o mere ka ọ bụrụ mmehie n’ọnọdụ anyị; ka anyị onwe anyị wee ghọọ ezi omume Chineke n’ime ya. Ma, dị ka ndị anyị na ya na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọkwa unu ka unu ghara ịnara amara Chineke n’efu, n’ihi na ọ na-asị [n’Aịsaịa 49:8, Septuagint], N’oge a na-anara mmadụ nke ọma ka m nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka m nyeere gị aka: lee, ugbu a bụ oge a na-anara mmadụ nke ọma; lee, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta: anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla n’ihe ọ bụla, ka a ghara ịta ije ozi anyị ụta; kama n’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi.” (2 Ndị Kọrint 5:20–6:4) Gịnị ka okwu Pọl pụtara?

      19 Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ndị nnọchianya nọ n’ọnọdụ Kraịst, oké ìgwè mmadụ ahụ bụkwa ndị ozi ya. N’ịdị n’otu, ha na-agba ụmụ mmadụ ume ka ha mee ka ha na Chineke dịrị n’otu ka ha wee nweta nzọpụta. Pọl achọghị ka onye ọ bụla nara obi ebere Jehova Chineke nke na-erughịrị mmadụ site na Jisọs Kraịst ma kwere ka nzube ya funarị ya. Nke ahụ pụrụ ime anyị ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ịrụ ọrụ ahụ nke obi ebere na-erughịrị mmadụ mere ka anyị ruo eru ịrụ. N’ịbụ ndị ha na Chineke bụ enyi dị ka ndị e mere ka ha na ya dị n’otu, anyị agaghị na-anara obi ebere ahụ na-erughịrị mmadụ n’efu ma ọ bụrụ na anyị na-arụzu “ije ozi nke ime ka a dị n’otu ahụ; nke bụ na Chineke nọrịị n’ime Kraịst na-eme ka ya onwe ya na ụwa dị n’otu.” (2 Ndị Kọrint 5:18, 19) Ọ ga-abụkwa obi ọma kachasị ukwuu ka anyị na-egosi ndị ọzọ site n’inyere ha aka ime ka ha na Chineke dị n’otu.

      20. Gịnị ọzọ ka anyị ga-atụle?

      20 Ndị ohu Jehova na-eji oge na ihe onwunwe ha na-eme ihe n’ọrụ dị iche iche nke obi ọma mgbe ha na-achọ inyere ndị mmadụ aka n’ụzọ ime mmụọ site n’ije ozi ndị Kraịst. Ma gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Akwụkwọ nsọ nke itinye obi ọma n’ọrụ? Ka anyị gaa n’ihu ma nyochaa ụfọdụ n’ime ndị a ma tụlee ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi mee ihe na-atọ Jehova ụtọ site n’igosi obi ọma.

      Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

      ◻ Gịnị bụ obi ọma?

      ◻ Olee ụzọ anyị pụrụ isi zere igosi obi ọma nke hiere ụzọ?

      ◻ N’ihi gịnị ka ndị Jehova pụrụ iji nwee ntụkwasị obi n’obi ebere ịhụnanya ya?

      ◻ Gịnị bụ ụfọdụ ụgwọ ọrụ nke obi ọma?

      ◻ Site n’ime gịnị ka nzube nke obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ na-agaghị efunarị anyị?

  • Na-achụso Obi Ebere Ịhụnanya Mgbe Nile
    Ụlọ Nche—1991 | Julaị 15
    • Na-achụso Obi Ebere Ịhụnanya Mgbe Nile

      “Onye na-agbaso ezi omume na ebere [“obi ebere ịhụnanya,” NW] na-achọta ndụ, na ezi omume, na nsọpụrụ.”—ILU 21:21.

      1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya na ndị ahụ mmụọ Chineke na-eduzi ga-egosi obi ọma?

      JEHOVA nwere obi ọma na ọmịiko. Ọ bụ “Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Ya mere, o kwere nghọta na mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya gụnyere ịhụnanya na obi ọma.—Ndị Galetia 5:22, 23.

      2. Ihe atụ dịgasị aṅaa ka anyị ga-atụle ugbu a?

      2 Ndị ahụ mmụọ nsọ Jehova ma ọ bụ ike ọrụ ya na-eduzi, na-egosipụta mkpụrụ ya nke obi ọma. Ha na-egosi obi ebere ịhụnanya ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ. N’eziokwu, ha na-agbaso ihe nlereanya Pọl, na-eme ka a mara ha dị ka ndị na-ejere Chineke ozi “n’ime obi ọma” na n’ụzọ ndị ọzọ. (2 Ndị Kọrint 6:3-10) Mmụọ ha nke inwe obi ebere, ọmịiko, na mgbaghara kwekọrọ n’ọdịdị nke Jehova, bụ́ onye ‘na-aba ụba n’obi ebere ịhụnanya,’ onye e nwekwara ọtụtụ ihe nlereanya nke obi ọma n’Okwu ya. (Abụ Ọma 86:15; Ndị Efesọs 4:32) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ụfọdụ n’ime ndị a?

      Obi Ọma Na-eme Ka Anyị Na-ele Ndị Ọbịa Anya Nke Ọma, Gharakwa Ịdị Na-achọ Ọdịmma Nanị Onwe Anyị

      3. N’ụzọ dị aṅaa ka Abraham si bụrụ ezi ihe nlereanya n’igosi obi ọma, agbamume dị aṅaa ka Pọl nyere n’ihe banyere nke a?

      3 Nna ochie ahụ bụ Abraham (Abram)—‘enyi Jehova,’ onye bụkwa ‘nna nke ndị nile nwere okwukwe’—setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’igosi obi ọma. (Jemes 2:23; Ndị Rom 4:11) Ya na ezinụlọ ya, gụnyere nwa nwanne ya bụ Lọt, hapụrụ obodo ndị Kaldea ahụ bụ Ua wee banye na Kenean mgbe Chineke nyere ha iwu ka ha mee otú ahụ. Ọ bụ ezie na Abraham bụ onye mere okenye karị, bụrụkwa onye isi ezinụlọ ahụ, o nwere obi ọma, gharakwa ịchọ ọdịmma nanị onwe ya n’ikwere ka Lọt họrọ akụkụ kachasị mma nke ala ịta nri, ebe ya onwe ya weere nke fọdụrụnụ. (Jenesis 13:5-18) Obi ọma dị otú ahụ pụrụ ịkpali anyị ikwe ka ndị ọzọ rite uru nke gaara abịaworo anyị. Iji obi ọma mee ihe n’achọghị ọdịmma nanị onwe onye n’ụzọ dị otú a kwekọrọ na ndụmọdụ Pọl onyeozi: “Ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.” Pọl n’onwe ya ‘mere ihe tọrọ mmadụ nile ụtọ n’ihe nile, n’achọghị uru nke aka ya kama uru nke mmadụ nile ka e wee zọpụta ha.’—1 Ndị Kọrint 10:24, 33.

      4. È si aṅaa kwụọ Abraham na Sera ụgwọ ọrụ maka igosi obi ọma n’ụdị nke ile ndị ọbịa anya nke ọma?

      4 Mgbe ụfọdụ, a na-egosi obi ọma n’ụdị nke ile ọbịa anya nke ọma n’ụzọ sitere n’ala ala obi. Abraham na nwunye ya bụ Sera, nwere obi ọma, leekwa ndị ọbịa atọ na-agafe agafe otu ụbọchị ọbịa nke ọma. Abraham gbara ha ume ịnọtụ nwa oge, mgbe ya na Sera mere ngwa ngwa kwadebe ihe oriri dị mma maka ndị ọbịa ahụ. O mesịrị bụrụ na ndị ọbịa ahụ bụ ndị mmụọ ozi Jehova, ndị otu n’ime ha ziruru ozi nkwa ahụ nke bụ na Sera onye meworo agadi n’amụtaghị nwa gaje inwe otu nwa nwoke. (Jenesis 18:1-15) Lee nnọọ nkwughachi ụgwọ nke a bụ maka iji obi ọma lee ndị ọbịa anya nke ọma!

      5. N’ụzọ dị aṅaa ka Gaịọs si gosi obi ọma, ànyị pụkwara isi aṅaa mee ihe yiri nke ahụ?

      5 Otu ụzọ nke ndị Kraịst nile pụrụ isi gosi obi ọma bụ site n’ịbụ ndị na-ele ndị ọbịa anya nke ọma. (Ndị Rom 12:13; 1 Timoti 3:1, 2) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, ndị ohu Jehova na-eji obi ọma na-ele ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ọbịa nke ọma. Nke a na-echetara anyị ụdị obi ọma onye Kraịst narị afọ mbụ ahụ bụ Gaịọs gosiri. O mere “ihe kwesịrị ntụkwasị obi” n’ịnabata ụmụnna bụ ndị ọbịa nke ọma—ha bụkwa “ndị ọbịa” ndị ọ na-amabughị tupu mgbe ahụ. (3 Jọn 5-8) Dị ka ọ na-adịkarị, anyị maara ndị anyị pụrụ iji obi ọma lee ọbịa nke ọma. Ma eleghị anya, anyị na-ahụta na otu nwanna nwanyị ime mmụọ anyị nọ ná mwute. Ọ pụrụ ịbụ na di ya bụ onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ ọbụna onye a chụpụrụ n’ọgbakọ. Lee nnọọ ohere nke a bụ igosi obi ọma site n’ịkpọ ya òkù ka o sonyere ezinụlọ anyị ná nnọkọ ime mmụọ nakwa n’ihe oriri site n’oge ruo n’oge! Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na anyị agaghị eme oké oriri, o doro anya na ezinụlọ anyị ga-enweta ọṅụ n’igosi nwanna nwanyị dị otú ahụ obi ọma. (Tụlee Ilu 15:17.) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-egosipụtakwa ekele ya maka nke a n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi ekele.

      6. Olee ụzọ Lidia si gosi obi ọma, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji dị mkpa igosi obi ekele maka ihe obi ọma ndị e meere anyị?

      6 Mgbe e mesịrị nwanyị ahụ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe, bụ́ Lidia, baptism, “ọ rịọ anyị, sị, Ọ bụrụ na unu [Pọl na ndị ya na ha so] atụlewo na abụ m onye kwere n’Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], batanụ n’ụlọ m, nọgide n’ebe ahụ.” Luk kwukwara, sị, “O wee rụgide anyị.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha gosiri obi ekele ha maka obi ọma Lidia gosiri ha. (Ọrụ 16:14, 15, 40) Ma, ịghara igosipụta ekele pụrụ imebi ihe dị ukwuu. N’otu mgbe, otu nwanna nwanyị gbaworo 80 afọ, onye ahụ na-esichaghị ike, onye ego o nwere na-ehighịkwa nne, ji obi ọma rụsie ọrụ ike ịkwadebe ihe oriri maka ndị ọbịa ole na ole. O wutere ya nke ukwuu mgbe otu nwa okorobịa na-enweghị ike ọbụna ime ka ọ mara na ya agaghị enwe ike ịbịa. N’otu oge ọzọ, ụmụnna nwanyị abụọ abịaghị iri nri otu nwa agbọghọ bu ha n’uche wee kwadebe. “Nke a kụdara m mmụọ nke ukwuu,” ka nwa agbọghọ ahụ sịrị, “ebe ọ bụ na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha o mere nchefu. . . . Ọ gaara akara m mma ịnụ na ha chefuru banyere ịbịa iri nri, ma kama nke ahụ, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ụmụnna nwanyị ahụ nwere obi ọma ma ọ bụ ịhụnanya ruo n’ókè nke ime ka m mara na ha agaghị abịa.” Mkpụrụ nke mmụọ nsọ nke bụ obi ọma ọ̀ ga-akpali gị igosi obi ekele na ezi echiche n’ọnọdụ ndị yiri ndị a?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya