Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Iji Ntachi Obi Na-eme Nkwusa n’ala nke Ice na Ọkụ
    Ụlọ Nche—1993 | Septemba 15
    • ozi ọma n’ókèala a, na-enwe obi ike na Jehova ga-eme ka ihe a kụrụ too.—1 Ndị Kọrint 3:6.

      Olileanya Dị Mma Maka Mmụba

      Na-eji ụlọ okpomọkụ ndị e ji okpomọkụ sitere n’ime ala na-eme ka ha kpoo ọkụ na ọkụ a mụnyere n’ime ha, ndị Iceland na-akọ ugbo enwewo ike ịkọ ụdị mkpụrụ osisi dị iche iche, akwụkwọ nri, na ihe ọkụkụ ndị ọzọ. N’otu aka ahụ, Ndịàmà ahụ, na-eji eziokwu ime mmụọ, ikpo ọkụ nke nrụgide dị nro, na ngọzi nke mmụọ nsọ Jehova, anọwo na-arụpụta ihe ndị dị ịtụnanya n’ubi nke Iceland.

      N’afọ a 542 mmadụ bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst, a na-eduzikwa ugbu a ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 200 ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọzọkwa, nzaghachi dị mma n’agbamume ahụ nke ije ozi n’ókèala ndị na-enweghị ndị e kenyere ha na-enye anyị obi ike na ndị nile yiri atụrụ n’agwaetiti a sara mbara ga-anụ olu Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 10:14-16) Lee ihe ọṅụ ọ ga-abụrụ ndị nkwusa Alaeze ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị gosiworo ndidi na ntachi obi dị ukwuu n’ikwusa ozi ọma ahụ n’ala nke ice na ọkụ n’ime 64 afọ gara aga!

  • Nọgidesie Ike N’ije Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche—1993 | Septemba 15
    • Nọgidesie Ike N’ije Ozi Ọsụ Ụzọ

      IHE DỊ ka 4,500,000 Ndịàmà nke Jehova na-ekwusa ozi ọma gburugburu ụwa. N’etiti ha e nwere ihe karịrị 600,000 ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị nkwusa Alaeze oge nile. Ndị nọ n’usuu a bara ụba nke ndị ọsụ ụzọ sitere ná ndị na-erubeghị afọ iri na atọ ruo ná ndị laworo ezumike nká nọ n’afọ ndụ ha nke 90. Ha sitere n’ụdị nzụlite na akụkụ nile nke ndụ.

      Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ndị a nile na-eme nkwusa oge nile chọrọ inwe ihe ịga nke ọma n’ozi ọsụ ụzọ. Ọtụtụ chọrọ ime ya ọrụ ha ga-arụ ná ndụ. Ụfọdụ enweghị ike ime otú ahụ n’ihi ihe ụfọdụ. Ma, ndị ọzọ enwewo ike ịnọgide na-asụ ụzọ n’agbanyeghị ihe isi ike ego, ahụ adịghị ike, nkụda mmụọ, na nsogbu ndị ọzọ. Ya mere olee otú ndị nkwusa oge nile pụrụ isi nagide nsogbu ndị dị otú ahụ ma nọgide n’ozi ịsụ ụzọ?

      Igbo Mkpa Ego

      N’ozuzu ha, ndị ọsụ ụzọ na-arụ ọrụ ego iji kwụọ ụgwọ mmefu ha, dị ka Pọl onyeozi mere. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:9) N’akụkụ ka ukwuu nke ụwa, ha na-eche ọnụ ahịa ndị na-arị elu oji maka nri, uwe, ụlọ, na usoro njem. Ọtụtụ mgbe ọ na-esi ike inweta ọrụ ego nwa oge nke ha chọrọ. Ọ bụrụ na ọ dị, ọrụ ndị dị otú ahụ na-enyekarị nanị ụgwọ ọrụ dịkarịsịrị nta, n’enweghị uru inshọransi ahụ ike.

      Ọ bụrụ na anyị anọgide ‘buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya,’ anyị pụrụ inwe okwukwe na Jehova ga-eme ndokwa maka mkpa ihe onwunwe anyị. Ya mere, mgbe a nọ n’okpuru nrụgide ego, ọ dịghị ndị ọsụ ụzọ mkpa ‘ichegbu onwe ha banyere ụbọchị na-eso.’ (Matiu 6:25-34) Ka ha na-etinye ezi mgbalị idozi nsogbu ndị dị otú ahụ, okwukwe siri ike na Jehova ga-eme ka ha ghara inwe nchegbu n’enweghị isi.

      Mgbe ihe isi ike ego chere mmadụ ihu, ma eleghị anya a pụrụ ibelata mmefu. Site ná mgbanwe ụfọdụ n’atụmatụ mmefu ego, ọ pụrụ ikwe mee inweta ihe ndị dị mkpa, ma ọ bụghị ihe nkịtị ndị a chọrọ n’ụzọ ihe onwunwe. Iji belata mmefu, ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ na-eso ndị Kraịst ndị ọzọ na-ekerịta ụlọ. Iji nyere ụmụ ha aka ịsụ ụzọ, ndị nne na nna mgbe ụfọdụ na-enye ụlọ n’efu ma ọ bụ n’ọnụ ahịa dị nnọọ ala. Ndị ọzọ na-enyere ndị ọsụ ụzọ aka n’ihe banyere nri na ego njem. Ma ndị ọsụ ụzọ agaghị achọ ịbụ ibu nye ndị ọzọ, n’ihi na ha nwere ọrụ Akwụkwọ Nsọ nyere ha nke ịkwado onwe ha.—2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12.

      A pụrụ ibelata ego njem site n’iso ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ na-akwụkọrịta ụgwọ. Ọ bụrụ na ndị ọsụ ụzọ abụọ nwechara ụgbọ ala, ha pụrụ ịrụkọ ọrụ n’otu ebe, na-eji otu ụgbọ ala wee na-ezere mmefu nke ịgba ụgbọ ala abụọ. Ndị ọsụ ụzọ na-enweghị ụgbọ ala pụrụ isonyere ndị nwere ma kere òkè n’ịkwụ ụgwọ ego njem. A ka pụkwara ibelata ego njem site n’ijezu ókèala ndị dị nso site n’iji ụkwụ aga. N’ọtụtụ mba ndị ọsụ ụzọ na-eji usoro njem ọha nke dị ọnụ ala.

      N’etiti ndị meriri nsogbu ego ma nọgide n’ozi oge nile e nwere Newton Cantwell na nwunye ya. Ha rere ugbo ha wee malite ịsụ ụzọ ha na isii n’ime ụmụ ha asaa n’afọ 1932, n’oge Oké Ndakpọ ahụ. “Ọ dịghị anya anyị risịrị ego anyị nwetara n’ire ugbo anyị—karịsịa n’ịkwụ ụgwọ ọgwụ,” ka Nwanna Cantwell dere. “Anyị na-echeta na mgbe anyị gara n’ebe nke abụọ e kenyere anyị ọrụ, anyị nwere nanị ihe ga-ezu ịkwụ ụgwọ ụlọ izu abụọ, ọ mafọdụ dollar ise. Ka o sina dị, anyị maara na Jehova ga-enye ihe a chọrọ ma ọ bụrụhaala na anyị ji ịdị uchu na-eje ozi anyị. . . . Anyị mụtara iji nwayọọ na-emefu ihe n’ọtụtụ ụzọ. Mgbe anyị kwagara n’ókèala ọhụrụ, dị ka ihe atụ m ga-agwa ụfọdụ ndị nwe ebe a na-agbara mmanụ ụgbọ ala okwu ma kọwaa na kwa ụbọchị anyị nwere ụgbọ ala atọ na-agba n’ụzọ n’ihe banyere ọrụ ndị Kraịst anyị. Nke a na-akpatakarị anyị ịdị na-agbata petrol n’ọnụ ahịa e bepụrụ ihe. Ngwa ngwa ụmụ anyị ndị nwoke mụtara ịdị na-edozi ụgbọ ala anyị, na-echebere anyị ego dị ukwuu a gaara akwụ ndị mekanik.” Ezinụlọ Cantwell si otú nagide ihe ịma aka ego nke ọma ma nọgide n’ozi oge nile. Nwanna Cantwell ka nọkwa n’ọkwá ndị ọsụ ụzọ mgbe ọ nwụrụ n’afọ ndụ nke 103.

      Inweta Ọrụ Nwa Oge

      Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-akwado onwe ha n’ụzọ ego site n’ọrụ nwa oge. Iji kwado onwe ya n’ozi ahụ na Kọrint, Pọl rụrụ ọrụ dị ka onye na-akpa ákwà ụlọikwu ya na ndị kwere ekwe ibe ya bụ́ Akwịla na Prisila. (Ọrụ 18:1-11) Taa, ụmụnna ime mmụọ na-enwekarị obi ụtọ inye ndị ọsụ ụzọ ọrụ ego nwa oge. Ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ na-enweta ọrụ dị otú ahụ site n’ụlọ ọrụ ndị na-enye ọrụ bụ́ ndị na-enye ọrụ na-adịghị adịte anya. Okwukwe n’ebe Chineke nọ dị mkpa, otú ahụ ka ọ dịkwa ekpere si n’obi maka nduzi ya n’ime mkpebi ọrụ.—Ilu 15:29.

      “Mgbe m nwetasịrị ume dị ukwuu site ná ntụle e ji ekpere mee,” ka otu onye ọsụ ụzọ kwuru, “m gwara onye nlekọta ọrụ m na ọrụ ije ozi m bụ ibu ọrụ onwe onye siri ike nakwa na m gaghị enwe ike ịnakwere ọnọdụ nke ọrụ oge nile. Na Wednesday na-eso ya, a jụrụ m ma m ga-echebara ọrụ ahụ echiche ọzọ kama n’ọnọdụ ọrụ nwa oge. Eji m obi ụtọ nakwere ya.” Eledala ike nke ekpere anya, meekwa ihe dị ka ekpere gị si dị.

      Ndị ọsụ ụzọ pụrụ ịhụ ya dị ka ihe dị mma ịgwa ndị pụrụ iwe ha n’ọrụ na nzube ha n’ịchọ ọrụ nwa oge bụ iji kwado ha n’ozi ahụ. Ha pụrụ ihota ụbọchị ndị ha nọ ya na ọnụ ọgụgụ hour kwa izu ha pụrụ itinye n’ọrụ. Ụmụnne nwanyị abụọ otu nne ji nwere ike ikewa otu ọrụ oge nile n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka okwu ikpe n’etiti onwe ha, na-enye nke ọ bụla n’ime ha ohere ịrụ ọrụ ụbọchị abụọ na ọkara kwa izu. Nke a kwadoro ha dị ka ndị ọsụ ụzọ ruo mgbe ha gara ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead ma nata ọrụ ndị ozi ala ọzọ.

      A pụrụ ịchọta ụdị ọrụ dị iche iche Akwụkwọ Nsọ na-anabata site n’ikwunyere ndị kwere ekwe ibe anyị na ndị ọzọ okwu ma ọ bụ site n’ile mkpọsa ozi ịchọ ndị ọrụ n’akwụkwọ akụkọ. Obi umeala na-enye aka, n’ihi na ọ pụrụ ime ka ndị ọsụ ụzọ ghara ịdị na-agba nhọ banyere ụdị ọrụ ha ga-arụ. (Tụlee Jemes 4:10.) Iji nọgide na-asụ ụzọ ọ pụrụ ịdị ha mkpa ịrụ ọrụ ego nke ụfọdụ ndị na-eleda anya. Ọ bụrụ na a nakwere ọrụ dị otú ahụ ma ihe dị iche abụrụ ihe a na-achọ, ọ pụrụ imesịa kwe mee ịgbanwe ọrụ.

      Ahụ Esighị Ike na Nkụda Mmụọ

      Ụfọdụ aghaghị ịkwụsị ije ozi ọsụ ụzọ ha n’ihi nsogbu ahụ ike siri ike. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị ọsụ ụzọ emeghị ngwa na nke a, ha pụrụ ịhụ na a pụrụ ịgwọ ọrịa ma mee ka ahụ ike ha dịwanye mma otú zuru ezu maka ha ịnọgide na-asụ ụzọ. Ọtụtụ pụrụ ịsụ ụzọ n’agbanyeghị nsogbu ahụ ike n’ihi na ha na-enweta usoro ịgwọ ọrịa, na-anọgidesi ike n’usoro nri dị ha mma n’ahụ, ma na-enwe ezumike na mmega ahụ dị mkpa. Onye nlekọta na-ejegharị ejegharị hụrụ otu nwanna nwanyị ọrịa arthritis na-enye nsogbu nke ukwuu nke na ọ chọrọ enyemaka iji na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ozi ahụ. (Ọrụ 20:20) Ma, ya na di ya duziri 33 ọmụmụ Bible ebe obibi, ha enyewokwara 83 mmadụ aka ịnakwere eziokwu Chineke. Ahụ ike ya kara mma mgbe oge na-aga, ọ gakwara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ n’afọ 11 n’ihu.

      Nkụda mmụọ pụrụ ime ka ụfọdụ hapụ ozi ọsụ ụzọ. (Ilu 24:10) Otu ọsụ ụzọ gwara onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, sị: “M gaje ịkwụsị ịsụ ụzọ. . . . Enwere m ụgwọ ndị m ga-akwụ.” O nwere mkpa maka ugegbe anya na-ada 20 dollar. “Ị̀ gaje ịkwụsị ịsụ ụzọ n’ihi mkpa ga-efu 20 dollar?” ka onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị jụrụ. A tụrụ aro ka ọsụ ụzọ ahụ rụọ ọrụ n’ugbo kọfị dị n’ógbè ahụ n’otu ụbọchị, rụta 20 dollar, zụrụ ugegbe anya ahụ, ma nọgide n’ịsụ ụzọ. Nkwurịta okwu e nwekwuru kpughere na nsogbu bụ isi bụ nkụda mmụọ n’ihi ọnụ ahịa dị elu gabiga ókè nke idozi ụgbọ ala. A tụrụ aro ka ọsụ ụzọ ahụ belata mmefu ndị ọ na-eme site n’ịkwọ ụgbọ gburugburu ókèala dị kilomita ole na ole kama nke buru ibu. A gwakwara ya okwu ndụmọdụ ka o jigide ọnọdụ ime mmụọ ya. Onye ọsụ ụzọ ahụ tinyere okwu ndụmọdụ ahụ n’ọrụ, ọnwa isii kwa n’ihu ọ natara òkù a kpọrọ ya ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilead. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, e kenyere ya ọrụ ịga ná mba dị n’ofesi ma jee ozi n’ebe ahụ n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ ruo ọnwụ ya. Ee, ngọzi ndị dị ukwuu na-abịakarị ma ọ bụrụ na nkụda mmụọ emerighị anyị kama anyị na-eburu n’uche na Jehova nọnyeere anyị.

      Were Ihe Ùgwù Ije Ozi Gị Dị Ka Akụ

      N’agbanyeghị ọnwụnwa dị iche iche, dị ka mgbe mkpa na oge enweghị nri, Pọl lere ozi ya anya dị ka akụ. (2 Ndị Kọrint 4:7; 6:3-6) N’ihu ihe isi ike na mkpagbu taa, ọtụtụ ndị na-ejere Jehova ozi n’Africa, Esia, Ọwụwa Anyanwụ Europe, na ebe ndị ọzọ ejigidesiwo ihe ùgwù ha nke ịsụ ụzọ ike. Ya mere, mgbe e zutere ọnwụnwa, tinye mgbalị nile iji nọgide n’ihe ùgwù ije ozi nke a, iji nye Jehova otuto.

      Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ nwere ike ịbanye n’ọrụ nkwusa oge nile nanị n’ihi na ha mere ka ndụ ha ka mfe. Dị ka Pọl, ha guzogidere ihe ndọrọ dị iche iche nke ihe onwunwe ma zụlite afọ ojuju n’inwe “ihe e ji azụ ahụ na ihe igbokwasị n’ahụ.” Iji nọgide n’ije ozi ọsụ ụzọ, ọ dị ha mkpa ịnọgide bụrụ ndị afọ juru n’ihe ndị dị mkpa. (1 Timoti 6:8) Ọṅụ na-esite n’iwere ihe ùgwù ndị Chineke nyere anyị dị ka akụ, na-edebe ha n’elu ihe onwunwe ndị a na-ahụ anya.

      Iji maa atụ: Anton Koerber nwere ihe ùgwù ịnọchite anya ọdịmma Alaeze n’ihu ndị isi gọọmenti na Washington, D.C. O jere ozi dị ka ọsụ ụzọ ruo oge ụfọdụ, bụrụkwa onye nlekọta sekit n’afọ ndị 1950. Ụfọdụ ndị ya na ha zụkọburu ahịa nwere mgbe ha jekwuuru ya na-eji atụmatụ ọrụ ga-eme ka ọ zụtara onwe ya uru otu nde dollar. Otú ọ dị, iji mee nke ahụ, ọ ga-adị ya mkpa itinye oge ya nile n’ihe banyere azụmahịa ahụ ruo ihe dị ka otu afọ. Mgbe o kpesịrị ekpere maka nduzi na mmụọ nke uche zuru okè, ọ sịrị: “Ọ gaghị ekwe omume ka m hapụ ihe ùgwù m dị ebube nke ijere Jehova ozi n’ebe a ọbụna maka otu afọ, ee e, ọ sọ ya bụrụ maka ego nile dị n’ụwa. Ijere ụmụnna m ozi n’ebe a na Washington dị oké ọnụ ahịa nye m karị, amakwaara m na m nwere ngọzi Jehova. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na m ga-erite otu nde dollar, ma ná ngwụsị nke afọ nke ụdị ndụ ahụ, olee otú m ga-adị n’ime mmụọ, ma ọ bụ ọbụna n’anụ ahụ?” Ya mere ọ jụrụ atụmatụ ọrụ ahụ. Iwere ihe ùgwù ha dị ka akụ n’otu aka ahụ na-enyere ọtụtụ ndị aka ịnọgide n’ije ozi ọsụ ụzọ.

      Lee aha ngọzi ndị dị ebube ndị ọsụ ụzọ na-enweta! Ọ bụ ngọzi itinye ọtụtụ hour n’ikwu banyere ọbụbụ eze dị ebube nke Jehova. (Abụ Ọma 145:11-13) N’ihi itinye oge dị nnọọ ukwu n’ozi ahụ, ndị ọsụ ụzọ nwere ngọzi nke iwetara ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu, ndị ọrịa na ndị mmadụ nwụnahụrụ, na ndị ọzọ nọ n’oké obi ilu ma nọrọ ná mkpa maka olileanya e ji n’aka, nkasi obi ime mmụọ. Ya mere, ọ bụrụ na ọnọdụ enye anyị ohere ikere òkè n’ọrụ nkwusa oge nile, anyị ga-enweta n’ezie ọtụtụ ngọzi. Ọ bụ ‘ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya.’ (Ilu 10:22) Ọ bụkwa site n’enyemaka na ngọzi ya ka ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze ji ọṅụ na-anọgide n’ije ozi ọsụ ụzọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—1993 | Septemba 15
    • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

      Ná Ndị Rom 9:3, Pọl onyeozi dere, sị: “Ana m ekperị ekpere, ka mụ onwe m bụrụ anathema [“onye a bụrụ ọnụ,” “NW”] pụọ n’ebe Kraịst nọ n’ihi ụmụnne m, ndị ikwu m dị ka anụ ahụ si dị.” Ọ̀ na-ekwu na ya ga-achụ ndụ ya n’àjà iji zọpụta ndị Juu ibe ya?

      Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya kasị elu nke ịhụnanya. Ọ dị njikere ịtọgbọ mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ, ya, maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. N’oge ozi ihu ọha ya, o jiri onwe ya rụọ ọrụ maka ndị obodo ya—ndị Juu—ka ọtụtụ dị ka o kwere mee wee soro ná ndị ga-erite uru n’àjà mgbapụta ya. (Mak 6:30-34) Azaghachighị nke ọma na mmegide ha n’ebe ozi nzọpụta ahụ dị adịghị mgbe o mere ka nchegbu ịhụnanya Jisọs jụọ oyi maka ndị Juu. (Matiu 23:37) Ọ hapụkwara ‘ihe ilereanya ka anyị soo ijeụkwụ ya nile.’—1 Pita 2:21.

      Ọ̀ pụrụ ikwe mee ka ndị mmadụ na-ezughị okè gbasoo ihe nlereanya Jisọs nke ịhụnanya? Ee, anyị pụkwara ịhụ ihe atụ nke a n’ime Pọl onyeozi. O nwere nchegbu nke ukwuu maka ndị Juu ibe ya nke na, site n’ịhụnanya maka ha, o kwuru na ya na-ekpe na ya onwe ya bụ “[onye a bụrụ ọnụ, NW] n’ebe Kraịst nọ” n’ihi ha.

      Pọl n’ebe ahụ jiri ụdị nkwufe okwu, ma ọ bụ ikwu ihe gabiga otú ọ dị, iji wepụta isi ihe ọ na-ekwu. Jisọs jiri otu ụdị ahụ nke ikwu ihe gabiga otú ọ dị mee ihe na Matiu 5:18, mgbe ọ sịrị: “Ruo mgbe eluigwe na ala ga-agabiga, ọ dịghị otu ihe ọ bụla dịkarịsịrị nta ga-agabiga n’iwu ma ọlị, ruo mgbe ihe nile ga-eme.” Jisọs maara na eluigwe na ala agaghị agabiga. Ọ dịghịkwa mgbe Pọl ga-aghọ onye a bụrụ ọnụ, ndị Juu nile agaghị anakwere Iso Ụzọ Kraịst. Ma isi ihe Pọl na-ekwu bụ na ya ga-eme ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe ọ bụla iji nyere ndị Juu aka ịnakwere ụzọ Chineke maka nzọpụta site na Jisọs Kraịst. Ka a sịkwa ihe mere onyeozi ahụ pụrụ iji gbaa ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst”!—1 Ndị Kọrint 11:1.

      Taa, ndị Kraịst kwesịrị inwe otu nchegbu ahụ Jisọs na Pọl nwere maka ndị na-ekweghị ekwe. Ọ dịghị mgbe ha ga-ekwere ka enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide pụtara ìhè site ná ndị nọ n’ókèala anyị na-agba àmà mee ka ịhụnanya anyị maka ndị agbata obi anyị na ịnụ ọkụ n’obi anyị inyere ha aka ịmụta ụzọ nke nzọpụta jụọ oyi.—Matiu 22:39.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya