Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 3/1 p. 29-31
  • Ihe Isi Ike Dịịrị Nkà Mmụta Okpukpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Isi Ike Dịịrị Nkà Mmụta Okpukpe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmalite na Ntolilte nke Otu Ihe Isi Ike
  • Pọl Ò Kwenyere ‘n’Ọnọdụ Dị n’Agbata’?
  • Mbilite n’Ọnwụ—Eziokwu Bible nke Magburu Onwe Ya
  • Gosipụta Okwukwe maka Ndụ Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Nkwenye Gị ná Mbilite n’Ọnwụ Siruru n’Ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “A Gaje Ime Ka Ọnwụ Ghara Ịdị Irè”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 3/1 p. 29-31

Ihe Isi Ike Dịịrị Nkà Mmụta Okpukpe

“ECHICHE nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na okwukwe ná mbilite n’ọnwụ . . . bụ echiche abụọ na-aga nnọọ iche iche, nke a na-aghaghị ime nhọrọ n’etiti ha abụọ.” Okwu ndị a nke Philippe Menoud chịkọtara ihe isi ike na-eche ndị ọkà mmụta okpukpe Protestant na Katọlik ihu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Bible na-ekwu banyere olileanya mbilite n’ọnwụ “n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 6:39, 40, 44, 54) Ma olileanya nke ọtụtụ ndị kwere ekwe, ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Gisbert Greshake na-ekwu, “dabeere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, nke na-ekewapụ site n’ahụ mgbe a nwụrụ ma laghachikwuru Chineke, ebe olileanya ná mbilite n’ọnwụ n’ụzọ dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ọ bụghị kpam kpam, pụworo n’anya.”

N’ọnọdụ ahụ, nsogbu siri ike na-ebilite, ka Bernard Sesboüé na-akọwa: “Gịnị bụ ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ n’oge ‘dị n’agbata’ ọnwụ nke ahụ ha na mbilite n’ọnwụ ikpeazụ?” Ajụjụ ahụ yiri ka ọ bụwo isiokwu nke nrụrịta ụka nkà mmụta okpukpe n’afọ ole na ole ndị ka gara aga. Gịnị dubara na ya? Nke kakwa mkpa, gịnị bụ ezi olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ?

Mmalite na Ntolilte nke Otu Ihe Isi Ike

Ndị Kraịst mbụ nwere echiche ndị doro anya banyere okwu ahụ. Ha matara site n’Akwụkwọ Nsọ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ Hibru na-asị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:5, 10) Ndị Kraịst ahụ lere anya ka mbilite n’ọnwụ were ọnọdụ n’oge “ọnụnọ Onyenwe anyị” nke dị n’ihu. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:13-17, NW) Ha atụghị anya ịnọ otu ebe na-ama ihe ọ bụla ka ha na-echere oge ahụ. Joseph Ratzinger, onye isi nlekọta e nwere ugbu a nke Ọgbakọ Vatican Maka Ozizi nke Okwukwe, na-asị: “Ọ dịghị nnwapụta ozizi dịnụ na Chọọchị ochie ahụ banyere anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi.”

Otú ọ dị, Nuovo dizionario di teologia na-akọwa na mgbe a na-agụ akwụkwọ Ndị Nna Chọọchị dere, dị ka nke Augustine ma ọ bụ Ambrose na narị afọ nke anọ, “anyị na-ahụ ihe ọhụrụ n’ihe banyere omenala Bible—mpụta nke nkụzi ndị Gris, nke dịwagara iche pụọ na nke okpukpe ndị Juu na ndị Kraịst.” Nkụzi ọhụrụ nke a dabeere ‘n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, n’ikpe onye ọ bụla ikpe ma nye ụgwọ ọrụ ma ọ bụ ntaramahụhụ ozugbo a nwụrụ.’ Otú a, e welitere otu ajụjụ banyere “ọnọdụ nke dị n’agbata”: Ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-anọgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị, gịnị na-eme ya mgbe ọ na-echere mbilite n’ọnwụ “n’ụbọchị ikpeazụ”? Nke a bụ ihe isi ike ndị ọkà mmụta okpukpe gbalịworo idozi.

Na narị afọ nke isii O.A., Pope Gregory nke Mbụ rụrụ ụka na n’ọnwụ mkpụrụ obi na-aga ozugbo n’ebe akara aka ha dị. Obi siri Pope John nke Iri Abụọ na Abụọ nke narị afọ nke 14 ike na ndị nwụrụ anwụ ga-enweta ụgwọ ọrụ ikpeazụ ha n’Ụbọchị Ikpe. Otú ọ dị, Pope Benedict nke Iri na Abụọ gbaghara onye butere ya ụzọ okwu. N’akwụkwọ Benedictus Deus (1336) nke popu dere, o kwuru na “mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ na-abanye n’ọnọdụ obi ụtọ [eluigwe], nnụcha [pọgatrị], ma ọ bụ ọmụma ikpe [hell] ozugbo a nwụsịrị, nanị ịbụ ndị e jikọghachiri ha na anụ ahụ ha a kpọlitere n’ọnwụ n’ọgwụgwụ nke ụwa.”

N’agbanyeghị esemokwu na nrụrịta ụka, nke a abụwo nguzo nke chọọchị nile nke Krisendọm ruo ọtụtụ narị afọ, ọ bụ ezie na chọọchị ndị nke Protestant na Orthodox n’ozuzu ha ekwenyeghị na pọgatrị. Otú ọ dị, site ná ngwụsị nke narị afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmụta atụwo aka ná mmalite na-adabereghị na Bible nke ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, n’ihi ya kwa, “nkà mmụta okpukpe nke oge a na-anwakarị ugbu a ile mmadụ anya dị ka njikọ nke a na-akwatu kpam kpam n’ọnwụ.” (The Encyclopedia of Religion) Ya mere, ndị na-enye nkọwa banyere Bible na-enwe ihe isi ike igosi izi ezi nke ịdị adị nke “ọnọdụ dị n’agbata.” Bible ọ̀ na-ekwu banyere ya, ka ọ̀ na-enye olileanya dị iche?

Pọl Ò Kwenyere ‘n’Ọnọdụ Dị n’Agbata’?

Akwụkwọ bụ́ Catechism of the Catholic Church na-asị: “Iji soro Kraịst bilie, anyị aghaghị iso Kraịst nwụọ: anyị aghaghị ‘ịpụ n’ahụ ma nọọ n’ụlọ n’ebe Onyenwe anyị nọ’. [2 Ndị Kọrint 5:8] ‘N’ọpụpụ’ ahụ nke bụ ọnwụ a na-ekewapụ mkpụrụ obi pụọ n’ahụ. [Ndị Filipaị 1:23] A ga-ejikọghachi ya na ahụ n’ụbọchị mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.” Ma n’akụkụ ihe odide ndị e hotara n’ebe a, Pọl onyeozi ọ̀ sịrị na mkpụrụ obi na-anọgide ndụ mgbe ahụ nwụsịrị ma chere “Ikpe Ikpeazụ” ahụ ka e jikọghachi ya na ahụ?

Ná 2 Ndị Kọrint 5:1, Pọl na-ezo aka n’ọnwụ nke ya ma na-ekwu banyere “ụlọ nke ụwa” bụ́ nke “a kwaturu.” Ọ̀ na-eche banyere ahụ nke mkpụrụ obi ya na-adịghị anwụ anwụ gbahapụrụ? Ee e. Pọl kwenyere na mmadụ bụ mkpụrụ obi, ọ bụghị na o nwere mkpụrụ obi. (Jenesis 2:7; 1 Ndị Kọrint 15:45) Pọl bụ onye Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ onye olileanya ya, dị ka nke ụmụnna ya nke narị afọ mbụ, bụ nke ‘e debere n’eluigwe.’ (Ndị Kọlọsi 1:5; Ndị Rom 8:14-18) Ya mere, ihe ‘na-agụsi ya ike’ bụ ka a kpọlite ya gaa n’eluigwe dị ka mmụọ e kere eke nke na-adịghị anwụ anwụ n’oge Chineke kara aka. (2 Ndị Kọrint 5:2-4) N’ikwu banyere olileanya a, o dere: “A ga-enwo anyị nile . . . mgbe a ga-afụ opi ikpeazụ: n’ihi na a ga-afụ opi, a ga-emekwa ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie na-apụghị ire ure, a ga-enwokwa anyị onwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 15:51, 52.

Ná 2 Ndị Kọrint 5:8, Pọl sịrị: “Anyị na-enwe obi ike, . . . ọ dịkwa anyị ezi mma karị ka anyị ghara ịnọ n’ụlọ n’ahụ anyị, ka anyị nọọkwa n’ụlọ n’ebe Onyenwe anyị nọ.” Ụfọdụ kwenyere na okwu ndị a na-ezo aka n’ọnọdụ dị n’agbata nke bụ́ nchere. Ndị dị otú ahụ na-ezokwa aka ná nkwa Jisọs nye ụmụazụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi na ya na-aga ịkwadebere ha ebe ya ‘ga-anara ha ịnọ ebe ya onwe ya nọ.’ Ma olee mgbe a ga-emezu olileanya ndị dị otú ahụ? Kraịst sịrị na ọ ga-abụ mgbe ọ ‘bịara ọzọ’ n’ọnụnọ ya dị n’ihu. (Jọn 14:1-3) N’otu aka ahụ, ná 2 Ndị Kọrint 5:1-10, Pọl sịrị na olileanya ndị Kraịst e tere mmanụ nwekọrọ ọnụ bụ iketa ebe obibi nke eluigwe. Nke a ga-emezu, ọ bụghị site n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi e chepụtara echepụta, kama site ná mbilite n’ọnwụ n’oge ọnụnọ Kraịst. (1 Ndị Kọrint 15:23, 42-44) Ọkà nnyocha akwụkwọ bụ́ Charles Masson na-ekwubi na 2 Ndị Kọrint 5:1-10 “pụrụ ịbụ nke a ghọtara nke ọma mgbe ahụ n’echigharịkwurughị nchepụta nke ‘ọnọdụ dị n’agbata.’”

Ná Ndị Filipaị 1:21, 23, Pọl na-asị: “N’ebe m nọ ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ anwụ bụkwa uru. Ma anọ m n’ebe dị mkpa n’etiti ihe abụọ ndị a, ebe agụụ ịla na ịnọ n’ebe Kraịst nọ na-agụ m; n’ihi na ọ kachasị mma nke ukwuu.” Pọl ọ̀ na-ezo aka n’ebe a ‘n’ọnọdụ dị n’agbata’? Ụfọdụ na-eche otú ahụ. Otú ọ dị, Pọl na-asị na ihe abụọ pụrụ ime—ndụ ma ọ bụ ọnwụ—na-arụgide ya. “Ebe agụụ ịla,” ka ọ gbakwụnyere, na-ehota ihe nke atọ pụrụ ime, “na ịnọ n’ebe Kraịst nọ na-agụ m.” Ọ̀ bụ “ịla” iji nọrọ n’ebe Kraịst nọ ozugbo ọ nwụsịrị? Ọ dị mma, dị ka anyị hụworo, Pọl kwenyere na a ga-akpọlite ndị Kraịst e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge ọnụnọ Kraịst. Ya mere, ọ ghaghị ibu n’uche ihe ndị ga-eme n’oge ahụ.

A pụrụ ịhụ nke a n’okwu ya ndị a na-achọta ná Ndị Filipaị 3:20, 21 na 1 Ndị Tesalọnaịka 4:16. “Ịla” dị otú ahụ n’oge ọnụnọ Kraịst Jisọs ga-enye Pọl ike ịnata ụgwọ ọrụ nke Chineke kwadebewooro ya. Na nke a bụ olileanya ya ka a na-ahụ n’okwu ndị ọ gwara nwa okoro ahụ bụ́ Timoti: “Nke fọdụrụ bụ na e debeworo m okpueze nke ezi omume ahụ, nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye ezi omume n’ikpe ikpe, ga-enyeghachi m n’ụbọchị ahụ: ma ọ bụghị nanị mụ onwe m, kama Ọ ga-enyeghachikwa ndị nile hụworo ngosi Ya n’anya.”—2 Timoti 4:8.

Mbilite n’Ọnwụ—Eziokwu Bible nke Magburu Onwe Ya

Ndị Kraịst mbụ lere mbilite n’ọnwụ anya dị ka ihe omume nke ga-amalite n’ọnụnọ Kraịst, ha nwetakwara ume na nkasi obi site n’eziokwu Bible nke a magburu onwe ya. (Matiu 24:3; Jọn 5:28, 29; 11:24, 25; 1 Ndị Kọrint 15:19, 20; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:13) Ha ji ikwesị ntụkwasị obi chere ọṅụ ahụ dị n’ihu, na-ajụ nkụzi ndapụ n’ezi ofufe nile nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi.—Ọrụ 20:28-30; 2 Timoti 4:3, 4; 2 Pita 2:1-3.

Otú ọ dị, a kparaghị mbilite n’ọnwụ ahụ ókè nye nanị ndị Kraịst nwere olileanya eluigwe. (1 Pita 1:3-5) Ndị nna ochie ahụ na ndị ochie ndị ọzọ jeere Chineke ozi gosipụtara okwukwe n’ike Jehova nwere iweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ n’elu ụwa. (Job 14:14, 15; Daniel 12:2; Luk 20:37, 38; Ndị Hibru 11:19, 35) Ọbụna ọtụtụ ijeri mmadụ ahụ ndị, n’ọtụtụ narị afọ na-agafenụ, na-enweghị ohere ịma banyere Chineke nwere ohere nke ịbụ ndị a kpọghachitere ná ndụ n’ime paradaịs elu ala, ebe “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15; Luk 23:42, 43) Nke a ọ́ bụghị olileanya na-akpali akpali?

Kama ime ka anyị kwere na ntaramahụhụ na ọnwụ ga na-adị mgbe nile, Jehova na-atụ aka n’oge mgbe a ga-ewepụsị ‘onye iro ikpeazụ, ọnwụ,’ ruo mgbe ebighị ebi, ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-ebikwa ndụ ruo ebighị ebi n’ụwa e weghachiri gaa na Paradaịs. (1 Ndị Kọrint 15:26; Jọn 3:16; 2 Pita 3:13) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe magburu onwe ya ịhụ ka ndị anyị hụrụ n’anya laghachitere ná ndụ! Lee ka olileanya nke a e ji n’aka si ka mma karịa anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ bụ́ nke a na-eche nanị n’echiche—ozizi nke dabeere, ọ bụghị n’Okwu Chineke, kama ná nkà ihe ọmụma ụwa nke ndị Gris! Ọ bụrụ na ị tụkwasị olileanya gị ná nkwa e ji n’aka nke Chineke, gị onwe gị kwa pụrụ ijide n’aka na n’isi nso “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ”!—Mkpughe 21:3-5.

[Foto dị na peeji nke 31]

Mbilite n’ọnwụ bụ eziokwu Bible nke magburu onwe ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya