-
Akọ na Uche Ibu Arọ Ka Ọ̀ Bụ Uru?Ụlọ Nche—1997 | Ọgọst 1
-
-
mgbe a ṅara ya ntị n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ pụkwara iji mmetụta nke afọ ojuju dị ukwuu na udo nke ime nyeghachi anyị ụgwọ ọrụ. Ọ pụrụ iduzi, ichebe, na ịkpali anyị. Akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Bible na-ekwu, sị: “A pụrụ ichebe ahụ ike nke echiche na mmetụta echiche nanị mgbe onye ahụ na-agbalị imechi olulu dị n’agbata ihe ọ na-eme na ihe o chere na ya kwesịrị ime.” Olee otú mmadụ pụrụ isi mechie olulu ahụ? Ọ̀ ga-ekwe omume ịkpụzi na ịzụ akọ na uche anyị? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
-
-
Ụzọ Isi Zụọ Akọ na Uche GịỤlọ Nche—1997 | Ọgọst 1
-
-
Ụzọ Isi Zụọ Akọ na Uche Gị
“AKỌ na uche dị ọcha bụ ohiri isi kasị mma.” Okwu a meworo ochie na-emesi otu eziokwu dị mkpa ike: Mgbe anyị ṅara akọ na uche anyị ntị, anyị na-enwe udo nke ime na ịdị jụụ.
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile na-ahọrọ ime otú ahụ. Adolf Hitler kwupụtara na ya nwere ike ịtọhapụ mmadụ site ná nchepụta efu, ma ọ bụ ihe ahụ na-eduhie eduhie, nke na-eweda n’ala, nke a maara dị ka akọ na uche. Ọchịchị ya nke ime ihe ike na-egositụ n’ụzọ na-akụda mmụọ otú ndị mmadụ dịruru obi ọjọọ mgbe ha jụrụ akọ na uche ha. N’ezie, ọtụtụ ndị omempụ na-eme ihe ike dịkwa njọ otú ahụ—bụ́ ndị na-edina mmadụ n’ike ma na-egbu ọchụ n’enweghị mmetụta ọ bụla. Ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-eme ihe ndị a bụ ụmụaka. N’ihi ya akwụkwọ nke na-amụ ihe ịtụnanya a bu isiokwu nta bụ́ Children Without a Conscience.
Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ihe ka n’ọtụtụ mmadụ ga-eche echiche ime mpụ dị oké njọ, ọtụtụ enweghị nsogbu ọ bụla banyere inwe mmekọahụ rụrụ arụ, ịtụ asị, ma ọ bụ ịghọ aghụghọ. Ụkpụrụ omume na-adakpọ n’ụwa nile. N’izo aka n’oké ndapụ n’ezi ofufe ahụ, Pọl onyeozi dere na ụfọdụ ndị Kraịst ga-ekwenye na mmetụta nke ụwa, wee si otú a bụrụ “ndị e ji ígwè ọkụ daa ha n’akọ na uche nke aka ha.” (1 Timoti 4:2) Iyi egwu nke ịkpa àgwà na-ezighị ezi ka ọbụna ukwuu taa na “mgbe ikpeazụ” ndị a. (2 Timoti 3:1) Ya mere, ndị Kraịst aghaghị ijisi ike chebe akọ na uche ha. Anyị pụrụ ime nke a site n’ịzụlite ya.
Uche, Obi, na Akọ na Uche Gị
Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m ekwu eziokwu n’ime Kraịst, ekwughị m okwu ụgha, akọ na uche m na-esokwa m gbaa àmà n’ime Mmụọ Nsọ.” (Ndị Rom 9:1) Ya mere akọ na uche pụrụ ịbụ ihe na-agba àmà. Ọ pụrụ inyocha ụzọ e si akpa àgwà, kwadookwa ma ọ bụ katọọ ya. Onye Okike anyị etinyewo n’ime anyị ihe dị ukwuu n’echiche anyị nke ezi ihe na ihe ọjọọ. Ma, a pụrụ ịkpụzi ma zụọ akọ na uche anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’anyị inweta ezi ihe ọmụma site n’Okwu Chineke. “Ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè,” ka Pọl onyeozi na-ekwu. (Ndị Rom 12:2) Ka ị na-akụnye echiche na uche Chineke n’ime uche gị, akọ na uche gị na-amalite na-arụ ọrụ n’ụzọ Chineke karị.
Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde gburugburu ụwa aka ‘ịmara Jehova Chineke na Jisọs Kraịst.’ (Jọn 17:3) Site ná ndokwa ọmụmụ Bible ebe obibi ha na-eduzi n’efu, ha na-akụziri ndị obi ha ziri ezi ụkpụrụ Jehova Chi
-