Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gịnị Mere A Ga-eji Gbaa Àmà Ihe Ọjọọ?
    Ụlọ Nche—1997 | Ọgọst 15
    • Ịgba àmà ihe ọjọọ bụ ngosipụta nke ezi nchegbu maka onye ahụ mere ihe ọjọọ. Jemes dere, sị: “Ụmụnna m, a sị na onye ọ bụla n’etiti unu si n’eziokwu jehie, ma otu onye wee mee ka o chigharịa; ka ọ mara na onye meworo ka onye mmehie si ná njehie nke ụzọ ya chigharịa ga-azọpụta mkpụrụ obi n’ọnwụ, ọ ga-ekpuchikwa ọtụtụ mmehie.”—Jemes 5:19, 20.

      Ya mere, gịnịzi mere a ga-eji gbaa àmà ihe ọjọọ? N’ihi na ọ na-arụpụta ihe ọma. N’ezie, ịgba àmà ihe ọjọọ bụ ngosipụta nke ịhụnanya ndị Kraịst nwere ụkpụrụ e nwere n’ebe Chineke nọ, n’ebe ọgbakọ nọ, na n’ebe onye ahụ mere ihe ọjọọ nọ. Ka onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ji iguzosi ike n’ihe na-akwalite ụkpụrụ ezi omume nke Chineke, Jehova ga-agọzi ọgbakọ ahụ dum n’ụba. Pọl onyeozi dere, sị: “[Jehova] ga-emekwa ka unu guzosie ike ruo ọgwụgwụ ihe nile, bụrụ ndị a na-apụghị ibo ebubo n’ụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 1:8.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—1997 | Ọgọst 15
    • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

      Tetragrammaton (mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ahụ bụ́ aha Chineke) ọ̀ dị n’ihe odide Hibru nke Matiu nke onye Juu bụ́ ọgwọ ọrịa na narị afọ nke 14 bụ́ Shem-Tob ben Isaac Ibn Shaprut dere?

      Ee e, ọ dịghị. Ka o sina dị, ihe odide Matiu nke a ji hash·Shem’ (e depụtazuru ma ọ bụ nke e debiiri) mee ihe ugboro 19, dị ka e gosipụtara na peji nke 13 nke Ụlọ Nche nke August 15, 1996.

      Okwu Hibru bụ́ hash·Shem’ pụtara “Aha ahụ,” bụ́ nke o doro anya na ọ na-ezo aka n’ebe aha Chineke dị. Dị ka ihe atụ, n’ihe odide Shem-Tob, ụdị nke hash·Shem’ e debiiri edebi pụtara na Matiu 3:3, bụ́ akụkụ ihe odide ebe Matiu hotara Aịsaịa 40:3. Ezi uche dị na ya ikwubi na mgbe Matiu hotara otu amaokwu n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ebe a na-achọta Tetragrammaton, o tinyere aha Chineke n’Oziọma ya. Ya mere ọ bụ ezie na ihe odide Hibru nke Shem-Tob depụtara ejighị Tetragrammaton mee ihe, ojiji o ji “Aha ahụ” mee ihe, dị ka na Matiu 3:3, na-akwado iji “Jehova” mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

      Shem-Tob depụtagharịrị ihe odide Hibru nke Matiu n’akwụkwọ ya kpatara esemokwu bụ́ ʼEʹven boʹchan. Otú ọ dị, olee ebe e si nweta ihe odide Hibru ahụ? Prọfesọ George Howard, onye mere oké nchọpụta n’okwu a, na-atụ aro na “Matiu Hibru nke Shem-Tob dị laa azụ n’ihe dị ka narị afọ anọ mbụ nke oge ndị Kraịst.”a Ndị ọzọ nwere ike ghara ikwenyere ya na nke a.

      Howard na-arịba ama, sị: “Matiu Hibru ahụ e tinyekọrọ n’ihe odide a bụ nke a maara karịsịa site n’ọtụtụ ọdịiche ya site na Matiu Grik ọha nakweere.” Dị ka ihe atụ, dị ka ihe odide Shem-Tob gosiri, Jisọs kwuru banyere Jọn, sị: “N’ezie, asị m unu, n’etiti ndị nile ndị inyom mụrụ ọ dịghị onye biliworo nke ka Jọn Onye Na-eme Baptism ukwuu.” Ma ọ mafere okwu na-esonụ nke Jisọs: “Ma onye dị nta karị n’alaeze eluigwe dị ukwuu karịa ya.” (Matiu 11:11) N’ụzọ yikwara nnọọ nke ahụ, e nwere ọtụtụ ọdịiche dị n’agbata ihe odide Hibru dị adị nke Akwụkwọ Nsọ Hibru na ihe e dere n’ihe odide ya na ya kwekọrọ nke nsụgharị Septuagint Grik. Ọ bụ ezie na anyị na-ekwenye na ha nwegasịrị ọdịiche, ihe odide ochie ndị dị otú ahụ nwetụrụ ọnọdụ n’ihe ọmụmụ e ji atụnyere ibe ya.

      Dị ka e kwuworo, ihe odide Shem-Tob nke Matiu tinyere “Aha ahụ” n’ebe e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na Matiu ji Tetragrammaton mee ihe n’ezie. Ya mere, kemgbe 1950, e jiriwo ihe odide Shem-Tob mee ihe dị ka ihe nkwado maka itinye aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e zokwara aka na ya na The New World Translation of the Holy Scriptures—With References.b

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya