Eziokwu Banyere Ịgha Ụgha
“ONYE ỤGHA!” À gwatụwo gị okwu ndị ahụ na-agba agba n’ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị maara oké mmetụta uche ha na-enwe.
Dị nnọọ ka arịa dị oké ọnụ ahịa pụrụ isi kụrisịa ma a kụọ ya n’ala, otú ahụ ka ịgha ụgha pụrụ isi mebie mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa. N’eziokwu, mgbe oge ụfọdụ gara, ị pụrụ inwe ike mezie mbibi ahụ, ma mmekọrịta ahụ agaghị abụkwa otu ihe ahụ ọzọ.
“Ndị chọpụtara na a ghaworo ha ụgha,” ka akwụkwọ bụ́ Lying—Moral Choice in Public and Private Life na-ekwu, “na-akpachara anya ná mgbalị ndị ọhụrụ ịmaliteghachi ọbụbụenyi ahụ. Ha na-eleghachikwa anya azụ ná nkwenye na omume ha ndị gara aga na-eburu n’uche ụgha ndị ahụ a chọpụtara.” Mgbe aghụghọ pụtara ìhè, mmekọrịta na-agabu nke ọma ná nkwurịta okwu sitere n’obi na ntụkwasị obi pụrụ ịbụ nke inyo ihe enyo na obi abụọ mebiri.
N’ihi mmetụta ọjọọ nile ndị e jikọtara ya na ịgha ụgha, anyị aghaghị ịjụ, sị, ‘Olee otú omume aghụghọ dị otú ahụ si malite?’
Ụgha Mbụ
Mgbe Jehova Chineke kere mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, o tinyere ha n’ebe obibi mara mma bụ ubi a gbara ogige. E nweghị ụdị aghụghọ ma ọ bụ wayo ọ bụla n’ebe obibi ha. Ọ bụ paradaịs n’ezie!
Otú ọ dị, n’otu oge mgbe e kesịrị Iv, Setan bụ́ Ekwensu ji onyinye na-adọrọ adọrọ bịakwute ya. A gwara Iv na ọ bụrụ na o rie “mkpụrụ nke osisi ahụ,” nke Chineke machibidoro iwu, ọ gaghị anwụ dị ka Chineke kwururị na ọ ga-anwụ. Kama nke ahụ, ọ ga-adị “ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 2:17; 3:1-5) Iv kwetara ihe Setan kwuru. O weere mkpụrụ osisi ahụ, rie ya, wee nyezie di ya ụfọdụ. Ma kama ịdị ka Chineke dị ka Setan kwererịị ná nkwa, Adam na Iv ghọrọ ndị mmehie nupụrụ isi, ndị ohu nke mmebi. (2 Pita 2:19) Sitekwa n’ịgha ụgha mbụ ahụ, Setan ghọrọ “nna nke ụgha nile.” (Jọn 8:44, Today’s English Version) Ka oge na-aga, ndị atọ a mere mmehie mụtara na ọ dịghị onye na-erite uru mgbe mmadụ ghara ụgha ma ọ bụ tụkwasị obi n’ụgha.
Mmetụta Ndị Na-eweta Ọnwụ
Jehova chọrọ ka ihe nile o kere eke—n’eluigwe na n’elu ala—mara na a ga-enye ntaramahụhụ maka ilezi anya nupụ isi. O mere ihe ngwa ngwa site n’ịma mmụọ ahụ e kere eke nupụrụ isi ikpe ibi ndụ ya fọdụrụnụ n’anọghị ná nzukọ dị nsọ nke Chineke. Ọzọkwa, Jehova Chineke ga-emesịa hụ na e bibiri Setan kpam kpam. Nke a ga-eme mgbe “mkpụrụ” ahụ Chineke kwere nkwa inye nyere ya mmerụ ahụ ga-eweta ọnwụ n’isi.—Jenesis 3:14, 15; Ndị Galetia 3:16.
N’akụkụ nke ha a chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden ahụ. Chineke mara Adam ikpe na-asị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” Ka oge na-aga, ma ya ma Iv nwụrụ, ọbụna dị ka Chineke buworo ụzọ kwuo.—Jenesis 3:19.
Dị ka ụmụ Adam, e renyewo ezinụlọ nile nke ụmụ mmadụ “n’okpuru mmehie.” Ụmụ mmadụ nile eketawo ezughị okè nke na-eduje n’ọnwụ. (Ndi Rom 5:12; 6:23; 7:14) Lee ka ihe ndị siworo n’ụgha mbụ ahụ pụta si dị njọ!—Ndị Rom 8:22.
Omume Gbamiri Mkpọrọgwụ
Ebe ọ bụ na e gbubeghị Setan na ndị mmụọ ozi sonyeere ya ná nnupụisi megide Chineke, o kwesịghị iju anyị anya na ha na-akpali ndị mmadụ ‘ikwu okwu ụgha.’ (1 Timoti 4:1-3) N’ihi ya, ịgha ụgha gbamiri mkpọrọgwụ n’ọha mmadụ. “Ịgha ụgha abụrụwo akụkụ nke ọha mmadụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Los Angeles Times kwuru, “nke na ọha mmadụ bụ ugbu a n’ụzọ dị ukwuu ndị ọ na-adịghị enye nsogbu n’uche.” Ọtụtụ ndị taa na-ejikọta ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ịgha ụgha n’ụzọ chiri anya, ma ị̀ maara na ndị ndú okpukpe so ná ndị kasị agha ụgha?
Ndị okpukpe megidere Jisọs gbasara ụgha banyere ya n’oge ozi elu ala ya. (Jọn 8:48, 54, 55) Ọ katọrọ ha n’ihu ọha, na-asị: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ Ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. . . . Mgbe ọ bụla ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.”—Jọn 8:44.
Ị̀ na-echeta ụgha ahụ a kọsara mgbe a hụrụ na ili Jisọs tọgbọrọ chakoo ka mbilite n’ọnwụ ya gasịrị? Bible na-ekwu na ndị isi nchụàjà ‘nyere ndị agha ahụ ego hiri nne, sị, Sịnụ, Ndị na-eso ụzọ Ya bịara n’abalị, zuru Ya n’ohi mgbe anyị na-arahụ ụra.’ A gbasara ụgha a ebe nile, e jikwa ya duhie ọtụtụ ndị. Lee ka ndị ndú okpukpe ahụ si nwee obi ọjọọ!—Matiu 28:11-15.
Ụgha Okpukpe Taa
Gịnị bụ ụgha pụtara ìhè nke ndị ndú okpukpe na-agha taa? O yiri nke ahụ Setan ghaara Iv: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ.” (Jenesis 3:4, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ma Iv nwụrụ n’ezie, ọ laghachikwara n’ala, n’ájá ebe e si mee ya.
Otú ọ dị, ò yiri nanị ka ọ nwụrụ ma nọgide na-adị ndụ n’ezie n’ụdị ọzọ? Ọnwụ ọ̀ bụ nanị ọnụ ụzọ na-eduje ná ndụ ọzọ? Bible enyeghị ihe ọ bụla na-egosi na akụkụ Iv ụfọdụ maara ihe nọgidere na-adị ndụ. Mkpụrụ obi ya anọgideghị na-adị ndụ. Site n’inupụrụ Chineke isi, o mehiewo, Bible na-ekwukwa, sị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) E kere Iv, dị ka di ya, ịbụ mkpụrụ obi dị ndụ, ndụ ya dị ka mkpụrụ obi dị ndụ kwụsịkwara. (Jenesis 2:7) Banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, Bible na-asị: “Ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Otú ọ dị, gịnị ka chọọchị dị iche iche na-akụzikarị?
Chọọchị dị iche iche na-akụzikarị na ụmụ mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nakwa na ọnwụ na-atọhapụ ya ịdị ndụ ọzọ—nke obi ụtọ zuru okè ma ọ bụ nke mmekpa ahụ. Dị ka ihe atụ, The Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Chọọchị na-akụzi agwụghị agwụ nke ihe mgbu nke hel n’ezoghị ọnụ dị ka eziokwu nke okwukwe nke onye ọ bụla na-apụghị ịgọnarị ma ọ bụ gbaghaa n’egosighị ịjụ okwukwe n’ụzọ doro anya.”—Mpịakọta nke 7, peji nke 209, mbipụta nke 1913.
Lee ka ozizi ahụ si dị iche n’ihe Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya! Bible na-akụzi na mgbe mmadụ nwụrụ, “o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” (Abụ Ọma 146:4) Ya mere, dị ka Bible si kwuo, ndị nwụrụ anwụ apụghị inwe ihe mgbu ọ bụla, n’ihi na ha amaghị ihe ọ bụla ma ọlị. Ya mere, Bible na-agba ume, sị: “Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị na [Sheol, NW; (ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ)], ebe gị onwe gị na-ala.”—Eklisiastis 9:10.
Mkpa nke Ịnọ na Nche
Ọbụna dị ka e si jiri ụgha nke ndị nchụàjà duhie ọtụtụ ndị n’ụbọchị Jisọs, otú ahụ ka e nwere ihe ize ndụ nke ịbụ onye e ji ozizi ụgha nke ndị ndú okpukpe nke taa duhie. Ndị a ejiriwo “eziokwu nke Chineke gbanwere ụgha ha,” ha na-akwalitekwa ozizi ụgha ndị dị ka anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ na echiche bụ na a ga-emekpa mkpụrụ obi ụmụ mmadụ ahụ n’ọkụ ala mmụọ.—Ndị Rom 1:25.
Tụkwasị na nke ahụ, okpukpe dị iche iche nke taa na-edebekarị ọdịnala na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ na eziokwu Bible n’otu ọkwá ahụ. (Ndị Kọlọsi 2:8) N’ihi ya, iwu Chineke banyere omume ọma—tinyere iwu ịkwụwa aka ọtọ na àgwà mmekọahụ—bụ ndị a na-ele anya dị ka ndị a kpaara ókè, ọ bụghị nke metụtara ihe nile. Ihe ọ rụpụtara bụ dị ka e si kọwaa ya na magazin Time: “Ụgha na-ejupụta mgbe e nwere ejighị ihe n’aka ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya, mgbe ndị mmadụ na-enwekwaghị ike ịghọta, ma ọ bụ kwekọrịta, n’iwu ndị na-achị akparamàgwà ha n’ebe ibe ha nọ.”—Tụlee Aịsaịa 59:14, 15; Jeremaịa 9:5.
Ibi na gburugburu ebe a na-ejikebeghị eziokwu kpọrọ ihe na-eme ka o sie ike ịṅa ntị na ndụmọdụ Chineke ka a ghara ịgha ụgha. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịdị na-ekwu eziokwu mgbe nile?
Iwere Nguzo Maka Eziokwu
Ọchịchọ anyị nwere ito Onye Okike anyị na-enye anyị mkpali kasị nnọọ mma iji zụlite ikwu eziokwu. N’ụzọ dị ịrịba ama, Bible na-akpọ ya “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ga-atọ Onye Okike anyị ụtọ, bụ́ onye kpọrọ “ire okwu ụgha” asị, a ga-akpali anyị iṅomi ya. (Ilu 6:17) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?
Ịmụsi Okwu Chineke ike pụrụ inye anyị ihe ọ na-ewe iji ‘na-ekwu eziokwu onye ọ bụla n’ebe onye agbata obi ya nọ.’ (Ndị Efesọs 4:25) Otú ọ dị, nanị ịmata ihe Chineke chọrọ anyị n’aka ezughị ezu. Ọ bụrụ na, dị ka ọtụtụ ndị nọ n’ime ụwa taa, anyị adịghị enwe mgbe nile ọchịchọ ikwu eziokwu, ọ ga-adị anyị mkpa ime ezi mgbalị ime otú ahụ. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịgbaso ihe nlereanya Pọl onyeozi ma ghara imere onwe anyị ebere. “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m,” ka Pọl dere.—1 Ndị Kọrint 9:27.
Enyemaka ọzọ e nwere na mgba a na-agba ikwu eziokwu mgbe nile bụ ekpere. Site n’ịrịọ Jehova maka enyemaka, anyị pụrụ inwe “ọkịka nke ike ahụ.” (2 Ndị Kọrint 4:7) N’ezie, ịnọgide na-enwe “egbugbere ọnụ eziokwu” na iwepụ “ire okwu ụgha” pụrụ ịbụ mgba na ọgụ n’ezie. (Ilu 12:19) Ma site n’enyemaka Jehova a pụrụ ime ya.—Ndị Filipaị 4:13.
Na-echeta mgbe nile na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-eme ka o yie ka ịgha ụgha ọ̀ bụ ihe dị otú o kwesịrị. Ọ ghọgburu nwanyị mbụ, bụ́ Iv, ghaara ya ụgha ọjọọ. Otú ọ dị, anyị maara nke ọma ihe ọdachi ndị si n’omume ịgha ụgha nke Setan pụta. A wụkwasịwo ezinụlọ ụmụ mmadụ ahụhụ a na-apụghị ịkọ akọ n’ihi otu ụgha ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ndị atọ na-achọ ọdịmma onwe ha nanị—Adam, Iv, na Setan.
Ee, eziokwu banyere ịgha ụgha bụ na a pụrụ iji ya tụnyere nsí na-egbu egbu. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, anyị pụrụ ime ihe banyere ya. Anyị pụrụ ịkwụsị omume ịgha ụgha ma nwee ihu ọma Jehova, bụ́ Chineke nke “na-aba ụba n’ebere na eziokwu,” ruo mgbe ebighị ebi.—Ọpụpụ 34:6.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]
A pụrụ iji ịgha ụgha tụnyere nsí na-egbu egbu
[Foto dị na peeji nke 11]
Mmetụta nke ịgha ụgha yiri nkụrisị nke otu arịa