Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 11/15 p. 28
  • Kpachara Anya Maka Iji Ego Azụrụ Ọkwá!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Maka Iji Ego Azụrụ Ọkwá!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 11/15 p. 28

Kpachara Anya Maka Iji Ego Azụrụ Ọkwá!

A NA-AKWANYERE Saịmọn onye Sameria ùgwù nke ukwuu n’ógbè ya. Ọ dịrị ndụ na narị afọ mbụ O.A., ime mgbaasị ya kpalikwara ndị mmadụ nke ukwuu nke na ha na-ekwu banyere ya, sị: “Onye a bụ ike ahụ nke Chineke nke a na-akpọ Ike Ukwu.”—Ọrụ 8:9-11.

Otú ọ dị, mgbe Saịmọn ghọsịrị onye Kraịst e mere baptism, ọ chọpụtara ike dị ukwuu karịa ihe o gosipụtaburu. Ọ bụ ike ahụ nke e nyere ndị ozi Jisọs, nke na-eme ka ha nwee ike inye ndị ọzọ onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ. Ọ masịrị Saịmọn nke ukwuu nke na o chere ndị ozi ahụ ego n’ihu ma rịọ, sị: “Nyekwanụ m ike a, ka, onye ọ bụla m ga-ebikwasị aka m abụọ n’isi, ka o wee nara Mmụọ Nsọ.”—Ọrụ 8:13-19.

Pita onyeozi baara Saịmọn mba, na-asị: “Ka ọlaọcha gị so gị laa n’iyi, n’ihi na i chere na ị ga-anata onyinye Chineke site n’ego. I nweghị òkè ma ọ bụ ihe nketa n’okwu a: n’ihi na obi gị ezighị ezi n’ihu Chineke.”—Ọrụ 8:20, 21.

Site n’ihe ndekọ Bible a ka okwu Bekee bụ́ “simony” (iji ego azụrụ ọkwá) si pụta, nke a kọwaworo dị ka “mmehie nke ịzụ ma ọ bụ ire ọkwá ma ọ bụ mbugo n’ọkwá na chọọchị.” New Catholic Encyclopedia na-ekweta na karịsịa site na narị afọ nke 9 ruo nke 11 “iji ego azụrụ ọkwá jupụtara n’ebe obibi ndị mọnk, n’etiti ndị ụkọchukwu nọ n’ọkwá dị ala, n’ọchịchị nke ndị bishọp, nakwa ọbụna n’ọchịchị nke ndị popu.” Mbipụta nke itoolu nke The Encyclopædia Britannica (1878) na-ekwu, sị: “Ọmụmụ nke akụkọ ihe mere eme banyere nzụkọ ndị e ji ahọpụta popu na-eme ka nwa akwụkwọ kwenyesie ike na e nwebeghị ntụliaka e mere nke iji ego azụrụ ọkwá na-adịghị na ya, ebe ọ bụ na n’ọtụtụ ihe atụ ndị e nwere, iji ego azụrụ ọkwá nke a na-eme ná nzụkọ ndị e ji ahọpụta popu abụrụwo nke kasị dị oké njọ, kasị bụrụ ihe ihere, na ụdị kasị pụta ìhè.”

Ezi ndị Kraịst taa aghaghị ịkpachara anya maka iji ego azụrụ ọkwá. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ pụrụ ịjabiga ndị pụrụ inye ha ihe ùgwù ndị ọzọ mma ókè ma ọ bụ nyebiga ha onyinye ókè ná mmesapụ aka. N’aka nke ọzọ, ndị pụrụ inye ihe ùgwù ndị dị otú ahụ pụrụ ile ndị ahụ nwere ike—bụ́ ndị na-achọsikarịkwa ike—inye ha ọtụtụ onyinye, anya n’ihu. Ọnọdụ abụọ ndị ahụ metụtara iji ego azụrụ ọkwá, Akwụkwọ Nsọ katọkwara omume dị otú ahụ n’ụzọ doro anya. “Ya mere chegharịa n’obi ọjọọ gị a,” ka Pita gbara Saịmọn ume, “rịọ Onyenwe anyị, ma eleghị anya a ga-agbaghara gị echiche obi gị [“atụmatụ gị a,” New Jerusalem Bible]. N’ihi na ahụrụ m na ị nọ n’olulu ilu na agbụ nke ajọ omume.”—Ọrụ 8:22, 23.

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Saịmọn hụrụ ịdị njọ nke ọchịchọ ya na-ezighị ezi. Ọ rịọrọ ndị ozi ahụ, sị: “Unu onwe unu rịọrọ m Onyenwe anyị, ka ihe ọ bụla n’ime ihe unu kwuworo ghara ịbịakwasị m.” (Ọrụ 8:24) N’ịṅa ntị n’ihe mmụta dị n’ihe ndekọ a, ezi ndị Kraịst na-agbalị izere mmerụ ọ bụla nke iji ego azụrụ ọkwá.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya