Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 9/15 p. 25-29
  • Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Abụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Abụọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Ọsụ Ụzọ Apụta
  • Chọọchị Emegwara
  • Mmetụta Obibi Akwụkwọ Nwere
  • William Tyndale na Bible Bekee
  • Nnyocha Eweta Nghọta Doro Anya Karị
  • Tyndale Asụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru
  • Bible na Tyndale ná Mmachibido Iwu
  • William Tyndale—Nwoke Na-elepụ Anya n’Ihu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ha Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ebe Dị Nchebe Maka Obibi Bible
    Teta!—2002
  • Ha Ji Baịbụl Kpọrọ Ihe—Nkebi Ya (William Tyndale)
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 9/15 p. 25-29

Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Abụọ

Ire ọkụ nwulisiri ike ka a na-ekponyekwu nkụ n’ọkụ na-enwu oké onwunwu. Ma nke a abụghị ọkụ nkịtị. A na-awụnye Bible ná nnukwu ọkụ ahụ ka ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ nwere ọkwá ukwu nọ na-ekiri. Ma, site n’ịzụrụ Bible ndị ahụ ka e bibie ha, bishọp nke London n’amaghị ama, nyeere onye nsụgharị ahụ bụ́ William Tyndale aka ịkwado mbipụta ndị ọzọ n’ụzọ ego!

Gịnị dugara ná mkpebi siri ike otú ahụ n’akụkụ abụọ nke ọgụ ahụ? Ná mbipụta bu ụzọ, anyị tụlere akụkọ ihe mere eme nke mbipụta Bible ruo n’akụkụ ikpeazụ nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Ugbu a anyị na-abanye ná mmalite nke ọgbọ ọhụrụ mgbe ozi na ikike nke Okwu Chineke na-aga inwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ ọha na eze.

Onye Ọsụ Ụzọ Apụta

John Wycliffe, ọkà mmụta si Oxford a na-akwanyere ùgwù, mere nkwusa ma dee ihe dị ukwuu megide omume Chọọchị Katọlik ndị na-ekwekọghị na Bible, na-eme ka ikike ya dabere ‘n’iwu Chineke,’ bụ́ Bible. O zigara ndị ọ na-ezi ihe, bụ́ ndị òtù Lollard, n’ime ime obodo nile nke England ka ha jiri Bekee kwusaa ozi Bible gwa onye ọ bụla ga-ege ntị. Tupu ọ nwụọ na 1384, ọ malitere nsụgharị nke Bible site na Latin gaa na Bekee a na-asụ n’ụbọchị ya.

Chọọchị chọtara ọtụtụ ihe mere ha ga-eji kpọọ Wycliffe asị. Nke mbụ, ọ katọrọ ndị ụkọchukwu maka imebiga ihe ókè na omume rụrụ arụ ha. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ihe Wycliffe na-amasị ji ihe ndị ọ kụziri mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji kwadoo nnupụisi ha ji ngwá agha enupụ. Ndị ụkọchukwu tara Wycliffe ụta, ọbụna mgbe ọnwụ ya gasịrị, n’agbanyeghị na ọ dịbeghị mgbe ọ kwadoro nnupụisi ime ihe ike.

N’otu akwụkwọ ozi o degaara Popu John nke Iri na Atọ na 1412, Achịbishọp Arundel kwuru banyere “onye ahụ na-abaghị n’ihe nke na-akpasu mmadụ iwe bụ́ John Wycliffe, nke a na-echeta dị ka ajọ mmadụ, nwa agwọ ochie ahụ, onye obuụzọ na nwa mmegide Kraịst.” N’imezu nkatọ ya, Arundel dere, sị: “Iji meruo ihe ọjọọ ya n’isi, o chepụtara abamuru nke nsụgharị ọhụrụ nke akwụkwọ nsọ gaa n’asụsụ ala ya.” N’ezie, ihe were ndị ndú chọọchị iwe karịsịa bụ na Wycliffe chọrọ inye ndị mmadụ Bible n’asụsụ nke ha.

Ka o sina dị, aka mmadụ ole na ole nwere agba ruru Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ala ha. Otu bụ Anne nke Bohemia, onye lụrụ Eze Richard nke Abụọ nke England na 1382. O nwere nsụgharị Bekee nke Oziọma ndị ahụ nke Wycliffe, bụ́ nke ọ mụchiri anya. Mgbe ọ ghọrọ nwunye eze, àgwà nkwenye o nwere nyere aka n’ịkwalite mgbalị a na-eme banyere Bible—ọ bụghịkwa n’England nanị. Anne gbara ụmụ akwụkwọ sitere Mahadum Prague dị na Bohemia ume ịbịa Oxford. N’ebe ahụ ha ji ịnụ ọkụ n’obi mụọ akwụkwọ ndị Wycliffe dere ma were ụfọdụ n’ime ha laghachi Prague. Iwu ewu nke nkụzi Wycliffe na Mahadum Prague mesịrị bụrụ ihe nkwado nye Jan Hus, bụ́ onye gụrụ akwụkwọ ma mesịa kụzie n’ebe ahụ. Hus mepụtara nsụgharị Czech a pụrụ ịgụ agụ site ná nsụgharị Slavonic ochie. Mgbalị ya mere ka ọ dịkwuoro ọha na eze mfe ịgụ Bible na Bohemia na n’ala ndị gbara ya agbata  obi.

Chọọchị Emegwara

Ndị ụkọchukwu wesokwara Wycliffe na Hus iwe dị ukwuu n’ihi ịkụzi na “ihe odide gba ọtọ,” bụ́ Akwụkwọ Nsọ mbụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke a na-atụkwasịghị ihe ọ bụla, nwere ikike dị ukwuu karịa “nkọwa dị nkenke,” bụ́ nkọwa ọdịnala na-agwụ ike ndị dị n’agbata peji nke Bible ndị chọọchị nakweere. Ọ bụ ozi a na-agwagbughị agwagbu nke Okwu Chineke ka ndị nkwusa ndị a chọrọ ime ka o ruo ndị nkịtị aka.

N’ịbụ onye e kwere nkwa ụgha ịghara ime ya ihe ọ bụla, a ghọrịrị Hus ịpụta n’ihu Kansụl Katọlik nke Constance, Germany, na 1414 iji kwadoo echiche ya. Ndị ụkọchukwu, ndị bishọp, na ndị kadinal 2,933 mejupụtara kansụl ahụ. Hus kwetara ịjụ ihe o kwuburu ma ọ bụrụ na a pụrụ isite n’Akwụkwọ Nsọ gosipụta na nkụzi ya ezighị ezi. Nye kansụl ahụ, nke ahụ abụghị ihe iseokwu. Aka ọ mara ịbụisi ha ezuwo iji kpọọ ya ọkụ n’elu osisi na 1415, ka ọ na-ekpe ekpere n’olu dara ụda.

Otu kansụl ahụ mere ihe ikpeazụ iji katọọ ma kparịa John Wycliffe site n’inye iwu ka e gwupụta ọkpụkpụ ya n’England ma kpọọ ya ọkụ. A sọrọ ntụziaka a oyi nke na e meghị ya ruo 1428, mgbe popu kwuru ka e mee ya. Otú ọ dị, dị ka ọ na-adị mgbe nile, mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ dị otú ahụ ebelataghị ịnụ ọkụ n’obi nke ndị hụrụ eziokwu n’anya. Kama nke ahụ, ọ mụbara mkpebisi ike ha ibipụta Okwu Chineke.

Mmetụta Obibi Akwụkwọ Nwere

Ka ọ na-erule 1450, nanị afọ 35 mgbe Hus nwụsịrị, Johannes Gutenberg malitere iji mkpụrụ akwụkwọ a na-edogharị edogharị ebi akwụkwọ na Germany. Akwụkwọ mbụ ya magburu onwe ya bụ mbipụta nke Vulgate Latin, nke e bichara n’ihe dị ka na 1455. Ka ọ na-erule 1495 e biwo akụkụ nile nke Bible ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ na German, Italian, French, Czech, Dutch, Hibru, Catalan, Grik, Spanish, Slavonic, Portuguese, na Serbian—n’usoro ahụ.

Ọkà mmụta Dutch bụ́ Desiderius Erasmus wepụtara mbipụta mbụ zuru ezu e biri ebi nke ihe odide Grik na 1516. Ọ bụ ọchịchọ Erasmus ka Akwụkwọ Nsọ “bụrụ nke a sụgharịrị gaa n’asụsụ ndị nile.” Ma, ọ lara azụ itinye ọkwá ukwu ya n’ihe ize ndụ site n’ịsụgharị ya n’onwe ya. Ka o sina dị, ndị ọzọ ga-enwe obi ike karị sochiri. Onye pụtara ìhè n’ime ndị a bụ William Tyndale.

William Tyndale na Bible Bekee

Tyndale gụrụ akwụkwọ n’Oxford, n’ihe dịkwa ka na 1521 ọ bịara n’ụlọ Sir John Walsh dị ka onye nkụzi ụmụ ya. A na-ahụkarị Tyndale ahụ na-eto eto na table nri Walsh nke na-ejupụta n’ụba ihe oriri ka ọ na-esoro ndị ụkọchukwu arụrịta ụka. Tyndale ezoghị ọnụ n’ịma echiche ha aka site n’ịsape Bible na igosi ha akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche. Ka oge na-aga, ezinụlọ Walsh kwenyere n’ihe Tyndale na-ekwu, a dịghịkwa akpọkebe ndị ụkọchukwu òkù, a dịghịkwa ejicha ikpo ọkụ anabata ha. Dị ka a ga-atụ anya ya, nke a mere ka ndị ụkọchukwu ahụ wesokwuo Tyndale na nkwenkwe ya iwe.

N’otu mgbe n’oge nrụrịta ụka, otu n’ime ndị na-emegide okpukpe Tyndale kwuru, sị: “Ọ ka mma ịnọ n’enweghị iwu Chineke kama ịnọ n’enweghị nke Popu.” Chee echiche obi ike Tyndale ka ọ zaghachiri, sị: “Ana m ajụ Popu na iwu ya nile. Ọ bụrụ na Chineke edebe m ndụ, tupu ọtụtụ afọ, aga m eme ka nwa na-ebu ọ́gụ̀ mara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ karịa ka ị maara.” Mkpebi Tyndale apụtawo ìhè. O mesịrị dee, sị: “Ahụwo m site n’ahụmahụ otú o si ghara ikwe omume ime ka ndị nkịtị mata eziokwu ọ bụla, ọ gwụla ma a gbara Akwụkwọ Nsọ n’anwụ n’asụsụ ala ha, ka ha wee nwee ike ịhụ isi ihe, usoro, na ihe ihe odide ahụ pụtara.”

N’oge ahụ, ọ dịbeghị Bible e biri na Bekee. Ya mere na 1523, Tyndale gara London ịrịọ maka nkwado Bishọp Tunstall maka ọrụ nsụgharị. N’ịbụ onye a katọrọ, ọ hapụrụ England ịga mezuo nzube ya, n’alaghachighịkwa ma ọlị. Na Cologne, Germany, a wakporo ebe obibi akwụkwọ mbụ ya, Tyndale jikwa nnọọ ihe nta gbanahụ ọnwụ, na-achịrị ụfọdụ n’ime peji ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa a na-adụkọtaghị ọnụ. Otú ọ dị, na Worms, Germany, e bichara ma ọ dịkarịa ala 3,000 nke “Agba Ọhụrụ” Bekee ya. E zigara ndị a England, e wee malite ikesa ha n’ebe ahụ ná mmalite 1526. Ụfọdụ n’ime ndị a bụ Bible ndị Bishọp Tunstall zụụrụ ma kpọọ ọkụ, n’amaghị ama na-enyere Tyndale aka ịga n’ihu n’ọrụ ya!

Nnyocha Eweta Nghọta Doro Anya Karị

O doro anya na Tyndale nwere mmasị n’ọrụ ya. Ka akwụkwọ The Cambridge History of the Bible si ekwu ya, “Akwụkwọ Nsọ nyere ya obi ụtọ, e nwekwara ihe dị ngwa na-akpali akpali n’ụzọ o si eme ihe nke na-egosipụta obi ụtọ ya.” Nzube Tyndale bụ ime ka Akwụkwọ Nsọ gwa ndị nkịtị okwu n’asụsụ kwesịrị ekwesị ma dị mfe dị ka o kwere omume. Ihe ọ na-amụ na-egosi ya ihe okwu dị iche iche nke Bible pụtara bụ́ ndị e jiworo nkwenkwe okpukpe kpuchie eri ọtụtụ narị afọ. N’abụghị onye e ji ọnwụ ma ọ bụ ajọ ihe odide nke onye iro ọjọọ ya bụ́ Sir Thomas More menye ụjọ, Tyndale tinyere ihe ndị ọ chọpụtara ná nsụgharị ya.

N’iji Grik mbụ nke ihe odide Erasmus rụọ ọrụ, kama nke Latin, Tyndale họọrọ “ịhụnanya” kama “ọrụ ebere” iji kọwaa n’ụzọ zuru ezu ihe okwu Grik ahụ bụ́ a·gaʹpe pụtara. O jikwa “ọgbakọ” mee ihe kama “chọọchị,” “chegharịa” kama “ịnata ọpịpịa,” na “ndị okenye” kama “ndị ụkọchukwu.” (1 Ndị Kọrint 13:1-3; Ndị Kọlọsi 4:15, 16; Luk 13:3, 5; 1 Timoti 5:17, Tyndale) Mgbanwe ndị a bibiri ikike chọọchị na ihe omume okpukpe ọdịnala, dị ka imere onye ụkọchukwu nkwupụta.

N’otu aka ahụ Tyndale rapagidesiri ike n’okwu bụ́ “mbilite n’ọnwụ,” na-ajụ pọgatrị na ịma ihe mgbe a nwụsịrị dị ka ihe Bible na-akwadoghị. Banyere ndị nwụrụ anwụ, o degaara More, sị: “N’idebe ha n’eluigwe, hel, na pọgatrị, [ị] na-ebibi arụmụka ndị ahụ Kraịst na Pọl ji nwapụta eziokwu nke mbilite n’ọnwụ.” N’ọnọdụ a, Tyndale zoro aka na Matiu 22:30-32 na 1 Ndị Kọrint 15:12-19. Ọ bịara kwere n’ụzọ ziri ezi na ndị nwụrụ anwụ na-anọ n’amaghị ihe na-emenụ ruo ná mbilite n’ọnwụ dị n’ihu. (Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 9:5; Jọn 11:11, 24, 25) Nke a pụtara na ndokwa ahụ dum nke ikpegara Meri na “ndị senti” ekpere enweghị isi n’ihi na n’ọnọdụ amaghị ihe ha, ha enweghị ike ịnụ ihe ma ọ bụ ịrịọchitere ndị ọzọ ihe.

Tyndale Asụgharịa Akwụkwọ Nsọ Hibru

Na 1530, Tyndale wepụtara mbipụta nke Pentateuch, akwụkwọ ise mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. O si otú ahụ ghọọ onye mbụ sụgharịrị Bible site na Hibru gaa kpọmkwem na Bekee. Tyndale bụkwa onye nsụgharị Bekee mbụ ji aha ahụ bụ́ Jehova mee ihe. Onye London bụ́ ọkà mmụta bụ́ David Daniell na-ede, sị: “O doro anya na ọ ga-emetụworị ndị gụrụ akwụkwọ Tyndale n’ahụ n’ụzọ dị ike na e kpughere aha Chineke ọzọ.”

Ná mgbalị ya ime ka ihe doo anya, Tyndale ji okwu Bekee dị iche iche sụgharịa otu okwu Hibru. Ma, ọ gbasoro ọdịdị Hibru n’ụzọ chiri anya. Ihe si na ya pụta bụ ikike zuru okè nke Hibru. Ya onwe ya kwuru, sị: “Ọdịdị nke asụsụ Hibru kwekọrọ na Bekee otu puku ugboro karịa ka o kwekọrọ na Latin. Ụzọ e si asụ ha bụ otu; nke mere na n’ọtụtụ ebe nanị ihe dị gị mkpa bụ ịsụgharị ya gaa na Bekee, otu okwu maka otu okwu.”

Ụzọ nsụgharị a bụkarịrị nke nkịtị ji okwu Hibru mee ka nsụgharị Tyndale makwuo mma. Ụfọdụ n’ime ha aghaghị iyiwo ihe ọhụrụ n’ọgụgụ mbụ ya. Ma, e mesịrị mara Bible ahụ nke ọma nke na ọtụtụ n’ime okwu ndị a bụ akụkụ nke asụsụ Bekee ugbu a. Ihe atụ ụfọdụ na Bekee pụtara “otu nwoke dị ka obi Ya si chọọ” (dị ka na 1 Samuel 13:14), “ememe ngabiga,” na “ewu ọpụpụ.” Tụkwasị na nke ahụ, ndị na-agụ Bible Bekee si otú ahụ ghọta echiche Hibru, bụ́ nke mere ka ha nwee nghọta ka mma n’Akwụkwọ Nsọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ.

Bible na Tyndale ná Mmachibido Iwu

Mmadụ inwe ike ịgụ Okwu Chineke n’asụsụ nke ya na-enye obi ụtọ. Ndị Bekee zaghachiri site n’ịzụrụ Bible nile a pụrụ ibute na nzuzo ná mba ahụ, bụ́ ndị a na-emegharị ka ha yie ùkwù ákwà ma ọ bụ ngwá ahịa ndị ọzọ. Ka ọ dịgodị, ndị ụkọchukwu tụlere ọkwá na-aghaghị ifunahụ ha ma ọ bụrụ na a bịa were Bible dị ka okwusịa ọgwụ. N’ihi ya, ọnọdụ ahụ ghọkwuru okwu ọnwụ na ndụ nye onye nsụgharị ahụ na ndị nkwado ya.

N’ịbụ onye Chọọchị na Ọchịchị nọgidere na-achụgharị, Tyndale nọgidere na-arụ ọrụ na nzuzo n’Antwerp, Belgium. N’agbanyeghị nke ahụ, o wepụtara ụbọchị abụọ n’izu maka ihe ọ kpọrọ ihe ntụsara ahụ ya—na-enyere ndị England ọzọ gbara ọsọ ndụ, ndị ogbenye, na ndị ọrịa aka. O mefuru ihe ka ukwuu n’ego ya n’ụzọ dị otú a. Tupu o nwee ike ịsụgharị ọkara ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, onye England mere ka a ga-asị na ya bụ enyi ji maka ego rara Tyndale nye. N’ịbụ onye e gburu na Vilvoorde, Belgium, na 1536, okwu ikpeazụ sitere ya n’obi bụ, “Onyenwe anyị! meghee anya Eze England.”

Ka ọ na-erule 1538, Eze Henry nke Asatọ n’ihi nzube nke ya enyewo iwu ka e debe Bible na chọọchị nile dị n’England. Ọ bụ ezie na e kwughị na ọ bụ nke Tyndale, nsụgharị a họọrọ bụ nke ya n’ụzọ bụ isi. N’ụzọ dị otú a, nsụgharị Tyndale ghọrọ nke a maara nke ọma na nke a hụrụ n’anya nke na o “kpebiri ọdịdị bụ isi nke ihe ka ọtụtụ n’ime nsụgharị ndị e mesịrị nwee” na Bekee. (The Cambridge History of the Bible) E debanyere ihe ruru 90 pasent nke nsụgharị Tyndale kpọmkwem na King James Version nke 1611.

Inweta Bible n’enweghị mgbochi pụtara oké mgbanwe nye England. Nkwurịta okwu ndị a na-enwe banyere Bible ndị e debere na chọọchị kpooro ọkụ nke ukwuu nke na ha na-egbochi iduzi chọọchị mgbe ụfọdụ! “Ndị agadi mụtara ịgụ ihe ka ha wee nwee ike ịga kpọmkwem n’Okwu Chineke, ụmụaka sonyekwaara ndị okenye iji gee ntị.” (A Concise History of the English Bible) E nwekwara n’oge ahụ ịrị elu dị egwu ná nkesa nke Bible n’ala na asụsụ Europe ndị ọzọ. Ma ọnọdụ Bible n’England gaje inwe mmetụta zuru ụwa ọnụ. Olee otú nke a si mee? Oleekwa otú nchọpụta na nnyocha ndị ọzọ e mere si metụta Bible ndị anyị ji eme ihe taa? Anyị ga-eji isiokwu na-esonụ n’usoro a mechie akụkọ anyị.

[Foto dị na peeji nke 26]

“Agba Ọhụrụ” Tyndale nke 1526—nanị ihe odide zuru ezu a maara lanarịrị ọkụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© The British Library Board

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 26, 27]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Akara Ụbọchị Ndị Bụ Isi ná Ndepụta nke Bible

Oge Anyị

A malite Bible Wycliffe (b. 1384)

1400

E gbuo Hus 1415

Gutenberg —Bible mbụ e biri c. 1455

1500

Ndị Mbụ E Biri n’Asụsụ Obodo

Ihe odide Grik nke Erasmus 1516

“Agba Ọhụrụ” Tyndale 1526

E gbuo Tyndale 1536

Henry nke Asatọ enye iwu ka e tinye Bible na chọọchị   1538

1600

King James Version 1611

[Foto]

Wycliffe

Hus

Tyndale

Henry nke asatọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya