Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/00 p. 1
  • Ime Ka A Mara Aha Jehova n’Ụwa Nile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Ka A Mara Aha Jehova n’Ụwa Nile
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Otú Anyị Si Ezi Ozi Ọma—Anyị Na-esi Ụzọ Dị Iche Iche Ezi Ozi Ọma
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Gịnị Mere Ozi Ụlọ n’Ụlọ Ji Dị Mkpa n’Oge A?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Kwusaa Ozi Ọma ahụ Ebe Nile
    Ozi Alaeze Anyi—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 1/00 p. 1

Ime Ka A Mara Aha Jehova n’Ụwa Nile

1 Mgbe Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ nke ịbụ ndị àmà ya ‘ruo ebe ụwa sọtụrụ,’ o burularị ụzọ setịpụrụ ha ihe nlereanya ha ga-agbaso. (Ọrụ 1:8) Mgbe ọ bụla na ebe ọ bụla ọ hụrụ ndị mmadụ, o kwuru banyere nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. N’iṅomi Jisọs, òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi na-eji ọtụtụ ụzọ dị iche iche eme ka a mara aha Jehova “n’ụwa nile.”—Aịsa. 12:4, 5.

2 Ihe Ndị E Mere n’Oge Ndị Gara Aga: N’afọ ndị gara aga, e bipụtara ozi ọma n’akwụkwọ akụkọ; e mepụtara ma gosi ọtụtụ nde mmadụ “Foto Ihe Nkiri nke Okike”; e jiri ụgbọala ndị nwere ígwè okwu mee ihe; e jikwara ígwè phonograph mee ihe n’ụzọ dị ukwuu, ruokwa oge ụfọdụ, e ji redio mee ihe—ihe a nile bụ iji kwusaa ozi ọma ahụ. Otú ọ dị, e kwusiwo okwu ike mgbe nile na ọ dị mkpa ịgakwuru ndị mmadụ ihu na ihu iji wulite mmasị ha. N’ihi ya, ozi ụlọ n’ụlo abụrụwo nnọọ ụzọ dị irè isi mee ka a mara aha Jehova n’ebe nile.—Ọrụ 5:42.

3 Ihe Ndị A Na-eme n’Oge Anyị: N’ihi mgbanwe nke oge, a naghị nnọọ enwezi ohere n’ụwa, n’ọtụtụ ebe kwa a dịghị ahụcha ndị mmadụ n’ụlọ. Ọ bụ mmadụ ole na ole nwere ọchịchọ iwepụta oge maka ịgụ ihe na ịtụgharị uche n’ihe ime mmụọ. Ya mere anyị aghaghị ime mgbanwe iji mee ka ozi anyị kwekọọ na ya. Tụkwasị n’ịnọgide na-arụzu ókèala anyị site n’ụlọ ruo n’ụlọ, a gbawo anyị ume ịga ebe ndị mmadụ nọ na ịbụ ndị “e doziworo mgbe dum” ịgọpụrụ olileanya ahụ anyị nwere. (1Pita 3:15) Nke a pụtara ịgbalị ime nkwusa nye ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị nọ n’okporo ámá na n’ebe a na-adọwa ụgbọala, ịga site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, na ebe ọ bụla ọzọ a pụrụ ịhụ mmadụ. N’ịbụ ndi nwere nkwado Jehova, mgbalị anyị ga-enwe nnọọ ihe ịga nke ọma. Ị̀ na-ekere òkè n’ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe ọ bụla ha nọ?

4 Ka anyị nile n’otu n’otu mee ike anyị n’ihe banyere ime ka a mara aha Jehova n’ókèala anyị. Anyị pụrụ inweta afọ ojuju dị ukwuu n’ijezu ozi anyị, ka anyị na-elegara Jehova anya ịdọta ndị obi ha ziri ezi.—Jọn 6:44.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya