Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 6/15 p. 10-13
  • Ì Kwesịrị Ime Ka Echiche Gị Sakwuo Mbara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Kwesịrị Ime Ka Echiche Gị Sakwuo Mbara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Lezuo Ihe Anya
  • Otú I Si Ele Ndị Ọzọ Anya
  • N’inye Ihe Onwunwe
  • Mgbe A Na-enye Ndụmọdụ
  • Rụọ Ọrụ Iji Mee Ka Ọ Sakwuo Mbara
  • Ị̀ Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Kere Òkè N’ọṅụ Nke Inye Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ekwela Ka Ihe Ndị Ọzọ Na-emejọ Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ị̀ Na-eme Ka Echiche Gị na Echiche Jehova Bụrụ Otu?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 6/15 p. 10-13

Ì Kwesịrị Ime Ka Echiche Gị Sakwuo Mbara?

OTU ala ọma jijiji bibiri oké ihe mere na Kobe City dị n’ebe ọdịda anyanwụ Japan, ndị ọrụ afọ ofufo na-achụ onwe ha n’àjà gbatakwaara ndị bi n’ebe ahụ bụ́ ndị ihe ahụ metụtara ọsọ enyemaka ngwa ngwa. Otú ọ dị, ìgwè ndị dọkịta si esi bịa hụrụ na otu onye na-arụ ọrụ n’Ụlọ Ọrụ Ahụ Ike nke obodo ahụ jụrụ arịrịọ ha rịọrọ ka e nye ha ọgwụ. Onye ọrụ ahụ, onye bụ́kwa onye nduzi nke otu ụlọ ọgwụ ukwu dị n’ógbè ahụ, chọrọ ka ndị ahụ merụrụ ahụ gaa n’ụlọ ọgwụ Kobe kama ndị dọkịta ahụ ịgba ha ọgwụ ndị dara oké ọnụ n’ógbè enyemaka dị iche iche. N’ikpeazụ, e mere ihe ndị dọkịta ahụ rịọrọ, ma a katọrọ omume ịgba isi akwara nke yiri enweghị ọmịiko bụ́ nke onye ọrụ ahụ mere na mbụ, n’ụzọ sara mbara.

Ikekwe i nwetawo ụdị ịgba isi akwara ahụ n’aka onye nọ n’ọkwá dị elu. Ọbụna ị pụrụ imetụwo ya n’onwe gị. Ị̀ pụrụ irite uru site n’ịzụlite echiche sakwuru mbara?

Lezuo Ihe Anya

Ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ndị mmadụ n’otu n’otu ile ihe anya site nanị n’otu akụkụ, ma ọ bụ echiche, si otú ahụ ghara ịmazu ma ọ bụ ịghọtazu ihe ahụ. Nke a na-abụkarị n’ihi ihe ndị dị ka agụmakwụkwọ, ahụmahụ ná ndụ, na nzụlite. Mmadụ pụrụ ime mkpebi ndị amamihe ka dịrị na ha mgbe ọ gbalịrị ịhụzu ihe nile. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-agafe ebe ụzọ wara abụọ ma ọ bụ karịa bụ́ ebe a na-enweghị ọkụ eletrik na-eduzi ụgbọala, ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịnọ na-ele nnọọ anya n’ihu? Ọ dịghị ma ọlị! N’otu aka ahụ, ime ka echiche gị sakwuo mbara iji hụzuo ihe pụrụ ịbụ nke na-enye nnọọ aka n’ime mkpebi dị iche iche na ime omume n’ụzọ iji ihe akpọrọ ihe. Ọ pụrụ ọbụna ịzọpụta ndụ.

Ma eleghị anya, anyị nile pụrụ imeziwanye ihe n’akụkụ a. Ya mere jụọ onwe gị, ‘Olee ebe ndị m pụrụ irite uru, ma eleghị anya, site n’ime ka echiche m sakwuo mbara?’

Otú I Si Ele Ndị Ọzọ Anya

Gịnị ka ị na-ahụ mgbe i lere ndị ọzọ anya? Ì nwere àgwà nke ile ihe ha na-ekwu ma ọ bụ na-eme anya dị ka ma ọ́ bụghị nke dịcha mma, ọ bụrụ na ha nile dịcha njọ, dị ka a ga-asị na ọ pụghị ịdịtụ njọ dịtụkwa mma? Ị̀ na-ele okwu mmadụ kwuru anya dị ka ma ọ́ bụghị ịja mma ọ bụrụ mkparị? Mmadụ ọ̀ na-ezicha ezi ma ọ bụ ghara izi ezi kpam kpam nye gị? Isi otú ahụ ele ihe anya ga-adị ka onye na-ese foto bụ́ onye na-eleghara ọtụtụ àgwà buru ibu e nwere n’oge mgbụsị akwụkwọ anya, dị ka a ga-asị na ọ bụ nanị ihe ndị na-acha ọcha na ndị na-eji oji ka e nwere. Ka ị̀ na-elekwasịkarị anya n’akụkụ ndị na-adịghị mma nke àgwà mmadụ, dị nnọọ ka onye njem bụ́ onye na-ekwe ka ntakịrị ahịhịa onye ọbịa na-adịghị echebara ndị ọzọ echiche hapụrụ mebie mmasị o nwere n’ebe mara mma?—Tụlee Eklisiastis 7:16.

A pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ịtụle ụzọ Jehova si ele mmehie mmadụ anya. Ọ bụ ezie na ọ maara ọtụtụ adịghị ike na mmehie nke mmadụ, ọ na-ahọrọ ịghara ilekwasị ha anya ma ọ bụ na-echeta ha mgbe nile. Ọbụ abụ ahụ nwere ekele kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, . . . Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Jehova dị njikere iwepụ ajọ omume n’ebe dị anya site n’ebe ndị mmehie nwere nchegharị nọ, ee na-eji obiọma ehichapụ ha, ka ha wee ghara ịbụ ntụpọ n’ebe mmekọrịta anyị na ya dị. (Abụ Ọma 51:1; 103:12) Jehova pụrụ ikwu banyere Eze Devid, bụ́ onye ya na Bat-sheba mere ajọ mmehie n’otu oge, na ọ bụ nwoke “weere obi ya nile jesoo m, ime nani ihe ziri ezi n’anya m.” (1 Ndị Eze 14:8) N’ihi gịnị ka Chineke pụrụ iji kwuo nke a banyere Devid? N’ihi na o lekwasịrị anya n’àgwà ndị ka mma nke Devid nwere nchegharị. Ọ tụlere isi ihe nile dị mkpa ma họrọ ịnọgide na-emere ohu ya ebere.

N’ụzọ ntụpọ na-adịghị na ya, Kraịst Jisọs gosipụtara ụzọ a sara mbara nke ile emezighị emezi nke ndị ọzọ anya. (Jọn 5:19) Mgbe o chere emezighị emezi nke ndị ozi ya ihu, Jisọs gosipụtara obi ebere na nghọta. Ọ ghọtara banyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè na ọbụna mgbe ‘mmụọ nke mmadụ dị ọkụ, anụ ahụ adịghị ike.’ (Matiu 26:41) N’iburu nke a n’uche, Jisọs mesoro adịghị ike na emezighị emezi nke ndị na-eso ụzọ ya n’ụzọ ndidi na nghọta. O lekwasịghị anya n’ebe ndị ha dara kama, o lekwasịrị anya n’àgwà ọma ha.

N’otu oge mgbe ọ gbazisịrị ndị ozi ya n’ihi na ha rụrụ ụka banyere onye o yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu, Jisọs gbakwụnyere: “Ma unu onwe unu bụ ndị soworo m n’ọnwụnwa m nile; Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m, ka unu wee rie nụọkwa na tebụl nke m n’alaeze m; unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Luk 22:24-30) Ee, n’agbanyeghị ọtụtụ emezighị emezi nke ndị ozi ahụ, Jisọs chetara ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ. (Ilu 17:17) Jisọs nwere obi ike n’ihe ha pụrụ ime na ihe ha ga-eme, ya mere o sooro ha gbaa ndụ inye ha Alaeze. Ee, ‘Jisọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya ruo ọgwụgwụ ihe.’—Jọn 13:1.

Ya mere ọ bụrụ na àgwà na emezighị emezi mmadụ achọọ ịgbakasị gị ahụ, yie Jehova na Jisọs. Mee ka echiche gị sakwuo mbara, gbalịakwa ịtụle akụkụ nile. Site n’ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ ga-adịrị gị mfe karị ịhụ ụmụnna gị n’anya na inwe ekele maka ha.

N’inye Ihe Onwunwe

Ihe ùgwù nke inye ihe bụ otu n’ime ọṅụ ndị a gbasapụụrụ ndị Kraịst. Ma ọ̀ dị anyị mkpa ịkpa inye ihe anyị ókè gaa nanị n’otu ọrụ, dị ka ihe atụ, ikere òkè n’ozi ubi? (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ka ị̀ pụrụ ime ka echiche gị sakwuo mbara ịgụnye mkpa anụ ahụ na ọdịmma nke ndị ọzọ? N’ezie, ndị Kraịst nile na-aghọta na inye ihe n’ụzọ ime mmụọ dị mkpa karịsịa. (Jọn 6:26, 27; Ọrụ 1:8) Ma, ọ bụ ezie na inye ihe n’ụzọ ime mmụọ dị mkpa, a gaghị eleghara inye ihe n’ụzọ ihe onwunwe anya n’ezie.—Jemes 2:15, 16.

Ka anyị na-atụle mkpa chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke ụmụnna ime mmụọ anyị ndị nọ n’ọgbakọ anyị na gburugburu ụwa, anyị pụrụ ịhụ n’ụzọ ka zuo ezu ihe anyị pụrụ ime iji nyere ha aka. Mgbe ndị aka ruru ime otú ahụ ji mmesapụ aka soro ndị ọzọ na-ekerịta ihe, a na-eme ka ihe hara nhata. N’ụzọ dị otú a, a na-egbo mkpa nke ụmụnna anyị nile. Otu onye Kraịst bụ́ okenye si otú a kwuo ya: “Ọ bụrụ na mkpa adapụta n’otu akụkụ nke ụwa, ụmụnna nọ n’akụkụ ọzọ nke ụwa ga-agbatara ha ọsọ enyemaka. Ọ bụrụ na aka erughị ha inye aka, mgbe ahụ ụmụnna nọ n’ebe ọzọ ga-eme otú ahụ. N’ụzọ dị otú a, a na-egbo mkpa nke ụmụnna anyị gburugburu ụwa. Òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ bụ ihe magburu onwe ya n’ezie.”—2 Ndị Kọrint 8:13-15; 1 Pita 2:17.

Otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst bụ́ onye ji ezi obi chọọ ije otu n’ime mgbakọ mba nile ndị e mere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe enweghị nnọọ ike ime otú ahụ. Otú ọ dị, ọ nụrụ na Bible dị ụmụnna nọ n’ebe ahụ mkpa nke ukwuu, ya mere o sitere n’aka onye jere mgbakọ ahụ tụnye ụtụ maka Bible ndị ahụ. N’ụzọ dị otú a, o nwetara obi ụtọ nke inye ihe, nke isoro ụmụnna ya ndị nọ n’ala ọzọ kerịta ihe.—Ọrụ 20:35.

Ikekwe site n’ime ka echiche gị saa mbara, ị pụrụ ịtụnye ọbụna ụtụ ka ukwuu n’ọrụ nkụzi Bible nke na-agbasawanye gburugburu ụwa, na-ewetara onwe gị nakwa ndị ọzọ ọṅụ.—Deuterọnọmi 15:7; Ilu 11:24; Ndị Filipaị 4:14-19.

Mgbe A Na-enye Ndụmọdụ

Mgbe a kpọrọ anyị ka anyị nye ndụmọdụ ma ọ bụ mgbazi, iche echiche n’ụzọ ziri ezi na n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-enyere anyị aka inweta nkwanye ùgwù nke ụmụnna ime mmụọ anyị nakwa inyere ha aka n’ụzọ dị irè n’ezie. Ọ dị nnọọ mfe ilekwasị anya n’ihe ole na ole ma mee mkpebi ọkụ ọkụ, nke dalara n’otu akụkụ. Nke a na-enye echiche na anyị enweghị obi sara mbara, ikekwe ọbụna obi na-adịghị njikere ịtụle ihe, dị ka ndị ndú okpukpe nke oge Jisọs, bụ́ ndị chọrọ iji iwu nchịkwa ha ndị na-enweghị ọgwụgwụ bogbuo ndị ọzọ. (Matiu 23:2-4) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị ezere ịnọ n’otu akụkụ ma na-enye ezi ndụmọdụ ndị dabesiiri ike n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ, na-egosipụta echiche ezi omume nke Jehova, bụ́ nke ziri ezi ma dị ebere, ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe karị ịnabata na itinye aro ndị anyị tụrụ n’ọrụ.

Afọ ụfọdụ gara aga, ụmụnna nwoke na-eto eto sitere n’ọgbakọ ụfọdụ bịakọrọ ọnụ iji gwurie egwu. N’ụzọ dị mwute, mmụọ nke ịsọ mpi bilitere n’etiti ha, na-akpata ha ịgwa ibe ha okwu ndị na-agbakasị ahụ. Olee otú ndị okenye ọgbakọ ndị ahụ si hụ maka nsogbu a? N’ịbụ ndị ghọtara mkpa ọ dị ndị na-eto eto inwe ntụrụndụ, ha atụghị aro ka ha kwụsị kpam kpam. (Ndị Efesọs 5:17; 1 Timoti 4:8) Kama nke ahụ, ha dọrọ ha aka ná ntị siri ike ma bụrụ nke ezi uche dị na ya banyere ihe mmụọ nke ịsọ mpi pụrụ iduga na ya. Ha tụkwaara ha aro ndị na-enye aka, dị ka ime ka ndị tọrọ ha, bụ́ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe nọrọ ya. Ndị ntorobịa ahụ ghọtara amamihe na izi ezi nke ndụmọdụ ahụ, ha meghachikwara omume n’ụzọ dị mma. Ọzọkwa, nkwanye ùgwù na mmetụta ịhụnanya ha nwere n’ebe ndị okenye ahụ nọ rịrị elu.

Rụọ Ọrụ Iji Mee Ka Ọ Sakwuo Mbara

Ọ bụ ezie na ị pụrụ inwe ajọ mbunobi n’amaghị ama, ọ ka ga-ewe mgbalị e ji mkpebisi ike mee iji mee ka echiche gị sakwuo mbara. Ka ị na-amụ Okwu Chineke, tụgharịa uche na ya ka i wee ghọta ma nwee ekele maka ụzọ Jehova si eche echiche. (Abụ Ọma 139:17) Gbalịa ịghọta ihe mere e ji kwuo okwu ndị e kwuru n’ime Bible nakwa ụkpụrụ ndị o metụtara, ma gbalịa ịtụ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ dị ka Jehova na-eme. Nke a ga-ekwekọ n’ekpere Devid: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị zikwa m ihe.”—Abụ Ọma 25:4, 5.

Ka ị na-enwe ụzọ sakwuru mbara isi ele ihe anya, a ga-agọzi gị. Otu ngọzi ị ga-enweta maka inwe echiche sakwuru mbara ga-abụ gị ịbụ onye a maara dị ka onye nwere echiche ziri ezi na onye na-aghọta mmadụ. Ị ga-enwe ike imeghachi omume n’ụzọ ezi uche na nghọta dị na ya karị mgbe ị na-enyere ndị ọzọ aka n’ọnọdụ dịgasị iche. Nke a kwa, ga-atụnye ụtụ n’ịdị n’otu na nkwekọ magburu onwe ha nke òtù ụmụnna ndị Kraịst.

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Iji mmesapụ aka na-enye ihe na-enyere ndị ọzọ aka, na-ewetara onye na-enye enye ọṅụ, na-emekwa Nna anyị nke eluigwe obi ụtọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya