Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 2/1 p. 31
  • ‘Okpueze na Ihe Àmà Ahụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Okpueze na Ihe Àmà Ahụ’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 2/1 p. 31

‘Okpueze na Ihe Àmà Ahụ’

‘JEHOIADA bụ́ onye nchụàjà wee mee ka nwa eze pụta, o kpube ya okpueze, nye ya ihe àmà; ha wee mee ya eze, tee ya mmanụ.’ (2 Ndị Eze 11:12) Otú a ka akwụkwọ Ndị Eze si kọwaa ochichi eze nke Eze Joash. Ị̀ rịbara ama na e wezụga “okpueze” ahụ, ma ọ bụ ihe okike isi nke ndị eze, Jehoiada tụkwasịkwara n’isi nwa okoro ahụ bụ eze “ihe àmà” ahụ. Gịnị bụ Ihe Àmà ahụ? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji bụrụ otu akụkụ nke ememe ochichi eze ahụ?

Okwu Hibru nke a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ihe àmà” na-ezokarị aka n’Iwu Iri ahụ ma ọ bụ n’Iwu Chineke n’ozuzu ya. (Ọpụpụ 31:18; Abụ Ọma 78:5, Revised Standard Version) N’ikwekọ na nke a, ihe ndekọ ya na nke a kwekọrọ na 2 Ihe Emere 23:11 na-agụ ná nsụgharị The Jerusalem Bible (1966), sị: “Mgbe ahụ Jehoiada kpọpụtara nwa eze ahụ, kpukwasị ya okpueze, meekwa ka Iwu ahụ dịkwasị ya.” Otú ọ dị, ná 2 Ndị Eze 11:12, nsụgharị nke a ji okwu ahụ bụ “ihe ike n’aka” dochie anya “ihe àmà” ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ otu okwu Hibru ahụ pụtara n’amaokwu abụọ ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

Otu akwụkwọ asụsụ German a ma ama na-akọwa Bible, bụ́ Herders Bibelkommentar, kọwara na ụfọdụ ndị nsụgharị apụghị iche otú o si bụrụ na eze ahụ ga-eyikwasị Iwu ahụ n’isi ya ma ọ bụ n’aka ya. Ebe ọ bụ na, mgbe ọ na-ekwu ihe banyere Eze Sọl, 2 Samuel 1:10 gụnyere ihe okike aka (ma ọ bụ, ọla aka) na okpueze ahụ o yi, ha kweere na ihe odide ahụ dị ná 2 Ndị Eze 11:12 aghaghị ịbụworị “okpueze na ihe okike aka ndị ahụ.” Ma nke a bụ nchepụta echiche efu. Iji “ihe okike aka” dochie anya “ihe àmà” ahụ bụ oké mgbanwe n’usoro ihe odide.

N’ihi ya, The New Jerusalem Bible (1985) na-ewebataghachi echiche nke na-ezo aka n’ebe Iwu ahụ, ma ọ bụ ọgbụgba ndụ iwu ahụ dị, na-asụgharị ahịrị okwu ahụ ịbụ, “wee nye ya otu ihe odide nke ọgbụgba ndụ ahụ.” Ma Jehoiada ò nyere Joash ‘ihe àmà ahụ’? N’eziokwu, okwu Hibru ahụ nke a sụgharịrị ịbụ “tụkwasị” pụkwara ịbụ nke a sụgharịrị “nye.” Ma, ma n’akwụkwọ Ndị Eze ma n’Ihe Emere, ọ pụtara nanị otu ugbo, na-ezo aka ma n’okpueze ahụ ma n’Ihe Àmà ahụ. Karịsịa, ihe sochiri ya ozugbo bụ okwu Hibru ahụ bụ́ “n’isi.” N’ihi ya, “tụkwasị n’isi” aghaghị ịbụ nsụgharị nke ziri ezi. Ma okpueze ahụ ma Ihe Àmà ahụ bụ nke ‘a tụkwasịrị n’isi’ nwa okoro ahụ bụ Eze Joash, dị ka New World Translation gosiri.

Ya mere, ọ̀ bụ n’ihi gịnị—ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa—ka onye isi nchụàjà ahụ si “tụkwasị” Ihe Àma ahụ n’isi nwa okoro ahụ bụ eze? Tụlee okwu onye ọkà mmụta bụ́ onye Germany, bụ́ Otto Thenius, kwuru: “Iwu Ahụ, akwụkwọ ebe e dekọrọ iwu Mosis ndị ahụ nile. E jidere nke a n’ụzọ ihe atụ n’elu isi eze ahụ, mgbe e kpubesịworo ya okpueze ahụ.” (Die Bücher der Könige) N’otu aka ahụ, Professor Ernst Bertheau kwuru, sị: “Ịtụkwasị Iwu ahụ [n’isi eze ahụ] nwere echiche nke ihe atụ n’ezie, nke bụ na eze ahụ nwere ibu ọrụ nke ịchị achị n’ụzọ kwekọrọ na ya.”—Die Bücher der Chronik.

Chineke nyere iwu na mgbe eze nọkwasịrị n’elu ocheeze ya, ọ ga-edepụtara onwe ya Iwu ahụ, na-amụ ya, na-etinyekwa ya n’ọrụ ná ndụ ya nile. (Deuterọnọmi 17:18-20) Ịtụkwasị ‘ihe àmà ahụ’ n’isi eze ọhụrụ ahụ pụrụ ịbụworị obere ihe ngosi ihe atụ nke na-egosi na ọbụna na ọ bụ eze ugbu a, ọ karịbeghị Iwu Jehova. Ọ bụ ihe na-adịghị enye obi ụtọ na mgbe onye isi nchụàjà bụ Jehoiada nwụsịrị, Joash chefuru ihe mmụta nke a dị oké mkpa, wee jiri nwayọọ nwayọọ hapụ ofufe Jehova, ma mesịa nwụọ n’aka ndị ogbu mmadụ.—2 Ihe Emere 24:17-25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya