“Anyị Bụ Ndị Ha na Chineke Na-arụkọ Ọrụ”
1 Pọl onyeozi dere, sị: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs kwọsara ya mmiri, ma Chineke nọgidere na-eme ka ọ na-eto; . . . Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:6, 9) Ndị Kraịst nọ na narị afọ mbụ ghọtara n’ụzọ zuru ezu na ha inwe ihe ịga nke ọma n’ozi ahụ dabeere n’ebe Jehova Chineke nọ.
2 N’ọmụmụ Bible Ebe Obibi: N’iburu n’uche na ọrụ anyị gụnyere ịkụziri ndị ọzọ ihe Kraịst nyere n’iwu, o kwesịrị ekwesị ka anyị tinye ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị n’ekpere. Anyị ime otú ahụ na-egosi na anyị na-adabere n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye na-eme ka ihe na-eto eto.
3 Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, peeji nke 3, paragraf nke 7, na-ekwu, sị: “Iji ekpere maka nduzi na ngọzi Jehova na-emeghe ma na-emechikwa ọmụmụ ihe ahụ na-eme ka ọmụmụ ihe ahụ bụrụ ihe ùgwù, na-etinye mmadụ n’ọnọdụ uche dị nsọpụrụ, na-edurukwa uche gaa n’ebe Jehova nọ dị ka onye ọ bụ ya bụ Onye Nkụzi n’ezie.—Jọn 6:45.”
4 Olee ihe ụfọdụ ndị ga-ekwesị ekwesị iwebata n’ekpere mgbe a na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi? Ekpere nlereanya nke Jizọs nakwa ekpere Pọl kpere maka ndị Filipaị bụ ihe atụ ndị magburu onwe ha. (Mat. 6:9-13; Fil. 1:9-11) Ekpere anyị ekwesịghị ịdị ogologo, ma e kwesịrị ịkpọ okwu aha na ha. Ọ dị mkpa na anyị ga-agụnye okwu ndị kwesịrị ekwesị iji nye Jehova otuto n’ihi ọtụtụ ọrụ ọ rụrụ bụ́ ndị magburu onwe ha. Anyị pụrụ ikwu okwu ndị ga-egosi na anyị ghọtara ịdị ukwuu ya, ịdị ebube ya, na àgwà ya ndị zuru okè. (Ọma 145:3-5) Ịkpọ onye ahụ a na-amụrụ Bible aha, ikekwe ikwu ọnọdụ ya, na ikpe ekpere ka ọ na-enwe ọganihu ime mmụọ ga-abụ ihe bara uru. Ka ọ na-enwe ọganihu, anyị pụrụ ịrịọ ka Jehova gọzie mgbalị ndị ọ na-eme n’ịga nzukọ na iso ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu ndị ọ na-amụta. Gụnye arịrịọ maka ngọzi Jehova n’ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ.
5 Olee mgbe ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị ikpe ekpere n’ọmụmụ Bible ebe obibi? E kwesịrị iji ekpere meghee ọmụmụ ihe nke gbanyeworo mkpọrọgwụ. Otú ọ dị, wepụta oge kọwaara onye ahụ a na-amụrụ ihe otú e si ekpe ekpere tupu ị malite iji ekpere na-eme ihe n’ọmụmụ ihe. Ka anyị nile na-adabere n’ebe Jehova nọ maka ịgọzi mgbalị anyị ka anyị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi.