Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ezi Okwukwe—À Ka Pụrụ Inwe Ya?
    Ụlọ Nche—2001 | Ọktoba 1
    • na-adịghị ada ada nke Chineke,” kama nke ahụ, na ọ bụ “okwu na-ada ada nke mmadụ, nke ma eleghị anya nwere ihe ụfọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke n’akụkụ ya ụfọdụ.”

      Mgbe ụfọdụ, okwukwe na-anwụ nnọọ. Nke ahụ bụ ihe mere n’ebe onye edemede na onye mgbasa ozi bụ́ Ludovic Kennedy nọ. Ọ na-ekwu na malite n’oge ya bụ nwata na ya “na-enwe obi abụọ [banyere Chineke] site n’oge ruo n’oge, nakwa na ekweghị ekwe [ya] mụbara.” O yiri ka ọ dịghị onye pụrụ ịza ya ajụjụ ya dị iche iche n’ụzọ ezi uche dị na ha. Ọnwụ nna ya nwụrụ n’oké osimiri bụ oké ihe mberede kpara okwukwe dịrịla mbụ bụrụ nke na-esitụghị ike, aka ọjọọ. Chineke azaghị ekpere e kpekuru ya ka o “chebe anyị pụọ n’ihe ize ndụ nke oké osimiri nakwa n’ihe ike nke ndị iro” ka ụgbọ mmiri agha nke ndị Germany wakporo ma bibie ụgbọ mmiri ahụ a rụgharịrị arụgharị bụ́ nke nna ya nọ n’ime ya n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.—All in the Mind—A Farewell to God.

      Ahụmahụ ndị dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. “Ọ bụghị mmadụ nile,” ka Pọl onyeozi na-ekwu, “nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Gịnị ka i chere? Ọ̀ ka kwere omume inwe ezi okwukwe n’ebe Chineke na Okwu ya nọ n’ụwa nke ịrụ eziokwu ụka na-arịwanye elu na ya? Tụlee ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu n’okwu a.

  • Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe
    Ụlọ Nche—2001 | Ọktoba 1
    • Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe

      Mgbe Sarah Jayne dị afọ 19, ọ matara na ya bu ọrịa cancer nke akụkụ ahụ na-emepụta àkwá. Mgbe a wasịrị ya ahụ, ahụ bịara dị ya mma, ọ bịakwara nwee nchekwube maka ọdịnihu. N’ezie, o nwere nnọọ nchekwube nke na mgbe ọ dị afọ 20, o kwere otu nwoke nkwa ọlụlụ ma malite ime atụmatụ maka agbamakwụkwọ ya. N’afọ ahụ kpọmkwem, ọrịa cancer ahụ lọghachiri, ọ matakwara na ndụ ya fọdụrụ nanị izu ole na ole. Sarah Jayne nwụrụ na June 2000, mgbe ọ fọrọ obere ihe ka o ruo afọ 21.

      IHE kpaliri mmasị ndị letara Sarah Jayne mgbe o dina n’ihe ndina n’ụlọ ọgwụ bụ nchegbu ọ na-adịghị echegbu onwe ya maka ọdịnihu, tinyere okwukwe miri emi o nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’Okwu ya, bụ́ Bible. N’agbanyeghị ajọ ọdachi ọ nọ na-eche ihu, o ji olileanya mbilite n’ọnwụ n’aka—na ọ ga-ahụ ndị enyi ya nile ọzọ. (Jọn 5:28, 29) “Aga m ahụ unu nile n’ụwa ọhụrụ Chineke,” ka o kwuru.

      Ụfọdụ na-ewere okwukwe dị otú ahụ dị ka nkwenkwe ụgha. “Olee ihe ọzọ bụ ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị ma ọ́ bụghị nkwenkwe ndị na-enweghị nchebe nwere,” ka Ludovic Kennedy na-ajụ, “na mgbe a ga-afụ opi ikpeazụ, a ga-enwe ihe omume ndị pụrụ iche na opi a ga na-afụrụ ha, nakwa na ha na ndị buru ha ụzọ nwụọ na ndị ha ga-ebu ụzọ anwụ ga-anọ n’Iden osisi jupụtara na-ekpori ndụ?” Anyị aghaghị ịjụ ajụjụ iji gbaghaa okwu ahụ. Olee nke ezi uche ka dịrị na ya—ọ̀ bụ ikwere na “ọ bụ ndụ a nanị ka anyị nwere ịdị, n’ihi ya ọ kaara anyị mma inweta ihe nile anyị pụrụ inweta na ya,” dị ka Kennedy na-enye echiche ya, ka ọ̀ bụ ikwere na Chineke nakwa ná nkwa ya nke mbilite n’ọnwụ? Sarah Jayne họọrọ nke abụọ ahụ. Olee otú o si zụlite okwukwe dị otú ahụ?

      “Chọọ Chineke . . . Wee Chọta Ya”

      Iji zụlite okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe mmadụ nọ, ọ dị gị mkpa ịmara ya na ịmata otú o si eche echiche ma na-eme omume. Nke a bụ ihe e ji obi na uche eme. N’ezie, ọ bụ otu ihe ahụ ma a bịa n’ịzụlite ezi okwukwe n’ebe Chineke nọ. Ọ dị gị mkpa ịmara ya, ịmara banyere àgwà ya na ụdị onye ọ bụ, ịchọpụta otú ọ bụruworo onye a pụrụ ịtụkwasị obi na onye a pụrụ ịdabere na ya n’ihe nile o kwuworo ma mee.—Abụ Ọma 9:10; 145:1-21.

      Ụfọdụ na-eche na nke a agaghị ekwe omume. Ha na-ekwu na Chineke nọ n’ebe dị nnọọ anya, na ọ dị nnọọ omimi—ma ọ bụrụdịrịị na ọ dị adị n’ezie. “Ọ bụrụ na Chineke dị adị n’ezie dị ka o yiri ka ọ dị nye ndị Kraịst dị ka Sarah Jayne,” ka ndị na-arụ eziokwu ụka na-ajụ, “gịnị mere na ọ dịghị eme ka ndị fọdụrụ n’ime anyị mara ya?” Ma Chineke ọ̀ nọ n’ebe dị nnọọ anya ma bụrụ onye a na-apụghị ịchọta achọta n’ezie? N’okwu Pọl onyeozi gwara ndị ọkà ihe ọmụma na ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ n’Atens, o kwuru na “Chineke Onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya” enyewokwa ihe nile dị mkpa iji “chọọ [ya] . . . wee chọta Ya.” N’ezie, Pọl kwuru, sị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.”—Ọrụ 17:24-27.

      Oleezi otú ị pụrụ isi “chọọ Chineke . . . wee chọta Ya”? Ụfọdụ emeela nke ahụ nanị site n’ikiri eluigwe na ala nke gbara ha gburugburu. Nye ọtụtụ ndị, nke ahụ n’onwe ya na-agba akaebe zuru ezu iji mee ka ha kwenye na a ghaghị inwe Onye Okike.a (Abụ Ọma 19:1; Aịsaịa 40:26; Ọrụ 14:16, 17) Ha na-eche, dị ka Pọl onyeozi, na “ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya.”—Ndị Rom 1:20; Abụ Ọma 104:24.

      Bible Dị Gị Mkpa

      Otú ọ dị, iji wulite ezi okwukwe n’ebe Onye Okike nọ, ihe ọzọ o wepụtaworo dị gị mkpa. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ Bible—Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee nke o jiri kpughee uche na nzube ya. (2 Timoti 3:16, 17) “Cheregodị,” ka ụfọdụ ga-asị, “ọ̀ pụrụ isi aṅaa kwe gị omume ikwere ihe nile Bible na-ekwu mgbe ị na-ahụ arụ ndị na-ekwu na ha na-agbaso Bible na-eme?” N’eziokwu, Krisendọm nwere ihe ndekọ na-awụ akpata oyi n’ahụ nke ime ihu abụọ, inwe obi ọjọọ, na ime omume rụrụ arụ. Ma onye ọ bụla nwere ezi uche pụrụ ịhụ na Krisendọm na-eme nanị ka a ga-asị na ọ na-agbaso ụkpụrụ Bible.—Matiu 15:8.

      Bible n’onwe ya dọrọ aka ná ntị na ọtụtụ mmadụ ga-azọrọ na ha na-efe Chineke ma, n’ezie, ha ga “na-agọnahụ ọbụna Onyenwe ha Onye gbara ha.” “Ndị,” ka Pita onyeozi kwuru, “a ga-ekwulu ụzọ nke eziokwu n’ihi ha.” (2 Pita 2:1, 2) Jisọs Kraịst kwuru na ndị a bụ “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu” bụ́ ndị a ga-amata nke ọma site n’omume ọjọọ ha. (Matiu 7:15-23) Ịjụ Okwu Chineke na-adabere n’ihe ndekọ nke omume Krisendọm dị ka ịtụfu akwụkwọ ozi si n’aka enyi ị tụkwasịrị obi nanị n’ihi na onye wetaara gị ya nwere aha ọjọọ.

      E wezụga Okwu Chineke, ọ gaghị ekwe omume ịzụlite ezi okwukwe. Ọ bụ nanị na Bible ka Jehova na-egosi ebe ọ kwụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ na-aza ajụjụ ndị a jụwara kemgbe ụwa, dị ka ihe mere o jiworo kwere ka nhụjuanya na ihe mgbu dịrị na ihe ọ ga-eme banyere ọnọdụ ahụ. (Abụ Ọma 119:105; Ndị Rom 15:4) Sarah Jayne bịara kwere na Bible bụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13; 2 Pita 1:19-21) N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụghị nanị n’ihi na ndị mụrụ ya gwara ya otú ahụ, kama n’ihi na o wepụtara oge iji jiri obi ọcha tụlee ihe àmà nile na-egosi na Bible bụ mkpughe pụrụ iche sitere n’aka Chineke. (Ndị Rom 12:2) Dị ka ihe atụ, ọ chọpụtara mmetụta dị ike Bible nwere ná ndụ ndị na-agbaso ụkpụrụ ya. Site n’iji mbipụta ndị dị ka The Bible—God’s Word or Man’s?b mee ihe, o jikwa nlezianya nyochaa ọtụtụ ihe àmà dị n’ime Bible bụ́ ndị na-egosi na e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ya.

      “Okwukwe Si n’Ọnụnụ Pụta”

      Otú ọ dị, nanị inwe Bible ma ọ bụ ọbụna ikwere na e ji ike mmụọ nsọ dee ya ezughị ezu. “Okwukwe,” ka Pọl onyeozi na-ede, “si n’ọnụnụ pụta.” (Ndị Rom 10:17) Ihe na-ewulite okwukwe bụ ịnụ ihe Bible na-ekwu, ọ bụghị nanị inwe Bible. Ị “na-anụ” ihe Chineke nwere ikwu site n’ịgụ na ịmụ Okwu ya. Ọbụna ụmụaka pụrụ ime nke a. Pọl na-ekwu na site “n’oge [Timoti] dị na nwa ọhụrụ,” nne ya na nne ya ochie kụziiri ya “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ.” Nke a ọ̀ na-enye echiche na e duhiere ya n’ụzọ ụfọdụ? Ee e! E jighị aghụghọ chịkwaa Timoti ma ọ bụ ghọgbuo ya n’ụzọ ọ bụla. E ‘mere ka o kwere’ ihe ọ nụrụ ma gụọ.—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.

      E mere ka Sarah Jayne kwere n’otu ụzọ ahụ. Dị ka ndị Beria nke narị afọ mbụ, o “weere obi dị ọkụ nile nara okwu [sitere n’aka ndị mụrụ ya na ndị ozizi ndị ọzọ] nke ọma.” Mgbe ọ bụ nwata, obi abụọ adịghị ya na ọ tụkwasịrị nnọọ obi n’ihe ndị mụrụ ya gwara ya. Mgbe e mesịrị, ka o tolitere, ọ nakwereghị ihe nile a kụziiri ya n’ajụghị ase ma ọ bụ n’ụzọ imezu iwu. O ‘ji nlezianya nyochaa ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a dị otú a.’—Ọrụ 17:11.

      Ị Pụrụ Ịzụlite Ezi Okwukwe

      Gị onwe gị pụkwara ịzụlite ezi okwukwe—ụdị okwukwe ahụ Pọl onyeozi kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst. O kwuru na okwukwe dị otú ahụ bụ “atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1, NW) Ọ bụrụ na i nwere okwukwe dị otú ahụ, ị ga-ejide nnọọ n’aka na olileanya na atụmanya gị nile, gụnyere nkwa mbilite n’ọnwụ Chineke kwere, ga-emezu. Ị ga-ekwenyesi ike na olileanya dị otú ahụ dabeere n’ihe e ji n’aka, ọ bụghị n’echiche efu. Ị ga-ama na ọ dịtụbeghị mgbe Jehova dara n’imezu nkwa ya. (Joshua 21:45; 23:14; Aịsaịa 55:10, 11; Ndị Hibru 6:18) Nkwa Chineke banyere ụwa ọhụrụ ga-abụ nnọọ ihe i ji n’aka dị ka a ga-asị na ọ bịalarị. (2 Pita 3:13) Ị ga-ejikwa anya nke okwukwe hụ nke ọma na Jehova Chineke, Jisọs Kraịst, na Alaeze Chineke dịcha adị, na ha abụghị nkwenkwe ụgha.

      A dịghị ahapụ gị ka i jiri aka gị zụlite ezi okwukwe. E wezụga ime ka Okwu ya na-eru onye ọ bụla aka, Jehova ewepụtawokwa ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst bụ́ nke na-arụsi ọrụ ike n’inyere ndị obi ha ziri ezi aka ịzụlite okwukwe n’ebe Chineke nọ. (Jọn 17:20; Ndị Rom 10:14, 15) Nakwere enyemaka nile Jehova na-enye site ná nzukọ ahụ. (Ọrụ 8:30, 31) Ebe okwukwe bụkwa mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, na-ekpe ekpere n’esepụghị aka ka mmụọ ahụ nyere gị aka ịzụlite ezi okwukwe.—Ndị Galetia 5:22.

      Ekwela ka ndị na-arụ eziokwu ụka bụ́ ndị na-akwa onye ọ bụla nke na-asị na ya nwere okwukwe na Chineke na n’Okwu ya, emo kụdaa gị mmụọ. (1 Ndị Kọrint 1:18-21; 2 Pita 3:3, 4) N’ezie, inwe ezi okwukwe bara oké uru n’ime ka mkpebi gị iguzogide mwakpo ndị dị otú ahụ sikwuo ike. (Ndị Efesọs 6:16) Sarah Jayne chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu, ọ gbakwara ndị bịara leta ya n’ụlọ ọgwụ ume mgbe nile ịzụlite okwukwe nke ha. “Mee ka eziokwu ahụ bụrụ nke gị,” ka ọ na-asị. “Na-amụ Okwu Chineke. Nọrọ nzukọ Chineke nso. Na-ekpe ekpere n’esepụghị aka. Na-arụsị ọrụ ike n’ozi Jehova.”—Jemes 2:17, 26.

      Mgbe otu n’ime ndị nọọsụ ya hụrụ okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ nakwa ná mbilite n’ọnwụ, o kwuru, sị: “Ahụla m na i kweere ihe a n’ezie.” Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji nwee nchekwube dị otú ahụ n’agbanyeghị ọnwụnwa ya, ọ zara, sị: “Ọ bụ inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ ezigbo enyi m, ahụkwara m ya n’anya nke ukwuu.”

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Lee akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

      b Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

      [Foto dị na peeji nke 6]

      ‘Site n’oge Timoti bụ nwa ọhụrụ,’ nne ya na nne ya ochie kụziiri ya “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ”

      [Foto dị na peeji nke 6]

      A jara ndị Beria mma maka inyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị

      [Ebe E Si Nweta Foto]

      Site na “Photo-Drama of Creation,” 1914

      [Foto ndị dị na peeji nke 7]

      Ihe na-ewulite okwukwe bụ ịnụ ihe Bible na-ekwu na ime ya, ọ bụghị nanị inwe ya

      [Foto dị na peeji nke 7]

      “Aga m ahụ unu nile n’ụwa ọhụrụ Chineke”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya