Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/03 p. 1
  • Inwe Ekele Maka Ebere Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inwe Ekele Maka Ebere Chineke
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nna Unu Na-eme Ebere”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Anyị Na-efe Chineke Onye Ebere Ya “Na-enweghị Atụ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Na-ekwusa Ozi Ọma Gbasara Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Obi Dị Anyị Ụtọ na Chineke Na-egosi Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 7/03 p. 1

Inwe Ekele Maka Ebere Chineke

1 Tupu Pọl onyeozi aghọọ Onye Kraịst, o ji ike guzogide mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na o mere ya n’amaghị ihe, e meere ya ebere. Jehova gosiri Pọl obiọma na-erughịrị ya, o nyekwara ya ọrụ ime nkwusa. Pọl ji ọrụ ahụ kpọrọ ihe. (Ọrụ 26:9-18; 1 Tim. 1:12-14) Ekele Pọl nwere maka ebere Jehova meere ya kpaliri ya itinye onwe ya n’ijezu ozi ya.—2 Kọr. 12:15.

2 Dị ka ebere Chineke si dị, e nyewokwa anyị onwe anyị ozi anyị ga-eje. (2 Kọr. 4:1) Dị ka Pọl, anyị pụrụ igosipụta ekele anyị nwere maka ebere e meere anyị site n’itinyesi mgbalị ike n’inyere ndị ọzọ aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Otu ụzọ anyị pụrụ isi mee ya bụ site n’ịmalite nakwa n’iduzi ọmụmụ Bible.

3 Ịmalite Ọmụmụ Bible: Otu ụzọ isi malite ọmụmụ Bible bụ site n’iguzobe ụzọ magazin. Ka anyị na-eleta ndị nọ n’ụzọ magazin anyị ugboro ugboro, anyị na-amata nchegbu ndị ha na-enwe nke ọma. Ka oge na-aga, otu isiokwu dị n’ime magazin ndị ahụ pụrụ ịbụ ihe ga-eduga n’ịmalite ọmụmụ Bible na broshuọ Na-achọ. Ná nleta ndị ga-esochi, ọ pụrụ ikwe mee ịnọgide na-enwe nkwurịta okwu na broshuọ Na-achọ mgbe ọ bụla anyị wegaara onye nwe ụlọ magazin.

4 Mgbalị E Ji Ekpere Mee Dị Mkpa: Ekpere na mgbalị siri ike ga-eme ka ọrụ nkwusa anyị ka mma. Otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ nke nwere otu ọmụmụ Bible kpekuru Jehova ekpere ka ọ gọzie ya inwetakwu ndị ọzọ ọ ga na-eduziri ọmụmụ Bible. O mekwara ihe kwekọrọ n’ekpere ya. O chebaara ozi ya echiche ma chọpụta na mgbe ọ na-eme nletaghachi, ọ dịghị agwa ndị mmadụ ka ya duziere ha ọmụmụ Bible. Ọ malitere ime otú ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya, o nwetara mmadụ abụọ ọzọ ọ na-eduziri ọmụmụ Bible.

5 Lee ihe ùgwù ọ bụụrụ anyị ikere òkè n’ime ka a mara “ozi ọma nke obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke”! (Ọrụ 20:24) Ka ekele anyị nwere maka ebere Chineke kpalie anyị ịdị uchu n’inyere ndị ọzọ aka irite uru n’obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya