Okwukwe Kpaliri Ya Ime Ihe
MGBE Jehova nyere Mosis ọrụ idupụta mba Israel n’agbụ Ijipt, na mbụ Mosis rịọrọ ka ya ghara ịrụ ọrụ ahụ, na-asị: “Biko, Onyenwe anyị, Ọ bụghị onye ọkà okwu ka m bụ, ma ọ bụ na mgbe gara aga, ma ọ bụ site na mgbe Ị gwara ohu Gị okwu: n’ihi na onye ọnụ ya dị arọ, nke ire ya dịkwa arọ, ka m bụ.” (Ọpụpụ 4:10) Ee, Mosis echeghị na ya ruru eru ịrụ ọrụ ahụ dị arọ.
N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova na-eche mgbe ụfọdụ na ha erughị eru ịrụzu ọrụ e kenyeworo ha. Dị ka ihe atụ, otu onye nlekọta bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Theodore na-akọ, sị: “N’ihe nile Jehova gwara m ka m mee, ozi ubi sikarịsịrị ike. Mgbe m bụ nwata, m na-aga n’ọnụ ụzọ ngwa ngwa, mee dị ka m na-akụ mgbịrịgba ụzọ, ma jiri nwayọọ pụọ, na-enwe olileanya na ọ dịghị onye ga-anụ mkpọtụ m ma ọ bụ hụ m. Ka m na-etowanye dimkpa, m kwụsịrị ime nke ahụ, ma echiche nke ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-abịa m ọrịa. Ọbụna ruo taa, ọrịa na-abịa m tupu mụ apụọ n’ozi, ma m na-agakwarị ya.”
Gịnị mere ka Mosis na Ndịàmà nke oge a dị ka Theodore nagide ụdị egwu ahụ? Bible na-aza, sị: “Okwukwe ka o [Mosis] ji hapụ Ijipt, . . . n’ihi na ọ nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.”—Ndị Hibru 11:27.
N’ezie, site n’inwe okwukwe na Jehova, Mosis nwere ike imeri mmetụta ya nke erughị eru wee rụzuo ọrụ ndị e kenyere ya dị ka onye ikpe, onye amụma, onye ndú mba, onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, ọchịagha, ọkọ akụkọ ihe mere eme, na onye so dee Bible.
N’ụzọ dịkwa otú ahụ, mgbe anyị nwere okwukwe dị ka Mosis, anyị ga-eje ije dị ka a ga-asị na anyị “na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.” Ụdị okwukwe ahụ na-akpali obi ike, na-eme ka anyị nwee ike iburu ibu ọrụ ndị Kraịst anyị—ọbụna mgbe anyị chere na anyị erughị eru.