IHE ỌMỤMỤ NKE 53
A Gbara Ndị Na-ege Ntị Ume Ma Wusie Ha Ike
N’AGBANYEGHỊ nsogbu ndị ha na-eche ihu, ndị ohu Chineke kwesịrị inwe ike inweta agbamume n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Iji mezuo nke ahụ, ndị okenye karịsịa aghaghị ịhụ na okwu ha na ndụmọdụ ha na-enye agbamume. Ndị okenye kwesịrị ịdị “ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.”—Aịsa. 32:2.
Ọ bụrụ na ị bụ okenye, okwu gị hà na-enye ume ọhụrụ na nkasi obi? Hà na-eme ka ndị na-agbalị ijere Jehova ozi n’ikwesi ntụkwasị obi dị ike? Hà na-enye ume iji nọgide na-eme ihe Chineke na-achọ n’agbanyeghị enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide nke ọha na eze? Gịnị ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ndị na-ege gị ntị na-enwe ịda mbà n’obi, na-ahụsi anya n’ihi ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba, ma ọ bụ na-agbaso ọrịa siri ike nke a na-amaghị ihe ga-agwọta ya mgba? Ị pụrụ ‘iji okwu ọnụ gị gbaa ụmụnna gị ume.’—Job 16:5.
Jiri ohere i nwere dị ka ọkà okwu nyere ụmụnna gị aka inweta olileanya na ume site n’aka Jehova na site ná ndokwa ndị o meworo.—Rom 15:13; Efe. 6:10.
Chetaghachiri Ha Ihe Jehova Meworo. Otu ụzọ dị mkpa nke isi mee ka e nwee obi ike bụ igosi otú Jehova si nyere ndị ya aka ịgabiga ihe isi ike dị iche iche n’oge ndị gara aga.—Rom 15:4.
Jehova gwara Mozis ka o “mee ka [Jọshụa] dị ike” “gbaakwa ya ume” tupu Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, bụ́ nke mba bụ́ ndị iro ha bichiri n’oge ahụ. Olee otú Mozis si mee ya? N’ihu Jọshụa, Mozis chetaara mba ahụ dum ihe dị iche iche Jehova meere ha mgbe ha si n’Ijipt na-apụ. (Deut. 3:28; 7:18) Mozis chetaghachikwara mmeri dị iche iche Jehova mere ka ha merie ndị Amọraịt. Mozis gbaziri Jọshụa ume, sị: “Dị ike, nweekwa ume.” (Deut. 31:1-8) Mgbe ị na-achọ ịgba ụmụnna gị ume, ị̀ na-enyere ha aka inweta ume site n’icheta ihe dị iche iche Jehova mewooro ha?
Mgbe ụfọdụ, nsogbu ndị mmadụ nwere na-ebu nnọọ ibu nke na ha na-eche ma ọ̀ dị mgbe ha ga-enweta ngọzi nile nke Alaeze ahụ. Chetara ha na nkwa Jehova kwere bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha.—Josh. 23:14.
N’ala ụfọdụ, iwu ndị gọọmenti nyere machibidoro ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ndị okenye na-ahụ n’anya pụrụ inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka inweta ume site n’ahụmahụ nke ndịozi Jizọs Kraịst. (Ọrụ 4:1–5:42) Imekwa ka ụzọ Chineke si mee ka ọnọdụ gbanwee dị ka e dekọrọ ya n’akwụkwọ Esta pụta ìhè, ga-eme n’ezie ka ụmụnna ahụ nwee obi ike.
Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-aga nzukọ ọgbakọ ma ha adịghị enwe ọganihu karịa nke ahụ. Ha pụrụ iche na ọ dịghị ihe ga-eme ka Chineke gbaghara ha n’ihi na otú ha si bie ndụ na mbụ dị oké njọ. Ma eleghị anya ị pụrụ ịkọrọ ha otú Jehova si mesoo Eze Manase. (2 Ihe 33:1-16) Ma ọ bụ i nwere ike ịkọrọ ha banyere ndị nọ na Kọrint oge ochie bụ́ ndị gbanwere ụzọ ndụ ha, ghọọ Ndị Kraịst, bụrụkwa ndị Chineke gụrụ ná ndị ezi omume.—1 Kọr. 6:9-11.
Ụfọdụ ndị hà na-eche na nsogbu ndị ha na-enwe na-egosi na ha enwekwaghị ihu ọma Chineke? Ị pụrụ ichetara ha ihe mere Job na otú e si gọzie ya nke ukwuu n’ihi na ọ nọgidesiri ike n’iguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova. (Job 1:1-22; 10:1; 42:12, 13; Ọma 34:19) Ndị nkasi obi ụgha nke Job kwuru n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ ghaghị ịbụ na ọ dịwo ihe ọjọọ Job mere. (Job 4:7, 8; 8:5, 6) N’ụzọ dị iche na nke ahụ, mgbe ha na-ewusi ndị na-eso ụzọ ike ma “na-agba ha ume ịnọgide n’okwukwe,” Pọl na Banabas kwuru, sị: “Anyị aghaghị ịbanye n’alaeze Chineke site n’ọtụtụ mkpagbu.” (Ọrụ 14:21, 22) N’otu aka ahụ taa, ị pụrụ iwusi ndị nọ n’ọnwụnwa ike site n’ịkọwapụta na a chọrọ ntachi obi n’aka Ndị Kraịst nile mgbe ha nọ ná mkpagbu nakwa na ntachi obi dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.—Ilu 27:11; Mat. 24:13; Rom 5:3, 4; 2 Tim. 3:12.
Gbaa ndị na-ege gị ntị ume iche echiche banyere ụzọ dị iche iche Jehova siworo mezuo nkwa ya ná ndụ ha. Site n’ichetara ha ihe ụfọdụ, ha pụrụ ịhụ otú Jehova siworo mesoo ha onwe ha, dị nnọọ ka o kwere ná nkwa. N’Abụ Ọma 32:8, anyị na-agụ, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.” Site n’inyere ndị na-ege gị ntị aka icheta otú Jehova siworo duzie ha ma ọ bụ wusie ha ike, ị ga-eme ka ha nwee ike ịhụ n’onwe ha kpọmkwem na Jehova na-eche banyere ha nakwa na ọ ga-enyere ha aka n’ezie imeri ọnwụnwa ọ bụla ha na-eche ihu ugbu a.—Aịsa. 41:10, 13; 1 Pita 5:7.
Gosi Obi Ụtọ n’Ihe Chineke Na-eme Ugbu A. Mgbe ị na-achọ ịgba ụmụnna gị ume, dọrọ uche ha gaa n’ihe Jehova na-eme ugbu a. Ikwu banyere ihe ndị a n’ụzọ na-egosi na ha na-enye gị obi ụtọ ga-akpali ụdị mmetụta ahụ n’obi nke ndị na-ege gị ntị.
Tụlee otú Jehova si enyere anyị aka ịnagide nrụgide dị iche iche nke ndụ. Ọ na-egosi anyị ụzọ kasị mma isi bie ndụ. (Aịsa. 30:21) Ọ na-akọwara anyị ihe kpatara mpụ, ikpe na-ezighị ezi, ịda ogbenye, ọrịa, na ọnwụ, na-agwakwa anyị otú ọ ga-esi weta ihe a nile ná njedebe. O ji òtù ụmụnna na-ahụ n’anya gbaa anyị gburugburu. O nyere anyị oké ihe ùgwù nke ikpe ekpere. O nyere anyị ihe ùgwù nke ịbụ Ndịàmà ya. Ọ na-emeghe anya anyị ịhụ na e meworị ka Kraịst nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe nakwa na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe ochie a ji ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya.—Mkpu. 12:1-12.
Gbakọnye nzukọ ọgbakọ anyị na mgbakọ dị iche iche ná ngọzi ndị ahụ. Mgbe ị na-ekwu maka ndokwa ndị a n’ụzọ na-egosi na i ji ha kpọrọ ihe n’ezie, ị ga-eme ka mkpebi ndị ọzọ mere ịghara ileghara iso ụmụnna ha zukọọ sikwuo ike.—Hib. 10:23-25.
Akụkọ ndị na-enye ihe àmà nke ngọzi Jehova ná mgbalị anyị n’ozi ubi bụkwa ebe e si enweta ume. Na narị afọ mbụ mgbe Pọl na Banabas nọ na-aga Jeruselem, ha mere “ka ụmụnna nile na-enwe ọṅụ dị ukwuu” site n’ịkọrọ ha n’ụzọ zuru ezu nchegharị nke ndị mba ọzọ. (Ọrụ 15:3) Gị onwe gị kwa pụrụ ime ka ụmụnna gị nwee ọṅụ site n’iso ha na-ekerịta ahụmahụ ndị na-ewuli elu.
Ndị mmadụ ga-enweta agbamume ka ukwuu mgbe e nyeere ha aka ịhụ uru ihe ha na-eme bara. Jaa ha mma maka òkè ha na-ekere n’ozi Ndị Kraịst. Jaa ndị agadi na ndị ọrịa mma, bụ́ ndị ọnọdụ ha kpaara ihe ha na-arụ ókè nke ukwuu ma ha na-egosi iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi. Chetara ha na Jehova adịghị echefu ịhụnanya ha gosiworo maka aha ya. (Hib. 6:10) Okwukwe nke ọnwụnwa leworo ule bụ ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa. (1 Pita 1:6, 7) Ọ dị mkpa ka e chetara ụmụnna anyị nke a.
Jiri Mmetụta Kwuo Okwu Banyere Olileanya Dị n’Ihu. Nkwa ndị sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ihe ndị gaje ịbịa bụ isi iyi nke agbamume nye ndị nile hụrụ Chineke n’anya. Ma eleghị anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-ege gị ntị anụwo ihe ndị a ọtụtụ ugboro. Ma site n’ekele ị na-egosipụta mgbe ị na-ekwu banyere nkwa ndị a, ị pụrụ ime ka ha dị ọhụrụ, mee ka e nwee ntụkwasị obi ná mmezu ha, ma mee ka obi ndị mmadụ jupụta n’ekele. Iji ihe ị mụtaworo n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke mee ihe pụrụ inyere gị aka ime nke ahụ.
Jehova n’onwe ya bụ Onye Ukwu Na-enye Agbamume na Onye Na-enye ndị ya ume. Ma, gị na ya pụrụ ịrụkọ ọrụ n’ịkpọsa ngọzi ndị dị otú ahụ. Mgbe ị na-agwa ọgbakọ okwu, jiri ohere i nwere ime ya mee ihe nke ọma.