-
A Gbara Ndị Na-ege Ntị Ume Ma Wusie Ha IkeRite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
-
-
imeri ọnwụnwa ọ bụla ha na-eche ihu ugbu a.—Aịsa. 41:10, 13; 1 Pita 5:7.
Gosi Obi Ụtọ n’Ihe Chineke Na-eme Ugbu A. Mgbe ị na-achọ ịgba ụmụnna gị ume, dọrọ uche ha gaa n’ihe Jehova na-eme ugbu a. Ikwu banyere ihe ndị a n’ụzọ na-egosi na ha na-enye gị obi ụtọ ga-akpali ụdị mmetụta ahụ n’obi nke ndị na-ege gị ntị.
Tụlee otú Jehova si enyere anyị aka ịnagide nrụgide dị iche iche nke ndụ. Ọ na-egosi anyị ụzọ kasị mma isi bie ndụ. (Aịsa. 30:21) Ọ na-akọwara anyị ihe kpatara mpụ, ikpe na-ezighị ezi, ịda ogbenye, ọrịa, na ọnwụ, na-agwakwa anyị otú ọ ga-esi weta ihe a nile ná njedebe. O ji òtù ụmụnna na-ahụ n’anya gbaa anyị gburugburu. O nyere anyị oké ihe ùgwù nke ikpe ekpere. O nyere anyị ihe ùgwù nke ịbụ Ndịàmà ya. Ọ na-emeghe anya anyị ịhụ na e meworị ka Kraịst nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe nakwa na mgbe ikpeazụ nke usoro ihe ochie a ji ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya.—Mkpu. 12:1-12.
Gbakọnye nzukọ ọgbakọ anyị na mgbakọ dị iche iche ná ngọzi ndị ahụ. Mgbe ị na-ekwu maka ndokwa ndị a n’ụzọ na-egosi na i ji ha kpọrọ ihe n’ezie, ị ga-eme ka mkpebi ndị ọzọ mere ịghara ileghara iso ụmụnna ha zukọọ sikwuo ike.—Hib. 10:23-25.
Akụkọ ndị na-enye ihe àmà nke ngọzi Jehova ná mgbalị anyị n’ozi ubi bụkwa ebe e si enweta ume. Na narị afọ mbụ mgbe Pọl na Banabas nọ na-aga Jeruselem, ha mere “ka ụmụnna nile na-enwe ọṅụ dị ukwuu” site n’ịkọrọ ha n’ụzọ zuru ezu nchegharị nke ndị mba ọzọ. (Ọrụ 15:3) Gị onwe gị kwa pụrụ ime ka ụmụnna gị nwee ọṅụ site n’iso ha na-ekerịta ahụmahụ ndị na-ewuli elu.
Ndị mmadụ ga-enweta agbamume ka ukwuu mgbe e nyeere ha aka ịhụ uru ihe ha na-eme bara. Jaa ha mma maka òkè ha na-ekere n’ozi Ndị Kraịst. Jaa ndị agadi na ndị ọrịa mma, bụ́ ndị ọnọdụ ha kpaara ihe ha na-arụ ókè nke ukwuu ma ha na-egosi iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi. Chetara ha na Jehova adịghị echefu ịhụnanya ha gosiworo maka aha ya. (Hib. 6:10) Okwukwe nke ọnwụnwa leworo ule bụ ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa. (1 Pita 1:6, 7) Ọ dị mkpa ka e chetara ụmụnna anyị nke a.
Jiri Mmetụta Kwuo Okwu Banyere Olileanya Dị n’Ihu. Nkwa ndị sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ihe ndị gaje ịbịa bụ isi iyi nke agbamume nye ndị nile hụrụ Chineke n’anya. Ma eleghị anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-ege gị ntị anụwo ihe ndị a ọtụtụ ugboro. Ma site n’ekele ị na-egosipụta mgbe ị na-ekwu banyere nkwa ndị a, ị pụrụ ime ka ha dị ọhụrụ, mee ka e nwee ntụkwasị obi ná mmezu ha, ma mee ka obi ndị mmadụ jupụta n’ekele. Iji ihe ị mụtaworo n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke mee ihe pụrụ inyere gị aka ime nke ahụ.
Jehova n’onwe ya bụ Onye Ukwu Na-enye Agbamume na Onye Na-enye ndị ya ume. Ma, gị na ya pụrụ ịrụkọ ọrụ n’ịkpọsa ngọzi ndị dị otú ahụ. Mgbe ị na-agwa ọgbakọ okwu, jiri ohere i nwere ime ya mee ihe nke ọma.
-
-
Nọgide Na-enwe ỌganihuRite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
-
-
Nọgide Na-enwe Ọganihu
Ị̀ RỤWO ọrụ n’onwe gị na nke ọ bụla n’ime isi ihe ndị a ga-enye ndụmọdụ na ha n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ a? Ì mesịwo ihe omume ndị a tụrụ aro ha? Ị̀ na-etinye isi ihe nke ọ bụla n’ọrụ mgbe ị na-ekwu okwu, ma ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ̀ bụ ná nzukọ ndị ọzọ, nakwa mgbe ị na-ekere òkè n’ozi ubi?
Nọgide na-erite uru ná mmụta a na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. N’agbanyeghị ogologo oge ị nọworo na-ekwu okwu, e nwere akụkụ ndị ị pụrụ inwekwu ọganihu na ha.
-