-
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mee Baptizim?Ụlọ Nche—2002 | Eprel 1
-
-
15. N’ihi gịnị ka e ji emikpu ndị a na-eme baptizim n’ime mmiri?
15 Mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke site n’aka Kraịst, anyị na-ekwupụta mkpebi anyị ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke dị ka e depụtara ya n’Akwụkwọ Nsọ. Ná ngosipụta nke nraranye ahụ, a na-emikpu ndị ahụ a gaje ime baptizim ná mmiri, ọbụna dị ka e mere Jizọs baptizim n’Osimiri Jọdan iji gosi mwepụta o wepụtara onwe ya n’ihu Chineke. (Matiu 3:13) O kwesịrị ka a rịba ama na Jizọs nọ na-ekpe ekpere n’oge ahụ dị oké mkpa.—Luk 3:21, 22.
16. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ọṅụ anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe anyị hụrụ ka a na-eme ndị mmadụ baptizim?
16 Baptizim e mere Jizọs bụ ihe omume dị mkpa ma na-enye ọṅụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa baptizim a na-eme Ndị Kraịst n’oge a. Mgbe anyị hụrụ ndị mmadụ ka ha na-egosipụta nrara ha raara onwe ha nye Chineke, anyị pụrụ igosipụta ọṅụ anyị site n’iji nkwanye ùgwù na-akụ aka nakwa site n’ịja mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ma a na-ezere iti mkpu, ịfụ mkpọrọhịhị, na ihe ndị yiri ha n’ihi nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke ngosipụta nke okwukwe a. Anyị ga-egosipụta ọṅụ anyị n’ụzọ dị ùgwù.
17, 18. Gịnị na-enye aka ikpebi ma mmadụ o ruru eru ịbụ onye e mere baptizim?
17 N’adịghị ka ndị na-efesa ụmụaka mmiri n’isi ma ọ bụ amanye ìgwè mmadụ na-enweghị ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ ịbụ ndị e mere baptizim, Ndịàmà Jehova adịghị amanye onye ọ bụla ịbụ onye e mere baptizim. N’ezie, ha adịghị eme ndị na-erughị eru n’ụzọ ime mmụọ baptizim. Ọbụna tupu onye ọ bụla aghọọ onye na-ekwusa ozi ọma a na-emebeghị baptizim, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ejide n’aka na ọ ghọtara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible, na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha, ma zaa ee n’ajụjụ dị ka nke a, “Ị̀ chọrọ n’ezie ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?”
18 N’ọnọdụ ka ukwuu, mgbe ndị mmadụ na-ekere òkè buru ibu n’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ma kwupụta ọchịchọ ha ịbụ ndị e mere baptizim, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-esoro ha kwurịta okwu iji jide n’aka na ha bụ ndị kwere ekwe rarawooro onwe ha nye Jehova ma ruo ihe ndị Chineke chọrọ maka ịbụ ndị e mere baptizim. (Ọrụ 4:4; 18:8) Mmadụ ịza 100 ajụjụ dabeere n’ozizi Bible n’onwe ya na-enyere ndị okenye aka ikpebi ma ndị na-aza ajụjụ ndị ahụ hà ruru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ maka ịbụ ndị a ga-emikpu ná mmiri. Ụfọdụ adịghị eru eru, n’ihi ya kwa, a dịghị ekwe ka e mee ha baptizim Ndị Kraịst.
Ọ̀ Dị Ihe Na-adọla Gị Azụ?
19. N’iburu Jọn 6:44 n’uche, ole ndị ka ha na Jizọs ga-eketakọ ihe?
19 Ọ pụrụ ịbụ na a gwara ọtụtụ ndị a manyere ịbụ ndị e mere baptizim n’ìgwè na ha ga-aga eluigwe ma ha nwụọ. Ma n’izo aka n’ebe ụmụazụ ya nọ, Jizọs sịrị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) Jehova adọtawo n’ebe Kraịst nọ 144,000, bụ́ ndị ga-abụ ndị ha na Jizọs ga-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe. Ịbụ onye e mere baptizim ná mmanye edotụbeghị onye ọ bụla nsọ maka ọnọdụ ahụ dị ebube ná ndokwa Chineke.—Ndị Rom 8:14-17; 2 Ndị Tesalonaịka 2:13; Mkpughe 14:1.
20. Gịnị pụrụ inyere ndị ụfọdụ na-emebeghị baptizim aka?
20 Karịsịa, kemgbe etiti afọ ndị 1930, ìgwè mmadụ ndị nwere olileanya ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ ma biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi esonyewo n’òtù “atụrụ ọzọ” nke Jizọs. (Mkpughe 7:9, 14; Jọn 10:16) Ha ruru eru ịbụ ndị e mere baptizim n’ihi na ha emewo ka ndụ ha kwekọọ n’Okwu Chineke ma jiri ‘obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum, ike ha dum, na uche ha dum’ hụ Chineke n’anya. (Luk 10:25-28) Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị ghọtara na Ndịàmà Jehova ‘na-efe Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu,’ ha agbasobeghị ihe nlereanya Jizọs ma nye ihe àmà ihu ọha nke ezi ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ nakwa nrara ha raara onwe ha dum nye ya site n’ịbụ ndị e mere baptizim. (Jọn 4:23, 24; Deuterọnọmi 4:24; Mak 1:9-11) Ekpere e ji ezi obi kpee na nke a kpọrọ okwu aha na ya banyere nzọụkwụ a dị oké mkpa pụrụ ime ka ha nwee mkpali na obi ike dị ha mkpa iji na-eme ihe kwekọrọ n’Okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu, iji rara onwe ha dum nye Jehova Chineke, na iji bụrụ ndị e mere baptizim.
21, 22. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji ala azụ ịrara onwe ha nye na ịbụ ndị e mere baptizim?
21 Ụfọdụ na-ala azụ ịrara onwe ha nye na ịbụ ndị e mere baptizim n’ihi na ha tinyere nnọọ onwe ha n’ihe omume ụwa ma ọ bụ ná nchụso nke akụ̀ na ụba nke na ha nwere ntakịrị oge maka ihe ime mmụọ. (Matiu 13:22; 1 Jọn 2:15-17) Lee ka ha ga-esi nwee obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha agbanwee echiche na ihe mgbaru ọsọ ha! Ịbịaru Jehova nso ga-eme ka ha baa ụba n’ụzọ ime mmụọ, ọ ga-enyere ha aka ibelata nchegbu, ọ ga-ewetakwara ha udo na afọ ojuju bụ́ ndị na-abịa site n’ime uche Chineke.—Abụ Ọma 16:11; 40:8; Ilu 10:22; Ndị Filipaị 4:6, 7.
22 Ndị ọzọ na-ekwu na ha hụrụ Jehova n’anya ma ha achọghị ime nraranye ma bụrụ ndị e mere baptizim n’ihi na ha chere na ha ga-esi otú ahụ zere ịbụ ndị ga-aza ajụjụ. Ma onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịza Chineke ajụjụ. Anyị na-aghọ ndị ga-aza ajụjụ mgbe anyị nụrụ okwu Jehova. (Ezikiel 33:7-9; Ndị Rom 14:12) Dị ka ‘ndị a họpụtara,’ a mụnyere ndị Izrel oge ochie ná mba a raara nye Jehova, n’ihi ya kwa, ha nwere ibu ọrụ nke iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi n’ụzọ kwekọrọ n’iwu ya. (Deuterọnọmi 7:6, 11) Ọ dịghị onye a na-amụnye n’ime mba dị otú ahụ taa, ma ọ bụrụ na anyị enwetawo ezi ntụziaka Akwụkwọ Nsọ, ọ dị anyị mkpa iji okwukwe mee ihe banyere ya.
23, 24. Olee egwu ndị na-ekwesịghị ịdọla mmadụ azụ n’ịbụ onye e mere baptizim?
23 Egwu na ha enweghị ihe ọmụma zuru ezu pụrụ ịdọghachi ụfọdụ azụ n’ịbụ ndị e mere baptizim. Ma, anyị nile nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’ihi na “mmadụ agaghị achọpụta ọrụ ahụ nke Chineke rụworo site ná mmalite wee ruo na nsọtụ.” (Eklisiastis 3:11) Tụlee ihe banyere ọnaozi Etiopia. Dị ka onye na-eso ụzọ ndị Juu, o nwere ihe ọmụma ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ, ma ọ pụghị ịza ajụjụ nile banyere nzube Chineke. Otú ọ dị, mgbe ọ mụtasịrị banyere ndokwa Jehova mere maka nzọpụta site n’àjà mgbapụta Jizọs, e mere ọnaozi ahụ baptizim ime mmiri ozugbo.—Ọrụ 8:26-38.
24 Ụfọdụ ndị na-ala azụ ịrara onwe ha nye Chineke n’ihi na egwu ọdịda na-atụ ha. Monique dị afọ 17 na-ekwu, sị: “Anọwo m na-ala azụ ịbụ onye e mere baptizim n’ihi egwu nke ịghara inwe ike ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye m.” Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi anyị dum, ‘ọ ga-eme ka okporo ụzọ anyị zie ezie.’ Ọ ga-enyere anyị aka ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ’ dị ka ndị ohu ya raara onwe ha nye bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.—Ilu 3:5, 6; 3 Jọn 4.
25. Ajụjụ dị aṅaa kwesịrị ka a tụlee ya ugbu a?
25 N’ihi ntụkwasị obi zuru ezu na ịhụnanya sitere n’obi nke ha nwere n’ebe Jehova nọ, kwa afọ a na-akpali ọtụtụ puku mmadụ ime nraranye ma bụrụ ndị e mere baptizim. N’eziekwa, ndị nile bụ́ ndị ohu Chineke raara onwe ha nye chọrọ ikwesị ntụkwasị obi nye ya. Ma, anyị na-ebi n’oge siri ike, anyị na-echekwa ule dịgasị iche iche nke okwukwe ihu. (2 Timoti 3:1-5) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova? Ọ bụ ya ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.
-
-
Nọgide Na-eji Obi Na-eguzosi Ike Na-ejere Jehova oziỤlọ Nche—2002 | Eprel 1
-
-
Nọgide Na-eji Obi Na-eguzosi Ike Na-ejere Jehova ozi
“Obi m na-eguzosi ike, Chineke, obi m na-eguzosi ike.”—ABỤ ỌMA 57:7, NW.
1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee nkwenye siri ike dị ka nke Devid?
JEHOVA pụrụ ime ka anyị na-eguzosi ike n’okwukwe Ndị Kraịst, ka anyị wee nwee ike ịrapagidesi ike n’Iso Ụzọ Kraịst dị ka ndị ohu ya raara onwe ha nye. (Ndị Rom 14:4) N’ihi ya, anyị pụrụ inwe nkwenye yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, bụ́ onye a kpaliri ịbụ, sị: “Obi m na-eguzosi ike, Chineke.” (Abụ Ọma 108:1, NW) Ọ bụrụ na obi anyị na-eguzosi ike, a ga-akpali anyị imezu nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke. Sitekwa n’ilegara ya anya maka nduzi na ike, anyị pụrụ igosipụta na anyị bụ ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ, na-akwụsi ike ná mkpebi nakwa ná nkwenye anyị dị ka ndị na-eguzosi ike n’ihe, ‘na-enwe ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Ndị Kọrint 15:58.
2, 3. Gịnị ka agbamume Pọl nyere nke e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 16:13 pụtara?
2 N’agbamume Pọl onyeozi nyere ụmụazụ Jizọs nọ na Kọrint oge ochie, bụ́ nke metụtakwara Ndị Kraịst nke oge a n’ezie, ọ sịrị: “Mụrụnụ anya, guzosienụ ike n’okwukwe, na-emenụ ka ndị dimkpa, dịnụ ike.” (1 Ndị Kọrint 16:13) N’asụsụ Grik, nke ọ bụla n’ime iwu ndị a nọ n’ụdị okwu na-egosi ihe na-eme ugbu a, si otú ahụ na-agba ume ka a nọgide na-eme ihe. Gịnị ka ndụmọdụ a pụtara?
3 Anyị pụrụ ‘ịmụrụ anya’ n’ụzọ ime mmụọ site n’iguzogide Ekwensu na ịnọ Chineke nso. (Jems 4:7, 8) Ịdabere n’ebe Jehova nọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-adị n’otu, nakwa ‘iguzosi ike n’okwukwe Ndị Kraịst.’ Anyị—gụnyere ọtụtụ ndị inyom nọ n’etiti anyị—‘na-eme ka ndị dimkpa’ site n’iji obi ike na-ejere Chineke ozi dị ka ndị mkpọsa Alaeze. (Abụ Ọma 68:11) Anyị ‘na-adị ike’ site n’ịnọgide na-elegara Nna anyị nke eluigwe anya maka ike iji na-eme uche ya.—Ndị Filipaị 4:13.
-