Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Mmadụ Abụọ Chineke Ji Mmụọ Nsọ Ya Zipụ’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • Ebe ndị mmegide iwe ji na-achụpụ Banabas n’obodo Antiọk dị na Pisidia.

      NKEBI NKE 4 • ỌRỤ 13:1–14:28

      ‘Mmadụ Abụọ Chineke Ji Mmụọ Nsọ Ya Zipụ’

      ỌRỤ 13:4

      Ná nkebi a, anyị ga-ahụ ebe ndị Pọl onyeozi gara nakwa ihe ndị o mere n’oge mbụ ọ gara mba ọzọ ikwusa ozi ọma. A kpagburu onyeozi a n’obodo ọ bụla ọ gara. N’agbanyeghị ya, mmụọ nsọ duziri ya, ya anọgide na-agba àmà, na-amalitekwa ọgbakọ ọhụrụ dị iche iche. N’eziokwu, akụkọ a magburu onwe ya ga-eme ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi anyị.

      Jehovah’s Witnesses facing an angry and threatening mob in Canada in 1945.
  • Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • N’OKPORO ỤZỌ

      N’oge ochie, njem okporo ụzọ na-egbu oge, na-agwụkwa ike. Ọ ga-abụkwa na ọ na-adị oké ọnụ karịa iji ụgbọ mmiri eme njem. Ma, ọ bụ naanị ụkwụ ka e nwere ike iji gaa ọtụtụ ebe.

      Onye ji ụkwụ nwere ike ịga naanị ihe dị ka kilomita iri atọ n’ụbọchị. Anwụ, mmiri ozuzo, okpomọkụ, na oyi ga-emekwa ka njem ya ghara ịdịchara ya mfe. O nwekwara ike ịdaba n’aka ndị ohi. Pọl onyeozi kwuru gbasara ebe dị iche iche ọ gara, sị: “Ka m na-aga, e nwere oge ndị m hụsiri anya ma n’osimiri, ma n’aka ndị ohi.”​—2 Kọr. 11:26.

      E nwere ọtụtụ okporo ụzọ a rụrụ nke ọma n’Alaeze Ukwu Rom. N’okporo ụzọ ndị ahụ, e nwere ụlọ ndị njem a rụrụ n’ebe dị iche iche. Ọ ga-ewe onye njem otu ụbọchị iji ụkwụ si n’otu garuo n’ọzọ. N’agbata ụlọ ndị ahụ, e nwere ebe onye njem nwere ike ịzụrụ ihe ndị dị ya mkpa. Ndị na-ede akwụkwọ n’oge ahụ kwuru na ụlọ ndị njem na ebe ndị ahụ a na-azụrụ ihe anaghị adị ọcha, ndị mmadụ na-akarị akarị na ha, àkpịrị́ na-ejukwa na ha. A na-ele ebe ndị ahụ anya ọjọọ n’ihi na ndị ọjọọ na-anọkarị na ha. Ndị nwe ụlọ ndị ijem na-ezukarị ndị njem ohi, ha na-akpọnyekwa ha ndị akwụna, narakwa ha ego maka ya.

      O doro anya na Ndị Kraịst na-agbalị ike ha niile izere ụdị ebe ndị ahụ. Ma ọ bụrụ na ha na-aga n’ebe ha na-enweghị ikwu na ibe, o yiri ka hà na-abanye n’ebe ndị ahụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya